Posted by on Apr 6, 2019 in publications | 0 comments

Nkwalite Ass igbo: ileba Anya na Nsghar

 

Nweze, Ifeoma M. (PhD)¹                                                                                                                                                                    Alex Ekwueme Federal University,                                                                                                                                                   Ndufu-Alike Ikwo, Ebonyi State, Nigeria

ifeomanweze62@yahoo.com 08030965053

na

Nwaoke, Emmanuel Emeka ²                                                                                                                                                      Ebonyi State University,                                                                                                                                                              Abakaliki Ebonyi State, Nigeria                                                                                                                                nwaokebest@gmail.com 08061109362

Na

Christiana Ngozi Ikegwonu ³                                                                                                                                  Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University,    Igbariam.                                                          ngozichristyikegwuonu@yahoo.com 08037776192

 

Ụmịedemede

Asụsụ bụ ụzọ mmadụ na ibe ya si ezikọrịta ozi. Obodo ọbụla nwere asụsụ nke ha; asụsụ ọbụla nwekwara olu ndị nke e siri na ha wube asụsụ izugbe ha. Ọtụtụ asụsụ na-alazi ala n’ihi mmasị ndị mmadụ nwere n’ebe asụsụ ndị ka enye ohere inweta akụ, mmekọrịta mmadụ na ibe ya na nke obodo na ibe ya nọ. Ọ bụ ụdị ọnọdụ a mere asụsụ Igbo ji adala azụ agbanyeghi na ọ bụ otu n’asụsụ mpaghara (regional languages) atọ gọvmentị Naịjịrịa kwadoro iji na-eme mkparịta ụka na ide edemede dị iche iche. Nchọcha a hụtara nsụgharị dịka ihe ga-aba uru pụrụ iche ịkwalite asụsụ Igbo site n’ime ka ederede na ihe omume dị iche iche na-akpalite mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụrụ nke a ga na-enyefe site n’asụsụ Igbo. Nchọcha a bụ nke ndịzịma (qualitative research), njatụle e ji mee nchọcha a bụ ndị e nwetara site na nlegharị adịm (survey) e merela iji chọpụta ụzọ dị iche iche nsụgharị si akwalite asụsụ. Nchọcha a kpughere na, agụụ ịdị ka nwa Bekee, ọrụ Bekee, iji asụsụ Bekee dịka asụsụ ala nke ọchịchị n’ala Naịjịrịa nakwa n’obodo ndị ọzọ n’ala Afriika so n’ihe ndị bụtere ọnọdụ a. A chọpụtakwara na nsụgharị bụ otu n’ime ụzọ ndị e ji akwalite asụsụ mana nsụgharị ndị na-amaghị asụsụ Igbo na asụsụ mba Afriika ndị ọzọ nke ọma, mere n’oge mbụ so n’ihe ndị megidere ọtụtụ asụsụ mba Afriika. Mana ọ bụrụ na gọvmentị, ndị nne na nna, ndị mara ihe ekwe kụrụ banyere asụsụ Igbo na ndị ọzọ tinye oke nke ha n’ide na ịsụgharị edereede na mmegharị emereme dị iche iche e mere n’asụsụ ndị ọzọ n’Igbo, ọ ga-enye aka kwalite asụsụ Igbo.

Mkpolite

Asụsụ bụ ngwa nzikọrita ozi nke na-arụkwa ọrụ dịka ejimmara mba ma ọ bụ obodo ọbụla. Ọ bụkwa ngwa e ji akwalite obodo site na mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma ọbụ obodo na ibe. Asụsụ bụ ngwa bara oke uru nye ọtụtụ ihe mmadụ na-eme. Ọ bụ nke a mere nchekwaba na nkwalite asụsụ ọbụla ji dị oke mkpa. Asụsụ Igbo dịka otu n’ime asụsụ a maa ama na mba ụwa ọkachasị na mba Afrịịka kwesiri ka e chekwaba ma kwalite ya. Nwadike (2002) kọwara asụsụ dịka igodo obi mmadụ. Ọ bụrụ na anyị tufuo igodo ahụ, ihe ọ pụtara bụ na anyị atụfuọla ndị nwee asụsụ ahụ.  Ọ bụrụ na anyị echekwaba igodo ahụ, ọ ga-enye aka ịkpọpe ụzọ akụ nke na enweghi ụzọ ọzọ a ga-esi kpọpe ya. Ọnwụka (2014) kwadoro Mgbodile (1999) site n’ịkọwa na orụ asụsụ dị mkpa ọkachasị n’amụmamụ gbasara edukeshọn n’inye nkọwa mpụtara asụsụ nakwa uru ọ bara n’etiti mmadụ na ibe ya site n’ịkwalite ezi mmekọrịta. O kwere ghọta na asụsụ na-eme ka ọ dị mfe mmadụ na ibe ya inwe ezi mkparitaụka, inyefe amamihe, echiche na ebumnobi ya niile site n’ ederede dị iche iche, ide akwụkwọ, igosipụta ya n’ihe onyoonyo nke mgbasa ozi na iwube otu asụsụ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Eleba anya n’ihe odoziakụ a kwuru, anyị ga-amata na nkọwapụta ya ziri ezi ma doo ewu na ọkụkọ anya na asụsụ jikọtara ọtụtụ ihe gbasara mmadụ na ibe ya. Iji kọwami mkpa asụsụ dị, akwụkwọ nsọ Baibụl, Genesis (chapter11: 5-8) gosipụtara όtu e si kposaa ndị na-arụ “Tower of Babel” site n’itinyere ha ọgbaaghara n’asụsụ.

