Posted by on Mar 20, 2019 in publications | 0 comments

Ọghọm dị na Ngwakọrịta Asụsụ Igbo na Asụsụ Bekee: Nrụtuaka n’Asụsụ Mgbasaozi Azụmahịa Ndị

na-ere Ọgwụ Ọgwọnnuọrịa (Multicure Medicine)

 

nke

Nweze, Ifeoma M. (Ph.D.) 1

Alex Ekwueme Federal University, Ndufu-Alike Ikwo, Ebonyi State, Nigeria

ifeomanweze62@yahoo.com 08030965053

                                                                

na

Mpamugo, Emmanuel E2

Ebonyi State University, Abakaliki Ebonyi State, Nigeria                                                                                                   nwaokebest@gmail.com 08061109362

 

 

Ụmịedemede

Asụsụ Igbo bụ asụsụ e jiri mara ndị Igbo. Ọ bụ otu njirimara ndị Igbo kacha dị ọkpụrụkpụ ma karịcha pụta ihe nke ọma. Asụsụ Igbo nwere usoro, ma n’odide ma n’ọsụsụ. Ya mere e ji nwee mkpụrụedemede ndi e pụtara e ji ede ya iji mee ka ya bụ asụsụ tozuo oke ma kwụrụ chịm. Ndị Igbo nwe asụsụ na-agwakọrịtazi ya na asụsụ Bekee Ọ dịzie ka a ga-asị na asụsụ Igbo egheghi eghe. Ọ bụ omume dị otu a kpalitere ndị nchọcha a ileba anya n’asụsụ Igbo; ngwakọrịta asụsụ nakwa ụzọ ha si angwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee iji tule mmekpahụ o nwere ike iwetara asụsụ Igbo. Ndị nchọcha gbadoro ụkwụ n’atụtụ ngwakọrịta asụsụ nke Esen (2016) wee tulee njatule a natara. Ndị nchọcha chọpụtara na ọ bụ etinyeghi uchu na ejighi ihe kpọrọ ihe butere ụdị akparamagwa a maka na okwu bekee ndị a gwakọrịtara ha na asụsụ Igbo nwechara ihe a na-akpọ ha n’asụsụ Igbo. Nke a na-bute nnukwu ihe ndọlaazụ nye ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. ọghọ ime ka asụsụ Igbo ghara ịkwụrụ otu o kwesiri.

Ọkpụrụkpụ okwu: Asụsụ, Ngwakọrịta asụsụ na Ọghọm

 

 

 

Ndubanye

Asụsụ bụ usorookwu a haziri ahazi nwere nghọta nke mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta. Ndị maọbụ otu ọbụla nọ n’ụwa a nwere asụsụ ha na-asụ ma bụrụ asụsụ njirimara ha. Asụsụ na omenala mba na-agakọta ọnụ. N’ịkwado nke a, Chibuzor (2015) kọwara na Omenala bụ uwe e ji chọọ asụsụ mma. A bịa n’obodo anyị bụ Naịjirịa, e nwere ọtụtụ asụsụ dị iche iche nke ụfọdụ n’ime ha bụ: Igbo, Awụsa, Yoroba, Efik, Ibibio, Urobo, Igala, Nupe, Gwari, Fulani na ndị ọzọ ga mana atọ kacha pụta ihe bụ asụsụ Awụsa, asụsụ Igbo nakwa asụsụ Yoruba. Asụsụ Igbo bụ nke dị anyị mkpa ebe a. Ọ bụ ndị Igbo bụ ndị a na-ahụta na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. .Asụsụ Igbo dịka Ugwu (2017) si kwu sonyere n’asụsụ ezinaụlọ a kpọrọ ‘New Benue Congo’nke sonyere na ‘Kwa sub family’. Ọkọwaokwu Wikipedia (2017) kwuru na, ndị na-asụ asụsụ Igbo ruru nde mmadụ iri abụọ na ise mana mmepe anya na mmepe obodo emeela ka ụfọdụ ndị Igbo ghara asụsụ Igbo na-asụ asụsụ Bekee nke bụ asụsụ ndị ọcha wetara n’ala anyị tinyekwara na gọmentị ala anyị kpebiri na ọ bụ asụsụ bekee bụ asụsụ izugbe a ga-eji na-ekwu ma na-ede ihe niile

