Posted by on Apr 6, 2019 in publications | 0 comments

Iji Asụsụ Ọdịnala Akụzi Ihe Ọmụmụ Niile n’Ụlọakwụkwọ Sekọndịrị Nta na Steeti Ebọnyị

 

Nneka Justina Eze                                                                                                                                                            Department of Arts and Social Science Education                                                                                                                     Ebonyi State University, Abakaliki – Nigeria                                                                                                                    08039555509/ nnekaeze44@gmail.com

 

Nwakego Nwigwe                                                                                                                                                            Department of Arts and Social Science Education                                                                                                                      Ebonyi State University, Abakaliki – Nigeria

 

Na

 

Fabian Uchenna Ude                                                                                                                                                     Department of Arts Education                                                                                                                                                     University of Nigeria, Nsukka – Nigeria

 

 

Ụmịedemede

Asụsụ ọdịnaala bụ asụsụ mmiri ara nne nke ndị ọbụla dịka o metụtara obodo ha. Asụsụ ọdịnaala bụ ọdịbennaa, a mụnyere nwata ọbụla na ya. Mkpa asụsụ ọdịnaala dị n’ihe ọmụmụ n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị nta. Nka nchọcha e ji mee ihe ọmụmụ a bụ nke nchọpụta ndịnakụkụ. O nwere mbunuche atọ na ajụjụ nchọcha atọ. Ụmụakwụkwọ e ji mee ihe ọmụmụ a bụ ụmụakwụkwọ ụfọdụ e ji usoro nsere wee sere ụlọakwụkwọ ha. Ụlọakwụkwọ ndị a bụ ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị sekọndịrị nkịtị na nke ndị Gọọment. Ngwa nchọcha e ji mee ihe ọmụmụ a bụ akwụkwọ mgbanjụ a kpọrọ Njụmaza. E jikwa ụsa ndị e nwetara wee chịkọta nchọpụta ihe ọmụmụ a. Nchịkọta na ntụnye aro wee bụrụ na ndị nkụzi ga-agba mbọ were asụsụ ọdịnaala ụmụaka na-akụziri ha ihe ọmụmụ niile na klas ha maka na nke a ga-ewulite nghọta na mmụta ihe ọmụmụ ahụ a na-akụziri ha karịa mgbe e ji naanị Bekee akụzi ya. Ndị Gọọment ga-agbakwa mbọ nabata amụma a, iji wulite agamnihu na nghọta na mmụta ụmụakwọ ebe niile na Steeti Ebọnyị.

 

 

 

 

Nkọwa

Asụsụ bụ ngwa nkụzi nke mbụ na mbụ n’ihe ọbụla, ọ kacha n’ihe ọmụmụ n’ogo ụloakwụkwọ niile. Mana anyị ga-agbado ụkwụ n’ụlọakwụkwọ nke sekọndịrị, n’ihi na ọ bụ ya ka e bu n’uche wee mee ihe ọmụmụ a. Asụsụ bụ ụdị ụda dị iche iche na-esi n’ọnụ mmadụ apụta a haziri nke ọma n’usoro ya. Ọ bụkwa n’ime obi ka a na-ebu ụzọ chepụta ya, jiri ọnụ nkịtị kwupụta ya, onye ọzọ ejiri ntị ya nụ ya ma ghọtakwa ihe ọ na-ekwu.  E nwekwara ike ịsị na asụsụ bụ ụda a haziri ahazi nwere nghọta na echiche zuru oke. Nke a pụtara na ịsụ asụsụ bụ mgbe ọbụla mmadụ na-ekwu okwu. Ọ bụ ya kpatara o ji bụrụ otu n’ime njirimara mmadụ n’ihi na ọ bụ naanị mmadụ ka Chi kenyere echiche zuru oke e nwere ike iji chepụta asụsụ, jiri ya rụọ ọrụ. Ọ bụ nke a mere na anụmanụ dị iche iche anaghị asụ asụsụ dịka mmadụ, n’agbanyeghị na ha nwere ike were mkpọtụ ma ọ bụ agwa wee kparịtara onwe ha ụka. Nwadike (2009) kọwara asụsụ dịka ọtụghe e ji atụghe obi mmadụ, ọ bụrụ na a tụfuo ọtụghe a, a tụfuo mmadụ. Ọ kọwakwara na ọ bụrụ na anyị edozie ọtụghe a, dozie ya nke ọma na ọ ga-atụghe ọnụ ụzọ ebe ihe ọma dị, ihe ọma nke ọnụ agaghị akọtali site n’akụkụ ọnụ ụzọ. Mgbodile (1999) hụtara asụsụ dịka ihe mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta, maka na e wezụga asụsụ, mmekọrịta mmadụ na ibe ya agaghị ezu oke, n’ihi na ha agaghị emekọrịta ọnụ site n’echiche, edemede, agụmagụ na ịkparịta ụka. Iwe na Ọnwụta (2016) hụtara asụsụ dịka amamihe nke mmadụ na ibe ya na-enyerịta onwe ha. E nwere ụdị asụsụ dị iche iche na mba ụwa nke asụsụ Igbo bụ otu n’ime ha. Asụsụ Igbo so n’otu n’ime asụsụ ọdịnaala pụtara ihe na Naịjịrịa.