                N’ eziokwu, asụsụ na omenaala gwakọtara ọnụ. Ndị mba ọbụla hapụrụ asụsụ ha, etufuola omenaala ha, ugwu ha, awamaanya, njirimara ha nakwa agbụrụ ha. A na-echekwaba asụsụ όtu e si echekwaba akụnụba. Ọ na-eto eto, ọ na-anwụ, ọ na-ekpochapụ. Nke a mere anyị ji nwe mmasị ime nchọcha banyere ụzọ dị iche iche e si akwalite asụsụ nke όtu n’ime ha bụ nsụgharị

Ndịigbo na Asụsụ Igbo

Ojiaku (2015) dere na ọtụtụ mmadụ kwenyere na ndị Igbo pụtara ndị gboo. O kwukwara na ndị ọzọ kwenyere na Igbo bụ aha e nyere ndị dị nta na mpaghara obodo Niger-Benue. O kwuru na nkọwa nke mbụ na nke abụo enweghi nke bụ ezi okwu n’ihi na ha enyeghi ezi nkọwa banyere Ndịigbo. Ndị ọzọ kwenyere na ndị Igbo malitere n’ala Jew n’ihi na ụfọdụ aha ha dịka Uburu na Hebrew nwere myiri ụda mkpọpụta. Ndị ọzọ kwenyere na Igbo bụ mgbakwụnye nganihu ma ọ bụ nsonaazụ a na-ahụta n’aha obodo ndị dị n’ala Igbo dịka Igbo-ukwu, Igbo-etiti, Igbo-eze, Obi-Igbo. Ajụjụ bụrụ ma Igbo ọ bụ naanị mpaghara ndịahụ aha ha nwere mgbakwụnye Igbo ka ọ bụ ala niile ahụ a kporo ala Igbo? Ndị Igbo bi na mgbada ugwu ọwụwa anyanwụ ala Naịjịrịa. Ha bi na steeti Imo, Abịa, Anambra, Enugu na Ẹbonyi. A bịa na Steeti Rivers, Delta na Cross River, e nwekwara ndị Igbo anaghị ekwe na ha bụ ndị Igbo mana otu ihe doro anya bụ na Igbo na-asụ n’olu n’olu mana ha kwa ụkwara ọ bụrụ otu.

Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ atọ atụmatụ asụsụ Naịjịrịa họtara maka ikụzi na ide ihe ndị dị iche iche tinyekwara iji ya na-ele ule n’ogo sekọndrị dịka ‘WAEC, NECO maka ibanye Mahadum. Amụma asụsụ a dị n’akwụkwọ iwu ala Naịjịrịa nke sitere na’atụmatụ agụmagụ (2004), (National Policy on Education). O nweghi asụsụ ọbụla bara uru karịa ndị nwe ya. Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị Igbo ịkwalite asụsụ Igbo. Ọ bụrụ na ha mesoo asụsụ Igbo omume ọma, asụsụ Igbo a bụrụ ihe ọma dịịrị ha mana ọ bụrụ na omume ha dị ọjọ ebe asụsụ Igbo dị, ọ ga-abụ ihe ọjọọ dịịrị ha n’ihi na ọ bụ ebe onye bi ka ọ na-awachị. 

Obinna (2002) kwuru na Igbo sara mbara; ebe ọbụla i jere, ị ga-ahụ ndị Igbo. Ọ bụghi naani na ị ga-ahụ ha kama ị ga-ahụ na ha guzoro, wube ma na-akwado ọganihu obodo ndị ahụ ha bi n’ihi na ala nke aka ha ebughi ibu inye ha ohere ha chọọrọ iwepụta onyinye chi nyere ha maka ọganiihu ndị Igbo n’ala Naịjịrịa na mba ụwa gbaaa gburugburu.

 Eme (2004) dere na ụfọdụ ndị nne na nna ọkachasị ndị gụrụ akwụkwọ anaghị ekwe ụmụ ha were asụsụ Igbo kparịta ụka. O nyere ọmụma atụ otu nne nwaanyị na mahadum Nsụkka onye gwara nwa ya ka ọ kwụsị ịsụ Igbo n’ihi na asụsụ Igbo enweghi isi. Ụdị nne na nna a bụ ndị o kwuru na ọ na-esekarị ha na ndị nkụzi na-akụzi Igbo. Ọ bụ ụdị ọnọdụ a mere UNESCO jiri dee na asụsụ Igbo bụ otu n’asụsụ mba ụwa ndị nọ na nsogbụ; na ọ bụrụ na e nweghi ihe e mere banyere ịkwalite asụsụ Igbo n’afọ iri ise na-abịa, asụsụ Igbo nwere ike ịbụ nke e kpochapụrụ ekpochapụ. A bịa na agụm akwụkwọ, Chunbow (1990) kwuru na asụsụ bụ ụzọ e si akụzi ma na-amụ ihe nke e nweghi ike iwezụga n’agụm akwụkwọ ma ọ bụ amụmamụ nka ndị ọzọ. Ị bịa n’ala Igbo, anaghị eji asụsụ Igbo akụzi ihe n’ogo ụlọ akwụkwọ nkịtị (Primary School) na ndị ọzọ n’ihi na ọ bụ asụsụ Bekee bụ asụsụ nkụzi ọkachasị n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’obodo mepere emepe. Ọzọkwa, agbanyeghi na gọvmenti kwadoro asụsụ Igbo dịka asụsụ mpaghara mgbada ọdịda anyanwụ ala Naịjịrịa, a chọpụtara na ọ bụ asụsụ Bekee ka ndị ọchịchị na ndị azụmahịa dị iche iche ji akparịta ụka n’ala Igbo agbanyeghi na ndị nọ n’isi ihe ndị ahụ bụ ndị Igbo.