Oke isụ asụsụ Bekee a, mere ụfọdụ ndị Igbo ji ree ire ha, nke mere na ha chọgodu ịsụ asụsụ Igbo, ha agwakọrịtaa ya na asụsụ Bekee. Nke a na-emetụta ndụ na ụtọasụsụ Igbo. N’itule ihe Okonkwo (1994) kwuru n’edemede Danladi (2013), ọ bụ naanị ndị Igbo bụ ndị na-enweghi mmasị n’ebe asụsụ ha nọ. Bamgbose na ndị otu ya (1995) kwenyekwara na nke a dịka ha katọrọ ndị Igbo sị na ha bụ ndị na-agbaso ihe ndị ọcha karịa ihe sitere na ndụ na omenala ha. Omume ndị Igbo na-emeso asụsụ Igbo adịghị mma. Ya ka anyị ji akpọku ụmụamaala Igbo ka anyị hie asaa n’anya ma lebara asụsụ anyị anya ka o nwee ike ịkwụsi ike. N’ihi ọnọdụ a ka ndị nchọcha a ji họrọ ilebara ndị na-ere ọgwụ ogwọnnuọrịa na-eji igwe okwu na ụgbọala ha ezisa ọhanaeze ozi azụmahịa gbasara ọgwụ ha, ọghọm dị n’ụdị omume a nakwa ihe a ga-eme iji wee kwụsị ụdị omume a.

Ebumnobi Nchọcha a

Ọtụtụ ndi Igbo ji asụsụ a gwara ọgwa akọwapụta uche ha. Ọnọdụ ngwakọrita a efela oke ọ kachasị n’ebe ndị ntorobịa nọ. Nke a na-adọla asụsụ Igbo azụ. Mkpalite nchọcha a bụ maka ileba anya n’oke ngwakọrịta asụsụ Igbo na nke Bekee igosi mmekpaahụ ọ na-ewetara otuto asụsụ Igbo. Ọ bụ mmasị ndị na-eme nchọcha a, ịmụnye ọkụ ma kpuheere ndị na-asụ asụsụ Igbo nzọhie ụkwụ ha ka ha zọgharịa ije.

 

Ngwakọrịta Asụsụ

Ọtụtụ ndị ọkachamara n’amụmamụ sayensị asụsụ atuleela ngwakọrịta asụsụ ma nye nkọwa dị iche iche maka ya. Romaine (1992) kọwara ngwakọrịta asụsụ dịka onye na-asụ asụsụ iji ọtụtụ asụsụ, olu otu maọbụ usoro dị iche iche na-akpa nkata, ka o si metụta ndị ha na ya na-akpa nkata. Nke a pụtara na onye na-agwakọrịta asụsụ na-etinye n’uche ụdị ndị ọ na-agwa okwu. Ndị dị ka Aranoff na Miller (2003) n’aka nke ha kwuputara na ọtụtụ ndị ọkachamara n’amụmamụ sayensị asụsụ akọwaala na ịgwakọrịta asụsụ bụ otu ụzọ nzisaozi kacha pụta ihe n’etiti ndị na-asụ asụsụ abụọ, dịka ịgwakọrịta olundị si dịrị ndị na-asụ otu ụdị asụsụ. Nkọwa a ha nyere pụtara na ndị nwere karịa otu asụsụ ha na-asụ n’obodo ha dịka ọ dị n’obodo Naịjirịa, ga na-agwakọrịta asụsụ ndị ahụ.

N’agbanyeghi ihe ndị a, Kaschula na Anthonissen (1995) kwenyesiri ike na ngwakọrịta asụsụ bụ ụzọ na-adịghị mma ndị na-asụ asụsụ si egbu asụsụ njirimara ha. Ha gakwara n’ihu kwuo na ndị na-agwakọrịta asụsụ na-egosipụta mperi ha nwere n’ebe asụsụ ha nọ. Lipski (1985) nọkwa n’otu akụkụ na-ekwu na a hụtala ngwakọrịta asụsụ dịka mgbagwoju anya nke echiche ime mmụọ, nke ndi na-asụ ya nwe, nke mere na ha enweghi ike ikewa asụsụ abụọ ka ha kwụrụ onwe ha dịka o kwesiri. Heredia na Altarriba (2010) kwuru na ngwakọrịta asụsụ bụ ụzọ ndị na-asụ ụdị asụsụ abụọ si ekpuchi ọnọdụ amaghị asụsụ ha ka a ghara ịhụta mperi ha. Roberto na Jeffery (2009) kwenyekwara na ngwakọrịta asụsụ bụ ụzọ ndị na-eri mperi n’asụsụ ha si emeju mperi ha. Anyị lee anya n’ihe ndị ọkachamara ndị a kwuchara, anyị ga-ahụ na ngwakọrịta asụsụ na-egosipụta iri mperi nke na-esite n’akwụdosighi ike n’asụsụ ndị.

