ÉKWÉ JỌNAL NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA Volume 4 No 2, September, 2017

Posted by on Sep 1, 2017 in publications | 0 comments

ÉKWÉ JỌNAL

NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA

Volume 4 No 2, September, 2017

 

Ndị nhazi:

Onukwube Alex Alfred Anedo na Ngozi Thecla Udemmadu

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

ÉKWÉ JỌNAL

 

kwa Ideta Akwụkwọ

Ékwe Jọnal nke ndị IGBO SCHOLARS FORUM, Nigeria na-akpọku ndị odee nwere ederede e nyochere ma dezie nke ọma n’ihe gbasara Igbo na ndị ya, ka ha wete ha ka e bipụtara ha n’Ekwe Jọnal.. Anyị na-anabata ederede na atụmaatụ ọbụla metutere ọdịmma ndị mmadụ, asụsụ, ekpemekpe, agụmakwụkwọ, mgbaragwụ na mkpakwụkwọ, Akụkọntọala, Akụnaụba, Mmekọrịta mmadụ na ibe ya, Omenala, Nkanaụzụ, Mmekọrịta azụmahịa, ọchịchị, Gburugburu, dgz. Zite akwụkwọ gị dịka akpaozi ntado nke ikuku site n’akara ozi ikuku a: igboscholarsforum@yahoo.com maọbụ i bipụta ya n’akwụkwọ ụzọ abụọ ma zigara ya otu onye n’ime ndị nhazi Jọnal a.ụdị nrụakaebe ihe ndị e legere anya n’ide ederede anyị ga-anabata bụ MLA agba nke asaa. Jọnal a bu n’obi ịdị na-ewepụta akaọrụ ya kwa.

 

Onukwube Alex. A. Anedo & Ngozi Thecla Udemmadu

Ndị nhazi

IGBO SCHOLARS FORUM NIGERIA

Department of African & Asian Studies, Nnamdi Azikiwe University Awka, Anambra State – Nigeria                                                                                                                                                     Phone: +2348037859249, +2347038296805

e-mail:igboscholarsforum@yahoo.com;

web: http://wwwigboscholarsforum.com.ng

Vol.4. No.2. September, 2017. ISSN: 2476-8448

Printed by: Besing Books Multipurpose Publications

No. 9 Wisdom Avenue Suleja, Niger State. 08060850177

ISSN: 2476-8448

 

                           FROM EDITORIAL DESK

Ekwe Jọnal bụ otu n’akaọrụ ndị   Igbo Scholars Forum nke malitere site n’obi ịnụ ọkụ iji chịkọlata ụmụaka Igbo gụrụ akwụkwọ ka ha wee nwee ike ịmalite chewe echichi dịka ndị Igbo site n’idepụta akwụkwọ, na-ezukọ ma na-enwe ọgbakọ. N’eziokwu, ọ bụ Dr. Onukwube Alexander Alfred Anedo and Dr. Mrs. Ngozi Thecla Udemmadu (Nee Obiora) malitere Igbo Scholars Forum was founded nke bidoro mgbe ha wepụtere akwụkwọ ha dere maka nna ọkpụtọrọ ọkpụ nke otu a bụ Prof. Obed Muojekwu Anizoba (Ọzọnwa),ka ọnwa Disemba nke afọ 2013 dị mkpụrụ ụbọchị iri na ise. Iji kwanyere ya ugwu. N’afọ ọma ya, Prof O. M. Anizoba kwere ha ọnya ikuku, http://www.igboscholarsforum.com.ng ebe ha ga-esi na-agwa ụwa ndị ndị Igbo bụ, ihe gbasara ndụ ha na ihe ha kwenyere na ya.. Jọnal ndị ọzọ nke ndị otu a chọrọ isi na ha na-eche Igbo n’ihu ndị ụwa bụ Ideal Journal na Igbscholars Journal.

 

Onukwube A. A. Anedo, Ph.D. na Ngozi T. O. Udemmadu, Ph.D.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Ndị ndụmọdụ:

Prof. Obed Muojekwu Anizoba

Department of African & Asian Studies, Faculty of Arts, Nnamdi Azikiwe University, Awka – Nigeria

Prof. Samuel Uzochukwu

Department of Igbo & Linguistics, Faculty of Arts, Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam, Nigeria.

Prof Betrand Okolo

Department of Languages & linguistics, University of Benin, Edo State.

 

 

 

(c) Igboscholarsforum 2017

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

NDỊNAYA na ndị ODEE      

                                   

1.Ọnọdụ Agụmagụ na Usoro Nzimoozi Ya Maka Asụsụ na Mmepe Obodo              

Ikeokwu, Enyinnaya Samuel  

Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages, University of Nigeria,

Nsukka+234(0)8066736976;enyinnaya.ikeokwu@unn.edu.ng

 

2.Mmemụbara n’Igbo

Evelyn E. Mbah, Ogbonna N Anyanwu*,

Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages                                         University of Nigeria, Nsukka

George O. Iloene na Angela Asadu

*Department of Linguistics and Nigerian Languages, University of Uyo.

3.Inyocha Abụ Ekere Udummiri na Ọkọchị: Etu Ha Si Metuta mmụta

Stella Ogechukwu Agwuna

Ngalaba Asụsụ Igbo na asụsụ Naịjirịa ndị ọzọ Nwafor Orizu koleeji Keedukeshọn, Nsugbe

  1. Mmekọrịta Jenda, Nzọkọta na Ikikere Ọchịchị: Mpụtara Ndịna Nkọkịrịkọ Igbo nke Nne Mgbaafọ na Nne Inyang Ọlụgụ Ikeokwu, Enyinnaya Samuel                          Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ, Mahadum Naịjirịa, Nsụka enyinnaya.ikeokwu@unn.edu.ng;  08066736976;                                                          Ezebube, Chinedu                                                                                                                 Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,                                                     Mahadum Naịjirịa, Nsụka. chinedu.ezebube@unn.edu.ng; 070305565592/08171253789

5.Ntinye ụdangwe dika usoro ndozi hiatus                                                                               Evelyn Mbah, George Iloene Na Nkechi Ukaegbu                                                 Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages University of Nigeria Nsukka

  1. 6. Nsogbu Ụmụakwụkwọ Na-enwe N’ide Edemede Leta N’Igbo N’ule Sinịọ Sekọndịrị Onwuka, Gloria T. (Ph.D)                                                                                                   Ngalaba Mmụta Nka, Mahadum Naịjirịa, Nsuka. onwuka@unn.edu.ng
  2. 7. Agụmagụ ọnụ ọdịnaala dịka akọrọngwa iduuazị: ileba anya n’agụmagụ ndị a họọrọ Ifeka, O. R. PhD Department of Igbo Language, Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam Campus
  3. Iji Asụsụ, Agụmagụ na Omenaala Kwalite Udo na Adịmnotu n’Ọgbọ Globalaịzeshọn dịka E Zipụtara n’Iduuazị Igbo Abụọ Nsolibe, Obiageli Theresa (PhD) Ngalaba Lịngwistiks na Igbo, Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu Kampus Igbariam +234(0)8035795591
  4. Nnwemagba Asụsụ Nye Echiche na Nsitihụ Asụsụ Igbo Patrick Umezi Department of Igbo, African and Asian Studies, Nnamdi Azikiwe University, Awka. ikennaumezi@yahoo.com
  5. Nzipụta Ndịna N’Abụ A Họọrọ Dị N’uche Bụ Afa

Ifeka, O. R. (PhD)

Department of Igbo Language, Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam Campus

 

  1. ÀKPỌ́ḾÓNWĒÁSỊ̀NÀ ḾGBÁKỤ̀TÁÁZỤ́: Ọ́RỊ́ÁJÍ ÁSỤ̀SỤ̀ NÀ ÒMÉNÀLÁ ÌGBÒ

George E. Ọnwụdiwe, PhD

Ngalaba Amụmamụ Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azịkiwe, Ọka

 

  1. Ntụcha Okwu Njirimee dka O si Metuta Okwu Nne Gwara Nwa Ya na-aga be Di Ọhụụ

Ibeh, Florence Uju

Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia, Fakọlti nke Aatị Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

  1. Mbịakọta Asụsụ Hausa na Igbo na Nsụ na mpaghara Abuja, Naịjirịa

Crescentia Ugwuona                                                                                                                                     Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naijiria Ndị Ọzọ (07036832566) crescentia.ugwuona@unn.edu.ng

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Ọnọdụ Agụmagụ na Usoro Nzimoozi Ya Maka Asụsụ na Mmepe Obodo

Ikeokwu, Enyinnaya Samuel

Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages

University of Nigeria, Nsukka

234(0)8066736976; enyinnaya.ikeokwu@unn.edu.ng

      

                  

Ụmịedemede

Edemede a gbara mbọ ịkọwa ọrụ asụsụ na agụmagụ nzimozi na-arụ n’ebe o metụtara mmepe obodo. Agụmagụ nzimozi bụ atụtụ nkọwa sayensị asụsụ njiarụọrụ nke na-eleba anya n’ọnọdụ obibindụ ndị nke e nwetara site na gburugburu ebe agụmagụ si pụta. Nke a pụtara na asụsụ na-arụ ụzọ ọrụ abụọ – ịbụ ihe e ji ezipụta agụmagụ nakwa ihe e ji enyocha agụmagụ. N’ime nke a, edemede a ga-agbakwasị ụkwụ n’agụmagụ na omenaala iji kwalite mmepe obodo dịka isi sekpụ ntị n’edemede a. Na nchịkọta, a chọpụtara na tupu a hụta agụmagụ dịka ihe bara uru ma nwee ike iweta mmepe obodo, agụmagụ ga-anọ n’agbata iji gosipụta ọnọdụ obibindụ nke ga-apụta ihe ma e gee, gụọ ma ghọta ya. Site n’ime nke a, agụmagụ ọha maọbụ obodo ga-abụ ụzọ e si ewulite ụdịdị omenaala ndị.

Okwu ndị dị mkpa: Asụsụ, Agụmagụ Nzimozi, Mmepe Obodo, Usoro na Ọnọdụ Agụmagụ

 

Mkpọlite

Isiokwu a wepụtara echiche abụọ; ha bụ: agụmagụ nzimozi (nke sitere n’iji asụsụ rụọ ọrụ nka) na mmepe obodo (nke sitere na agbambọ ndị mmadụ na gburugburu ebe obibi ha nke nwere ike imetụta n’ụzọ dị mma maọbụ nke ọjọọ, etu ha si ebi ndụ). Iji mee ka ihe a na-akọwa doo anya, a ga-edobe ha n’usoro kwesịrị ekwesị.

Mkpatara agụmagụ nzimozi

Na mbụ, ‘asụsụ’ bụ okwu nke nwere ọtụtụ nkọwa sitere n’aka ndị amụmamụ sayensị asụsụ na ndị na-abụghị (Nwaozuzu, 2013:2). Carol (1953) n’ime Nwaozuzu (2013: 2), kọwara asụsụ ka usoro ụda a haziri ahazi, nke mmadụ ji akparịta ụka, bụ nke na-echekwa ọnọdụ na ihe ndị gbara ya gburugburu. Ihe anyị na-eche ebe a bụ ma ọnọdụ ụbara asụsụ, omenala na mba dị na Naịjirịa ga-enye aka iweta udo na eziokwu nke ga-eme ka e nwee mmepe obodo. N’agbanyeghị nke a, ọ dị ka e nwere olileanya n’ekwumekwu a – ‘A na-enwe ịdịnotu na ndịmiche’; ndịmiche a ghaziri nke ọma na-ebute ịdịnotu na mmepe. Nke a pụtara na ndịmiche omenaala, asụsụ na mba nwere ikike iweta ịdịnotu na mmepe. Ịma atụ n’akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, steeti ọ bụla na gọọmentị etiti enweela ikikere nnọchite nhatanha na Kansụl Gọọmentị Etiti (Federal Eụecutive Council) na Nzukọ Omebe Iwu Obodo (National Assembly); usoro kwota, agụmakwụkwọ zuru ọha nakwa iwu gọọmentị etiti. Ihe ndị a nwere usoro ha si eji asụsụ akọwa onwe ha n’ebe o metụtara ọrụ ha na-arụ na iji ha mebe iwu ndị metụtara ha. Ụdị nzipụta a gụnyere: usoro kwota oke nrite ndị steeti n’ọnwa n’ọnwa, steeti ndị nwere ezi ogo agụmakwụkwọ (Educationally advantaged states) na ndị na-enweghị, mmegbu, nkewa obodo na ndị ọzọ.

Pushpinders na Jindal (2010) bawanyere ya bụ nsogbu nkọwa mgbe ha rụtụrụ aka n’echiche nkịtị na nsina asụsụ. Nke mbụ na-arụtụ aka n’ihe ihe pụtara, dịka nkọwa ya si dị n’akwụkwọ ọkọwaokwu, bụ nke e nwere ike ịghọta ngwangwa. Na nzimozi, a na-eji nkọwa enye okwu nghọta site n’echiche nke nsina karịa echiche nkịtị, ebe nke ikpeazụ metụtara nghọta okwu nke sitere n’atụmatụ okwu. Ihe okwu pụtara dabeere na mmetụta maọbụ ihe e ji tụnyere ya. Echiche nsina na-esikarị n’ọnọdụ maọbụ etu e si were okwu rụọ ọrụ; nke a metụtakwara etu e si zipụta echiche n’ekwughịekwu (ụdaolu, olu, ọnọdụ ihu okwuu dgw.) nakwa otu onye a na-agwa okwu si ghọta ya site n’ekwumekwu, ederede maọbụ akara dgw. Ọ bụ maka ebe a na-ejighị asụsụ enwe nzimozi ka ndị mmadụ na-ekwu maka ‘asụsụ njiahụmara’. N’otu aka ahụ, a bịa na nzimozi ekwurekwu, e nwere nke e kwughị ekwu, nke gụnyere ekwumekwu nkịtị (okwu e kwuru n’ọnụ) maọbụ njirime (ihe okwuu bu n’uche) ekwumekwu iji kwalite mmetụta ọnụụ (mmetụta ekwumekwu n’ebe ọnụụ nọ).