Nsogbu Asụsụ Igbo Nwere

Asụsụ Igbo nwere olundị dị iche iche iche ndị mejupụtara ya. O doro anya na e nwere ọtụtụ ihe ịma aka n’ihu ndị sitere n’aka gọvmentị, obodo anyị bụ Naịjịrịa nakwa n’aka ndị mmadụ ọkachasị ndị Igbo. Asụsụ Igbo nwere mkpụrụ edemede iri ato na isii ndị e ji ezipụta mkpụrụ ụda asụsụ ya n’odịde.  O nwekwara usoro mmebe okwu, usoro okwu na amụmamụ echiche doro anya.        Crystal (2000) kwuru na e nwere ụdị ọnọdụ atọ asụsụ nwere ike ịnọ; ha gụnyere asụsụ nwere onwe ya (safe), nke nọ na nsogbụ (endangered) na nke nwụrụ anwụ (language death). Kincade (1991) n’aka nke ya kwuru na e nwere ọnọdụ ise asụsụ nwere ike ịnọ nke gụnyere asụsụ dị ndụ (viable language), nke dị ndụ ma pee mpe (viable but small), nke nọ na nsogbụ, nke na-anwụ anwụ na nke nwụrụ anwụ. O kwuru na e nwere ike ime asụsụ nọ na nsogbụ ka ọ dịịrị ndụ ma nwere onwe ya ma ọ bụrụ na ọgụ ndị na-asụ ya gbagote. Ọ bụrụ na a tụle ọnọdụ asụsụ Igbo nke ọma, a ga-achọpụta na ọ dị ndụ mana o nwechaghị onwe ya. Norris (1998) kwenyere na asụsụ ndị na-asụ ya ebughi ibu ka nwere ohere ịdanye na nsogbụ. Yamamoto (1997) n’aka nke ya kwenyere na e kwesighi iji ọnụ ọgụ ndị na-asụ asụsụ atụle ọnọdụ nsogbụ ya n’ihi na ọ bụ mmasị ndị mmadụ nwere ịkwalite asụsụ ha bụ ihe na-enyere asụsụ ha aka. Ọ bụrụ na ndị na-asu asụsụ bụrụ ibụ mana ha enweghi mmasị ịkwalite asụsụ ha, asụsụ ahụ nwere ohere idanye na nsogbụ karịa asụsụ nke ndị na-asu ya pere mpe ma nwee mmasị ịkwalite ya.  Ọ bụ nke a mere anyị ga-eji sị na asụsụ Igbo nọ na nsogbụ.

Nsụgharị

Kuhiwczak (2007) dere na amụmamụ nsụgharị malitere mgbe asụsụ malitere iwere onodu na ndụ mmadụ dịka ngwa bara uru. Steiner (1975) kwuru na akụkọ ọkpụ banyere nsụgharịbụ nke e kere ụzọ agba ano doro anya. O kwuru na agba nke mbụ malitere na oge Cicero na Horace ruo na nke Alexander Fraser Tytler mgbe Alexander dere akwụkwọ o kporo “Essay on the Principles of Translation” n’afọ 1791. Agba nke abụo malitere n’ Alexander Fraser Tytler ruo n’afọ 1946 mgbe Valery Larbaud bipụtara akwụkwọ a na-akpo “Sous i’invocation de Saint Jérome.” Ebe agba nke atọ ya malitere n’oge Valery ruo afọ 1960 n’ube ya. Agba nke na-eso agba atọ bụ nke oge a (agba ụwa ọhụụ) bụ nke ọ hụtara dịka agba nke anọ: ọ bụ mgbe amalitere iji igwe ebipute akwụkwọ. Agbanyeghi na ọtụtụ kọtọrọ nkọwa a, o mere ka a mata na nsụgharị metụtara mpakara na ngalaba amụmamụ dị iche iche.

Nida (1964) dere na ezigbo nkọwa a ga-enyenwu nsụgharị dị ọtụtụ ma dịkwa iche iche n’ihi na echiche ha pụrụ inye dị ọtụtụ. Ọzọ, e kwesiri ịma ebụmnuche e ji maka ya were bipute ihe a na-asụgharị makwa ndị a na-enyefe ya. Nida na Taber (1969) kwenyere na nsụgharị dabara adaba bụ nke zipụtara ezi ebụmnuche odee n’asụsụ nke a tufere ya. Ha kwukwara na echiche na nka odee n’asụsụ nke mbụ kwesiri ka e zipụta ya nke ọma n’asụsụ nke abụọ. Bell (1991) dere na nsụgharịbụ echiche ederede nke e si na otu asụsụ nyefe n’asụsụ ọzọ ma chekwaba ezi echiche na nka ederede ndịahụ n’asụsụ nke abụọ. Meetham na Hudson (1972) hụtara nsụgharị dịka nnọchi a na-enye otu ederede site n’otu asụsụ banye n’asụsụ ọzọ. Catford (1965) kwadoro nke a ma gbakwunye na asụsụ nke mbụ bụ nke e ji dee ederede ahụ na mbụ ebe nke abụọ bụ ebe a sụgharịrị ya.