A bịa na ngwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee, ndị dịka Ahukanna (1990) kọwara ngwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee dịka atụmatụ igbu asụsụ Igbo nke ndị na-eme ya kpachara anya wee na-eme ya. Ọ gakwara n’ihu kwuo, n’adịghị ka ndị Awụsa na ndị Yoroba, ndị Igbo anaghị anọ kpaa nkata n’asụsụ ha na-etinyeghi ya asụsụ Bekee. Ogbonna (1985) kwukwara na ngwakọrịta asụsụ kacha pụta ihe n’etiti ndị Igbo karịa agbụrụ ndị ọzọ nọ na Naịjirịa. Obiamalu na Mbagwu (2008) hụtara ngwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee dịka ihe na-echere uto na ịkwụsi ike asụsụ Igbo aka mgba. Anyị gbado ụkwụ na nkọwa ndị a, anyị ga-ahụ nke ọma na ngwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee abụghị ihe ga-enyere asụsụ Igbo aka ma ndị nwe ya bụ asụsụ. Chibuzor (2015:3) kọwara na ọtụtụ ụmụ Igbo jiri asụsụ dịka Bekee a gwakọtara ya na Igbo bido ikwu okwu, ebe ndị ọzọ na-asụ Pijin. Ọ gara n’ihu kwuo na “Ihe ọtụtụ na-aghọta n’ asụsụ Igbo akarịghị, ‘Bịa ebe a!’, ‘Gịnị bụ aha gị?’, ‘Ọbụ gịnị?’ mọbụ ‘Anụ ọfịa!’ na ‘Mechie ọnụ gị!’ Nchọpụta ụfọdụ ndị ọkammụta mere, dịka nke Ohiri-Aniche (2002) gosịpụtara na ụzọ iteghete n’ime narị ụmụaka Igbo anaghị anụ asụsụ Igbo ma ọlị. Ihe a a na-ekwu abụghị maka sọọsọ ụmụaka, ọtụtụ ndị nne na nna amachaghị asụ Igbo ọfụma, dịka n’iji Igbo kwuo ahịrịokwu anọ maọbụ ise n’etinyeghị Bekee, ma ya fọdụzịa ụmụ ha”

Ntụlegharị Nchọcha E Merela na Ngwakọrịta Asụsụ n’Asụsụ ndị Ọzọ

Ụfọdụ ndị nchọcha e meela nchọcha banyere ngwakọrịta asụsụ n’asụsụ dị iche iche. Anyị ga-atụle  nchọcha ndị e mere n’asụsụ Yoruba nakwa asụsụ Awụsa.  Na nchọcha nke Oluwaseun (2018) mere na ngwakọrịta asụsụ Yoruba na asụsụ Bekee, ọ chọpụtara na ngwakọrịta asụsụ Yoruba na asụsụ Bekee e meela ka ọtụtụ mkpụrụokwu asụsụ Yoruba funyuo anya, nke na a kpachaghị anya, nwere ike ibute ọnwụ asụsụYoruba. Ọ gakwara n’ihu ịkọwa na ọ bụ ngosi amam asụ asụsụ Bekee na-ebute ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ Yoruba ịgwakọrịta ya na asụsụ Bekee. Na mmechi, ọ dụrụ ụmụafọ Yoruba na-asụ asụsụ Yoruba ọdụ ịgba mbọ na-asụ asụsụ Yoruba otu o kwesiri na-agwaghị ya ọgwa.