Asụsụ Ọdịnala

Asụsụ ọdịnaala ndị Igbo niile bụ asụsụ Igbo, asụsụ Igbo bụ asụsụ ndị Igbo nwere mmasị na ya na-agbanyeghị na ndị Igbo ụfọdụ n’onwe ha enweghị ihe ha ji ya bụ asụsụ ha kpọrọ. Ụdị ndị Igbo dị etu a amaghị na asụsụ ha fuo na ha onwe ha efuola n’ihi na asụsụ onye bụ onye ahụ, tinyere na Anagbogu (2001) kwuru na o nweghị asụsụ ka ibe ya mma. N’ihi ya kpatara na ndị Igbo kwesiri iji nkwuwa okwu na-atapịa asụsụ Igbo oge ọbụla na ebe ọbụla, tinye uchu na ya dịka o kwesiri ka o wee na-eto eto. Maka na ọ bụrụ na asụsụ ahụ na-egbo mkpa asụsụ ndị ọzọ na-egbo, o nweghịzị ihe dị iche n’asụsụ ahụ na asụsụ ndị ogbo ya ndị ọzọ. Nke a gosiri na e nwere ike iji asụsụ Igbo kụzie ihe niile e nwere ike iji bekee wee kụzie maka na o nwere mba ụwa ndị anaghị asụ asụsụ Bekee n’obodo ha, mana ha na-agụ akwụkwụkwọ na be ha n’ogo dị iche iche. Ọ bụkwa asụsụ ha ka ha ji na-amụ ihe ọmụmụ niile ha n’amụ na klas. Ọ bụrụ na ndị nkụzi niile n’ala Igbo na ụmụakwụkwọ niile chọpụtara nke a, ha ga-enwe agwa ọma banyere asụsụ ha. A ga-ewulitekwa nke a site n’ịgbasa ụdị ozi a na gburugburu anyị maka na ndị obodo Chaịna, Swiden na mba ndị ọzọ dị iche iche na-azụpụta ndị ọka ibe na ngalaba ọmụmụ dị iche iche n’ejighị asụsụ bekee. Obodo ọbụla nwere asụsụ ọdịnaala, nke a na-ekwesighị ka e jiri ya wee gwuo egwu n’ihi na ọ bụ ya bụ njirimara ndị kacha pụta ihe maka na a ghara ihe e ji achọ mma, mma arụọ.

Nnukwu otu ihe kpatara e ji eti mkpu ka a kwalite maọbụ kpalite asụsụ ọdịnaala bụ maka na ndị Igbo hụtara asụsụ ọdịnaala dịka asụsụ ndị nne na nna na ụmụ ha ji akparịtara ụka. Mana nke bụ eziokwu bụ na asụsụ Igbo karịrị ịbụ naanị maka mkparịta ụka kama, asụsụ e ji akụzi ihe dị iche iche n’ezinaụlọ, n’ahịa, n’ụlọụka, n’ụlọọrụ (ọrụ aka na ọrụ oyibo) nakwa n’ụlọakwụkwọ. A ga-emekwa ka asụsụ Igbo na-eto eto site n’ime ka o soro n’asụsụ ICT, ya bụ iji ya arụ ọrụ na kọmputa, na website nakwa na google na ngalaba dị iche iche ụmụaka ji were Bekee akparịta ụka n’ekwe ntị. Ọ bụrụ na e were asụsụ Igbo mere asụsụ nkụzi, ọ ga-eme ụmụaka ka ha mara na asụsụ Igbo bara nnukwu uru na ọ bụghị naanị asụsụ e ji akpa ụbụbọ kama na ọ bụ asụsụ ga-eme mmadụ ihe ọ ga-abụ n’ọdịniihu. Bamgbose (2016) kọwara na malite n’afọ 1977 bụ mgbe National Policy on Education nke mbụ na mbụ malitere. Ọ kọwara na e nweela ihe ruru mbipụta ise na ya; nke afọ 1981, 1998, 2004, 2007 na 2013. Mbipụta nke ọbụla na-ahazigharị amụma na usoro ihe ọmụmụ na ngalaba dị iche iche n’ogo amụmamụ agụmakwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị. Mana ọ bụ ihe ịgba anya mmiri na mbipụta niile, o nweghị nke a na-etinye n’ọrụ tupu e bipụta ọzọ. Ọ dị ka a ga-asị na ndị na-ahụ maka mbipụta NPE a na-enwe mgbagwoju anya maka na o nweghị ọnụ a ga-eji kwupụta na ndị ala anyị ga-ahapụ asụsụ ọdịnaala ha wee mee iwu na asụsụ ọdịnaala nke ndị ala ọzọ bụ ihe bụ iwu na nwata akwụkwọ ọbụla ga-emerịrị ya ma gafee n’ogo Praịmarị na sekọndịrị ukwu. Asụsụ ahụ wee bụrụ asụsụ ndị France. Nke a mere oge Jenaral Sanị Abacha na-achị n’agbata afọ 1993-1998. Oge ndị mba ụwa na-ahụ maka akụnaụba na-asụ Bekee nke mba Amerika (English-speaking Commonwealth and the United States of Amerika) wezụgara Naịjirịa n’akụkụ. Onyeisi ala anyị wee gbakwuru ndị France maka enyemaka nke mere ka e tie iwu na nwata akwụkwọ niile na sekọndịrị nta na nke ukwu ga-emerịrị French n’ụlọakwụkwọ iji kelee ha ekele, e wee tinye ya na mbipụta nke NPE nke 1998. Nke a gosiri na e nwere ike iti iwu na ọ bụ naanị asụsụ ọdịnaala ka a ga-eji na-akụzi ihe niile na sekọndịrị nta n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị niile dị n’ala anyị, naanị ihe ọ ga-ewe bụ ịtụgharị akwụkwọ ọgụgụ niile nke ihe ọmụmụ ha n’asụsụ ọdịnaala nke ndị ọbụla. Ọ bụrụ naanị asụsụ Bekee ka e ji Bekee akụziri ha, amụma a ga-ewelite maọbụ kpalite ogo nghọta ha maka na o nweghị ihe dịka mgbe e ji asụsụ doro mmadụ anya nke ọma akụzi maọbụ akọwara ya ihe, ọ ga-akara ghọta ya, ọ kacha webatakwuo akọnauche ya n’ihe ọmụmụ ahụ nke ga-eme ka ọ mara ihe ahụ karịarị onye nkụzi ya n’ihi na ọ ga-atụnye oke ya n’ihe ọmụmụ ahụ. E kwesịrị ime ka nwata akwụkwọ ọbụla nwere onwe ya iji asụsụ gburugburu ya maọbụ asụsụ mmiri ara nne ya wee kọwapụta onwe ya n’echiche ọbụla o chepụtara n’ime onwe. Nke a, ga-adị ire karịa Bekee n’ihi na asụsụ Bekee bụ asụsụ mbịara abịa. Ha agaghị enwe ike iji asụsụ a, a mụtara n’ụlọakwụkwọ wee kwuo maọbụ kọwaa ihe niile ka o si dị ya n’obi dịka ọ ga-esi kọwaa ya n’asụsụ a mụnyere ya na ya nke ọ maara ihe a na-akpọ ihe niile na ya maka na mgbe ụfọdụ ọ bụghị ihe niile ka nwata akwụkwọ maara ihe a na-akpọ ya na Bekee.  