 

Nchọcha n’isi okwu (Ntulegharị gbasara Nsụgharị nke Odee ndị Ọzọ merela)

Na nchọcha n’isi okwu, anyi ga-atụcha ọrụ Eke and Ugorji (1999), Chidi E. O. (2006) na nke Uguru J. O. (2007). Eke and Ugorji (1999) n’aka nke ha zipụtara ihe nhịa ahụ a na-ahụta mgbe a na-eme nsụgharị site n’otu asụsụ nyefe n’asụsụ ọzọ ma ụzọ e si ewezuga ihe nhịa ahụ ndị ahụ. Ha were asụsụ Igbo na nke Bekee dịka ebe mgbakwasị ụkwụ ha. Nchọcha ha kwuru na ọ bụ ndịiche dị n’agbata omenala na ewumewu Igbo na nke Bekee mere e ji enwetu ndịiche n’echiche ahịrị ndị a sụgharịrị mana myiri (equivalence), ndebe olu (modulation) na mmegharị (adaptation) bụ usoro ndị ka ibe ya mma iwezụga ihe ịma aka n’ihu ndị ahụ. Ọmụma atụ ndị ha nyere gụnyere:

 

  1. Ilu Igbo: Agadị nwaanyị daa ada ugboro abụọ, a gụọ ihe o bu n’isi ọnụ.

Ilu a dabara nke ọma n’asusu Igbo n’ihi omenala na nkwenye ndị Igbo nabatara ya mana ọ dabaghị n’asụsụ Bekee n’ihi na nkwenye ha na nke ndị Igbo abụghị otu. Ọzọ omenala ha akwadoghi ụdị akparamagwa dị etu ahụ ebe ndị agadị nọ. A sụgharịa ya nye n’asụsụ Bekee, ihe ụ ga-abụ bụ:

If an old woman falls down two times, one will count what she is carrying on her head

Mana ọ bụrụ na a chọrọ ka e nweta ezi ebumnuche ilu ahụ n’asụsụ Bekee, ihe a ga-ekwu bụ:

Once beaten, twice shy.

  1. Ha kwukwara na nkebi ahịrị e ji amalite akụkọ ifo n’asụsụ Bekee bụ:

“ Once upon a time”

Mana mgbe ọbụla ọkọ akụkọ chọrọ ka onye obụla gee nti n’akụkọ ya, dịka omenala na nkwenye ndị Igbo si dị, ọ ga-eji:

“chakpii… wọọ;

nkịta nyara akpa… nsị agwụ n’ọhịa;

o ruru otu mgbe…”

Ha kwenyere na mgbe obụla e si n’asụsụ Bekee eme nsụgharị enyefe n’asụsụ Igbo, e kwesiri ileba anya n’akpala okwu na atụmatụ okwu Igbo ịhụ na nkwenye obodo, amụmamụ osisi (flora) na amụmamụ anụmanụ (fauna) dabara nke ọma dịka omenala ha si dị.

Chidi E. O. (2016) mere nchọcha ịchọpụta ihe ndị na-egbochi nsụgharị tọrọ atọ ma daba nke ọma mgbe e si n’asụsụ Bekee asụgharị nye asụsụ Igbo nakwa ụzọ ka mma iji hụ na e nwere nrube isi (fidelity) nye nsụgharị. Atụtu ha gbasoro mee nchọcha bụ nke ntapi (interpretive theory).  O kwenyere na o siri ike inweta nsụgharị ga-enyefe kpọm kwem ebumnuche na echiche e zipụtara n’asụsụ mbụ mana e nwere ohere a ga-esi mee ka echiche a ga-enweta nwee ike zipụta ebumnuche ihe a sụgharịrị. Ọ gara n’ihu kwuo na ihe kacha ama nsụgharị ederede aka n’ihu bụ nkwenye omenala n’ihi na asụsụ na-adabere nke ukwu ebe omenala nọ. Akpala okwu, ilu, mbụrụ na atụmatụ okwu dị iche iche na-ezipụta echiche nhụrụnuche (imagery) si etu ahụ mee ka ndịiche dị n’omenala Igbo na nke Bekee pụta ihe ma metụta nsụgharị ha. O nyere ọmụmatụ ndị a:

  1. Ilu
  2. Igbo: Anaghị agba aka ahụ nwata eze

Bekee: * One does not see a child’s teeth empty handed.

  1. Bekee: One good turn deserves another

Igbo: * Otu ezigbo nchigharị kwesịrị ọzọ

  1. Bekee: Make hay while the sun shines

Igbo: * Kpokọwa ahịhịa mgbe anwụ ka na-acha

  1. Igbo: Agha akara aka anaghị eri ngwụrọ

Bekee: * An announced war does not eat a cripple

Nsụgharị e nyere ilu ndị a adabaghi adaba n’ihi omenala obodo ndị nwee asụsụ ebe a na-enyefe ha. O kwuru na o bụrụ na a chọọ inye ilu ndị a ezi echiche ha, ihe ndị ha ga-abụ bụ:

  1. Igbo: Anaghị agba aka ahụ nwata eze

(One does not see a child’s teeth empty handed)

Nkọwa ya na Bekee: Nothing goes for nothing.