 N’aka nke ọzọ, na nchọcha nke Jatau (2017) mere na ngwakọrịta asụsụ Awụsa na asụsụ Bekee, ọ chọpụtara na n’agbanyeghi mbọ ndị ọkachamara n’asụsụ Awụsa na-agba ịhụ na a tapịara mkpụrụokwu ọhụụ ndị a na-enweta site na mmepe na mbawanye obodo nakwa ihe nka na ụzụ oge ugbu a nyere, n’asụsụ Awụsa, ụfọdụ ndị Awụsa ọ kachasị ndị ntorọbịa gụrụ akwụkwọ, ka kpọọ ịgwakọrịta asụsụ Awụsa na asụsụ Bekee mkpa karịa ịmụta ma tinye mkpụrụokwu Awụsa ndị a n’okwu. Ọ gara n’ihu ịkọwa na ụdị akparamagwa a agaghị enyere asụsụ Awụsa aka n’ịkwụrụ chịm otu o kwesiri.

            Site na ntụlegharị nchọcha ndị nchọcha abụọ anyị wepụtara n’elu, anyị ga-ahụ na ha na-arụtu aka n’otu ihe nke bụ na ọ bụrụ na a kpachaghị n’otu e si jiri asụsụ Bekee na-agwakọrịta n’asụsụ izugbe anyị dị iche iche, mgbe na-adịghị anya, asụsụ anyị ndị a ga-anwụ ma nwụọ pịịị!

Usoro Nchọcha

N’usoro nchọcha a, ndị nchọcha lebara anya na ndịnisiokwu ndị a: ebe mgbadoụkwụ nchọcha, ndị e jiri mee nchọcha, ngwa nchọcha na usoro nnata data.

Ebe Mgbadoụkwụ Nchọcha: Ebe mgbadoụkwụ nchọcha a bụ Abakaliki Steeti Ebonyi.

Ndị E Jiri Mee Nchọcha: Ndị nchọcha jiri ndị na-eji ụgbọala ere ọgwụ ogbunnuọrịa abụọ bụ “Goko Cleanser” na “Extracure Bitters”, mee nchọcha a.

Ngwa Nchọcha: Ndị nchọcha ji igwe ndọrọ okwu wee mee nchọcha a.

Usoro Nnata Njatule: Ndị nchọcha jiri igwe ndọrọ okwu wee nata asụsụ mgbasaozi azụmahịa ndị na-ere ọgwụ ogbunnuọrịa “Goko Cleanser” na “Extracure Bitters”, nke o ji wee mere njatule.

Ngosipụta Njatule Na Nkọwa Ya

Site na njatule e nwetara, onye nchọcha gbadoro ụkwụ n’atụtụ ngwakọrịta asụsụ nke Esen (2016) tụpụtara iji wee mee nkọwa.N’atụtụ a Esen kọwara na ọ dị ụzọ ihe iri na otu na-ebute ngwakọrịta asụsụ mana nke kacha pụta ihe ma bụrụ nke metụtara nchọcha a bụ ọnọdụ ngwakọrịta asụsụ nke onye na-ezi ozi ji akọwami ihe ọ na-ekwu maọbụ egosipụta n’uju ebumnobi ya. Nke a ka ọ tụpụtara n’ụzọ ngwakọrịta asụsụ atọ ndị anyị ga-eji mee ntule. Na ntule a, “SI” pụtara Standard Igbo ebe “ET” pụtara English Translation. Ụzọ ngwakọrịta asụsụ ndị a gụnyere:

Ngwakọrịta Asụsụ nke na-abata na Ngwụcha Ahịrịokwu.

                Ụdị ngwakọrịta asụsụ a bụ nke a na-ahụta n’okwu mgbe okwuu ji otu asụsụ bido okwu ya ma were asụsụ ọzọ mechie ya.

Ọmụmaatụ:

  1. Ị na-enwe miscarriage?

(SI) Ị na-enwe atụrụ ọ pụọ?

(ET)  Are you having miscarriage?

  1. Ị na-enwe sexual weakness?

(SI) Ị na-enwe adịghị ike mmekọ nwoke na nwaanyị?

(ET) Are you having sexual weakness?

  1. Ị na-enwe worm?

(SI) Ị na-enwe ntakasị okpo afọ?

(ET) Are you having warm?

  1. Ị na-enwe loss of appetite?

(SI) Ị na-anọ ọnọdụ enweghi agụụ nri?

 (ET) Are you having loss of appetite?

