Posts made in March, 2019

ÉKWÉ JỌNAL NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA Volume 12; No 1, April, 2019

Posted by on Mar 20, 2019 in publications | 0 comments

Ndịnaya na Ndị Odee Agwa Na Akparamagwa N’ejije Igbo                                                                                                                  Igbeakụ, Benjamin ChimuatỤlamỤra (Ph.D.)                                                                                          Department of Linguistics, Igbo & Other Nigerian Languages                                                                                 University of Nigeria, Nsukka                                                                                                                                              +234803 315 6026; benjamin.igbeaku@unn.edu.ng Ọnụzulike, Chinyere Ada (MRS)                                                                                                                                Department of Linguistics, Igbo & Other Nigerian Languages                                                                                              University of Nigeria, Nsukka                                                                                                                                                          +234703 988 7466; nkechinyereozioma@gmail.com  Ntụcha Asụsụ Ndịnọrụ nke Mkparịta Ụka Dị N’etiti Onye Isi Ala Muhammadu Buhari Na Praịm Mịnịsta David Cameron Gbasara Mpụ                                                                                                              1*Ahamefula, N.O., Udechukwu, C.N, Aboh, S.C., Ezekiel, J.C.                                                                Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ, Mahadum Naịjirịa, Nsụka                                                         2Okoye, C.L.,               ...

Read More

Posted by on Mar 20, 2019 in publications | 0 comments

Mmetuta Mọfim/Usoro Mmebe Okwu Igbo Waawa n’Odide Okwu Igbo Izugbe n’Ogo Sinịọ Sekọndịrị dị na Steeti Ebonyi na Enugu Si N’aka Dr. Uchenna Fabian Ude Department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka                                      uchenna.ude@unn.edu.ng   08064231662   Ụmịedemede Isiokwu nchọcha a bụ mmetụta mọfịm/usoro mmebe okwu Igbo Waawa n’odide okwu Igbo Izugbe n’ogo sinịọ sekọndịrị dị na steeti Ebonyi na Enugu. Ụmụakwụkwọ n’ogo sinịọ sekọndịrị nọ na steeti Ebonyi na Enugu na-eji mọfịm olu Igbo Waawa asụ ma na-edekwazị Igbo izugbe nke na-emetụta ha n’ule sinịọ sekọndịrị. Ụdị nchọcha e ji nchọcha a bụ nke Exspostu Fakto (Expost factor design), ebe ọnụọgụ e ji mee nchọcha dị 15,684 (puku iri na ise, nari isii, iri asatọ na anọ. E seere ọnụọgụ dị 1,555 (otu puku, nari ise, iri ise na ise) site n’iji usoro nsere nke nhọ na nha tụmbọm (proportionate stratified random sampling technique). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha bụ Nnwale Nhụrụ Anya (observational) Mmetụta Mọfịm Olu Igbo Waawa n’odide okwu Igbo Izugbe (NNMMOIWI). Eji pesenti wee tụcha ihe a chọpụtara; ebe ihe a chọpụtara na-egosi na mọfịm olu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ na mmebe okwu Igbo Izugbe. Onye nchọcha tụkwara aro ka ndị nkụzi na-akụziri ụmụakwụkwọ etu e si emepụta okwu Igbo site n’iji mọfịm Igbo Izugbe.   Mkpọlite Ntọala Nchọcha                 Asụsụ bụ otu n’ime njirimara agbụrụ ọbụla nke mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta n’ụdị mkparịta ụka iji mee ka mbunuche ha pụta ihe. Ọ bụ site n’asụsụ ka mmadụ si aghọta ma na-amatakwa ihe onye ọzọ bu n’uche. Asụsụ bụ ihe nrịbaama nke mmadụ ji ezipụta ihe o bu n’obi mgbe ya na ndị ọzọ bịakọtara ọnụ. Ọ bụ asụsụ ka mmadụ na ibe ya ji ekwukọrịta okwu nke mere na e wepụ asụsụ, ọ ga-ahịa ahụ ịmata ihe mmadụ bu n’uche. Asụsụ bụ otu ihe mere ka mmadụ karịa anụ ndị ọzọ dị n’ụwa elu. Farinde (2005), kwadoro na asụsụ bụ nnukwu ihe bara oke uru mmadụ jiri dị elu karịa anụ ndị ọzọ dị iche iche. Agbụrụ ọbụla nwere asụsụ ha na-asụ be ha. Ndị Igbo dịka agbụrụ, nwere asụsụ nke ha na-asụ bụ asụsụ Igbo. Asụsụ Igbo so n’otu n’ime asụsụ a na-asụ na Naịjirịa nke a na-asụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala Naịjirịa.  Ọzọ kwa, asụsụ Igbo so n’asụsụ atọ (Awụsa, Igbo na Yoruba) gọọmentị etiti ala Naịjirịa wepụtara ka a na-akụzị ma na-elekwa n’ule sinịọ sekọndịrị. Ọ bụ n’ihi oke uru ọmụmụ asụsụ bara mere gọọmentị etiti Naịjirịa jiri kọwapụta nke ọma n’akwụkwọ Federal Republic of Nigeria (2008) na gọọmentị nabatara ma hụ uru asụsụ bara dịka nke e ji akwalite ezi mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ibe ya, nkwụgidesike nke ala Naịjirịa nakwa nchekwaba omenaala dị iche iche. Ya mere nwata ọbụla ga-eji mụọ asụsụ dị na gburugburu ya. N’ịga n’ihu, maka ọdịmma, ịdịkọ n’otu ala Naịjirịa, nwata ọbụla ga-amụrịrị otu n’ime asụsụ ọdịnaala Naịjirịa: Awụsa: Igbo na Yoruba (FRN 2008). Nke a gosiri na nkụzi na ọmụmụ asụsụ ndị ahụ a kpọrọ aha ebe a dị nnukwu mkpa n’ụlọakwụkwọ Naịjirịa dị iche iche; ma nke praịmarị, sekọndịrị nakwaazị ndị dị elu. Asụsụ Igbo bụ asụsụ ọdịnaala e jiri mara ndị Igbo nke a na-asụ na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ala Igbo ebe a na-asụkarị asụsụ Igbo dịka ndị nwe asụsụ a bụ na steeti ise gụnyere: Abịa, Anambra, Ebọnyị, Enugu na Imo. N’ ime asụsụ atọ (Awụsa, Igbo na Yoruba) gọọmentị nabatara ka a na-akụzi n’ ụlọakwụkwọ dị na Naịjirịa, asụsụ Igbo so na ya. Asụsụ Igbo bụ nke ụdaolu.N’ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ, ọ bụ Igbo Izugbe ka a na-akụziri ụmụakwụkwọ. Igbo Izugbe bụ Igbo...