Ebe ọ bụ na, a naghị amụ ma ọ bụ asụ asụsụ na nkịtị, njiarụ ọrụ ya nwere njedebere metụtara ndịnụbụrụ na obibindụ nke nwere ike ịpụta ihe na nkwugharị ọnụ, ụbụrụ anọkọghị ọnụ, ọnọdụ gburugburu mmadụ dgw. Ọ bụ n’ogogo a ka asụsụ bụ isi sekpụ ntị na nzimozi. Nzimozi bụ ụzọ e si ezi mmadụ ozi site n’ịtụgharị echiche, ozi, na mmetụta site n’ekwumekwu, ederede, akara maọbụ akparamagwa. Onye maara ihe ekwe na-akụ na nzimozi ga-ezipụtanwu ndịiche dị n’echiche nkịtị na nke nsina.

N’anya nke mmadụ, asụsụ malitere n’okike ụwa ma na-ewetakwa ihe mgbagwoju anya mgbe ọ bụla a sị ka a kọwaa ya. O nwere ike ịbụ asụsụ nsụrụnọnụ ma ọ bụ nke mmegharịahụ, ekwurekwu maọbụ ekwughịekwu, ekwurunọnụ maọbụ ederede maọbụ akara, emereme maọbụ enwe emereme, mmepụtanegwu ma ọ bụ ọgbụgbaegwu, ahụamara ma ọ bụ ahụghịamara, keagụmagụ maọbụ abụagụmagụ, kempụtaihe maọbụ keapụtaihe dgz. Ndị a bụcha ụzọ asụsụ si apụta ihe. Asụsụ ọbụla na-enweghị ike izipụta njirimara ndị a ka a na-asị na ọ nwụrụ anwụ. Ndetu mbụ e deturu nsiripuru asụsụ n’akwụkwọ nsọ bụ mgbe Chineke sịrị, “Ka ihe dị, ihe wee dị” (Jenesis 1:3) na “Bịanụ ka anyị kee mmadụ n’oyiyi nke anyị” (Jenesis 1:26). Nke abụọ ka e deturu ma kpọọ ya ‘Tower nke Babel’ (Jenesis 11: 1-9) ebe nke atọ bụ ịsụ n’asụsụ dị iche iche n’ụbọchi Pentikọstụ (Ọlụ Ndị Ozi 2: 1-6); nke a mere e ji si n’inwe otu asụsụ nwee ụbara asụsụ. Akụkọ etu asụsụ siri malite n’Akwụkwọ Nsọ pụtara ihe ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ itinye asụsụ n’ọrụ nke rụpụtara ezigbo ihe maọbụ ajọ ihe, nke mekwara ka ụwa na-aga n’ihu maọbụ na-adaghachi azụ site n’otu oge ruo n’ọzọ. Nke abụọ bụ itinye asụsụ n’ọrụ nke na-ezipụta ikikere ‘ọchịchị isi’ na ‘mwedanala,’ nke na-egosi ikikere Chineke nwere n’ebe ihe o kere eke dị.

Ọ bụ ụdị ikike asụsụ nwere ma a bịa n’izipụta ihe mere Ferdinand de Saussure (1916), ye hiwere Sayensị asụsụ ọlọrọọhụrụ nakwa nna Sayensị asụsụ ndokọ ji kọwaa ya dịka ‘La langue et parole,’ ya bụ, ọmụmanuju na ntinyenọrụ. Ụlọakwụkwọ Geneva nke Saussure so n’ime ya tulegharịrị amụmamụ mmekọrịta dị n’etiti asụsụ na ihe ọ na-akọwapụta wee kpọ ya akanka (agụmagụ nzimozi) site n’ilebanye anya na ndacha asụmasụ (parole) nwere n’asụsụ (langue) Ọmụmanuju gunyere okwuu ịmatacha ihe niile asụsụ ọ na-asụ nwere na ihe ndị mejupụtara ya ebe ntinyenọrụ bụ itinye echiche ndị ahụ dị n’asụsụ okwuu nwere n’ọrụ na iji mkpụrụokwu, iwu asụsụ nabatara na fonọlọjị a kụnyere n’ime mmadụ oge a na-azụlite ya n’obodo, nke ọ na-asụkarị ma na-aghọtakwa. Omụmanuju pụtara okwu ndị ahụ gara n’ezi usoro nke ndị okwuu na-emepụta mgbe ha na-asụ asụsụ ha; ọzọ, nke a sokwa mejupụta ọnọdụ ntinyenọrụ (Agbedo, 2000:19). Nke a na-adịwaga iche n’ebe ndị mmadụ nọ, nke ihe na-akpatakarị ya bụ ka ndị si eche echiche na ka ha si ebi ndụ n’ebe o metụtara abụm nwoke maọbụ nwaanyị, afọ, ọnọdụ akụnụba dgw.

Ọ bụ ntinyenọrụ na ọmụmanuju nke mmadụ nwere na-enyere ya aka ịtụgharị asụsụ e ji akparịtaụka kwa ụbọchị (asụsụ mmụta) ka ọ bụrụ ọrụ nka (asụsụ nka). Iji asụsụ arụ ọrụ nka gbadoro ụkwụ n’etu onye ahụ siri ghọta ya (ya bụ, ndaba) na ogogo onye ahụ ghọtadebere asụsụ ahụ; ya bụ, ma ọ bụrụ na odee ewepụta ụzọ ọzọ ọ ga-esi jiri asụsụ rụọ ọrụ na-agbasoghị usoro asụsụ ahụ nabatara (ya bụ, ndacha) (Leech, 1969:24); ya bụ, iwebata enweghịenwe dị n’asụsụ.Ọ bụ iji asụsụ nka arụ ọrụ na-eme ka odee were asụsụ otu ọ masịrị ya kpụpụta echiche ọ chọrọ. Ndaba (nke gụnyere pụrụụdaasụsụ, mkpụrụokwu na ndanusoro) na ndacha (nke gunyere mkpụrụokwu, ahịrịokwu na mkpụrụụdaasụsụ) dị ka ọrụ nka na-enyere onye nka ekwurekwu aka ịkpụpụta ma kpụnwo; ịrụpụta ma rụnwota isiokwu ga-ezipụta echiche ochie ka bụrụ echiche ọhụrụ nakwa asụsụ ga-adị ndị ngere ụtọ na ntị. Ịma atụ, lee anya n’ahịrịokwu ndị a:

  1. Sapo na ncha dị n’aka Ada.
  2. N’aka Ada, sapo na ncha dị.

N’ahịrịokwu nke mbụ (1), ọ bụ ihe doro anya na Ada, dịka mmadụ nkịtị, kpachaara anya were ihe ndị ahụ dobe n’aka ya mana a bịa n’ahịrịokwu nke abụọ (2), ọ pụtara na ihe ndị ahụ dị n’aka Ada bụ site n’ikike o nwere, na-abụghịzi mmadụ nkịtị. Ahịrịokwu (2) bụ ụzọ e si eji akanka akọwapụta echiche ebe ahịrịokwu nke mbụ (1) bụ asụsụ kwa ụbọchị, nke e ji usoro mmebe ahịrịokwu a kpọrọ ndogharị mkpụrụokwu. Nke a bụ iji mee ka a ghọta n’eziokwu na asụsụ e ji ede agụmagụ nka dịwagara iche na nke nkịtị. Nhọokwu ya na-adị ngọrịngọ ma kwuuru onwe ya site n’ịhọrọ okwu kwesịrị ekwesị maka iji ya rụọ ọrụ n’agụmagụ, ebe etu e si amata ụdị agụmagụ bụ site na nhọokwu na ọdịdị agụmagụ.

Ọ bụrụ na anyị lee anya n’akụkọala lingwistiks (sayensị asụsụ) maọbụ staịlistiks (sayensị akanka, nke ọ na-amasịkarị m ịkpọ sayensị agụmagụ n’ihi na ihe sayensị asụsụ na-amụ maka ya bụ asụsụ, ebe ihe akanka na-amụ maka ya bụ agụmagụ), anyị ga-ahụ ka ha si bụrụ nnu na mmanụ. Dịka akụkọ siri kọọ, mgbanwe ọbụla a na-enwe n’amụmamụ sayensị asụsụ na-emetụtakarị akanka. A na-eji sayensị asụsụ dịka atụtụ njiarụọrụ, atụtụ ndịnaọnọdụ, atụtụ mwunantọ, atụtụ ndokọ, atụtụ mgbasa, atụtụ nnyochanuju, atụtụ amụmamụ omebendị dgw, bụgasị ngwa e ji enyocha agụmagụ nzimozi. ụzọ ndị mbụ amụmamụ sayensị asụsụ Greek si were akụkọ dike Homeric rụọ ọrụ (ndị asụsụ nsinachi (naturalists) na ndị asụsụ nsinaomenala (conventionalists) maọbụ (analogists) na (anomalists) dịka ngwaọrụ e ji eme amụmamụ sayensị asụsụ na-enye aka akwalite agụmagụ nzimozi ma mee ka ọ dị ike karịa sayensị asụsụ.

 

Gịnị bụ mmepe obodo?

N’akụkụ nke a kwa, a kọwara ọkpụrụkpụ okwu abụọ ‘obodo’ na ‘mmepe’ iji mee ka nkọwa gbasara mmepe obodo bụrụ nke a ghọtara nke ọma. N’ịkọwa ihe obodo bụ, Renan (1990:19) n’edemede ya nke ọ kpọrọ “Gịnị bụ obodo?” mere ka nke a doo anya nke ọma site n’iji mmadụ nye nkọwa ya n’ụzọ dị etu a:

Obodo, dịka mmadụ bụ nchịkọta nke ịgba mbọ niile a gbara n’oge gara aga, aja a chụrụ nakwa ntinye niile. A bịa n’otu nzuzo niile, ọ bụ otu ndịichie kacha bụrụ ọdịniwu, n’ihi na ndịiche mere anyị ihe anyị bụ. Ndị dị ike mere ihe ike nke dị ezigbo ebube n’oge gara aga; nke a bụ isi ihe niile gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ebe mmadụ na-ebido echiche nke ọbụla maka obodo.

 

 

N’echiche ya, Uzochukwu (2004) rụtụrụ aka n’ihe Bikoi kọwara obodo ka ọ bụrụ ihe

… nwere ike ịdị ma guzosie ike naanị ma ọ bụrụ na a ghọta ọpụrụiche ya ma nwee ike ịchọpụta ha, gbazie ma mekwaa ka ha guzosie ike na-enweghị ihe nhịahụ ọbụla n’ime ihe njikọta nke nkwado ya nke na-eji nwayọ abịa n’efu; ihe njikọta nke onye ọbụla na-ahụta onwe ya n’ime otu ihe ma bụrụkwa otu ihe; nke a dịwagara iche n’ịchọ oyiyi kama ime ka ngalaba nke ọbụla n’ime ya ka o sie ike.

 

Otu ọ dị, obodo abụghị naanị obosara ala na ihe ndị a na-ahụ anya n’ime ya ma ọ bụ osisi na ụmụanụmanụ kama ọ gunyekwara mmadụ, ya bụ mmadụ ọbụla nọ na gburugburu ahụ a na-ekwu maka ya. Nkọwa ndị a dị n’elu ga-edubazi anyị n’atụtụ nkọwa maka mmepe obodo.

 

Kedu mgbe a ga-asi na obodo mepere emepe?

Ọ bụ nkwenye zuru ụwa ọnụ na mmepe bụ ihe gbasara akụnụba, mana o jedebeghị na nke a. A hụtara mmepe obodo n’ụzọ gbasara agbasa dịka o metụtara ‘mkpa kacha dị elu, ụbịam, mkpagbu na enweghị ọrụ’ (Olopoenia, 1993:23). Nkom (1997) kọwara n’agbanyeghị otu ọbụla e siri kọwaa mmepe obodo, na ọ gụnyerịrị:

Mbọ a na-agba iji wulie obodo n’ụzọ ka mma, obodo e ji nnukwu agamnihu nke ihe nnweta were mara nakwa nke nwere ohere maka ezi ndụ nye ọtụtụ ndị nọ na ya; obodo ebe e nwere mbawanye a na-ahụ anya n’otu ndị mmadụ si aghọta, achịkwa nakwa agbanwe gburugburu ha maka adịmnamma ha nakwa nke mmadụ niile gbaa gburugburu; obodo nke na-emepe ọtụtụ ohere ọhụrụ maka mbuli elu nke onwe maka mmejupụta omenaala, obodo ebe a na-akwado ekemekeuche, nrụpụta nakwa nsonye mmadụ dum.

 

Na nkọwa ndị e nyere n’elu banyere mmepe, ekemekeuche, nrụpụta nakwa nsonye na-enye aka eweta uto nke obodo; ya mere anyị na-ekwu maka mkpokọta ihe e mepụtara ọhụrụ nke ala anyị (Gross Domestic Product). Ọ bụ n’ihi nke a ka Ade-Ajayi (2000: 17) gbakwasị ụkwụ n’echemeche ndị Kansụl Akụnaụba na Mmekọrịta nke Otu Mba Ụwa (Economic and Social Council of the United Nations n’afọ 1962, sị: Mmepe bụ uto a gbakwụnyere na mgbanwe na-adị si na mgbe ruo na mgbe. Mgbanwe, n’aka nke ya metụtara mmekọrịta na omenala nakwa akụnụba ma mma nakwa n’uju … ihe nlegara anya ga-abụrịrị ịkwalite ndụ ndị mmadụ.

Uzochukwu (2004) kọwara na ụdịrị mmepe a, a kọwara n’elu bụ dịka o metụtara ihe a na-ahụ anya ma wepu omume nke agwa ụmụ mmadụ. Iji mejupụta nke omume agwa, Egudu (2002) gbakwụnyere nke metụtara:

Iji hụ na akụkụ mmepe a dịka o metụtara mmadụ bụ nke a na-ahụta ma na-akwanyere ugwu. O kwesịrị na a ga-emepụta akụkụ mmepe ọzọ, bụ akụkụ omume nke ga-achịkwa ma duzie akụkụ ihe a na-ahụ anya. ọ bụ ogo mmepe dị elu nke na-akwagide mmekọrịta n’etiti akụnụba nke obodo nakwa ahụike nke obodo ahụ.