  1. I nwee heart failure or kidney failure

(SI) I nwee obi okpu maọbụ  akụrụ okpu                                                                                      

(ET) If you have heart failure or kidney failure

  1. Ọ bụrọkwa witches and wizard

(SI) Ọ bụghịkwa ndị na-ata amosu

(ET) It is not witches and wizard

  1. Ọ bụrụ na ị na-enwe weak erection

(SI) Ọ bụrụ na ihe iji bụrụ nwoke anaghị akwụ ọtọ

(ET) If you are having weak erection

  1. Ọ naghị akwụzi attention

(SI) Ọ naghị akwụzi ọtọ

(ET) It no longer stands attention

  1. Ọ bụrụ na ị na-enwe low sperm

(SI) Ọ bụrụ na ị na-enwe agbazughi oke

(ET) If you are having low sperm

mmirimmụọ e ji atụba nwaanyị ime

  1. Ọ na-enwe different colours?

(SI) Ọ na-enwe ụcha dị iche iche?

(ET) Is it having different colours?

  1. Nke i nwere ike ibute na public toilet

(SI) Nke i nwere ike ibute n’ụlọ mposi ọhanaeze                                                           

(ET) which you can contract from public toilet

  1. Anyị ga-akọwara gị ihe na-eme gị free of charge

(SI) Anyị ga-akọwara gị ihe na-eme gị n’anaghị ego           

(ET) We will explain to you what is wrong with you free of charge

  1. Ọgwụ anyị bụ try and see

(SI) Ọgwụ anyị bụ tulee ma hụ

(ET) Our medicine is try and see

  1. Ọgwụ anyị bụ taste and see taste and confirm

(SI) Ọgwụ anyị bụ ịṅụcha ikwuputa

(ET) Our medicine is taste and see,

ihe ọ rụrụtaste and confirm

  1. Ọgwụ anyị na-agwọ fibroid

(SI) Ọgwụ anyị na-agwọ ọnọchị akpanwa             

 (ET) Our medicine cures fibroid

  1. Ọgwụ anyị na-agwọ diabetes

(SI) Ọgwụ anyị na-agwọ ọrịa mamịrị                 

 (ET) Our medicine cures diabetes

  1. Ọ na-agwọ pile

(SI) Ọ na-agwọ otuto n’akwara ọnụ ike                         

  (ET) It cures pile

  1. Ọ na-agwọ all kinds of infection

(SI) Ọ na-agwọ ọrịa na-efe efe dị iche iche                

  (ET) It cures all kinds of infection

 

  1. Ọgwụ anyị enwerọkwa side effect

(SI) Ọgwụ anyị enwerọkwa  mmekpaahụ ọ na-enye                                                                                                                                   (ET) Our medicine doesn’t have  side effect

 

  1. Onye na-aṅụ ọgwụ anyị anaghị aya ahụ at all at all

(SI) Onye na-aṅụ ọgwụ anyị anaghị  arịa ahụ ma olị                             

 (ET) Whoever takes our medicine doesn’t get sick at all

 

 

 

  1. Ngwakọrịta Asụsụ nke na-abata n’Etiti Ahịrịokwu.

                Ụdị ngwakọrịta asụsụ a bụ nke a na-apụta n’okwu mgbe okwuu ji otu asụsụ bido okwu ya, bịa n’etiti webata asụsụ ọzọ, ma werezie asụsụ o ji bido okwu mechie okwu ya.

Ọmụmaatụ:

  1. I na-enwe discharge na private part gị?

(SI) Abụ ọ na-agbapụta n’ihe i ji bụrụ nwaanyị?

(ET) Are you having discharge from your private part?

  1. Menses gị, ọ na-acha black?

(SI) Ọbara nsọ nwaanyị gị ọ na-eji oji?

(ET) Is your menses black?

  1. Lekwa opportunity i nwere n’ebe a

(SI) Lekwa ohere i nwere n’ebe a

(ET) See the opportunity you have her

  1. I mekwaa I don’t care, ọ ga-egbunyukwa gị anya

(SI) I mekwaa ọ gbasaghị m, ọ ga-egbunyukwa gị anya

(ET) If you do I don’t care, it will kill you completely

  1. Gị na nwaanyị ibe gị eyikọzina undies dịka pant, tight na ndị ọzọ

(SI) Gị na nwaanyị ibe gị eyikọzila uwe imeahụ dịka ọbante, mbeleukwu, na ndị ọzọ                                                                             

(ET) You and your fellow women should not share undies like pant, tight and others

  1. I rubeghi forty years ị baa menopause

(SI) I rubeghi afọ iri anọ ị kwụsị ịhụ nsọ gị                                                                                                             

(ET) You have not reached forty years and you entered menopause

  1. Ị naghịzi ahụ ovulation gị?