 

Ngwa Ọrụ A Ga-Eji Mee Nke a

Ngwa ọrụ a ga-eji mee nke a bụ ndị nkụzi ma nke ekwe na-akụ n’asụsụ ọdịnaala wee tọọ anya n’ala, wee banye n’ọrụ ntụgharị nke akwụkwọ ọgụgụ ndị e ji Bekee bipụtachara na ngalaba ihe ọmụmụ dị iche iche. Ngwa nkụzi kọmputa dịkwa mkpa dịka ngwa ọrụ a ga-ejị mee nke a, a ga-eji Igbo fọnt wee were kọmputa jiri asụsụ Igbo bipụtagharịa akwụkwọ ọgụgụ ndị ahụ ka o wee kara rụọ ọrụ na ndụ ndị e ji maka ha bipụta ya. A ga-ejikwa igwe onyoonyoo na-egosi ha ihe ụfọdụ, iji mee ka ha wee hụ ma ghọta ihe a na-akụziri ha nke ọma. A ga-eme nke a n’ihi na ọ bụ etu a ka a ga-esi wulite asụsụ ọdịnaala anyị ma wulitekwe ebumnobi agụmakwụkwọ.

 

Yusuf (2016) kọwara na etu ọbụla e si hụ agụmakwụkwọ na ọ bụ nkwadobe maka ndụ n’onwe ya, ya bụ ka mmadụ ga-esi hụta ụwa, ma baa uru n’ụwa ọ nọ n’ime ya. Ọ kọwara na o nweghị onye ọbụla na-aghọta ihe enweghị ike ịsụ maọbụ kpọpụta ya nke ọma. Ọ bụrụ na a choro ka agụmakwụkwọ baa uru ma rụọ ihe ọ bịara ịrụ, a gaghị eji asụsụ Bekee na-akụzi ihe niile. Nke bụ na onye ọbụla asụsụ Bekee na-ahịa ahụ nghọta, aghọọla onye itibọrịbọ, maka na Bekee siere nwata akwụkwọ ike egosighị na e were asụsụ doro ya anya kọwaa ya na ọ gaghị aghọta ya. Ebe ọ bụ na ebumnobi agụmakwụkwọ bụ ka mmadụ baa uru nwee ngalaba ebe ọ bụ a kwaa a kwụrụ; e nwere ndị ọrụ moto (Mechanics), ndị ọzụzụ anụmanụ, ndị Ọkwanka dị iche iche n’ọtụtụ ọrụ e ji asụsụ ọdịnaala arụ. E jiri asụsụ ọdịnaala nwata akwụkwọ kụziere ya mgbakọ na mwepụ, Kemistry, Fiziks, Bayọlọgi dgz, nwata akwụkwọ ahụ ga-akara ghọta ya maka na o nwere aha ọ ga na-anụ, ọ gaghị ama na ọ bụ n’ahụ ya ka ọ dị mana a kpọọ ya aha ahụ o ji mara ya, ọ kara were uche ya kọwaa etu o si arụ ọrụ karịa mgbe ọ na-anụ ya ka ihe adịghị n’elu ụwa (abstract) NPE 2013 kwadoro na iwu bụ na nwa akwụkwọ ọbụla ga-emerịrị otu asụsụ ọdịnaala n’ụlọakwụkwọ ya iji mee ka ha mara na asụsụ ọdịnaala na nke mbịara abịa bụ otu maka na ha niile bụ asụsụ. 