  1. Bekee: One good turn deserves another

(Otu ezigbo nchigharị kwesịrị ọzọ)

Nkọwa ya n’Igbo: Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri.

iii. Bekee: Make hay while the sun shines

(Kpokọwa ahịhịa mgbe anwụ ka na-acha)

Nkọwa ya n’Igbo: A na eji ehihie achọ ewu ojii

  1. Igbo: Agha akara aka anaghị eri ngwụrọ

(An announced war does not eat a cripple)

Nkọwa ya na Bekee: To be forewarned is to be forearmed

 

O nyekwara ọmụmatụ ndị a banyere amụmamụ anụ na osisi ( Flora and Fauna) na echiche ha na-ezipụta dịka omenala na nkwenye ndị Igbo na nke ndị Bekee si dị.

  Asụsụ Bekee Asụsụ Igbo
I Fox (cunning)

 

Mbe (Tortoise)

 

Ii Olive branch (peace)

 

ọ̀mụ́ (palm tendril)

 

Iii Dragon (danger/evil)

 

Ikwiikwii (Owl)

 

Iv Sign post (notice of danger)

 

ọ̀mụ́ (palm tendril)

 

 

Nchọcha Uguru J. O. (2007) mere banyere ụzọ e si akwalite mmepe obodo site n’amụmamụ sayensi asụsụ nyere nkọwa banyere ụzọ e si agwọ ọrịa n’ala Igbo ma nyekwa nsụgharị ha n’asụsụ Bekee.

                                               

        Ọrịa                (ailment) Ọgwụgwọ

(cure)

Ụzọ e si eme va

                  (method)

 

1. ahụ mgbu

(pains)

mmiri ọkụ na akwa

(hot water and cloth)

Tinye akwa na mmiri ọkụ. pịkọọ ya ma bie ya ebe na-egbu gị mgbu

(soak cloth in very hot

water, squeeze out and

apply on affected part

of the body).

2. Ọgbụgba ọbara/ mmee

(bleeding)

Unyi ọkụ

(soot from a native

kitchen rack)

Kpụchapụta unyi, were

rnkpịsị aka tere ya ma

chie ya n’ihu ọnya

(scrape out soot and use

your finger to press it on

the face of the wound).

3. nje naebute ihe

ụdụdọ (Tetanus)

mma ọkụ na mmanụ

(heated knife and palm oil)

Hụọ ọnụ mma n’ọkụ, ọ chaa uhie wepụta ya, tụsa ya obere mmanụ.

mee ka mmanụ ahụ tanye

ebe i merụrụ ahụ. (Mee

nke a abali atọ: otu ugboro

n’ụbọchị)

(heat tip of the knife till it

glows, drop little quantity

of oil on it and allow to

drop on the affected part)

[once a day for three days]).

4. Ogo/ntu/ogwu ọdụdụ (bottle/nail/thorn piercing skin) mma ọkụ na mmanụ

(heated knife and palm oil)

mee ihe dị na nke atọ

(same as in three)

 

Ọ gara n’ihu de na onye nkụzi na-akụzi etu e si echekwaba nri n’ala Igbo ga-ahụta nke a dịka ihe mgbakwasị ụkwụ. Ọ kọwara ha n’asụsụ Igbo ma nyekwa nsụgharị ha n’asụsụ Bekee.

 

Ụzọ ndị 1gbo si echekwa nri

(methods of food preservation in Igbo land)

Nri                                          Nchekwa

(Food item)                          (Preservation)

Akpụ (cassava)                  Orọma nk/nsi

Anụ (meat)                           Ọmịmị(drying/smoking)

Azụ (fish)                              Ọmịmị (drying/Smoking)

Jinja (ginger)                         lie ya n’ala (bury it in the ground)

Mmiri ọṅụṅụ                        Ite ụrọ (tee ite mmiri ụrọ)

(Drinking water)   (Clay pot)

 O kwenyere na site na amụmamụ asusu ala Naijirịa na nke obodo ndị ọzọ, a ga-enwe mwulite na mmepe obodo.

 