(SI) Ị naghịzị anọ ọnọdụ ihụ  nsọ gị?

(ET) You no longer see your ovulation

  1. Infection jọrọ njọ na family, ọ bata o mee everybody affect

(SI) Ọrịa na-efe efe jọrọ njọ n’ezinaụlọ, ọ bata o metu onye ọbụla                                                                        

 (ET) Infection is bad in the family; if it enters it affects everybody

  1. Kedu ndị typhoid and malaria na-akpụgharị?

(SI) Kedu ndị ọrịa ajọọ mmiri na ọrịa ịba na-akpụgharị?                                                                                         

(ET) Where are those that typhoid and malaria are making restless?

  1. Say no to sickness ka i nwere onwe gị one touch

(SI) Sị ọrịa mba ka i nwere onwe gị n’otu ntabianya                                                                                    (ET) Say no to sickness so that you will be free one touch

  1. Ike ọgwụgwụ abụrọzikwa portion gị

(SI) Ike ọgwụgwụ abụghịzikwa oke gị                       

  (ET) Weakness is no longer your portion

  1. Ọ bụrụ na ị chọọ ịfụ anyị ịbịaba direct na motor a

(SI) Ọ bụrụ na ị chọọ ịhụ anyị ịbịawa n’ụgbọala a eleghi anya n’azụ                                                                  

  (ET) If you want to see us you start  coming direct to this car

  1. Maọbụ ịbịakwute anyị na office anyị, opportunity dịkwaara gị

(SI) Maọbụ ịbịakwute anyị n’ụlọọrụ anyị, ohere dịkwaara gị                                                                       

(ET) Or you come and meet us at our office there is an opportunity for you

  1. Sọọsọ five hundred ị na-anara m ọgwụ a

(SI) Sọọsọ narị ise ị na-anara m ọgwụ a                      

(ET) Only five hundred, you are collecting this medicine from me

  1. Maka na ọ kwa promo ka anyị na-eme

(SI) Maka na ọ bụkwa ibe ọnụ ahịa ka anyị na-eme                                                                                                                 (ET) Because it is promo that we are doing

  1. After one month anyị emechie promo

(SI) Ọ bụrụ na otu ọnwa agaa anyị emechie ibe ọnụ ahịa                                      (ET) After one month we close this promo

  1. Extracure bitters ga-egbu ya bụ bacteria wee kpọlite akwara ndị nwụrụ anwụ

 ha arụbakwa ọrụ

(SI) Extracure bitters ga-egbu ya bụ nje wee kpọlite akwara ndị nwụrụ anwụ ha arụbakwa ọrụ

(ET) Extracure bitters will kill the bacteria and raise dead veins to start working

  1. E nwere quantity sperm a na-atụ anya

 ga-esi n’ahụ nwoke baa n’ahụ nwaanyị

(SI) E nwere ntụ mmirimmụọ e ji atụba nwaanyị ime a na-atụ anya ga-esi n’ahụ nwoke baa n’ahụ nwaanyị                                                                                                                                               (ET) There is quantity of sperm that is that is expected to be transferred from a man to a woman

 

  1. Ngwakọrịta Asụsụ nke na-abata na Mkpụrụokwu

Ụdị ngwakọrịta asụsụ a bụ nke a na-ahụta n’okwu mgbe okwuu na-agbakwunye mkpụrụokwu si n’asụsụ ọzọ na mkpụrụokwu nke o ji emebe okwu nke na-eme ka okwu e mebere ghara inwe asụsụ nke ọ kwụ na ya.

Ọmụmaatụ:

  1. Ovulation gị ọ na-acutacut?

(SI) Ọnọdụ ihụ nsọ gị ọ naghị abịacha otu o kwesiri?

(ET) Does your ovulation cut?