 

Nleda Anya Iji Asụsụ Ọdịnala Akụzi Nkụzi

Nke a bụ okwu a kpụ n’ọnụ n’ụlọakwụkwọ niile ma nke ndị nkịtị ma nke ndị Gọọment n’ihi na ha kwenyere na nwata akwụkwọ ọbụla nwere mmekọrịta n’asụsụ ọdịnaala n’ụdị ọbụla agaghị aba uru, maọbụ na ọ bụ onye itibọrịbọ. Ọ bụ nke a kpatara na ọtụtụ ụlọakwụkwọ na-amalite n’ọtaakara asụrụ ụmụaka asụsụ bekee ka o wee bụrụ na ụlọakwụkwọ nke ha bụ ọkaibe, were na-aghọrị ndị nne na nna amaghị uru asụsụ ọdịnaala bara, maka na ụfọdụ ha na-egbochikwa ụmụ ha ịsụ asụsụ mmiriara nne ha ọ bụladị n’ụlọ nne na nna ha. Mana ọtụtụ nchọcha ekpugheela na ihe ndị ahụ bụ ezigbo ụgha maka na a chọpụtaala na ụmụaka e ji asụsụ ọdịnaala akụziri, na-eme nke ọma karịa ndị nke e ji Bekee akụziri rukwaa na sekọndịrị ukwu. Ọ bụkwa ndị nke e ji Bekee zụọ maọbụ akụziri, na-akacha ada n’ule asụsụ Bekee n’ule WAYEKỊ, n’ihi na e werela asụsụ Bekee nke adịgboroja kpojuo ha n’ụbụrụ, nke a na-eme na mgbe onye nkụzi a zụrụ nke ọma n’asụsụ Bekee bịara kụziwe nke bụ ịgba, ha enwee oke mgbagwoju anya n’ihi na ọ bụghị nke ha maara maọbụ ha chere na ọ bụ ya bụ nke dị mma. Ọtụtụ n’ime ha nne na nna ha ahụ na-asụrụ ha Bekee n’ụlọ agụghị asụsụ Bekee wee mara tịịtịị na rịịrịị niile dị na ya. N’otu aka ahụ, ndị nkụzi ihe ọmụmụ niile ahụ a na-amụ n’ụlọakwụkwọ abụghị ndị ọkaasụsụ Bekee. Anyị kwesịrị ịbụ ndị ji asụsụ ọdịnaala anyị na-eme ọnụ, ghara ikwe ka nke ndị ọzọ dị ka ọ ka nke anyị mma site n’ịsọ ihere asụsụ ọdịnaala anyị maka na anyị enweghị asụsụ ọzọ anyị ga-eji nọchie ya. Tinyekwara na o nweghị ka anyị ga-esi, gụọ maọbụ sụọ asụsụ Bekee, ọ ghọọ asụsụ ọdịnaala anyị, n’ihi na ọ ga-abụrịrị asụsụ mbịara mbịa ọ bụ ruo mgbe ebighi ebi.

 

Mbunuche Ihe Ọmụmụ a

Mbunuche izugbe ihe ọmụmụ a bụ ịchọpụta mkpa ọ dị iji asụsụ ọdịnaala akụzi ihe ọmụmụ niile n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị nta na Steeti Ebọnyị.

Ihe ọmụmụ a ga-eleba anya kpọm kwem n’ihe ndị a;

  1. Ịchọpụta ma ụlọakwụkwọ ndị nkịtị eso eti iwu asụkwala asụsụ ọdịnaala
  2. Ịchọpụta ma ụlọakwụkwọ ndị Gọọment a na-eti iwu megide asụsụ ọdịnaala
  • Ịchọpụta ma ụmụaka niile e ji Bekee zụọ a na-ama akwụkwọ nke ọma
  1. Ịchọpụta ma o nwere uru asụsụ ọdịnaala bara ma e wezụga ịkpa ụbụbọ

Uru Ihe Ọmụmụ a

Ihe ọmụmụ a ga-ekpughe aghụghọ ndị nkụzi ụfọdụ na-aghọ, ịkụnye n’ime ụmụ akwụkwọ ha na nwatakịrị ọbụla na-asụ Bekee bụ nwata maara akwụkwọ. Ọ ga-emekwa ka ụmụ akwụkwọ mara na asụsụ ọdịnaala bụ nke ha, ihe ha natara n’aka ndị nna nna ha, na ọ bụkwa ya bụ njirimara ha ebe ọbụla ha nọ n’elu ụwa a. N’ihi ya, ha kwesịrị ichekwa nke ọma wee ghara ịhapụ ya ka ọ nwụọ n’ihi na ha enweghị asụsụ ọzọ. Ọ ga-ekpughekwa na nchọpụta egosila na nwata e ji asụsụ ọdịnaala kụziere ihe na-aka emeta nke ọma n’ihe ọmụmụ ahụ. Ha ga-ejikwa nkwuwa okwu na-asụ ya ebe ọbụla na mgbe ọbụla. Ndị nkụzi ga-amụtakwa na ha chọọ ka ụmụ akwụkwọ ha na-emeta nke ọma na ha ga-eji asụsụ ọdịnaala nwata kọwaara ya ihe ọmụmụ ahụ. Ndị nne na nna ga-amụtakwa na ịsụrụ ụmụ ha Bekee n’ụlọ bụ igbu ha egbu kama ịzọ ha azọ

 

Oke Ihe Ọmụmụ a

Ihe ọmụmụ a bụ naanị ụlọakwụkwọ iri ka o ji mee nchọcha ya, ụlọakwụkwọ ndị nkịtị ise na nke ndị Gọọment ise. Ha niile dịcha na Steeti Ebọnyị. O lebakwara anya n’ụfọdụ isiokwu e ji mee nchọcha n’ụlọakwụkwọ ndị ahụ dịka; ịchọpụta ma ụlọakwụkwọ ndị nkịtị eso eti iwu asụkwala asụsụ ọdịnaala, ịchọpụta ma ụlọakwụkwọ ndị Gọọment a na-eti iwu megide asụsụ ọdịnaala, ịchọpụta ma ụmụaka niile e ji Bekee zụọ a na-ama akwụkwọ nke ọma, ịchọpụta ma o nwere uru asụsụ ọdịnaala.