Ya mere, mkpa agụmagụ dị bụ ime ka mmetụta dị n’etiti ya na ụmụamaala sie ike ma bụrụkwa ihe mgbochi nye ha pụọ n’ajọ ọmụme niile ga-eweta ihe ọgbatauhie nye ha na ndị ọzọ. Site n’ime nke a, a ga-ekepụta ebe dị mma nke ga-eweta mmepe obodo. Adịghị eme nke a n’ike, kama site na nkwagide, na nkụzi n’obi ụtọ bụ nke a na-enweta n’uru nakwa mma agụmagụ (Uzochukwu, 2004:3).

Ọ bụ n’ihi nke a ka oge ọchịchị ndị agha nke ndị isi ala Buhari na Abacha ji wepụta ihe a kpọrọ ‘Agha Megide Adịghị n’Iwu’ na ‘Agha Megide Adịghị n’Iwu na Mpụ.’ Ọ bụkwa ụdị mmepe a nyere ndị nnyocha mmekọrịta na ọchịchị ikikere ịkọwa onyeisiala n’oge gara aga bụ Goodluck Jonathan dịka onyeisiala, a kacha katọọ na Naịjirịa. O nwere ọtụtụ ihe na-echere ya aka mgba, site na mpụ, ọnụ ahịa mmanụ nke na-akwụghị otu ebe, enweghị ọkụ rukwaa na mmekpa ahụ nke ndị Boko Haram, nke kacha njọ bụ ntọrị ụmụakwụkwọ ụmụ akwụkwọ karịrị narị abụọ na iri asatọ na asatọ ndị Chibok n’ugwu Awụsa.

Ọ bụkwa n’ihi mmepe nke ezi omume nye ụmụ amaala ka e jiri kọwaa Goodluck Jonathan dịka onye udo na-abụkwaghị onye ihe gbasara ikike ọchịchị na-egbu ka mmanya n’ihi na ọ sịrị:

Ọchịchọ m ezughị ihe ọbụla ịtụnyere ọbara nwa amaala Naịjirịa ọ bụla. Mmadụ ọ bụla aghọla aghụghọ maka m. ọ bụrụ na m daa na nhọpụta nke ọchịchị, m laghachi obodo m. Ala Naịjirịa abụghị ama nna m. Adị m njikere ije ozi, kama ọ dịghị echu m ụra.

Ọ bụghị naanị n’ọnụ okwu na n’echiche ka o gosipụtara ịhụnanya ya nye obodo ya, kama sitekwa n’omume; mgbe ndị na-ahụ maka nhọpụta onye ọchịchị bidoro wepụtawa ihe e metara na nhọpụta nke onyeisiala n’afọ 2015, Jonathan hụtara na a na-emeri ya emeri ma tupu a kpọọ nke ikpeazụ, ọ matara na ọ gaghị emeri, o jisiri ike kpọọ onye ya na ya na-adọkọrịta ndọrọndọrọ bụ Muhammadu Buhari ma kelee ya. Otu omume a abụghị naanị na-apụghịhefu ya echefu n’ọtụtụ obodo ụwa gbaa gburugburu kama, ọ zakwara n’ụzọ dị mma, ọtụtụ ajụjụ a na-ajụ maka ‘ọchịchị onye kwuo uche ya’ na Naịjirịa; ebe ụfọdụ ndị na-ajụ sị ‘Naịjirịa, ọ pụrụ imenwu ya?’ Taa, n’agbanyeghị mperi Goodluck Jonathan, ọ bụzi onye a ma ama, na-etokwa n’ụwa niile ma bụrụkwa onye udo dịka o duuru obodo iri ise na asaatọ n’ụwa niile ka ha hụ maka nhọpụta onye ọchịchị nke afọ 2015 na mba Tanzania n’ọnwa Ọktoba. ọtụtụ akwụkwọ mgbasa ozi na ndị ụfọdụ a tụpụtala arọ ka e nye ya onyinye ‘Mo Ibrahim na Nobel Peace Prizes’. Kwakpovwe (2015:41) kwadoro echemeche a oge ọ sịrị:

E meriri Jonathan kama o meriri. Nke a bụ ihe udo na-eme. Ọ na-atụgharị mmadụ ọ dị ka onye na-adịghị ike kama onye ahụ bụkwa onye siri ezigbo ike n’otu aka ahụ. Mee mmadụ ọ dị ka onye e meriri, kama onye ahụ bụ onye mmeri n’ikpeazụ. Mee ihere ọ bụrụ ugwu. Ọ na-atụgharị ihe ụkọ ọ bụrụ akụnaụba.

Mahatma Gandhi, onye India nyere nkọwa mmegide udo oge ọ rụtụrụ aka na “mmee mmegwara ga-adọghachi ụwa azụ.” Ya mere, ọ bụrụ na Jonathan kwụgidere, ndị Naịjirịa ga-anọ na nnukwu nkwafu ọbara. Nke a pụtara na e nwere ike ịsị na obodo emepeela ma ọ bụrụ na ndị bi na ya ezipụta udo, obi umeala ma karịsịa, ịhụnanya obodo karịa onwe n’ebe ndị ọzọ nọ.

Mgbasara agụmagụ nzimozi

Kedu ka asụsụ na mmebere agụmagụ ga-esi jikọta aka iji weta mmepe obodo? Agụmagụ nzimozi gbasaara iji asụsụ n’ụzọ nkọwa wee zipụta mmepe omenaala na obodo dịka o metụtara ntọala oge na ebe. Ọ bụkwa ụzọ e si ezipụta omenaala na mmetụta ya n’ebe omenaala ọzọ dị iji hunyere ma kwado ihe ya bụ omenaala nabatara na ihe ndị ọ na-asọ nsọ. Nke a ga-ewube mmekọrịta dị mma, ga-adọta mmasị ndị ụnọ na ndị mba ọzọ. N’ịma atụ, ndị “Zee World Channel” nke ụlọ ọrụ ihe onyonyo esila n’ejije ha, gosipụtara mba ụwa, ezinaụlọ ụbara ndị India, ịhụnanya, ihe nlekwa ahụike na tekịnụzụ na-etozughị etozu. Ọ bụrụkwa na e lee anya n’emereme na agaramije dị n’ejije ndị China na Japan, ha na-ezipụta agaramije ngwangwa nke na-apụta ihe na tekịnụzụ ọgbatumtum Suzuki, Toyota, Jincheng, ọuinklin dgw. A bịazie n’ụlọ, Aba na anya bụ aha ọchọmma e ji mara akwa ndị Igbo mere ma bụrụkwa nke mere Aba, obodo diketere Akwete (ndị e ji ikwe akwa a kpọrọ Akwete, bụ akwa aka mere mara) ka ọ bụrụ ebe mmebere maka akwa kemgbe 1970. O nwere ka tekịnụzụ a na ọdịda ya n’oge ugbu a ji nwee nkwekọrịta na nkwenye ndị Igbo na ndụ bụ ihe na-agabiga agabiga; n’ihi nke a, ọ naghị adịgide. Nke a pụtara na ndụ dabeere n’ihe anyị mepụtara na ya n’oge na n’ebe; ya mere ekwumekwu dịka: ụwa bụ otu mbịa, ụwa bụ onye mere ike ya, ọ laa dgz.

Agụmagụ dị ka nrọgharị obibi ndụ mmadụ site n’akọmakọ na-eji ekereuche maọbụ asụsụ nka ezipụta agwa mgbaranaanwụ (homo fictus) bụ nke na-ahagide agwa nzokpuru (Homo sapiens). Agwa mgbaranaanwụ bụ agwa ndị ahụ agbara ndụ nzuzo ha n’anwụ site n’agụmagụ nka ebe agwa nzokpuru bụ ndị agbabeghị ndụ nzuzo ha n’anwụ. Agbamnanwụ a na-akụzi ihe ma na-akwalitekwa echiche n’ihi na mmepe obodo metụtara mgbanwe ziri ezi na ndụ ndị mmadụ; nke a bụ oke na ọrụ agụmagụ. N’ịkọwa agụmagụ nzimozi na mmepe obodo, anyị chọpụtara ọtụtụ ihe ndị zipụtara asụsụ nka. Na mbụ, Ahịrịokwu (ii) ncha-sapo na ihe gbasara Ada wepụtara ọnọdụ majiik ma ọ bụ ọgbaragharịị na ndụ n’elu ụwa; nke na-akpọlite echiche maka adịgideghị nke ndụ na mkpa ọ dị mmadụ ibi ndụ kwesịrị ịṅomi n’ebe ọ dị ndụ. N’ikpeazụ, ezi ndụ, nke e nwetara n’aka ndị nduzi, ndị nlereanya maọbụ ndị nlekọta, na-ewube mmụọ akpamike n’ebe ọgbọ ndị nọ n’ihu nọ, nke ga-eme ka ha soro nzọ-ụkwụ ndị dike nna ha. Ọ bụ ezi omume a nke na-ewulite obodo mere ndị mba Britain ji egosi ndị agha ha ihe nkiri gbasara “King Henry VI” tupu ha a gaa agha. Ejije ntọaja a bụ iji gbaa ha ume ka ha were obere ngwa agha ha nwere ma merie ndị iro ha dị ka King Henry mere.

Ngalaba agụmagụ niile, ọdịnịgha, ejije maọbụ abụ site n’ikike otuto na nkọtọ agwa ndị pụtara ihe na ya na-akụziri ndị ọgụụ ihe. Lebanye anya n’agwa ndị a: Okonkwo n’akwụkwọ Achebe (1958) Things fall apart maọbụ Ramatoulaye n’akwụkwọ Ba (1980) So long a letter; Chike na Ada n’Isi akwụ dara n’ala nke Ubesie (1973), Ugochi na Eze Onyekwere na Nke m ji ka maọbụ Eruru nke Nwaozuzu (2005 na 2009), Ngọzị na Obiọra n’nọdụ ugo… nke Obidiebube (2006) maọbụ Ọnwụdịnjọ (Aha na ihe ndị a kpọtụrụ aha n’abụ a bụ agwa mebere ha. A na-ezipụta akparamagwa n’ọtụtụ akwụkwọ abụ) n’abụ “Ụwa Ndọlị Ndọlị” dị n’Uche bụ ahịa nke Ikeokwu na Onyejekwe (2009). Ọ pụtara na e nweghị ihe mmụta si n’akpọmihuọma maọbụ nke ọjọọ, ọṅụ na arịrị ndị agwa pụtara ihe n’agụmagụ ndị ahụ maọbụ otu e si were asụsụ rụọ ọrụ n’ụzọ pụrụ iche dịka o si metụta ha?

Agwa ndị nọ n’agụmagụ bụ ihe ekere sitere n’aka onye odee. Ihe onye kere ha gwara ha kwuo, ka ha ga-ekwu; ebe o zigara ha, ka ha ga-aga; ihe a gwara ha mee, ka ha ga-eme dgw. N’ọnọdụ, agwa a rọrọ arọ ndị a ga-abụzi ụrọ n’aka onye ọkpụ ite ma nọrọ n’isi asụsụ nka, nke nwere ike ịdị n’ụdị asụsụ maọbụ mmegharịahụ. N’ihi nke a, ịkọwa ha dị mkpa iji nwee ezi ikpe ntọhapụ maọbụ ọmụma nye akparamagwa ha. Iji kwado ekewaghị ekewa nnyocha agụmagụ mba Afrịka, Nwadike (2015) depụtara nsiripuru mwulite agwa. ọ rụtụrụ aka na Aristotle bụ nna ma bụrụkwa onye hiwere nnyocha agụmagụ nke gbadoro ụkwụ na nkenụụdị, nhazi, akparamagwa na nka. Nwadike rụtụrụ aka na nkewa agwa nke Forster (1927:73-81) – agwa rarịị na agwa ndagharị. Agwa rarịị bụ agwa e ji otu akparamagwa mara nke ihe niile gbasara ya na-erugharị n’otu isiokwu ebe nke ndagharị bụ ihe nwere ọtụtụ ihu, nwee ike iweta ihe ịtụnanya ma dagharịa n’ụzọ dị iche iche.

Mmalite agụmagụ Afrịka, ọ kachasịuuazị na 1950 nyere iji usoro Europe nyochaa agụmagụ ikike. Ha katọrọ ma megide nhazi, akparamagwa nakwa mmebere agụmagụ ndị ọzọ nke mere ka e nwee akpọmoku maka iwepụta usoro nnyocha agụmagụ ọzọ. Mana ndị mba Afrịka chọrọ nkewa a enweghị usoro ha tụpụtara n’agbanyeghị mkpesa ha (Nwadike, 2015:1). N’arụmarụ ya na 1995, Nwadike wubere ụdịdị agwa atọ nke a kpọrọ “Agwa n’Agụmagụ: ‘Usoro Nwadike,’ na-agbagha echemeche na omume mmadụ anaghị apụta ihe naanị n’ụzọ abụọ, e nwere nke atọ. Ya bụ – agwa ike – ndị nọ n’uju akụkọ ma bụrụkwa ndị e nyere akparamagwa dị ọkpụrụkpụ. Nke abụọ bụ agwa nro – ndị e nyere obere akparamagwa ma bụrụkwa ndị pụtara ihe n’ụfọdụ emereme na emume nakwa agwa ndaramba maọbụ umengwu – bụ ndị e nyeghị akparamagwa ọbụla, ma bụrụkwa ndị ọnọdụ ha anaghị adịgide ngwa ngwa a kpọtụrụ ha aha n’akụkọ.