 

  1. Ọ gbatachaa ọ cutụọ

(SI) Ọ gbatachaa ọ gbabie                                                     

(ET) After flowing it will cut

 

  1. Emisskwala ọgwụ a

(SI) Ekwela ka ọgwụ a ghara irute gị                                  

  (ET) Don’t miss this medicine

 

  1. Imisseopportunity a atakwala mmadụ ụta

(SI) Ohere a gafere gị atakwala mmadụ ụta                         

 (ET) If you miss this opportunity don’t blame any person

 

  1. Ọbara ewee na-eflow ọfụma

(SI) Ọbara ewee na-agba nke ọma

 (ET) Blood will be flowing well

 

  1. Oge ọbụla ị na-acomplain

(SI) Oge ọbụla ị na-enye mkpesa

(ET) Every time you are complaining

  1. Bendịa gị ọnụ

(SI) Hịpịa gị ọnụ

(ET) Bend your mouth

 

  1. Ihe ineediri bụ Extracure bitters

(SI) Ihe ga-adị gị mma bụ Extracure bitters

(ET) What you need is Extracure bitters

 

Nchịkọta na Mmechi

Site na nchọcha e mere, anyị ga-ahụ na ngwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee na-edobe asụsụ Igbo n’ọnọdụ asụsụ ntọchị, o nweghi ugwu dị na ya. Nke a na-eme na ndị Igbo ọ kachasị ndị na-etolite etolite anaghịzị etinye uchu n’ịmụ aụsụ ara nne ha n’ihi na ngwakọrịta asụsụ amarala ha ahụ. Okwu asụsụ Bekee ndị a niile a gwakọrịtara ha na asụsụ Igbo nwechara ihe a na-akpọ ha n’asụsụ Igbo mana elezighi anya, amaghị eme na etinyeghi uchu n’ihe gbasara asụsụ Igbo, mere ndị a na-agbasa ozi azụmahịa ọgwụ ogwọnnuọrịa ji agwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee na-agbanyeghi na ndị ha na-ezisara ozi bụ ndị Igbo.

Ndị Igbo bụ ndị a maara dịka ndị dị uchu na ndị na-agbasi mbọ ike, mana a bịa n’ihe gbasara asụsụ ha, idi uchu ha na ịgba mbọ ha riri mperi. Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ atọ kacha pụta ihe na Naịjirịa, abụọ ndị nke ọzọ bụ Awụsa na Yoroba. Ndị Awụsa na Yoroba ejighi asụsụ ha egwu egwu maka na ngwakọrịta asụsụ ha na asụsụ ọzọ abụghị maka ha, ma okenye ma nwata. Keduzi ka nke anyị ji wee dị otu a? Nkemefula bụ otu aha ndị Igbo na-aza, ya bụ na ndị Igbo ga-akawa ahụ na-asụ naanị asụsụ Igbo na-agwaghị ya ọgwa ma n’ezinaụlọ, ma n’ụlọakwụkwọ, ma n’ụlọụka, ma n’ebe azụmahịa, ma n’ọgbakọ dị iche iche, ka nke anyị ghara ifu maka ọkụkọ hapụ kwọm o nweghizi ihe ọzọ ọ ga-eji zụọ ụmụ. Ndị gọọmentị anyị na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ala Igbo ga-agbakwa mbọ kwado amụmamụ asụsụ Igbo site n’Ọtaakara garuo na Mahadum ma dobekwa amụmamụ asụsụ Igbo n’ọnọdụ e dobere amụmamụ ahụike, amụmamụ sayensị na teknụụzụ nakwa amụmamụ mgbakọ na mwepụ. Nke a ga-akpọlite mmụọ ndị mmadụ inwe mmasị n’ebe asụsụ Igbo nọ.

 