 

Ajụjụ Nchọcha Ihe ọmụmụ a

 

  1. Olee etu ụlọakwụkwọ ndị nkịtị sị akwado iwu asụkwala asụsụ ọdịnaala?
  2. Kedu ụzọ ụlọakwụkwọ ndị Gọọment si emegide asụsụ ọdịnaala?
  • Olee etu ụmụaka niile e ji Bekee zụọ si amatadebe akwụkwọ?
  1. Kedu uru asụsụ ọdịnaala bara?

 

Ntụlgharị Agụmagụ

Asụsụ bụ ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe mmekọrịta. Ọ bụ nke a mere ka mmadụ dị iche n’anụmanụ. Anagbogu, Mba na Eme (2001) kọwara asụsụ dịka ụzọ mmadụ wepụtara iji na-enwe mmekọrịta, echiche, na mmetụta, izipụta otu obi dị ha na ebumnuche ha site n’okwu ọnụ maọbụ Ederede. Nke a gosiri na asụsụ bara nnukwu uru, ọ bụ nke a mere na a naghị ekwu okwu nkụzi ma e wezụga asụsụ n’akụkụ maka na asụsụ bụ na nkụzi nwere isi. Makinde (2006) hụkwara asụsụ dịka ụgbọ e ji ebu akọnauche na obibi ndụ ndị mmadụ. Asụsụ ọdịnaala bụ otu ihe na nkọwa a niile e nyere maka asụsụ, ọ bụ naanị asụsụ bụ nke onye ọbụla na-asụ mana asụsụ ọdịnaala nwere ndị nwe ya, maka na ndị ọbụla nwere nke ha. Ọ bụkwa ya bụ njirimara ndị ọbụla na agbụrụ ha. Ọhaike (2016) kọwara na asụsụ ọdịnaala bara nnukwu uru; Ọ bụ ya ka e ji ama ebe onye si, e ji ya akpa ihe achọghị ka ndị ọzọ nụ maọbụ mara, e ji ya echekwaba omenala na nkwenye ndị obodo ahụ, e ji ya enweta enyemaka, ọ na-eweta udo na ịdịnotu, dgz.                         

N’ịchọpụta ogo nleda anya a na-eleda asụsụ ọdịnaala, ọ kacha n’iji ya akụzi ihe n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị nta, ọchọcha chọpụtara na a machibidoro ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nta ịsụ asụsụ ọdịnaala ha na klas maọbụ na gburugburu ụlọakwụkwọ ahụ n’ihi ya o nweghị onye nkụzi na-ekwu okwu iji ya akụzi ihe n’ihi na asụsụ ọdịnaala dịzị ka a ga-asị na o nweghị uru ọ bara n’agụmakwụkwọ n’ihi na o nweghị ihe ọmụmụ ọbụla e ji ya akụzi. Onye nkụzi ọbụla bụ naanị asụsụ bekee ka ha ji akụzi ihe ma ụmụ akwụkwọ aghọtara ya ma ha aghọtaghị ya, n’ihi na ha chere na ọ bụ nke ahụ ga-eme ka a mara na ha maara nke ekwe na-akụ na ngalaba ihe ọmụmụ ahụ mana nke bụ eziokwu bụ na a sụchaa sụpịrị sụpịrị ma ụmụ akwụkwọ ahụ aghọtaghị ya nke ahụ gosiri na ihe ọmụmụ ahụ na ihe niile e tinyere na ya lara n’iyi. Ọhakama na Amechi (2015) kwadoro na ịsụ Bekee apụtaghị na mmadụ maara akwụkwọ n’ihi na ọ bụ ọrụ asụsụ Bekee na-arụ ka asụsụ Igbo na-arụ, n’ihi na ha niile bụ asụsụ. Ebe ọ bụ na e nwere ike iji asụsụ Bekee kụzie ihe ọmụmụ dị iche iche, e nwekwara ike iji asụsụ Igbo kụzie ihe ọmụmụ niile, nke enweghị aha Igbo akpọọ ya aha Bekee ya, were Igbo supee ya ma kọwaara ụmụ akwụkwọ mpụtara ihe ahụ n’asụsụ Igbo. Ọzọ kacha mkpa bụ na a ga-agbalịsi ike jiri egwu ọdịnaala dị iche wee na-akụziri ụmụaka ihe ụfọdụ, dịka mgbe ha na-aga Ọtaakara, na Praịmarị, e jiri asụsụ ọdịnaala gụpụtachaa ụmụ egwu maọbụ uri ndị ahụ ha na-ejikarị asụsụ Bekee na-agụ oge ahụ nke ga-akpali mmasị ha n’asụsụ ọdịnaala. Ofomata (2002) kọwara na ịmalite n’oge kụnye ụmụaka asụsụ ọdịnaala ha n’ime ga-eme ka ha nwee ugwu na nsọpụrụ n’asụsụ ahụ. Nke a gosiri na e kwesịrị ịgba mbọ webata ya na ihe niile ha na-eme n’ezinaụlọ, n’ahịa, n’ọgbakọ ọbụla ma n’ụlọakwụkwọ. Ndị nkụzi nwekwara oke na ọrụ na nke a maka na ha ga-eji ọnụ nkịtị kọwaara ha uru asụsụ ha bara karịa asụsụ mbịara abịa ndị ahụ ha na-egbu onwe ha ka ka mụta, n’ihi na nwata nwere ike ịmụta asụsụ abụọ maọbụ karịa ma werekwa ha niile arụ ọrụ, hụta ya na nke ọbụla bara uru n’ụdị nke ya maka na Anagbogu (2001) kwusiri ike sị na o nweghị asụsụ ka ibe ya mma, n’ihi na ọ bụrụ na asụsụ ahụ na-arụ ọrụ zuru oke dịka asụsụ; mara na okwu agwụla.