Ka Nwadike mechara ntunye aro a, Ikeokwu (2008), n’arụmarụ ya wepụtara usoro ọzọ nke a kpọrọ ‘Usoro Ikeokwu’ ebe o kewara agwa dịka mbunuche emereme ha si dị. ọ gbaghara na ilenye anya naanị n’ọnọdụ emereme nke Forster maọbụ n’oge akparamagwa agwa nke Nwadike enweghị ike ịkọwa emereme agwa nọ n’akụkọ n’uju. Nke a mere e ji nwee nkewa agwa nchọ ọhanaeze, agwa nchọ onwe na agwa nnọnetiti. Agwa nchọ ọhanaeze bụ agwa ndị mbunuche emereme ha na-egosipụta enwemmasị n’ọdịmma ọha. Ọ bụ dịrị agwa a mere Brutus, bụ otu n’ime agwa nọ na Julius Caesar ji soro ndị otu mmegide Caesar. Ọ sịrị, “… Ọ bụrụ maka ọdịmma (nke Rome) … ya bụ ka chi kwagide m dịka m hụrụ aha ugwu na nsọpụrụ n’anya karịa ka m si atụ egwu ọnwụ (17); “…a maara m na ọ dịghị ihe kpatara m ilelị gị mana nke ọha (nke Rome)”…; O bụghị na m ahụghị Caesar n’anya mana a hụrụ m Rome n’anya karịa …” (137). Ọ bụkwa ụdị ngosipụta a nyere mkpali agwa Ugochi na Eruru na Nke M Ji Ka na Eruru; nakwa Ngọzi n’Ọnọdụ Ugo. N’aka nke ọzọ, agwa nchọ onwe bụ ndị mbunuche emereme ha gbadoro ụkwụ n’ọchịchọ nke onwe (mụ tupu ndị ọzọ, ịhụnanya onwe karịa ịhụ ndị ọzọ n’anya maọbụ ọdịmma onwe karịa ịhụ mba n’anya) dịka e si hụta ya n’agwa Cassius na Julius Caesar. Cassius kwuru, “Ka Anthony na Caesar dakọọ ọnụ … (67), Brutus … ị maghị ihe ị na-eme. E kwekwala na Anthony ga-ekwu okwu n’akwamozu Caesar. Ị maara otu ndị mmadụ ga-esi gbasoo ihe o kwuru? Amaghị ihe ga-adapụta (eme); ọ dịghị m mma” (129); “Ire a akaghị ekwujọ ta a ma ọ bụrụ na okwu Cassius chịịrị” (221) ma ọ bụ Obiọra n’Ọnọdụ Ugo… N’otu aka ahụ, agwa nnọnetiti bụ ndị emereme ha nọ n’agbata agwa nchọ ọhanaeze na nke nchọ onwe. Ha na-agba mbọ imejupụta nkewa dị n’etiti ụdị agwa abụọ ndị a. Ya mere, Nwadike (1995) na nwaakwụkwọ ya, Ikeokwu (2008) kwenyere n’ihe mba Afrịka chọrọ ma wepụta usoro a nabatara iji nyochaa omume agwa ebe ọ bụ na ha kwenyere n’agụmagụ nke zuru ọha na nke kpọmkwem.

Anyị arụtụla aka na ọ bụ ndị odee ka ọ dịịrị inye agwa nọ n’akụkọ ha, ụdịrị asụsụ na mmegharịahụ ha chọrọ ka agwa ndị ahụ zipụta nke metụtara ebumnuche akparamagwa ha. N’agbanyeghị na a rọgharịrị omume agwa, ha na-ezipụta usoro obibi ndụ nke a na-ahụta kwa ụbọchị n’obodo nke na-akpalite agụmagụ. N’ịma atụ, na Nke M Ji Ka na Ọnọdụ Ugo, Nwaozuzu na Obidiebube ga-achọ ka anyị mee pachoo (bulie elu) agwa nwaanyị n’ihi na nwaanyị bụ ihe (na e kwesịghị ileda agwa nwaanyị anya n’agbanyeghị ihe ọbụla) site na agbambọ Eruru na Ngọzị, n’ibute mmepe n’ụwa akọmakọ ha. Eruru gara Eke Ụkpana Ndị Mmụọ; ọ bụghị naanị na o ji azụ mpete lọta, kama o jikwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ mara mma nke o nyegasịrị ndị mmadụ. Ngọzị rụrụ ụlọ ma lụọrọ nwanne nwoke, Obiọra nwaanyị, mepeere nwanne ya nwaanyị ebe ọ na-ere ọgwụ ma gbapuoro ndị obodo ha mmiri. Gịnị ọzọ, o jigidere adịmnsọ ya n’ogo dị elu n’agbanyeghị alụghị di ya ma jee kute nwa nwaanyị n’ekpe (child adoption) nke gosiri na ‘nwaanyị ga-aga n’ihu n’ịbara onwe ya na ọha obodo uru.’ Eruru n’otu aka ahụ, dobere onwe ya nsọ tutu ọ lụọ di n’agbanyeghị mmegbu na mmekpaahụ ọ na-anata n’aka nwunye nna ya. Ejije ndị a rụtụrụ aka, na-egosipụta ihe ọ pụtara ịbụ ihe mkpụzi agwa nye ụmụaka ụmụnwaanyị, ndị ọ ga-amasị iṅomi agwa nchọ ọhanaeze nke Eruru na Ngọzị megide ndị ga-achọ ime ka agwa nchọ onwe dịka agwa Obiọma na Ụdụakụ na Nwata Rie Awọ (1980) na Eriri Mara Ngwugwue Onyekaonwu bụ ndị a kọwapụtara ka ndị na-agba nhọ dị ma hụ ego n’anya. Ọchịchọ onwe ha mebiri ha ma weta mbibi nye ezinaụlọ na obodo ha. Site n’ịja omume, a na-ebuli obodo maọbụ site na nkatọọ e gbochie ya nsogbu na-echere agamnihu obodo aka mgba n’ihu; ọ bụ etu a ka e ji eme ka obodo dị mma.

N’ikwu maka agụmagụ na mmepe obodo, ndị Igbo kwuru na, a na-eji ụka akụgbu ụka. ụdị ekwumekwu a bụ nke ji okwu ụtọ dị mma jaa okwu maọbụ edemede mma, nke nwere ike ịtụcha ihe metụtara obodo dịka omume mbụrụ na agụmagụ (Okebalama, 2007:187). Omume mbụrụ dịka o si pụta ihe n’edemede a bụ nkọwa agwa ọma na nke ọjọọ dị ka o si metụta mmepe obodo ebe agụmagụ metụtara asụsụ ọchọmma nke ndị odee ji agba nhụrụụwa obodo ha n’anwụ nye ọhanaeze n’akwụkwọ ha. Ọ bụkwa agụmagụ a maka mmepe obodo ka ndị ọka n’ekwumekwu ji ejigide ọha ma ọ bụrụ na e nwee mgbanwe omume.

Ọzọ, ejije n’oge ugbu a aghọọla ejije maka mmepe obodo site n’iji ngwa mgbasa ozi dị iche iche, ọ kachasị redio, bụ nke kachasị erute ndị nọ n’ime obodo aka. Mpaghara ejije a na-eji isiokwu metụtara mmasị obodo na mba ụwa ma gbanwekwaa asụsụ kwa ụbọchị ya ka ọ bụrụ asụsụ nka maka ntụzi aka maọbụ nkụzi nke ọha obodo. Ndị bụ isi a hụrụ kwaba okpu n’ụdị ọgbakọ a maọbụ nkụzi a, bụ ndị ntorobịa, bụ ndị a na-akụziri ụzọ ziri ezi e si eme ezi omume dịka o si metụta mmepe obodo. Ihe dịka ndabere onwe site n’ọgbakọ ịmụ nka dịka nke ndị Ụlọọrụ Maka Achọmọọrụ (National Directorate for Employment (NDE) maọbụ nke ndị Otu Mbaụwa Maka Ego Enyemaaka Mmụta Ụmụaka (United Nations International Children Education Fund (UNICEF) maọbụ ndị Enyemaaka Ahụike Maka Mgbochi Ofufe Ọrịa (Preventive Health Care Against Communicable Diseases) maọbụ Ọrịa Nsitere na Mmekọrịta Nwoke na Nwaanyị (Seụually Transmitted Diseases (STDs). N’ụdị ejije a, a na-eji ọmụmụ zuru ọha ọnụ site n’iji ejije redio nke na-eji nka ụda na ọnụnụ ezi ozi n’ụzọ pụrụ iche. Ọmụmaatụ juputara n’akwụkwọ ndị UNICEF (2010), a kpọrọ Tieta Maka Mmepe Obodo (TIMMO), ejije dị n’agba n’agba.

Agụmagụ site n’usoro ọmụmụ mkparịtaụka mmadụ na ọdịbendị na-elebanye anya n’usoro omenaala metụtara ekwumekwu na emereme nsinokwu nke ndị. E nwekwara ike ịtụgharị nke a si n’otu asụsụ omenaala gaa n’ọzọ site n’iji ntụgharị echiche nke ga-enye aka kwalite mmepe obodo. N’ịma atụ, e nwere ekwumekwu Igbo – Onye bi ụlọ ụka nso na-aga leeti, nke e nwere ike inwogharị ma tụgharị ka ọ bụrụ – Onye bi mụskụ nso na-aga leeti. Etoo nwaanyị akịdị, ọ gwọta ọzọ nke si n’olundị Ụmụahịa/Ọhụhụ ka e nwere ike ịtụgharị n’olundị Nsụka site n’iji ntụgharị echiche ọkpa (Etoo nwaanyị akịdị/ọkpa, ọ gwọta/site ọzọ).

 

Nchịkọta

N’edemede a, a chọpụtara na nkọwa asụsụ na-ewebata n’ọnọdụ agụmagụ nzimozi dịka o metụta nkeụụdị agụmagụ dị iche iche site n’ọtụtụ ụzọ mmepe obodo dịkwa iche iche. Ntụle ihe e kwuru maka agụmagụ ederede na tieta maka mmepe obodo kwadoro nchọpụta a. Ọzọ, isi sekpụ ntị n’okwu a bụ ọmụmaatụ na nkọwa ụzọ dị iche iche agụmagụ si akwalite mmepe obodo, bụ nke e lebara anya. Dịka a chọpụtara n’ebe a, agụmagụ ọbụla bụ maka mmepe obodo bụ agụmagụ ndịnọrụ, n’ihi ya, agụmagụ ọbụla na-atụpụtaghị aro maọbụ nye ụsa gbasara nsogbu dị n’obodo abụghị agụmagụ.

Ihe anyị mere ebe a bụ ịkụpụta nkwa n’ihi na ọtụtụ mgbe ka ndị mmadụ na-eche ma na-atụle ụzọ a ga-esi were agụmagụ rụọ ọrụ mmepe obodo. Agụmagụ dịka anyị maara esighị n’oghere nkịtị pụta, o sitere n’obodo, nke zụpụtara maọbụ mụpụtara ya. N’ihi nke a, ihe ọbụla nwere ike ịdọta maọbụ kpalite mmụọ odee maọbụ ọgụụ agụmagụ ga-abụzi agụmagụ maka ikikere mmegide na nkwụgide. Ka o sila dị, mgbanwe ihe ndị metụtara obodo na-emetụtakwa agụmagụ ya n’ihi ya ọ dị mkpa ịkpachapụ anya, maka na a ga-emerịrị ya n’usoro ndịnọrụ nke ga-eweta ọsịsa nye nsogbu a na-enwegasị n’obodo dịka e siri hụ n’akwụkwọ ndị arụtụrụ aka n’ọrụ a.

 

 

Edensibịa

Achebe, C. (1958). Things fall apart. London: Heinemann Educational Books.

Ade-Ajayi, J.F. (2000). Humanity in conteụt. Occasional Publications of the Nigerian Academy of Letters,1, Ibadan: Faculty of Arts, University of Ibadan.

Agbedo, C.U. (2000). General linguistics: An introductory reader. Nsukka: ACE Resources Konsult.

De Saussure, F. (1916). Course in general linguistics. Wade Baskin 1959 Transl. London: Peter Owen.

Egudu, R.N. (1972). Social values and thought in traditional literature: The case of the Igbo proverb and poetry, Nigerian Libraries, 8(2): 20-27.

Forster, E.M. (1927). Aspects of the novel. Harmond-Sworth: Penguin.

Ikeokwu, E.S. (2008). Gender identity: An analysis of selected contemporary Igbo plays. An Unpublished Doctoral Dissertation, University of Nigeria, Nsukka.

Ikeokwu, E.S. & Onyejekwe, M.C. (2009). Uche b ahịa. Enugu: Format.

Kwakpovwe, C.E. (2015). Our daily manner. (October – December edition) Lagos: Manner

Resource Centre.

Leech, G.N. (1969). A linguistic guide to English poetry. London: Longman.

Ba’, M (1980). So long a letter. Ibadan: Heinemann Educational Books.

New King James Version (NKJV) (1982). HolyThe Bible, London: Haper Collins

Publishers

Nkom, S.A. (1973). Reflections on culture and national development in Nigeria. In Y. Nasidi

& Ligoil (Eds.), Culture and Democracy, (pp 220- 229), Zaria: Ahmadu Bello

University Press.

Nwadike, I.U. (2015). Characters in literature: The Nwadike model, a contribution to world

literature. A Paper Presented at the 9TH Conference of Igbo Studies Association (ISA) on Igbo Oral Literature: Problems and Prospects at the University of Nigeria, Nsukka, September, 22-25.

Nwaozuzu, G.I. (2005). Nke m ji ka. Enugu: CIDJAP.

Nwaozuzu, G.I. (2009). Eruru. Enugu: Format.

Nwaozuzu, G.I. (2013). The babelist theory of meaning. An Inaugural Lecture of the

University of Nigeria, Nsukka, February, 28.

Obidiebube, J.I. (2006). nọdụ Ugo (Adịghị egbe mma). Onitsha: Lincel.

Okebalama, C.N. (2007). Rhetoric in Igbo hunting poetry. In B.N. Anasiudu, G.I. Nwaozuzu

& C.N. Okebalama (Eds.), Language and literature in a developing country, (pp 187-

200), Onitsha: Africana-First Publishers Ltd.

Olopoenia, R.A. (1993). On the meaning of economic development. In I. Osayinwese (Ed.)

Development economics and planning, (pp 20-28), Ibadan: Unibadan Publishing Consultants.

Onyekaonwu, G.O. (1980). Nwata rie awọ. Onitsha: University Publishing Co.

Onyekaonwu, G.O. (1985). Eriri mara ngwugwu. Ibadan: University Press Ltd.