Read More

Posted by on Mar 20, 2019 in Igbo, publications | 0 comments

Ejirimara ndị Igbo na ụzọ A ga-esi A Kwalite Ejirimara ndị a si n’aka: Ngozi E.  Charles-Owuamanam                                                                                                                                           Sukulu Nke Jenaraal Sutọdisi                                                                                                                                                               Alvan Ikoku Feduraal Koleji Nke Edukeshọn,                                                                                                                              Owere. 08034127477.   Okwu Mmalite Ejirimara  dịka  ịkowa  ya,  bụ  akparamagwa  dị  iche  iche  nke  a na -ahụpụta  n’ime   ndụ  mmadụ  ma ọ bụ  obodo  .  Mmadụ  ọbụla  ma ọ bụ  obodo  ọbụla  nwere  ihe  dị  iche  iche e ji ama ya. A bịa n’ala Igbo, okwu a bụ Igbo nwere nghọta ato.  Nke mbụ, ọ na-egosi ebe obibi nke a na-akpọ ala Igbo. Nke abụọ, ọ na-egosi ndị bi ya bụ ebe nke a na-akpọ ndị Igbo. Nke atọ, ọ na-egosi olu okwu nke a na-akpọ asụsụ Igbo. A bịa n’asụsụ, asụsụ Igbo bụ asụsụ juputara n’olu dị iche iche. Olu ndị  a  niile  bụ  otu  n’ụdị  otu  asụsụ  mana  ha  nwere  otu  ha  si  akpọ  ihe  aha  na  otu  ụda  asụsụ  ha  dị ,  dịka  Igbo  Ọnịcha  ,  Igbo  Owere  ,  Igbo  Ikwere  ,  Igbo  Bendel  nakwa  Igbo  ndị  ọzọ.  Ejirimara  ndị  Igbo  bụ   omenaala  na  ọdịnaala  ha  nke  asụsụ  bụ  otu  n’ime  ha. Eji  m  aka  na  ọtụtụ  ndị  Igbo  anyị  taa   maara  nke  ọma  na  site  na  afọ  ise  nke  na-abịa    abịa    dịka  otu  onye  mba  Amerika  kwuru sị,  asụsụ  (ejirimara)  Igbo  ga-abụ  ihe  e chefuru  echefu. Ihe  kpatara  otu  a  bụ  ihe  anyị    ga-eleba  anya  n’akwụkwọ  a.  Ọzọ  kwa,  akwụkwọ  a  ga-elebe  anya  n’ụzọ  di  iche  iche  a  ga-esi  kwalite  ejirimara  ndị  Igbo. Ọtụtụ ụmụaka,  ndị  okorobịa  nta  na  agbọghọbịa    nta  nke  ndị  Igbo  bụzị  ndị  jiri  omenaala  ndị  ọzọ  mere  omenaala  nke  ha  taa.  A  na-ahụ  akparamagwa  nke  a  tumadị  ebe  asụsụ  ha  nọ  ,  ebe  ha  jiziri  asụsụ  bekee  merezịa  asụsụ  Igbo  ha.  Eji  m  oghere  n’ekele  mmadụ  niile  tinyere  aka  n’icheputa  ihe  odide  gbasara ụzọ  a ga-esi  akwalite  ejirimara  ndị  Igbo  ma  dekwa  ya  n’Igbo  ebe  onye  ji  aka  ya  bụ  onye  ọkammụta  dị  elu  bụ  Dọkịta  Oriakụ  Lucy  Apakama  n’ụlọ  akwụkwọ  a  di  elu  bụ  Alvan  Ikoku  Feduraal  Koleji  nke  Edukeshon, Owere.  N’ịkọ  ya  dịka  akụkọ  na  ụbọchị  Dọkịta  Oriakụ  Apakama  na-agwa  otu  onye  nọ  ebe  mụ  onwe  m  nọ  na  ọ  chọrọ  ka  onye  ahụ    soro  tinye  aka  n’ihe  odide  nke  a ga-eji  kwalite  asụsụ  Igbo  n’obodo  anyị,  anụpere  m  ihe  ọ  gwara  onye  ahụ    werekwa  gwa  ya  sị  na  achọkwara  m  isoro  ha  wee  dee  ya  bụ akwụkwọ.  Mgbe  onye  mụ  na  ya  nọ  n’otu  sukulu  bụ  Jenaraal  Sutodisi  nke  Alvan  nụrụ  ihe  m  gwara  Dọkịta a,  o  tiri  mkpu  ma  chịkwa  ọchị  sị  m  n’ụdị  ajụjụ:  “Bịa ị ...