 

Ụlọakwụkwọ ndị e ji mee ihe ọmụmụ a  

Aha ụlọ akwụkwọ ndị e ji mee nchọcha a bụ ndị a:

Ndị Gọọment nwe;

  1. Nnodo Secondary School Nnodo
  2. Girls High School Abakaliki
  • Holy Child Secondary School Sharon Igbeagu
  1. Community Secondary School Abomege
  2. Army Day Secondary School Nkwoagu

Ndị ndị nkịtị nwe;

  1. Bishop Otubelu Convent Abakaliki
  2. Twelve Apostles Seminary Igbeagu
  • Comprehensive Secondary Management and Technology
  1. Model Comprehensive Secondary School Ugwuachara
  2. Izzi High School Ishieke

 

Lee ụdị mgbanjụ e ji rụọ ọrụ n’ihe ọmụmụ a

 

Ulọkwụkwọ ndị Gọọment nwe

  Ee Mba Oge ụfọdụ
A na-eji asụsụ ọdịnaala akụzi ihe ọmụmụ niile na sekọndịrị nta n’ụlọakwụkwọ gị?      
Ị na-anata ntaramahụhụ ma ị sụọ asụsụ ọdịnaala gị na klas maọbụ na gburugburu ụlọakwụkwọ gị?      
Ị na-aghọta ihe e ji asụsụ ọdịnaala kụzie karịa nke e ji asụsụ Bekee kụzie?      
Ị na-enwe ezigbo mmasị mgbe e ji asụsụ ọdịnaala akụziri gị ihe ọmụmụ?      

 

Ulọkwụkwọ ndị ndị nkịtị nwe

  Ee Mba Oge ụfọdụ
A na-eji asụsụ ọdịnaala akụzi ihe ọmụmụ niile na sekọndịrị nta n’ụlọakwụkwọ gị?      
Ị na-anata ntaramahụhụ ma ị sụọ asụsụ ọdịnaala gị na klas maọbụ na gburugburu ụlọakwụkwọ gị?      
Ị na-aghọta ihe e ji asụsụ ọdịnaala kụzie karịa nke e ji asụsụ Bekee kụzie?      
Ị na-enwe ezigbo mmasị mgbe e ji asụsụ ọdịnaala akụziri gị ihe ọmụmụ?      

 

Nchọpụta anyị n’ihe ọmụmụ a

Site n’ihe ọmụmụ a, anyị chọpụtara na ọ bụghị ụmụ akwụkwọ niile chọrọ ka e jiri asụsụ ọdịnaala na-akụziri ha ihe niile n’ihi na ụfọdụ n’ime ha amachaghị asụ asụsụ ọdịnaala ha ma ya fọdụzịa ịghọta ihe niile e ji ya kuzie. Ebe e nwekwara ndị nke nwere mmasị na ya bụ asụsụ ọdịnaala mana mmachibido a machibidoro ha mere na ha anaghị asụ ya. Ndị nke ahụ na-akakwa aghọta ihe ọmụmụ e ji asụsụ ọdịnaala kụzie karịa nke e ji Bekee kụzie. Nchọpụta gosiri na ụlọakwụkwọ ndị dị n’ime obodo ka aghọta ihe e ji asụsụ ọdịnaala akụzi karịa ndị nke e ji asụsụ Bekee akụzi. Ụlọakwụkwọ nke ndị nkịtị nwe kacha eti iwu nwata akwụkwọ ọbụla anwakwala anwa sụọrọ ha asụsụ ọbụla abụghị asụsụ Bekee maọbụ French. Nke a bụ iji chakpodo ụlọakwụkwọ ndị ọzọ anya na ha bụ ọkaibe na-agbanyeghị na ọ bụghị ndị niile na-agụ akwụkwọ ebe ahụ na-emeta nke ọma n’ule, ọ kacha ule a pụrụ apụ wee lee. Ndị nchọcha ihe ọmụmụ a gbakwara mbọ kọwaara ụmụ akwụkwọ ndị ahụ na e mere elu e mere ala na ha agaghị ahapụ ndị Igbo ha bụ ghọọ ndị ọcha, etu ọbụla ọ masịrị ha si kwalite asụsụ nke ndị ọzọ na ha na-atụfu nke ha na-eme onwe ha mkpọkọrọ.