Nkwalite Asụsụ Igbo

Ebe a nọ amụ asụsụ metụtara ihe niile ọmụụ nụrụ na ntị ya na ndị ọ hụrụ anya. O nwekwara ike metụta ihe ndị ọzọ e nwere ike ịhụta ebe a nọ na mmekọrịta dị na agbata ọmụụ na mmadụ na ihe ndịọzọ. Ịmụta asụsụ dịka Rutherford (1987) siri kwuo bụ ịmụta mkpụrụ okwu na ọgbara okwu dị iche iche ịhụ na ebumnuche nzikọrịta ozi bụ nke e nwetara. Ezeani E. O. (2002) mere nchọcha banyere iji asụsụ Igbo akụzi sayensi n’ụlọ akwụkwọ. Nchọcha ya gosipụtara na asụsụ Igbo bụ asụsụ kasị mma iji kụziere umu akwụkwọ sayensi n’ogo praima n’ihi na ọ na-enye aka iwezụga ihe ịgbachi anya a na-ahụta n’amụmamụ sayensi. Igboanusi, H. (2006) tulere ntụnye oke ndị ozi/ndị ụka si obodo ọzọ tụnyere na ịkwalite asụsụ Igbo. Ọ gbara mbọ gosipụta ọnọdụ nnyemaka ha na ebe ha riri mperi. Nke bụ ezi okwu bụ na odide asụsụ Igbo malitere n’aka ndị ozi ahụ agbanyeghi na ha amaghị asụsụ ahụ nke ọma. Oyelami, O. M. (2008) kwuru na asụsụ Igbo so n’asụsụ ndị a hụtara na-adanye na nsogbu. Nke a mere o ji were kwuo na ọ dị mkpa na amụmamụ asụsụ Igbo bụ nke e mere ka ọ dị mfe inweta site na iji igwe kọmpụta na igwe ngosi dị iche iche (audio and visual media) ndị na-enye ndị mmadụ ohere ịmụ asụsụ ahụ mgbe ọ masịrị ha n’ebe nyemaka nzikọrịta ozi nkunkube (internet) dị ma ọ bụ ebe ọ dịghị. Iloene, M. I., Iloene, G. O., Mbah, E. E. na Mbah, B. M. (2013) mere nchọcha yiri nke a mgbe ha mere banyere etu e si eji igwe kọmpụta na ngwaa nkụzi ọgbara ọhụụ ndị ọzọ akụzi asụsụ Igbo na mahadum. Ha chọpụtara na a bịa na mahadum abụọ ha jere nweta ngwaa nchọcha ha, na e nwere ndị nkụzi mara ihe ekwe kụrụ banyere etu e si eji igwe kọmpụta akụzi ihe mana ihe ịma aka n’ihu ha chọpụtara bụ n’akụrụ ngwa kọmpụta ndị ahụ anaghi ebu asụsụ Igbo ma ọ bụ ede asụsụ Igbo nke ọma. Ọzọkwa, ọ naghi adị mfe inweta ngwongwo mfe (softwares) ndị na-enyere ngwongwo ike (hardware) aka ịhụ na igbe njikọ (central processing unit) ha nabara ma nye ohere ka ụgbọ abịịdịị (keyboard) bụrụ nke eji edebanye asụsụ Igbo nke oma. Ọnọdụ a mere ha ji were kwuo na ọ dị mkpa na emereme nka na ụzụ dị iche iche ji dị mkpa ịmata na asụsụ Igbo na asụsụ ndị ozo nwere akara dị iche iche kwesiri ka echeta ha n’ihe a na-eme. Nwankwere A.Ụ. N., Mmadike B. I. na Eme C. A. (2017) kwenyere na otu n’ụzọ ndị kacha mma iji chekwaba asụsụ Igbo bụ site na ndị nne na ndị nna ha na ụmụ ha bi n’obodo ịhụta mkpa ọ dị na ha malitere ịkụziri ụmụ ha asụsụ Igbo. Ha kwuru na ọ bụ naanị ndị nne na ndị nna ezinaụlọ bi n’obodo ndị ọzọ na abụghi ala Igbo pụrụ ime ka ụmụ ha nwee ike ịghọta asụsụ Igbo ma ọ bụ na-asụkwa ya. Ha kwenyekwara na ọ bụ ọrụ dịịrị ndị Igbo niile ịhụ na umu Igbo niile, agbanyeghi ebe onye bi mụtara ma na-asụ Igbo iji wezụga asụsụ Igbo ịdanye na nsogbu

 

Nkwalite Asụsụ Igbo site na Nsụgharị

E nwere ọtụtụ ụzọ e si akwalite asụsụ nke nsụgharị bụ otu n’ime ha. Mgbe ọbụla a na akwalite asụsụ, a na-agba mbọ hụ na ndị nwee asụsụ ahụ na-asụ ya. A na-ahụkwa na e chekwebara echiche na emereme dị iche iche n’agụmagụ asụsụ ahụ. Onodu a mere nsụgharị ji dị oke mkpa nye nkwalite asụsụ Igbo. Tupu e nwee nsụgharị dabara adaba a ga-esi n’otu asụsụ sụgharịa ihe ndị a na-ekwu maka ha nye echiche ya n’asụsụọzọ. Etu o sila dị, ọ bụ asụsụ Bekee bụ asụsụ a mara na-emekpe asụsụ Igbo na asụsụ ndị ọzọ ahụ n’ala Naịjịrịa. Nke a bụ n’ihi na mgbe nwa Bekee bịara ala Naịjịrịa, ha mere ka asụsụ ha bụrụ asụsụ azụmahịa, mkparịta ụka na nzikọrịta ozi gọvmenti n’ala Naịjịrịa. Ọnwụka (2014) zipụtara mkpebi Iwuala (2009) site n’okwu ndị a:

 oge ndị ọcha lachara, ọ dịzị ka ndị Igbo bu asụsụ Bekee n’ isi nke mere na ha hụrụ asụsụ Bekee n’anya karịa asụsụ Igbo, n’ ihi na onye Igbo na nwanne ya na-ekwu okwu, ha enweghị ike ikwucha otu ahịrịokwu Igbo nke ọma n’ etinyeghị ya asụsụ Bekee. Ọ gara n’ ihu kọwaa na asụsụ Bekee bụrụzi asụsụ nke jikọtara obodo niile nọ na Naịjirịa ọnụ, bụrụzie asụsụ e ji eme ihe niile dị mkpa dịka: asụsụ ndị goomenti, nke e ji azụ ahịa, nke e ji akụzi ihe n’ ụlọakwụkwọ, nke e ji agbasa ozi n’ ụzọ dị iche iche, nke agụmagụ, bụrụkwa nke ndị Naijirịa na ndị obodo ọzọ ji enwe mmekọrịta.