Pushpinder, S. & D.V. Jindal (2010). An introduction to linguistics: language, grammar and

            semantics (2nd edition). New Delhi: Prentice Hall.

Renan, E. (1990). What is a nation? In H.K. Bhaba (Ed.) Nation and narration, (pp17-23),

London: Routhledge.

Shakespeare, W. (1956). Julius Caesar (New Swan Shakespeare) Bernard Lott, M.A. Transl.

London: Longman Group Ltd.

Ubesie, T.U. (1973). Isi akw dara n’ala. Ibadan: University Press Ltd.

UNICEF. (2010). Tieta maka mmepe obodo (TIMMO): Ejije dị n’agba n’agba. Enugu:

Unicef na Same.

Uzochukwu, S. (2004). Oral literature and national development: The Igbo eụample. An

Inaugural Lecture of the University of Lagos. Lagos: University of Lagos Press.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Mmemụbara n’Igbo

 

Evelyn E. Mbah, Ogbonna N Anyanwu*, George O. Iloene na Angela Asadu

Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages

University of Nigeria, Nsukka

na

*Department of Linguistics and Nigerian Languages, University of Uyo.

 

Ụmịedemede

Akwụkwọ a gosipụtara nkọwa na usoro mmemụbara n’asụsụ Igbo n’uju. O gosipụtara ebe mwube/mmebe ụbara abụọ n’Igbo ma jiri usoro àgwàrà mgbakwulite (pekoleshọn) wee kọwaa etu mkpọaha si enweta ntapị n’ụbara. Akwụkwọ a chọpụtara na Igbo so n’otu asụsụ ga na-enye ngụ (nọmba) akara n’ụzọ usoro okwu karịa ọdịdị mkpụrụ asụsụ. Ọ gara n’ihu gosipụta na ọnụọgụ enweghi mkpụrụokwu kpọmkwem ma ọ bụ mmebe ụtọasụsụ nke ọrụ ya kpam kpam bụ izipụta mkpoolu ma ọ bụ ụbara, kama e nwere mkpụrụokwu ga ndị echiche ha bụ ụbara mana ihe e ji ha arụ na mwube ụtọasụsụ na-eme ka segmenti gbasatara ha ma ọ bụ mwube ha niile bụrụ ụbara. Ọzọkwa, usoro mmebe ụbara bụ site na ntozu ma ọ bụ mmezigharị, ma mgbe ọ bụla e jiri ezigbo mkpọaha Igbo rụọ ọrụ n’enweghi mmezigharị bụ na-enweghi ọnụọgụ a tụrụ aka kpọmkwem, kama nabata naanị ntapịa ọnụọgụ site na pekoleshọn mgbe e jiri mkpụrụ okwu kwesịrị ekwesị rụọ ọrụ iji hazie ya.

 

Ọkpụrụkpụ okwu: Akara ọdịdị usoro ụbara, ebe nkeji nkwusa (DP), ebe nkeji ngwaa (VP), agwara mgbakwulite (pekoleshọn).

 

 

Mkpọlite

Akwụkwọ a tụlere etu asụsụ Igbo si ezipụta ólé/ókè ihe ha site n’iji usoro ole na ole a gbasoro wee kọwapụta karịa ịdịkọ n’otu n’ime asụsụ. Ihe bụzị nsogbu nchọcha a kpọmkwem bụ: olee etu a ga-esi tapịa mkpọaha Igbo n’ụdị nkarị ịdị n’ótù. Nchọcha a kpọmkwem ga- (i) achọpụta ogogo nkọwa ọnụọgụ n’Igbo (ii) ekpebi ụdị ụzọ dị iche iche dị n’okpuru nkọwa ọnụọgụ n’Igbo (iii) achọpụta ike ga amụmamụ echiche nwere na ngosipụta ụbara n’Igbo. O jiri ntụcha agwara mgbakwulite (pekoleshọn) nke Ajiboye (2010) wee jide mmekọrịta mgbanwekọrịta dị n’etiti mmebe mkpoolu na ụbara mkpọaha ma ọ bụ nkeji mkpọaha dịgasị n’Igbo wee rụọ ọrụ a. Etu o sila dị, n’agbanyeghị na Ajiboye (2010) kwuru na e nwere ike ibufe pekoleshọn site n’ọdụdụ ruo n’isi, anyị ga-eji ntụle uche nke Abney (1987) na nkeji nkwuso/nrụmaka (DP) wee gosipụta n’ọmụma atụ, na katigori nrụmọrụ (D) na-ezipụta nkeji mkpọaha ahụ dịka mmeju ya. Ya bụ na nghọta ụbara ahụ na-agafe/ esite n’isi ọrụ (D) ruo na mmeju (NP). Nke a ga-enye aka site n’asụsụ Igbo ruo na mkpakọrịta ụka lingwistiik ebe ọzọ n’etiti àgwàrà pekoleshọn na usoro akara agwàrà nke akara.

A haziri akwụkwọ a n’ụzọ mpaghara ise. Nkeji nke mbụ bụ mkpọlite nke rụtụrụ aka na ntọala nchọcha a. Nkeji nke abụọ nyere ntụlegharị ederede nke ọnụọgụ n’atụtụ nke lingwistiik ugbu a nakwa usoro mmemụbara n’ụfọdụ asụsụ mba ụwa. Nkeji nke atọ tụlere ọnọdụ/ebe mmemụbara n’Igbo, nkeji nke anọ haziri ntụcha àgwàrà pekoleshọn, ebe nkeji nke ise gosipụtara nchịkọta ihe a chọpụtara na mmechi.

 

Ntụlegharị ọnụọgụ n’ụtọasụsụ

Ọnụọgụ bụ otu n’ime katigori ụtọasụsụ nke dọtara mmasị ndị ọkaasụsụ agba ochie. Ndị mbụ chọpụtara ya bụ ndị Sofist ga. Crystal (1971) na Baker (1978) kwuru na njirimara ya dabeere na o so n’ime otu nkeji ụtọasụsụ ga nke na-ezipụta mkpa/uru na mwube/mmebe ụtọasụsụ. Ụbara ga na mmemụbara bụ ihe e ji arụtụ aka n’ọnụọgụ. Ya mere na Crystal (2007) chọpụtara na ọnụọgụ bụ “katigori ụtọasụsụ nke e ji atụcha nkebi mkpụrụ okwu na-egosipụta ụdị ndịiche dị ka mkpọolu (sg, SG, Sing), ụbara (pl, PL), (abụọ), atọ (obere) (few) dgz.

Ọnụọgụ bụ asụsụ ozuru mba. Asụsụ ọdịnala na-eweta ndịiche ọnụọgụ n’ụzọ dị iche iche. Nke a bụ maka na ndị mmadụ dị iche iche na-ahụta eziokwu n’ụzọ dị iche iche ma werekwa ihe a na-agụta ọnụ na nke a naghị agụta ọnụ n’echiche nke aka ha dị n’iche n’iche. Ebe ụfọdụ nwere ndịmiche abụọ, ndị ọzọ nwere atọ, ma ndị ọzọ nwere karịa. Etu o sila dị, Robins (1964: 247) nabatara na ụzọ ndịmiche ọnụọgụ abụọ bụ nke kacha dị ire/gbasaa. Nkeji asụsụ ebe a na-akọwapụta echiche ọnụọgụ dị iche n’asụsụ n’asụsụ.

A kọwaala ọnụọgụ n’asụsụ ndị Yuropu ga n’ụzọ doro anya n’ihi ogologo akụkọ agụmagụ ọdịnala. Na Latịn, iji maa atụ, a na-agbakwunye nọmba na ngwaa. N’asụsụ Bekee, e nwere ndịka/myiri ọnụọgụ na mkpọaha na ngwaa. Ebe nsonaazụ (-s) na-emebe ụbara mkpọaha, enweghi ya na ngwaa na-egosi na isiokwu ahụ bụ ụbara. E werela mkpọaha na-akwụghị chịm ka mkpịche n’iwu mmebe ụbara na Bekee, mana agwara nkwekọrịta ha enweghi mgbagha n’usoro okwu na Bekee. French na Inglishi yitere mana Frenchị na-egosi abụmoke/anyị n’ihe niile. A na-ahụta usoro ụbara si agakọ na mkpọaha na atịkụl ga (articles) ịma atụ (le/les, un/une/des).

Asụsụ Afrịka ekpugheela ihe nnyocha ga pụrụ iche iji chọpụta nke ọma ọrụ ọnụọgụ ma wepụta usoro nkọwa ọnụọgụ. Na Lele, asụsụ ndị ọwụwa anyanwụ Chadik, Simmons (1993) kwuru na ụbara ngwaa ga gosiri mmenwo ihe e mere. N’okwu ya, ụzọ kacha mfe n’imebe ngwaa ụbara ga n’asụsụ a bụ itinye nsonazụ -wi na ime mgbochiume mbụ nwere ụda enweghi ụda ma ọ bụ ibelata ụda ya, dị ka na

  1. Mkpọolu ụbara
Al al -wi ‘ịgụ ụdị egwu mmeri
Hindihindi wi (mkparị)
Keelkel wi (tụtụrụ otu n’otu)
Digritigri (gbuo)
Bòrpòr gbajie

E nwere ike ime mkpọaha ụbara na Lele site n’itinye nsọkwunye kíyé, n’ime usoro mgbanwe gasị dị na ngwaa adịnusoro nke dị n’ime ụdaume, ọ kachasị maka ọtụtụ mkpọaha na-egosi ihe dị ndụ dị ka:

2. Hidà ‘osisi’ Hida-kíyé ‘osisi (ga)’
kumno ‘chi’ Kumno-kíyé ‘chi (ga)’
kura ‘hare’ Kura-kíyé ‘nze (ga)’

 

Na Lele kwa, a na-enye ụfọdụ nkọwaaha akara ụbara. Etu o sila dị, e nweghị mkparịta ụka ọ bụla gbasara mkpa ọnụọgụ dị n’usoro okwu n’asụsụ a n’ụdị nkwekọrịta ọ bụla.

Ajiboye (2010) kọwara usoro mmemụbara na Yoruba. O chere na na ntụcha akara ụbara, na asụsụ gasị nwere ike igosipụta n’ihu ọha na eze akara mkpọaha ha maka ntụgharịkọta ụbara asụsụ n’ụzọ abụọ: site n’iji (1) usoro hakọta akara ụbara ọdịdị mkpụrụ ụda asụsụ rụọ ọrụ site n’iji (2) usoro akara pekoleshọn ụbara n’usoro okwu rụọ ọrụ. Ọ chọpụtara na Yoruba nwere akara ụbara usorookwu ma jiri mkpụrụ okwu ụbara nke nwere ike ịtapịa mkpọaha dị ka ụbara wee rụọ ọrụ kpọmkwem; ma ọ bụ hụtazie ya ka nkọwa aha nke agba ochie (n’ụdị ndenwo) ma ọ bụ nzipụta, iji weta ntapịa ụbara mkpọaha ha na-akọwa. O kwuru na ụbara mkpụrụokwu ga ndị Yoruba bụ mgbakwunye ga ndị e jikọtara ha n’isi ji (mkpọaha ma ọ bụ nkọwa/ngosipụta/nzipụta) karịa mkpụrụ okwu ụbara ndị e tinyere n’ọrụ. Ọ gara n’ihu kwuo na e nwere ike ịtapịa nkeji mkpọaha ndị Yoruba n’enweghị nsogbu dịka mkpọolu ma ọ bụ ụbara n’ọnọdụ okwu kpọm kwem ma mepụta ntụcha ọnọụgụ ozuru mba iji gosipụta ọmụma atụ ihe nke a. Ajiboye (2010) chọpụtara ụdịdị ụbara mkpụrụ okwu anọ na Yoruba bụ ndị gụnyere: ‘àwọn’ nnọchiaha ụbara nke onye nke atọ, nke na-enye mkpọaha gasị ntapị ụbara; ọnụọgụgụ ole dị ka pu@p$ ‘ọtụtụ’ na ọnụọgụgụ na-ezipụta abụọ ma ọ bụ karịa; wọn, nke na-enye nzipụta gasị akara dịka ụbara; na nkọwa gasị e denwogharịrị. O jiri ntụcha agwara pekoleshọn wee gosipụta na mkpụrụ okwu ụbara ga na-amanye ntapị ụbara na mkpọaha ga ha na ya na-eso. Ọmachonu (2003; 2008), na nchọcha ya n’usoro mmemụbara n’Ịgala chọpụtara na ụbara nganihu dị ụdị abụọ, ‘ab’ na ‘am’. A na-eji ‘ab’ maka mmadụ ebe ‘am’ bụ maka ihe ndị ọzọ ga dị ndụ. Ejele (1997) n’aka nke ọzọ, wepụtara ụzọ usoro anọ maka mmemụbara n’Esan. Usoro ndị a bụ ngakọta ụdaume (vowel alternation), ndenwogharị, nsonaazụ -nv na ụbara ngwaa ga.

Anagbọgụ (2005) chọpụtara iwu mmebe ụbara ise dị iche iche na Koring. Iwu ndị a gụnyere itinye ‘gbọdoro ma mkpọaha gachaa, nhazigharị/ngakọta fonim, mgbakwunye efu na iji nkọwa ụbara ‘iye’ wee rụọ ọrụ.

Na nchọcha ya n’asụsụ Jaba na Eggon, Nkamigbo (2009 & 2011) guzobere n’ezie na asụsụ abụọ ndị a ji ụda olu mere usoro mmemụbara. Nkamigbo (2015) mere nchọcha na mkpọolu ọdịdị mkpụrụ asụsụ n’Ayụ ma chọpụta na usoro mmemụbara n’asụsụ ahụ gụnyere ntinye mkpọnimi, mgbakwunyere ihe efu (zero), mgbakwunye nganihu ma ọ bụ mwepu, pemuteshọn ụdaolu na mgbanwe mkpụrụ ụda asụsụ.