Uru Dị N’iji Asụsụ Ọdịnala Akụziri Ndị Sekọndịrị Nta Ihe Ọmụmụ

  • Ọ ga-akwalite asụsụ na omenala obodo.
  • Ọ na-eme ka nwata akwụkwọ nwere onwe ya ịjụ onye nkụzi ajụjụ na klas
  • Ọ na-eme ka nwa akwụkwụkwọ mụta nka dị iche iche ọ ga-eji bie ndụ ya n’ọdịniihu ọ kacha ebe o metụtarabụ ọrụ aka.
  • Ọ na-enye nwata akwụkwọ nwere onwe iche echiche nke aka ya, chepụta nke uche onye nkụzi maọbụ ndị ọkaibe erughị na ya .
  • Ọ na-eme ka nwata akwụkwọ mara na ụwa akwụghị otu ebe na ọ na-agbanwe agbanwe, dgz.

A gaghị agụta uru niile dị n’iji asụsụ ọdịnaala akụzi ihe na sekọndịrị nta ọnụ n’ihi na nke mbụ bụ na e jighị ya akụzi ihe bụ nke mbụ na mbụ na-akpata nleda anya asụsụ ọdịnaala dị na ndụ ndị agba ọhụụ taa, n’ihi na ha niile hụtara ya na o nweghị uru asụsụ ahụ bara ebe ọ bụ na mmadụ nwere ike ịbụ ihe ọ chọrọ ịbụ na-enweghị ihe jikọtara ya na asụsụ ọdịnaala n’ụdị ọbụla. Ohiri-Aniche (2004) Asụsụ ọdịnaala bụ mgbọrọgwụ puputara onye ọbụla n’agbụrụ nke ya maka na onye ọbụla nwere ebe o si pụta nke ahụ bụkwa mgbọrọgwụ ya. Mmadụ ọbụla maọbụ nwata akwụkwọ ọbụla nwere ntọala nke na-apụta ihe site n’ụdị asụsụ ọ na-asụ na omenala ya. A ga-akụziri ụmụ akwụkwọ na a gaghị ajụ nne maọbụ nna n’ihi na ọ kaala nka, maka na e wezụga ha nwata ahụ agaghị apụta ụwa, wee bịa gụọ ihe ọbụla ọ masịkwara ka ọ bụrụ ihe ọ gụrụ. Ịgbakụta asụsụ ọdịnaala azụ mgbe a na-amụ akwụkwọ gosiri na a chọrọ ka e kpochapụ ya n’ihi na o nweghị uru ọ bara. Nke a na-ebutekwa ọnwụ ike asụsụ ọdịnaala.

 

Nsogbu Ndị Nkụzi Ga-Ezute N’iji Asụsụ Ọdịnala Akụzi Ihe Niile

O nweghị akwụkwọ ọgụgụ ihe ọmụmụ niile e ji asụsụ Igbo dee ma e wezụga ihe ọmụ asụsụ Igbo n’onwe ya.

O nwere okwu ndị na-ahịa ahụ isupe nke ọma n’asụsụ ọdịnaala, tinyekwara na e nweghị ọtọgrafị

siri ike ehibere maka asụsụ ọdịnaala.

Kọrịkụlụm agụmakwụkwọ e webataghị iji naanị asụsụ ọdịnaala ndị wee na-akụzi ihe ọmụmụ niile.

Asụsụ ọdịnaala dị n’ụdị n’ụdị, iji maa atụ; asụsụ Igbo nwere ụdị ya dị iche iche a kpọrọ olumba maọbụ olubendị nke a pụtara na ọ bụghị ụdi Igbo ndị nke a na-asụ ka ibe ha na-asụ. ndị ọbụla nwere ụdị nke ha bụkwa naanị ndị be ha na-aghọta maọbụ onye mụtarala ya.

Nganga na mpako anaghị ekwe ndị nkụzi ha sụwara ụmụ akwụkwọ ha asụsụ Igbo n’ihi na ha na-eche na ha sụwa Igbo na ọ pụtara na ha amaghị akwụkwọ, maọbụ na ha abụghị ndị nkụzi a zụrụ nke ọma. N’ihi ya, ọ bụladị ụfọdụ ndị nkụzi asụsụ Igbo n’ogo agụmakwụkwọ niile bụ asụsụ Bekee ka ha na-eji akụzi asụsụ Igbo iji gosi na ha erighị ụgwọ akwụkwọ ha. Nke a na-eme na ụmụ akwụkwọ n’onwe ha ruo ogo ịhọrọ ihe ọmụmụ ndị ha ga-eme maka ule WAYEKỊ na sekọdịrị ukwu ha agbaara asụsụ Igbo ezigbo ọsọ.

Ọtụtụ nne na nna achọghị ka a kpọọ nwa ha aha, kpọọ asụsụ Igbo, ha achọghị ka o nwee ihe jikọtara nwa ha na asụsụ Igbo n’ụdị ọbụla.