Ihe nyere ha ohere ahụ bụ ọtụtụ asụsụ e nwere n’ala Naịjịrịa na mba Afriika dum nke na enweghi otu nke e nwere ike isi na ọ bụ asụsụ nke ọtụtụ na-aghọta. Nke a mere na mgbe ọbụla a na-eme nsụgharị asụsụ, e kwesiri ileba anya nke ọma na agwara nnọkwasịụda (supra-segmental featụres) nke asụsụ ndị ahụ na nke asụsụ Igbo dịka asụsụ ụda olu. Ihe ndị ahụ ga-enye aka mee ka ezi ebụmnuche asụsụ ndịahụ bụrụ nke e nwetara. Dechert (1983) kwuru na mgbe echiche asụsụ a na-asụgharị (L1) na nke a na-ekwugharị ya enye (L2) abụghi otu, a na-enwe ndehie.

Nsụgharị bara uru n’ihi na ọ bụ nka ndị odee na ndị nchọcha dị iche iche ji zipụta ihe ndị e mere n’oge gboo. Agụmagụ odịnala na nke ederede dị iche iche ndị e dere n’asụsụ ndị mba ọzọ bụkwuazi ndị a na-ahụta n’asụsụ ndị ọzọ dị iche iche n’ihi nka nsụgharị. Ihe dịka akwụkwọ nsọ Baibụlu e dere n’asụsụ Hebrew n’oge gboo na nke Koran nke e dere n’asụsụ Arab nwetara ohere ndị obodo ọzọ igu ha n’asụsụ dị iche iche n’ihi nka nsụgharị.

A bịa na mba ụwa, e nwere ọtụtụ emereme, agụmagụ ọnụ nakwa nke ederede ndị kwesiri ka a sụgharịa ha nye asụsụ Igbo anyị n’ihi uru ha nwere ike ịbara ndị Igbo. A bịa n’amụmamụ nka na uzu, nchọcha, nnyefe omenala, agum akwụkwọ, agwom orịa na ihe ndị ọzọ, e nwere ọtụtụ okpụrụ okwu ndị bara oke uru mana ha enweghi ntapị a na-enye ha n’asụsụ Igbo, nke mere nsụgharị jiri dị oke mkpa na nkwalite asụsụ Igbo.

Ọtụtụ mgbe, a na-enwe onodu ebe a na-esi n’otu asụsụ ma ọ bụ mpaghara obodo bụfee otu ihe ma ọ bụ ọzọ; ọ bụ onodu a mere Patil (2008) jiri dee si na nsụgharị bara uru nye nka na ụzụ, azụmahịa na ihe ndị ọzọ dịka nkum ume si dị mkpa nye ndu mmadụ na ihe ndị ọzọ na-eku ume. Dịka alaka kwesiri ileba anya nke ọma n’amụmamụ asụsụ, nsụgharị bara uru n’ihi na o ga-enye aka mee ka e nwere nnyefe echiche site n’otu asụsụ banye n’asụsụ ọzọ ọkachasị etu o si emetuta nchọcha na nchọpụta ga na nzikọrịta ozi.  Site na nsụgharị, agụmagụ ọdịnala Igbo dị iche iche a bụrụla ndị nke asụgharịrị nyefe n’asụsụ ndị ọzọ ọkachasị asụsụ Bekee. E siri n’ụzọ ahụ mee ka ihe nchọpụta dị iche iche bụrụ ndị a sụgharịrị ma nyefe n’asụsụ ndị ahụ. E sitere n’onodu ahụ mee ka nka edemede dị iche iche bụrụ nke e nyefere n’asụsụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na anyị soro otu nzọ ụkwụ ahụ site na isụgharị ederede na emereme asụsụ ndị ọzọ nye asụsụ Igbo, nka agụmagụ na nke ederede asụsụ ndị ahụ, ga-abụ ndị a ga-edubata n’asụsụ Igbo.

Nchkta na Mmechi

Ala Naịjịrịa nwere ubara asụsụ; nsụgharị na-enye aka ime ka echiche emereme na omenala nke ezipụtara n’otu asụsụ bụrụ nke e nwere ike izipụta n’asụsụ ọzọ. Ebe nke a dị ire n’asụsụ ndị ọzọ, a ga-emenwu nke a n’asụsụ Igbo site n’ịsụgharị ederede na agụmagụ dị iche iche a maa ama ọkachasị ndị na-ezipụta nkwenye na omenala Igbo ka ha bụrụ ndị a ga-echekwaba n’asụsụ Igbo. Nsụgharị na-abakwa uru nye azụmahịa, mwulite obodo, nka na uzu na ihe ndị ọzọ. Ebe ala Naịjịrịa nwere asụsụ Bekee dịka asụsụ gọvmentị etiti ma nwekwa asụsụ Igbo, Hausa na Yoruba dịka asụsụ mpaghara, ọ dị mkpa na anyị kwalitere asụsụ ndị ọzọ ka ha gboro anyị mkpa nkụzi, azụmahịa, mwulite obodo, nchọcha na ihe ndị ọzọ. Asụsụ ndị kachasị mkpa n’ogo a bụ ndị nke ahụ iwu asụsụ ala anyị wubere dị ka asụsụ mpaghara nke asụsụ Igbo bụ otu n’ime ha. Nke a ga-enye aka mee ka ha ghara idanye na nsogbụ.

 

 

 

 

 

 

Edensibịa

Akponye, O. (2007). Igbolanguage; is it a Dịeying language for a living people? Owerri: Totan Publishers.

Bell, R. T. (1991). Translation and translating: theory and practice. London and New York: Longman.

Catford, J. C. (1965). A linguistic theory of translation. London: Oxford University Press.