Ihe Ndị A Ga-Eme Iji Kwụsị Ngwakọrịta Asụsụ Ikpagbu Asụsụ Igbo

Ọ bụ eziokwu na asụsụ Bekee bụ asụsụ gọọmentị Naịjirịa wepụtara dịka asụsụ nkwekọ nke a ga-eji na-enwe mmekọrịta n’ebe dịka ụlọọrụ, ụlọakwụkwọ, na ngalaba gọọmentị dị iche iche; nke a agaghị eme ka anyị tufuo asụsụ anyị maọbụ ghara iji ya kpọrọ ihe site n’ịgwakọrịta ya na asụsụ Bekee. Ya bụ na anyị ga-agbanwe agwa ejighi asụsụ anyị kpọrọ ihe ma tinye uchu n’asụsụ anyị. Ndị nne na nna n’ezinụlọ ọbụla ga-agba mbọ hụ na ha na-akuziri ma na-asụkwara ụmụ ha asụsụ Igbo na-agwaghị ọgwa. Ndị nkuzi asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ dị iche iche nakwa n’ogo dị iche iche ga-ejisi ike na-akuziri ụmụakwụkwọ ha asụsụ Igbo na-agwakọtaghị ya na asụsụ Bekee. Otu ndị na-ahụ maka nchekwa asụsụ Igbo nakwa ịhọpụta na itinye mkpụrụokwu ọhụụ n’asụsụ Igbo ga-agba mbọ hụ na ọhaneze ga-amata maka okwu ọhụụ ọbụla agbakwunyere. Ọzọ bụ gọọmentị iti iwu ga-emegide igwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee ọ kachasị n’ebe mgbasaozi nọ.

Edensibịa

Ahukanna, J. G. (1990). Bilingualism and Code-Mixing in         Language Use in Nigeria: The Case of Igbo- English   Bilinguals. In Emenanjo, E. N. (ed.). Multilingualism,          Minority Languages and Language Policy in Nigeria. Agbor: Central Books Limited.

Aranoff, M. na Miller, J. (2003). The Handbook of Linguistics.                Blackwell Publishers: Oxford.

Bamgbose, A. (1995). New English: A West African Perspective.            Ibadan: Musoro Limited.

Chibuzor, E. D  (2015) Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo by scholti:        12:26am On Dec 07, 2015 Nairaland Forum / Nairaland                 /General / Culture / Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo              (3575 Views)

Danlidi, S. S. (2013). Language Policy: Nigeria and the Role of                English Language in the 21st Century. European Scientific                 Journal, 10 (17).

Esen, S. (2016). Code-Switching: Definition, Types and Examples.         Owlcation Hubpages Inc. 

Heredia, R. na Altarriba, J (2001). Bilingual Lnguage Mixing: Why        Do Bilinguals Code-Switch? New York Blackwell      Publishing                 Inc, 10 (5).

Jatau, A. N. (2017). Code-Switching and Mixing Among            Hausa/English Bilinguals: A Linguistic and Socio-       Psychological Survey. A natara site na                                   https://www.academia.edu/7854819 n’ụbọchị 18/01/2019.

Kaschula, R. na Anthonissen, C. (1995). Code-Switching and Code-       Mixing in Communicating Across Cultures in South    Africa.    In Ajoundi, E. K. (2016). “The Strengths and     Weaknesses of Code-Switching and Bilingualism in the             Language              Classroom.A natara site na       www.researchgate.net/publication n’ụbọchị 9/11/2017.

Lipski, J. M. (1985). Linguistic Aspects of Spanish Language   Switching. Tempe, AZ: Arizona State            University,             Centre for Latin American Studies.A natara site na        www.journals.sagepub.comn’ụbọchị 9/11/2017.

Obiamalu, G. O. na Mbagwu, D. U. (2008).Motivations for Code-           Switching Among Igbo-English Bilinguals:A Linguistic               and Socio-psychological Survey. OGIRISI: A New Journal               of African Studies.

Ogbonna, C. C. (1985). Immortalizing Igbo Language. In Nigerian         Statesman. Tuesday January 9. Owerri: Imo Newspaper           Ltd, p 5.

Oluwaseun, O. (2018). A Sociolinguistic Study of the Effects of               Yoruba – English Code-Mixing on the Yoruba Language. A                 natara site na http://arbitrer.fib.unand.ac.id n’ụbọchị                 18/01/2019.

Roberto, R. H. na Jeffrey, M. B. (2017). Code-Switching. Chicago:        Fitzroy Dearborn Publishers.A natara site na                 www.tamiu.edu/rheredia/switch.htm n’ụbọchị 10/11/2017.

Romaine, S. (1992). Bilingualigualism. In Esen, S. (2016). Code-             Switching: Definition, Types and Examples. Owlcation:                 Hubpages Inc.

Ọkọwaokwu Wikipedia. Ndị bụ Ndị Igbo. A natara site na                        http://en.wkipedia.org/wiki/Igbo n’ụbọchị    10/11/2017

Leave a Reply