Nchịkọta na Mmechi

Onye kpọọ nkata ya nkịrịnka ndị iro ya ewere ya kpofuo ahịhịa! Nke a gosiri na ka o sila dị, anyị niile ga-ejikọta aka ọnụ ịhụ na asụsụ ndị nna anyị nyefere anyị n’aka tupu ha anwụọ, efularịghị anyị maka na o nweghị onye na-ekweta na ofe nne ya tere atọghị ụtọ. N’ihi nke a, onye ọbụla ga-atụnye oke ya ịhụ na asụsụ ọdịnaala anyị efughị maọbụ nwụnyụọ anya, ọ kacha ugbu a ọ na-ekuzi ume ọnwụ. Ndị nne na nne niile teta n’ụra ma marakwa na nwata sụrụ asụsụ mmiri ara nne ya apụtaghị na ụbụrụ isi ya agaghị anabata kọmputa maọbụ agaghị egbochi ya ịgụ akwụkwọ maka ịbụ dibịa oyibo. Anyị niile, ma ụmụakwụkwọ ma ndị nkụzi dị na ya tinye aka ka anyị zọta nke anyị. Ekele dịrị Chineke na asụsụ Igbo abaala na BBC, ma na-agbanyeghị nke a, anyị ka na-atụkwa anya na ndị nkụzi Igbo nọ na Mahadum dị iche iche ọ kacha ndị Ọkammụta na Ọkankụzi ga-agbakọta aka ọnụ ihụ na a tụgharịrị akwụkwọ ọgụgụ na ngalaba ihe ọmụmụ dị iche iche n’asụsụ Igbo maka na otu Ọkankụzi n’asụsụ Awụsa atụgharịala akụkwọ ọgụgụ Kemistrị na Fiziks n’asụsụ ọdịnaala ha. Ndị nke ha niile nụrụ ya wee na-eto ya ma na-akụrụ ya ka nturu ugo. Ihe dị etu a kwesịrị ka ndị nkụzi Igbo n’ogo dị elu bụrụ ndị a mara aka n’ihu n’ihi na ọ bụ ihe dị mma ka a na-amụta, gbakwunyere na a bịa n’asụsụ ndị Awụsa, ma ndị nkụzi ma ndị nkịtị n’ụdị iji kwalite asụsụ ọdịnaala ha na-agbanyeghị ma ị bụ Ọkankụzi ma ị gaghị akwụkwọ, ọ bụ asụsụ ha ka Okeke na Okefọ na-asụ ọ masịkwa ya bụrụ onye dibịa oyibo. Agwa ọma dị etu a kwesịrị ka anyị niile gbasoo ụdị nzọ ụkwụ ahụ, ghara ịbụ ndị akwụ so ibe agba mmanụ, anyị mụọ Awụsa, anyị asụkarị ha, mụọ Yoruba sụkarịa ha mana a bịa na nke anyị anyị ewere Bekee dochie ya ma were iwu machibido ụmụ anyị ha asụkwala ya n’ụlọ ma n’ụlọakwụkwọ, mana nne na nna nke anyị ha sụọrọ ya anyị mana o gbochighị anyị ịbụ ihe Eke kere ụwa sị na anyị ga-abụ. Biko asụsụ ọdịnaala onye bụ onye ahụ, ọ bụ ya ka e ji kpọọ gị onye Igbo maka na asụsụ Igbo bụ asụsụ gị. Ndị Igbo niile ebe ọbụla ị nọ sụwa Igbo ma egbochila ụmụ gị ịsụ asụsụ gị maka ọ ga-eme ka nwa gị kpọ gị asị n’ọdịniihu maka na asụsụ Igbo a bụ naanị asụsụ ọdịnaala nke anyị.

 

Edensibịa

Anagbogu, P. N., Mba B. M., & Eme, C. A. (2001). Introduction to         Linguistics. Awka: J.F.C. Ltd.

Bamgbose, A. (20016) Language Provisions of Nigeria’s National           Policy on Education: Declaration Without     Implementation. A Journal of The National Institute for              Nigerian Languages, Aba. (NILAS). 3 (1).

Iwe, N. na Chidi-Onwuta G. (2017) The role of the Media in Igbo Language Education and Revitalization. Revitalisation of African Laguages. A festcrift in Honour of Ozo Mekuri Ndimelu. Published by the Linguistic Association of Nigeria (LAN)

Makinde, S. O. (2006) Dynamics of Language: The Yoruba Example. A paper presented at the 20th Conference of the Linguistics Association of Nigeria, NERDC, Sheda, Abuja. Nov. 13-17

Mgbodile, T. O. (1999). Fundamentals of Language Education. Nsukka: Mike Social Press.

Nwadike, I. U. Naịjirịa: Asụsụ, Omenala na Mmepe Obodo. Jọnal Mmụta Igbo (Journal of Igbo studies) 4 (1), 2009. ISA. Pascal Communications Enterprises. Nsukka: Enugu.

Ofomata, C. E. ( 2002). A Survey of the Igbo Nation.  Africana First Publishers Limited  Ibadan.

Ohaike, N. (2016) Nlegharị Anya Nke Iji Asụsụ Epum Maọbụ Nke         Ogbe Akụzi Ihe N’Ụlọakwụkwọ ọtaakara Na Nke      Praịmarị: Ịtọgbu Asụsụ Na Omenala Igbo A Journal of The       National Institute for Nigerian Languages, Aba. (NILAS). 3     (1).

Ohakama, N. na Amaechi, M. I. (2015) Wrong Home Foundational Background: The Bane of Igbo Language. A Journal of The National Institute for Nigerian Languages, Aba. (NILAS)  2( 3):

Ohiri-Aniche (2004). Nkụzi Igbo Dị Ka Asụsụ Epum (Igbo L1) N’ụlọ akwụkwọ ndị sekọndịrị. Port-Harcourt: Emhari Publications.   

Ӧrẹ, Y. (2016) The Role Of The National Institute For Nigerian Languages In The Language Provisions Of National Policy On Education. A Journal of The National Institute for Nigerian Languages, Aba. (NILAS). 3 (1).

Leave a Reply