Chidi E. O. (2016) Fidelity challenges in English-Igbo translation.  Journal of Nigerian Languages and Culture Vol. 16 No.2, http://imsu.edu.ng/oer/publcation/6005659b9367e7b3242d30e55b6f3e5d.pdf

Chunbow, B. S. (1990). Theplace of mother tongue in Nigerịa. Agbor.Central Books and Linguistics Assocịation of Nigerịa.

Crystal, D. (2000). Language death. (nhz 1). Cambridge, UK: Cambridge University Press.

Dechert, H. W. (1983). How a story is done in a second language. Na Faerch, C.& Kasper, G. (nhz.) Strategies in interlanguage communication. London: Longman.

Eme, C. A. (2004). “Improving Igbo Language use at Homes and Communities” Na P.C. Nzomiwu and J.E. Madu (eds.) Unizik Journal of Arts and Humanities.Awka; A Global Communications Production. Vol. V. pp. 302-313.

Ezeani, E. O. (2002) Learning the sciences in Igbo language. Journal of West African languages, XXIX, 2. Pp. 3-9

Federal Republic of Nigerịa, (2004). National Policy on Education (nhz 4). Lagos: NERDC Press.

Iwuala, Z.C. (2009). Ndị Igbo na Asụsụ ha na mahadum dị n’ ugwu Awusa nke Yola, Adamawa Steet. Journal of Igbo Language and Linguistics.

Igboanusi, H. (2006) Agents of progress or problem-makers?: Missionary activities in the development of the Igbo language African study monographs, 27(4): 157-168

Iloene, M. I., Iloene, G. O., Mbah, E. E., & Mbah, B. M. (2013). The use of new technologiesfor the teaching of the Igbo Language in schools: challenges and prospects. In L. Bradley & S. Thouësny (Eds.), 20 Years of EUROCALL: Learning from the past, looking to the future. proceedings of the 2013 EUROCALL conference, Évora, Portugal (pp. 117-122). Dublin/Voillans

Kincade, M. D. (1991). The decline of native languages in Canada. Na Robins, R. H. and E. M. Uhlenbeck (nhz.), Endangered languages. Oxford and New York: Berg.

Koller, W. (1989). “Equivalence in Translation theory”. In Chesterman, Andrew. (nhz.) Readịngs in translation theory. Finland: Oy Finn Lectura. Ab.

Kuhiwczak, P. (2007) A companion to translation studies NaKuhiwczak, Piotr & Karin Littau, (nhz.), 2007. Clevedon: Multilingual Matters. Retrieved December 20, 2018, from http://rahbar.ịauq.ac.ir/assets/subdọmains/rahbar/files/94/A%20Companion%20to%20Translation%20Studies.pdf.

Meetham, A. R. & Hudson, R. A. (1972). Encyclopaedịa in linguistics, information and control. Oxford, Pergamon.

Mgbodile, T.O. (1999). Fundamental of Language Education. Nsukka:                 Mike Socịal Press

National Policy on Education (2004). Federal Government of Nigerịa Press.         Lagos.

Nida, E. A. (1964). Toward a science of translating. Leiden. E.J. Brill, pp. 1-2, 82.

Nida, E & Taber, C. (1969). The theory and practice of translation. Leiden: E.J. Brill.

Nord, C. (2007). Translating as a purposeful activity: functionalist approaches explained. Manchester: St. Jerome Publishing.

Norris, M. J. (1998). Canada’s aboriginal languages. Canadịan Socịal Trends, Winter.

Nwadike, I. U. (2002). Igbo language education, A historical study. Obosi: Pacific Publishers.

Nwankwere A.U. N., Mmadike B. I. na Eme C. A. (2017) Safeguarding the Igbo language through teaching Igbo children in diaspora. http://dx.doi.org/10.4314/og.v13i 1.9

Obinna, V.E. (2002). “Igbo Language and the Challenges of Philosophical and Scientifico-technological expression”. In A]x journal of Igbo Arts and Culture. No. 6. pg. 122-130. Owerri: Imo State Council for Arts and Culture.

Ojiaku, M. O. (2015) The Igbo People Culture and Character. Bradenton, Florida, U.S.A. BookLocker.com, Inc.

Onwuka, G.T. (2014). Mmetụta Asụsụ Bekee Na-Emetụta ụmụakwụkwọ N’ Ọmụmụ Asụsụ Igbo Na Sinịọ Sekondịrị Dị Na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Unpublished Ph.D. Thesis University of Nigerịa Nsukka.

Oyelami, O. M. (2008) Development of Igbo language e-learning system. Turkish online journal of distance education-TOJDE Volume: 9 Number: 4 Article 2

Ray, J. S. (1972). Semantic interpretation in generative grammar. Cambridge, Massachusetts: MIT Press.

Rutherford, H. W.E. (1987). Second language grammar: learning and teaching. London: Longman.

Sager, J. (1994). Language engineering and translation: consequences of autọmation. Amsterdam & Philadelphịa: John Benjamins Publishing Com

Steiner, G. (1975) After Babel: aspects of language and translation. United Kingdom. Oxford University Press

Uguru, J. O. (2007) Scientific study of language for national development.  Language and literature in a developing country: Esaay in honour of Prof. Benson A. Oluikpe. Pp. 102-112

UNESCO (United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization). (2003). Educationin a multilingual world: Position paper on education. Parịs: UNESCO. Retrieved December 20,2018, from http://unesdoc.unesco.org/images/0012/001297/129728e.pdf.

Yamamoto, Akira Y. (1997). A survey of endangered languages and related resources. Newsletter of the foundation for endangered languages 5.

 

Leave a Reply