Adejoh (2012) tụlere usoro mmemụbara n’Idọma ma chọpụta na isi sekpu ntị na mkpọolu mọfịm/mkpụrụ asụsụ n’asụsụ a bụ ‘a-’ mana nke a na-abụkarị nganihu. Ihe nke a pụtara bụ na mgbakwunye nsonazụ na nnọnetiti adịbeghị n’asụsụ ahụ. Etu o sila dị, data gosipụtara ihe a ga-akpọ nnọchi ụdaume n’ọnọdụ mbido mkpụrụ okwu kama ịkpọ ya nganihu. O sikwara agụgọ na ngwaa gasị n’asụsụ ahụ anaghị agbanwe ọdịdị ya ihe n’ọnụọgụ.

Ọtụtụ ndị ode akwụkwọ akọwaala mmemụbara n’Igbo (Okonkwọ, 1974; Emenanjọ, 1978; Igwe, 1989; Okeke, 1993; Ifeagwazi, 2010 na Eze, 2014). Imirikiti ndị odee jiri akwụkwọ nkụzi ụtọasụsụ nke asụsụ Igbo wee dee obere ihe n’isiokwu a. Eze (2014) dị ka ọ bụ naanị ya mere nkọwa n’uju na mmemụbara n’Igbo. Ọrụ a jiri atụtụ ọchịchị (gọvmenti) na nkekọ (GB) wee mee ntụcha mmemụbara n’Igbo, kọwaa usoro dị iche iche a gbasoro iji nweta ya. Etu o sila dị, ọrụ ahụ nwegasịkwara ọtụtụ ihe a na-achọghị ka ọ bata na ya na nkeji/nkewa usoro mmemụbara nke nwere ike igbochi inweta ihe a chọrọ site na data asụsụ. Otu ihe mkpọbi ụkwụ pụtara ihe n’ọrụ a bụ ime ka a gụpụta / kpọpụta mkpọaha Igbo ga- enwe nnọsoaha adabaghị adaba n’ọmụma atụ ma gụnye ha na mkpọolu na futunootu ma ka na-ekwusi ike na ụfọdụ mkpụrụ okwu gasị anaghị agbanwe n’ọnọdụ ụbara ha (Eze, 2014), dịka a ga-asị na e nwere ụfọdụ na-agbanwe. Odee akwụkwọ tinyekwara òtù mkpụrụ okwu ndị a (ololo, iko, dgz) dịka mkpụrụ okwu ụbara gasị mgbe e mepụtara nghọta ụbara ahụ site na nziole (quantifiers) ga, nke a kọwagoro na mbụ/ebe ọzọ (hụ ihu akwụkwọ 63).

Ihe ndị a na ndị ọzọ butere mkpa ọ dị ịmụ maka isiokwu a n’ọdịnihu iji nweta ụzọ dogasịrị anya n’ime data ma nwee mkpebi zuru ọnụ/oke maka akara ụtọ asụsụ a n’asụsụ Igbo.

 

Ụbara na mmemụbara n’Igbo

Mgbakwunye (mgbanwe) ọnụọgụ n’asụsụ Igbo na-ezipụta onwe ya n’ụdị nnọchionwe mmeju. E nwere ike inweta ndịiche n’etiti mkpọolu na ụbara nrụgara aka dị iche mgbe ha bụ nnọchiaha kenkwuniihu n’asụsụ ahụ. Ụdịdị nnọchiaha mmeju ka e gosipụtara na tebụl a na-esote:

 

Table 1: Nnọchi onwe Igbo

Onye Mkpọolu

Nọminetiive

 

Akụzetiiv

Ụbara
1. m mụ anyị
2. i/ị gị Unu
3. o/ọ Ya Ha

 

E nwere mkpọaha kenghọta mkpụrụ okwu abụọ n’Igbo nke na-ezipụta nkewa/akpamoke ọnụọgụ keụdị mmeju: nwa na ụmụ, onye na ndị. ọmụma atụ n’ọnọdụ njiarụ ọrụ ya bụ ndị a:

3. nwa m ụmụ m
onyeọma ndịọma

Asụsụ Igbo ka e si ekwu ji usoro ọnụọgụ abụọ bara oke uru na-arụ ọrụ kama ọ naghị akpa okega n’ọnụọgụ izizi/mbụ na mkpọaha ndị n’adịghị na nke atọ n’elu. O nweghi mgbakwunye na-akọwapụta ụbara nke njikọta ya n’aha ma ọ bụ na nkeji mkpọaha na-eme ya ụbara. Asụsụ Igbo so n’otu asụsụ ga nke na-akọwa akara usoro okwu ụbara etu ndị ahụ ji akara ụbara mọfọloji/mkpụrụasụsụ esighi akọwa. Dịka Ajiboye (2010:142) si kwuo, akara ụbara mmebe okwu bụ usoro a na-agbaso n’itinye akara n’ụbara site na mgbanwe mkpọaha…, ụbara nwere akara usorookwu n’aka nke ọzọ bụ mọfịm/mkpụrụasụsụ ma ọ bụ mkpụrụ okwu ndị enweghị ike inyefe n’akara ụbara ozigbo. Ka o sila dị, e nwere ike ịtapị mkpọaha Igbo ga dịka mkpọolu ma ọ bụ ụbara site n’ọnọdụ okwu e kwuru ha ji wee rụọ rụọ. Ya bụ na mgbe ọ bụla o jiri dị mkpa inwe nkewa ọnụọgụ n’etiti mkpọaha ga, ụtọasụsụ Igbo anọnwee ụbara mkpụrụ okwu. Maka mkpebi akara ọnụọgụ n’Igbo, Heine na Nurse (2008) kwuru na ụdị ọdịda anyanwụ Benue Kongo gosipụtagasịrị ngwa akara ụbara n’asụsụ Igbo. N’asụsụ a, mkpọaha abụọ ahụ pụtara ‘nwa’ na ‘mmadụ’ nwere ụdịdị nnọchi ụbara ga, mana mkpọaha ha n’abụghị nke ukwu nwere ‘mmadụ’ ma ọ bụ ‘nwa’ dịka usoro mbụ ha, e nwere ike ịkọwa usoro ụbara naanị site n’itinye ọnụọgụgụ ma ọ bụ nziole dị ka ọtụtụ, ụfọdụ, imirikiti dgz, mana na ha niile, ọ dịwaga iche n’Afrịka.

Ụzọ ọzọ a ga-esi kọwapụta usoro ụbara n’Igbo bụga etu ọ dị n’ime data dịka anyị ga-egosipụta ugbu a. A na-ahụta usoro mmemụbara n’Igbo gbaa gburu gburu n’ụzọ ebe abụọ nke mwube ụbara ha bụ ebe Nkeji Nrụmaka (NR,DP) na ebe Nkeji Ngwaa (NN, VP),

 

Ọnọdụ Nkeji Nrụmaka nke Usoro Mmemụbara n’Igbo

Dịka Dryer (1989) si kwu, mkpụrụ okwu ma ọ bụ mọfịm nke na-enye mkpọaha ma ọ bụ ya na nkọwapụta ụbara nanọkọ bụ mkpụrụokwu ụbara. Mwube ụbara nke mwube ụfọdụ ọnụọgụgụ na-ebido na mkpụrụ okwu na-arụ ọrụ dịka nrụaka n’usoro asụsụ. N’isonye na ntụgharị uche Abney (1987) na nrụaka bụ isi nkeji nrụaka ga (DP) nke na-ewe nkeji mkpọaha (NP) nakwa ụdị mmewere usorookwu ndị ọzọ dịka mmeju ndị nwere agwa ọnụọgụgụ, ntapị ụbara e nyere mkpọaha gasị site na nnọkọta ha na nrụaka nke usoro ụbara. A ga-eji nrụaka rụọ ọrụ na ntụcha a iji zipụta ihe mmebe ihe niile tinyere mkpọaha gasị ndị e jiri rụọ ọrụ iji hazigharịa mkpọaha gasị n’ụdị ole ma ọ bụ etu ọ dị. Ihe mmebe ihe ndị a, tinyere mkpọaha gasị mebere mwube ọnụọgụgụ ga nke isi ha bụ nrụaka ga, nke pụtara na nzipụta kachasị ga-abụ nkeji nrụaka (Abney, 1987). Mgbe isi nrụaka ndị ahụ nwere ọgụgụ ụbara, akara (ụbara) na-agafe na mmeju nkeji mkpọaha (NP) site na mgbakwụlite (pekoleshọn), ma a na-atapị mkpọaha a dịka ụbara. Nke a na-akwado iwu akara mgbakwụlite (pekoleshọn) nke Selkirk (1982) na ọ bụrụ na mmewere ‘α’ bụ isi mmewere B, α na B jikọtara ọnụ na otu mkpokọta akara yitere onwe ha (usoro okwu ma ọ bụ dayakiritik). O kwenyekwara n’ihe Ajiboye (2010) kwuru na asụsụ gasị nwere akara usorookwu ụbara na-agbaso usoro akara mgbakwụlite (pekoleshọn). E gosipụtara ebe nkeji nrụaka nke mwube ụbara n’Igbo na nghazigharị mwube ọnụọgụgụ ya na iji mkpụrụ okwu ga pụrụ iche rụọ ọrụ ka a kọwara na mgbada.

 

Ọrụ Dimnutiivuga nwa/ụmụ

Mkpụrụokwu ‘nwa’ na ụbara ya bụ ‘ụmụ’ ka e ji enye mkpọolu na ụbara akara mgbe o metụtara mkpọaha dị ndụ. Ha na-arụtụkarị aka na mkpọaha ihe dị ndụ n’ihi na ọ bụ naanị ihe dị ndụ na-amụta nwa/ụmụ. Ya bụ na itinye mkpụrụokwu ndị a ga n’ọrụ abụchaghị usoro ụtọasụsụ kama na ọ bụ ihe omume osinachi (natural). Ịmaatụ.

4. mkpọolu ụbara
(a) nwantàkịrị ụmụ ntàkịrị
(b) nwaa#gbọ#ghọ ụmụ agbọghọ
(c) nwao#ko#ro#bịa$ ụmụ òkorobịa
(d) Nwanné ụmụ nné

Na data a dị n’elu, nwa/ụmụ dị ebe ahụ ka e jiri tapịa mkpọaha ha na-ahazi. Mkpọaha ha niile na mkpụrụ okwu (legzim) ga jikọtara bụcha ihe nwere ndụ nke nwere ike ịmụba/ịmụta ụmụ ga. Ya bụ na njịkọta ọnụ a bụ ọnatara chi ma bụrụkwa ndị e nwetara site n’akara amụmamụ echiche e gosipụara na mgbada:

 

   nwa   + obere                                   ụmụ̀         + obere

           + ụmụ na ụmụ                              + ụmụ na ụmụ

             + mkpọolu                                   + ubara

           + nwere ndụ                                 + nwere ndụ

 

Ebe ọ bụ na mkpụrụokwu diminutiivu ndị a dị n’elu bụcha akara otu, ọ bụzị ukwu amụmamụ echiche dabara na-ahụ maka ntapị/nkọwa edochaghị anya nke ọmụma atụ na (b) dị n’ala:

b. nwa@o#ke@ ụmụ$ o#ke#
nwa@agụ# ụmụ a#gụ#
nwannụnụ ụmụ nnụnụ

Nkọwa ọzọ doro anya nke mebere amụmamụ echiche bụ ndị na ọ bụladị mgbe e nwere mgbatị amụmamụ echiche, a na-ejikọta mkpọolu yiri na mkpọaha gasị enweghị ndụ, otu e sila chọọ ka e mepụta ọdịdị ụbara ya ga-eweta ụzọ adịghị otu o kwesịrị dịka e si gosipụta n’ala:

5(i) Nwa/* ụmụ$ ego dịka na: nwa/*ụmụ ahụ$ o nyere m
(ii) Nwa/* ụmụ$ nkụ$ dịka na: nwa/* ụụụ# ahụ$
(iii) Nwa/ * ụmụ$ nri dịka na: nwa/* ụmụ$ nri m riri

 

Ọzọkwa, mgbatị amụmamụ echiche na-ekwe ka mkpọaha n’enweghị ndụ na ụbara yitere jikọta ọnụ iji nweta ụzọ a nabatara mgbe ebumnuche ya bụ ịkọwa ụdị ihe dị iche iche n’enweghị ndụ. N’ihe ndị a niile, iji mkpọolu yitere wee rụọ ọrụ agaghịzị ezu oke. Lee ọmụma atụ ndị a na-esota:

6(i) Ụmụ/* nwaefere a
(ii) Ụmụ/ *nwaakwà ọ zụtara màrà mma#
(iii) Ụmụ/ *nwanri ha mepụtara dị mma#

Ọ pụtazịrị na mmebe mkpọolu na ụbara nke mkpụrụokwu diminutiivu ga bụ naanị na mkpọaha nwere ndụ ka a na-atụnyere ya ma bụrụkwa nke pụtara nwa na ụmụ kpọmkwem, mana mgbe e jikọtara ha, na mkpọaha ndị n’enweghị ndụ ọnụ, ha na-egosizi obere (dimunitiivu) na ụdị ya ga kpọmkwem. Maka ihi na ọdịdị mkpọolu na ụbara ha ga anaghị emebe ndịiche n’ọnụọgụ na mkpọaha gasị n’enweghi ndụ, ọ baghị uru ikpebi mkpụrụokwu ga nke dimunitiivu na-akọwa ọnụọgụ naanị na njikọta mkpọaha ga nwere ndụ. Ndịiche ọnụọgụ mkpọaha ndị nwere ndụ na-apụta ihe site na mkpụrụokwu ndị a ga ma nwee ike iguzogide nke bụ na e wezụga ha, na a ga-atapị adịghị ike mmebe ọnụọgụ na mkpọaha ga dịka mkpọolu ma ọ bụ ụbara site n’ebe mmekọrịta ha/nkwukorịta okwu ha. Ihe ndị na-esote gosipụtara ha:

7 Efere ha# e$nweghi isi
Ọzụ$rụ$ akwà(gasị)
Nri ha dị mma#

 

3.1.2      r nn$chinkwa (Relative pronoun) ‘n$ke@ /ónyé’ na ‘ndị’

Nnọchinkọwa Igbo na-enwe mmetụta n’ọnụọgụ. Ọzọkwa, dị ka ọnụọgụ n’asụsụ Bekee nke na-anaghị enwe njikọ / mmetụta na nnọchi nkọwa ga, asụsụ Igbo ji mmetụta ọnụọgụ nnọchinkọwa arụ ọrụ. N’aka nke ọzọ, nnọchinkọwa ga n’Igbo kwenyere n’ọnụọgụ na nkwuniihu ha n’ọdịdị/mmebe nkebi ahịrị. Nnọchinkọwa n’Igbo bụ; ónyé/ n$ke@ na n@dị@. Ọnọdụ ónyé/ n$ke@ na nkebiahịrị okwu na-eweta ntapị mkpọolu nke nkwuniihu, ebe ọnọdụ n@di@ na-enye nkwụniihu aha nghọta ụbara dịka ọmụma atụ dị na mgbada gosipụtara:

8(i) Akwà nke à bụ Uchè nwè ya
(ii) Akwụkwọ n$ke$ Eze zụrụ dị mma#
(iii) Akwà ndị à bụ$ Uché nwè ha
(iv) Akwụkwọ ndị Eze zụrụ dị m@ma
(v) Nnā a#nyị bụ$ onye ọrụ ugbo#
(vi) Nnā a#nyị bụ$ ndị ọrụ ugbo#

Data a dị n’elu na-egosi na ‘n$ke@’ na-ebulite ntapị mkpọolu nke isiokwu dị na (i-ii), ebe ‘ndị’ na-ahụ maka mmebe mkpọolu nke isiokwu ahụ dị na (iii, iv, vi). N’otu aka ahụ kwa, ‘onye’ wetara nghọta mkpọolu nke isiokwu na (v). Ya bụ na ‘n$ke@’ na ‘onye’ bụ mkpụrụokwu ga na-esochi onwe ha nke na-ebute nghọta na nkwuniihu ha; Ebe ‘n$ke@’ na-arụgara ma mmadụ ma ihe abụghị mmadụ aka, ‘onye’ (nke nghọta elu ya pụtara ‘mmadụ’) na-arụgara mmadụ aka.