Read More

Posted by on Mar 20, 2019 in publications | 0 comments

Ọghọm dị na Ngwakọrịta Asụsụ Igbo na Asụsụ Bekee: Nrụtuaka n’Asụsụ Mgbasaozi Azụmahịa Ndị na-ere Ọgwụ Ọgwọnnuọrịa (Multicure Medicine)   nke Nweze, Ifeoma M. (Ph.D.) 1 Alex Ekwueme Federal University, Ndufu-Alike Ikwo, Ebonyi State, Nigeria ifeomanweze62@yahoo.com 08030965053                                                                  na Mpamugo, Emmanuel E2 Ebonyi State University, Abakaliki Ebonyi State, Nigeria                                                                                                   nwaokebest@gmail.com 08061109362     Ụmịedemede Asụsụ Igbo bụ asụsụ e jiri mara ndị Igbo. Ọ bụ otu njirimara ndị Igbo kacha dị ọkpụrụkpụ ma karịcha pụta ihe nke ọma. Asụsụ Igbo nwere usoro, ma n’odide ma n’ọsụsụ. Ya mere e ji nwee mkpụrụedemede ndi e pụtara e ji ede ya iji mee ka ya bụ asụsụ tozuo oke ma kwụrụ chịm. Ndị Igbo nwe asụsụ na-agwakọrịtazi ya na asụsụ Bekee Ọ dịzie ka a ga-asị na asụsụ Igbo egheghi eghe. Ọ bụ omume dị otu a kpalitere ndị nchọcha a ileba anya n’asụsụ Igbo; ngwakọrịta asụsụ nakwa ụzọ ha si angwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee iji tule mmekpahụ o nwere ike iwetara asụsụ Igbo. Ndị nchọcha gbadoro ụkwụ n’atụtụ ngwakọrịta asụsụ nke Esen (2016) wee tulee njatule a natara. Ndị nchọcha chọpụtara na ọ bụ etinyeghi uchu na ejighi ihe kpọrọ ihe butere ụdị akparamagwa a maka na okwu bekee ndị a gwakọrịtara ha na asụsụ Igbo nwechara ihe a na-akpọ ha n’asụsụ Igbo. Nke a na-bute nnukwu ihe ndọlaazụ nye ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. ọghọ ime ka asụsụ Igbo ghara ịkwụrụ otu o kwesiri. Ọkpụrụkpụ okwu: Asụsụ, Ngwakọrịta asụsụ na Ọghọm       Ndubanye Asụsụ bụ usorookwu a haziri ahazi nwere nghọta nke mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta. Ndị maọbụ otu ọbụla nọ n’ụwa a nwere asụsụ ha na-asụ ma bụrụ asụsụ njirimara ha. Asụsụ na omenala mba na-agakọta ọnụ. N’ịkwado nke a, Chibuzor (2015) kọwara na Omenala bụ uwe e ji chọọ asụsụ mma. A bịa n’obodo anyị bụ Naịjirịa, e nwere ọtụtụ asụsụ dị iche iche nke ụfọdụ n’ime ha bụ: Igbo, Awụsa, Yoroba, Efik, Ibibio, Urobo, Igala, Nupe, Gwari, Fulani na ndị ọzọ ga mana atọ kacha pụta ihe bụ asụsụ Awụsa, asụsụ Igbo nakwa asụsụ Yoruba. Asụsụ Igbo bụ nke dị anyị mkpa ebe a. Ọ bụ ndị Igbo bụ ndị a na-ahụta na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. .Asụsụ Igbo dịka Ugwu (2017) si kwu sonyere n’asụsụ ezinaụlọ a kpọrọ ‘New Benue Congo’nke sonyere na ‘Kwa sub family’. Ọkọwaokwu Wikipedia (2017) kwuru na, ndị na-asụ asụsụ Igbo ruru nde mmadụ iri abụọ na ise mana mmepe anya na mmepe obodo emeela ka ụfọdụ ndị Igbo ghara asụsụ Igbo na-asụ asụsụ Bekee nke bụ asụsụ ndị ọcha wetara n’ala anyị tinyekwara na gọmentị ala anyị kpebiri na ọ bụ asụsụ bekee bụ asụsụ izugbe a ga-eji na-ekwu ma na-ede ihe niile Oke isụ asụsụ Bekee a, mere ụfọdụ ndị Igbo ji ree ire ha, nke mere na ha chọgodu ịsụ asụsụ Igbo, ha agwakọrịtaa ya na asụsụ Bekee. Nke a na-emetụta ndụ na ụtọasụsụ Igbo. N’itule ihe Okonkwo (1994) kwuru n’edemede Danladi (2013), ọ bụ naanị ndị Igbo bụ ndị na-enweghi mmasị n’ebe asụsụ ha nọ. Bamgbose na ndị otu ya (1995) kwenyekwara na nke a dịka ha katọrọ ndị Igbo sị na ha bụ ndị na-agbaso ihe ndị ọcha karịa ihe sitere na ndụ na omenala ha. Omume ndị Igbo na-emeso asụsụ Igbo adịghị mma. Ya ka anyị ji akpọku ụmụamaala Igbo ka anyị hie asaa n’anya ma lebara asụsụ anyị anya ka o nwee ike ịkwụsi ike. N’ihi ọnọdụ a ka ndị nchọcha a ji họrọ ilebara ndị na-ere ọgwụ ogwọnnuọrịa na-eji igwe okwu na ụgbọala ha ezisa ọhanaeze ozi azụmahịa gbasara ọgwụ ha, ọghọm dị n’ụdị omume a...