Matakwa na ndịiche dị n’etiti mkpọolu na ụbara nnọchinkọwa ga na-apụta dịka ihe adịghị na ihe dị na mgbakwunye ọnụọgụ ga kwa n’isiokwu mkpọaha ga nakwa na ngwaa ga nke ahịrịokwu a gbarịrị agbarị, na ntapị/ntụgharị asụsụ Bekee dị n’elu.

Ọrụ nkwugharị mkpọaha ugboro abụọ (naụn duplikeshọn)

Usoro ọzọ a gbasoro n’imeputa ndịiche ọnụọgụ n’Igbo bụ nkwugharị mkpọaha yiri onwe ha (oyiyi mkpọaha). O yitere ihe Ejele (1997) kpọrọ nkwụgharị ugboro abụọ (reduplication). N’ebe a, a na-ekwugharị mkpọaha yitere iji nweta ma ụbara ma nkwusiike ma ọ bụ agwa/omume. E nwere ike iji nkwụwa mkpọaha rụọ ọrụ dịka nkeji ụbara mkpọaha (NP) ma ọ bụ nkwuwa iji hazie ngwaa ga. Mgbe mkpọaha e kwugharịrị bụ isiahịrị ma ọ bụ mmeju mkpọaha ga, ha na-akpalite mmebe/mwube ụbara, mana mgbe ha na-ahazi ngwaa, ha na-ezipụta nkwusịike ma ọ bụ omume. Tulee ọmụma atụ a na-esota:

9(i) Akwa$ akwa$ dị n’àkpà ya
(ii) A$hụ ya bụ$ aja ājā
(iii) Ụlọ$ elū ụlọ$ elū dị$ bé ha
(iv) Anya ya nà-àchá ọ$bara ọ$bara$
(v) O ji$ ọsọ ọ#sọ# bịa

Hụta na nọmba (9i-iii) na mkpọaha ndị e kwugharịrị bụ omee (i, iii), na mmeju mkpọaha (ii) ma nwee mwube ụbara. Nke a adịghị ka (9iv-v) ebe mkpọaha ndị e kwugharịrị na-ahazi ngwaa ga ma nwee mwube omume/agwa. Nke na-atụ alo ọrụ ụbara, ọnọdụ e jiri rụọ ọrụ ahụ n’ụdị mkpagharị agwa mmegharị omume (hụ ‘pluractional’ na Newman, 1980, 1990).

 

Ọrụ Ọnụọgụgụ na nziole (kwọntifayas)

Ọnụọgụgụ na nziole bụkwa ụzọ e si ezipụta ụbara n’Igbo. Ụdị otu a na-ezipụta usoro nkọwa, na-ebute nghọta ndịnime ụbara na mkpọaha ga ha na ya na-apụtagharị. Nke a yitere ihe mere na Yoruba ebe e nyeghi mkpọaha nkịtị akara ụbara, mana a kọwara ya dịka ụbara edochaghị anya mgbe ha na nziole na ọnụọgụgụ gakọtara (Ajiboye, 2010). Ya bụ na isi ọnụọgụgụ karịrị ótù ka e ji arụ ọrụ n’Igbo iji nweta ọnụọgụgụ maka mkpọaha ga, ọkacha mgbe ọnụọgụ ahụ dabara nke ọma ebe a na-eji nziole arụ ọrụ mgbe ọnụọgụ ahụ kpọm kwem adabaghị. Ihe bụ isi okwu ebe a bụ na ntapị ụbara mkpọaha Igbo n’ebe a dị mfe site na njikọta ọnụọgụgụ na nziole. Nke a adịghị ka ihe a na-ahụ n’asụsụ ga na-enye mọfọloji ọnụọgụ akara ya na ebe mkpọaha ga ga-abụrịrị ụbara iji were ọnụọgụgụ (>1) na nziole gasị. N’ụdị asụsụ ahụ ga, dịka Chierchia (2005:8) si kwu “nziole n’ebe niile anaghị enwe agwara ụbara/nọmba ọdịdị/nsinachi, kama ha na-anata nke a site na nkwekọrịta”. Asụsụ Igbo nwere ọtụtụ nziole nke ọrụ ya bụ imebe ụbara mkpọaha ga. Ọmụma atụ: imilikịtị/ọtụtụ, olenāōle; ụfọdụ, niile/dum. Iji ọnụọgụgụ na nziole rụọ ọrụ iji gosi ụbara ka e gosipụtara na mgbada.

10(i) Mmadụ$ àtọ nọ$ n’ụlọ$ ha
(ii) Ọ$tụtụ mmadụ$ nọ$ n’ụlọ$ ha
(iii) Ụ$fọdụ akwụkwọ ya fùrù étù
(iv) Akwụkwọ ya ụfọdụ fùrù éfù

Ebe ọnụọgụgụ na-esote mkpọaha na ngosipụta usorookwu, ụfọdụ nziole nwere ike ịbịa tupu ma ọ bụ mkpọaha gachaa ndị ya na ha na-apụtakọ (hụụ iii na iv). Na ntapị ụbara ha na-ebute na mkpọaha ga, nziole na ọnụọgụgụ ka a na-ekwu na ha nwere agwara ụbara nzochi (nhụrụnuche) nke e nwere ike ịhụta na mkpọaha ga ha na ya na-apụtagharị (Ajiboye, 2010: 152).

 

Ebe Nkeji Ngwaa nke mmemụbara (verb phrase domain of pluralisation)

Nke a bụ ntapị ụbara nke ọnụọgụgụ ga nke si na mkpụrụ okwu ụbara n’ime nkeji ngwaa wee pụta. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ọnụọgụgụ dị n’ọdịdị mwube usoro okwu na-anabata nghọta ụbara site n’ezigbo ụma nke na ihe ndị ọzọ dị na nkeji ngwaa nwere nghọta ụbara. Ya mere na nkeji nke ngwaa (VP) ka e weere dị ka ebe mmebe ụbara. Ihe ndị e ji gosipụta mmebe/mwube ụbara ga na mkpọaha ga site na nkeji ngwaa ka a kọwara na mgbada.

 

Ọrụ Ogwe Ụbara Ngwaa (use of plural stem)

Igbo dị ka asụsụ Africa ndị ọzọ ga (ọmụma atụ Sandawe, hụụ Heine na Nurse, 2008: 209) nwere katigori nke ogwe ụbara ngwaa. Ọrụ nke ogwe ụbara ngwaa dịka n’usoro ụbara ka a kọsara maka Isan (Ejele, 1997). Ebe ọ bụ na e nweghị ụzọ a ga-esi nye nọmba ọnụọgụgụ akara n’Igbo, ụbara ndị sonyere na nkwusi ike ka e nyere akara na ngwaa site n’iji ogwe nnọchi ụbara wee nọchite ogwe ndị enweghị akara. Ya bụ na ogwe ngwa Igbo ole na ole nwere akara nnọchi ụbara n’ụdị na mgbe ọ bụla e tinyere ha n’ọrụ, otu ma ọ bụ ezi nkwụsi ike nke sonyere bụzị ụbara ma ọ bụ karịchaa ntapị ya n’ụdị nkarị otu. Ụdị ngwaa ahụ bụ ‘ji’ vs ‘chi’ ma ọ bụ kpọ dịka e gosipụtara na mgbada.

11(i) Eze$ ji$ akwụkwọ
(ii) Eze chị$ akwụkwọ
(iii) Eze kpo$ akwụkwọ

N’ọmụma atụ ndị a nọ n’elu, (11i) e nweghị akara ọnụọgụ n’ụdị na ntapị mkpọolu ma ụbara ga dị na mmeju àkwúkwó site n’ọnọdụ/ebe ngwaa ‘ji’ na-arụ ọrụ. ngwaa bụ ‘chi/kpó’, n’aka nke ọzọ bụ nnọchi ụbara na-esota nke na-egosi na a ga-atapị mmeju ahụ dịka ihe karịrị otu. Ntapị ụbara a nke ha tinyere na mmeju ha mere ka a hụta ngwaa gasị ahụ dịka mkpọaha e nweghị ike ịgụta ọnụ bụkwa nke e weere n’ụdị ole ọ ha n’asụsụ. Ya bụ na ụbara ma ọ bụ ole bụ uru amụmamụ echiche bara nke gbasatara mgbagha nke ngwaa ndị a bu. Ọ bụ maka ihi uru amụmamụ echiche ole a bara mere na mkpọaha ụfọdụ ga ndị bụ mkpọolu (dk akwà, àkpà) mana a tapịrị ha n’ụdị ole ka ngwaa ndị a họpụtara. Ọmụma atụ a gosipụtara ha:

12(i) Eze$ chị$/kpo$ aja
(ii) Ezè chị$/kpò ntụ
(iii) Ezè chị$/kpò akwà
(iv) Ézè chị$/kpò a$kpà

Ngwaa ndị ọzọga ndị e nwere ike ịkọwa n’ụdị a bụ ‘tu’ vs ‘gha/wụ’; ‘nò/dị vs ju’. Ebe tu bụ ntapị mkpọolu/ụbara enweghi ebe ọ kwụ akwụ, iji gha/wụ na-ezipụta ụbara ma ọ bụ ntapị nke ihe ngwaa na-ahụ anya enweghị ike ịgụta ọnụ. Ọzọkwa, e ji nọmba dị arụ ọrụ ebe niile n’agbanyeghị ma ọ bụ ntapị mkpọolu ma ọ bụ ụbara, mana ‘jú’ na-enye ụbara ma ọ bụ ntapị a gụtaghị ọnụ nye omee/isiahịrị n’ọnọdụ nke enwe ọnara (intrasitiivu). Nke a yitere amụma nke Heine na Nurse (2008: 209) na “ọnọdụ ọdịdị usoro okwu nke ogwe ụbara ga na-ezipụta ihe dị ka ụdị nnabiga (egative) n’ụdị na ngwaa enwe ọnara (intrasitiivu) ahụ nwere akara maka usoro ụbara nke isi okwu ga, ebe ngwaa transitiivu ka e nwere ike inye akara maka usoro ụbara nke ọnara. Ọmụma atụ:

13(i) Eze$ tụ$rụ$ m$ o$kwute#
(ii) Ezè ghàrà/wụ$rụ$ m$ o$kwute#
(iii) Mmadụ nọ n’ụ@lọ$ ha@
(iv) Mmadụ ju$ru$ n’ụ@lọ$ ha@
(vi) Nkịtā jùrù n’ụlọ$ ha

N’ọmụma atụ nke iri na atọ (13) n’elu, (i, iii na v) nwere ogwe ngwaa ga enweghị akara, ebe (ii, iv, na vi) nwere ụdịdị nnọchi ụbara nke ha na-esota. Ọzọkwa, ebe ọdịdị ụbara nke ihe nke ngwaa mmennara (transitiivu) pụtara ihe na (ii), ọdịdị ụbara nke isi okwu nke ngwaa enwe ọnara (intrasitiivu) pụtara n’ime (iv na vi). Igbo izugbe na-eji ‘nọ’ na ‘dị’ anọchite anya mmadụ ma ọ bụ ihe enweghị ndụ kwa (hụ iii na v) n’elu.

 

Ụdịdị Ngwaa Ntimiiwu

Mmebe ntimiiwu Igbo ga dịka ọ dị n’ọtụtụ asụsụ enweghị ngosipụta omee/isiahịrị. Mana dịka asụsụ Bekee n’abụghị asụsụ ndị ọzọ, Igbo nwere ike igosipụta ndịiche n’etiti isiokwu mkpọolu na ụbara omee n’ọnọdụ ntimiiwu. Ihe mere ya ka o kwee omume ma ọ bụ ihe kpatara ya bụ site n’itinye nsọkwunye n’ụbara nnọchiaha onye nke abụọ (unu) n’ụdị ngwaa ntimiiwu. Ọmụma atụ ndị a na-esote gosipụtara ha.

14(i) bịa! bịanụ$
rie! rienù!
gàa! gàanù
gbasàa! gbasàanù!
kwùo! kwùonù!

N’ọmụma atụ a dị n’elu, nsonaazụ ụdaume oghe nyere ntimiiwu, ma o nwere ntapị mkpọolu, na-egosi na isiahịrị na-ekwu maka ya bụ mkpọolu. Mgbe e bu isiahịrị ụbara n’obi/n’uche, ụdị ngwaa ntimiiwu na-anọ na nnọchiaha ụbara nke onye nke abụọ. Ya bụ na nwube ụbara nke isiahịrị nzuzo ahụ dị n’ime ngwaa ahụ.

 

Agwara Mgbakwulite (pekoleshọn) n’akara Ụbara n’Igbo

Agwàrà pekoleshọn na-akọwa mmekọrịta nke mbufe nke àgwà bido n’isi ruo na mmeju ya ma ọ bụ nzipụta kpọmkwem (maka mwube otu mmenara (transitiivu). Selkirk (1982) kwuru na pekoleshọn bụ ihe/ngwa nke na-eme ka mkpụrụ okwu mgbagwo nweta àgwàrà usorookwu nke isi ya. Ebe mwube ụbara abụọ n’Igbo ka a hụtara dika asụsụ aa-agbaso iwu àgwàrà pekoleshọn dịka ọ dịbu n’eserese dị na mgbada.

N’ọnọdụ DP, agwara ụbara nke nrụmaka ahụ ka e bufere n’ọnụọgụgụ ahụ a hazigharịrị dịka

Eserese 1: Agwara pekoleshọn na DP n’ọnọdụ mwube ụbara

DP

 

 

 

NP           D

 

mmadụ           niile

mmadụ               atọ

 

 

Maka nrụmaka ndị nwere ike ịmalite na iso mkpọaha, anyị weputara ọrụ mbugharị nke na-ebufe mkpọaha n’aka ekpe nke nkwuso. Nke a chere na nkwuso ahụ bụ ntọala mmalite/mbido site n’ọnọdụ ma mkpọaha gachaa. Ọ bụ mbugharị nke na-ewepụta mkpọaha site n’ọnọdụ tupu nkwuso ahụ gafee na nke nrụmaka ahụ gachaa. Ihe mkpalite nke nkwenye a bụ maka na nkeji mkpọaha Igbo (NM) na-enwe nhazigharị n’ikpeazụ n’izugbe.

 

 

 

 

 

 

 

Eserese 2: Agwara pekoleshọn n’ọnọdụ DP mwube ụbara na ọrụ mbugharị

 

DP

                                                  

                                        

                                         NP                D1

 

                                        

 

                                                       D                    NP

 

                                         ti               ụfọdụ              mmadụi      

 

N’eserese dị n’elu, okwu nsome (constituent) natara nkọwa ụbara pekoleshọn site na nkwụsọ (determiner). Na nkeji ngwaa nke nghọta ụbara, nghọta echiche ụbara pekọleshọn sitere na ụbara ngwaa ruo na mmeju mkpọaha dịka e gosipụtara n’eserese nke atọ n’ala :

 

Eserese 3: Agwàrà pekoleshọn na nkeji ngwaa (VP) mwube ụbara

VP

                                                  

                                        

                                         V                NP

                                        

                                

                                   chị/kpo        akwa                                

 

N’ebe a, ụbara ngwaa ahụ bụ ihe butere mwube ụbara nke mmeju mkpọaha ahụ.

 

Nchọpụtagasị na Mmechi

Nchọpụtagasị

E jighi mgbakwunye akọwa ọnụọgụ n’Igbo. A na-ewezuga akara ya ma kọwaa ya site n’okwu kwụụrụ onwe ya dịka mkpụrụ okwu ọnụọgụ ga (Dryer, 1989). E wepu akara nọmba ahụ, ezigbo mkpọaha Igbo agaghị abụzị maka ọnụọgụ, nke ga-enye ya ohere ntapị a dịka mkpọolu ma ọ bụ ụbara. Ọnụọgụ na ụdịdị mkpụrụ okwu ọnụọgụ ga n’Igbo na-adịwaga iche site n’asụsụ ndị ọzọ ga ndị nwere usoro akara ọnụọgụ yitere onwe ha. Mkpụrụ okwu ọnụọgụ n’Igbo ka a chọpụtara dịka ihe sitere n’ụzọ ebe abụọ doro anya. Nkeji nkwụso (DP) nakwa ebe nkeji ngwaa (VP). Ebe ọnụọgụ na nziole dị n’ime nkeji nkwụso (DP) dị ka o nwere mmetụta kelingwistiik site n’otu akụkụ gafee na nke ọzọ dịka iji ogwe ngwaa nke ụbara na ọdịdị ngwaa ụbara ntimiiwu rụọ ọrụ n’agụmagụ dị adị (ụzọ ebe nkeji nkwụso usoro ụbara ndị ọzọ a chọpụtara maka asụsụ Igbo bụ: iji mkpụrụokwu ga diminutiivu rụọ ọrụ nwa/ụmụ); nnọchinkọwa ga na-mmepụtagharị mkpọaha. Etu o sila dị, mkpụrụokwu diminutiivuga na-enye mkpọaha ndị nwere ndụ ntapị mkpọolu/ụbara, mana ọ naghị emegara mkpọaha ndị enweghị ndụ otu ahụ, n’agbanyeghị na ha nwere ike ịpụtagharị. N’ime ebe mwube ụbara niile a chọpụtara, isi na-ebufe nghọta ụbara na mmeju (belụsọ n’otu ebe isiagụgọ/iru ụka kwụsiri ike ebe ihe a tụrụ aka (ihe egosiri na nke zoro ezo nabatara ntapị ụbara site na ngwaa), ma bịa mejupụta iwu agwara pekoleshọn nke Selkirk (1982).

Nchịkọta/Mmechi

Ọnụọgụ bụ katigori ụtọasụsụ zuru ụwa ọnụ, ma na-ezipụtakarị onwe ya n’oke asụsụ dị iche iche. Ụfọdụ asụsụ na-eji mgbakwụnye egosipụta ya ebe ụfọdụ na-eji ihe kenghọta mkpụrụ okwu ya. Asụsụ Igbo so na katigori nke ikpeazụ. N’agbanyeghị n’ọdịdị nnọchiaha n’asụsụ ụfọdụ tinyere asụsụ Igbo kà nwere mgbanwe ga, mkpọaha n’Igbo na-ebu akara ụbara site na mkpụrụ okwu n’enweghị ike ịkwụrụ onwe ya. Ọnụọgụ n’Igbo na-egosipụta onwe ya dịka nnọchiaha nkọwa na ụbara ogwe ngwaa ga nke na ha niile nwere nghọta ụbara nke ha na-ebufe na mkpọaha mmetụta ahụ. Nkọwa ga na-ebufe nghọta ụbara na mkpọaha ha na-akọwa ebe ngwaa ụbara ga na-emekwa otu ahụ n’amụmamụ mmetụta nke ngwa. Mkpọaha enwe nnọsoaha Igbo, etu ọ dịla, ka a nọkwa n’okpuru maka ọnụọgụ kpọmkwem, n’ikwu eziokwu, ọ bụ naanị ebe e ji ya arụ ọrụ na-ekpebi ma a ga-atapị ya dịka mkpọolu ma ọ bụ ụbara. E kwesịrị ime nchọcha ọzọ iji chọpụta n’ụzọ miri emi ụzọ/usoro dị iche iche iji chọpụta nke ọma àgwà kelingwistiik ha nwere ma wube ụdịdị mmekọrịta kelingwistiik site n’otu ebe gaa n’ọzọ.

 

 

 

Edensibịa

Abney, S. P. (1987). The English noun phrase in its sentential aspect. Ph. D, thesis, MIT,      Cambridge MA.

Adejoh, M. O. (2012). Pluralisation in the Idoma language. Journal of Igbo Language and Linguistics.        (37-42)

Ajíbóyè, Ọ. (2010). Plural strategies in Yorùbá . Studies in African Linguistics. Volume 39, Number 2, 2010 (141-          181).

Anagbogu, P. N. (2005). Pluralisation in Koring. Awka journal of linguistics and languages 1, 132-140.

Baker, C. L.(1978). Introduction to generative-tranformational syntax. London: Prentice-

Hall

Chierchia, G. (2005). Substance, object and number. Ms. Harvard University, Boston

Crystal, D. (1971) . Linguistics. New York: Pelican

Crystal, D (2007). A dictionary of linguistics and phonetics. U.S.A. Blackwell.

Dryer, M. (1989). Plural Words. Linguistics 27:865-895.

Ejele, P. E. (1997). The expression of plurality in Esan. Nigerian language studies 5, 65-67.

Eze, M. A. (2014) Mmemubara n’Igbo. M. A. Dissertation, Department of Linguistics, Igbo

Languages, University of Nigeria, Nsukka.

Emenanjo, E. N. (1978) Elements of Modern Igbo Grammar Ibadan: Oxford University Press.

Heine, B. & Nurse, D. 2008. A Linguistic Geography of Africa. New York: Cambridge University Press.

Ifeagwazi, P.A. (2010). Pluralisation in Igbo. Ph.D Seminar Paper, Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka.

Igwe, I. O. (1989). Mbido Igbo. Onitsha: Kawuriz and Manilas Press.

Nkamigbo, L. C. (2009). Lexical Puralisation in Jaba. Journal of Journal of Linguistic          Association of Nigeria 12, 205-213.

Nkamigbo, L. C. (2011). Lexical pluralisation in Eggon. In N. Ezenwata & I. Ogbazi (eds.)

In the Perspective of Language and literature: Essays in honour of R. U. Uzoezie.               Nimo: Rex Charles and Patrick ltd, 154-159.

Nkamigbo L. C. (2015). Ayu plural morphology. In R. I. Okorji, C.A. Eme, & G. S. Omachonu        (eds.) Contemporary Issues in Linguistics and Language studies: A festchrift for Professor Clara Ikekeonwu at 65. Enugu: Rossen Publications Ltd. Pp 130-135.

Heine, B. and Nurse, D. (2008). A Linguistic geography of Africa. New York: Cambridge University Press.

Newman, P, (1980). The Classification of Chadic within Afroasiatic. Leiden: Universitaire Pers.

Newman, P. (1990). Nominal and Verbal Plurality in Chadic. Dordrecht: Foris Publications.

Okeke, P. N. (1993). Ngosiputa ubara n’asusu Igbo. NCE Project, Federal College of Education, Eha-Amufu.

Okonkwo, M.N. (1974). A complete course in Igbo grammar. Ibadan: Macmillan

Omachonu, G.S. (2003). Animacy hierarchy: a case for noun plural formation in Igala. In M. E. Attah, G. S. Omachonu, S. Y. Atabo. P. M. Onekutu, & E. M. A. Adama (eds.), Language and Literature in Education for a better society. Nsukka: Ap Publishers Ltd        pp. 201-208.

Omachonu, G. S. (2008). Inflectional morphology in Igala. Journal of the linguidtics

association       of Nigeria 11, 33-40.

Robins, R. H. (1964). General linguistics. London: Longman

Selkirk, E. (1982). The syntax of words. Cambridge, MA: MIT Press.

Simons, P. C. (1993). Plural in Lele. Journal of west African languages. XXIII.1 (73-77).

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

INYOCHA ABỤ EKERE UDUMMIRI NA ỌKỌCHỊ: ETU HA SI METỤTA MMỤTA

 

 

NKE

 

 

STELLA OGECHUKWU AGWUNA (DKT)

NGALABA ASỤSỤ IGBO NA ASỤSỤ NAỊJIRỊA NDỊ ỌZỌ

NWAFOR ORIZU KỌLEEJI KEEDUKESHỌN, NSUGBE

 

 

 

 

 

Ụmịedemede

Abụ so n’otu ngalaba agụmagụ Igbo. O jupụtara n’amamihe pụrụ iche. N’ọmụmụ agụmagụ Igbo, a na-elebakarị ọmụmụ agụmagụ ejije na iduuazị anya, legharazie agụmagụ abụ anya, chefuo na ọtụtụ ihe mmụta na ihe nkuzi ga-abawanye amamihe mmadụ jupụtara n’ihe ọmụmụ abụ, nke ga-akwalite ọdịmma na agamnihu mmadụ na nke obodo. Ọ bụ ya kpalitere nchọcha a. Ebumnuche nchọcha a bụ ka e nyochaa abụ ekere abụọ ndị a, Udummiri na Ọkọchị ndị Echebima G. N. dere n’afọ 2001 wee gosipụta amamihe ya na ka o si metụta mmụta. E gosipụtara uru na ọghọm dịga n’udummiri na n’ọkọchị. N’inyocha abụ ndị a, a chọpụtara ihe mmụta dị omimi na ihe ọbụla Chukwu kere nwere ọrụ ya. E tinyere ya isi n’ihe gbasara mmụta wee chọpụtakwa na nwataakwụkwọ, ndịnkuzi, nne na nna na ndị gọọmentị nwechara ọrụ dịịrị ha; e kere ọrụ eke. Onye rụọ nke ya oge kwesịrị, o rie uru, ọ baara ya. Onye arụghị, ọ gaghị aghọrọ mkpụrụ ọbụla. Nchọcha a gbasoro usoro nchọcha sọvee. N’ikpeazụ, a tụnyere alo ka a kwalite ọmụmụ agụmagụ abụ Igbo makana mmụta dị na ya ga-eweta agamnihu na ọdịmma ndị mmadụ. E nyekwara ndụmọdụ ka a kwalite ọnọdụ ọrụugbo n’ala anyị makana ọ ga-achụ ọrịa na ngana ma mekwaa ka erimeri bụrụ atụru tawa.

 

Ndubanye

Oge ọbụla mmadụ gụrụ agụmagụ, ọ bụ ejije, iduaazị na abụ, onye ahụ na-esi na ya mụta ihe ọhụrụ ma mee ka amamihe onye ahụ bawanye. A na-esite n’agụmagụ abụ amụta ọtụtụ ihe dị omimi, nke ọtụtụ ndị mmadụ amaghị. N’abụ okike, a na-agụta ọtụtụ ihe Chineke kere n’elu ụwa nke na-egosikwa na Chineke ebuka na ụwa dịkwa egwu. O nweghị mmadụ ọbụla ga-asị na ọ bụ ya kere ọtụtụ ihe dị n’ụwa, dị ka anyanwụ, mmiri ozizo, ide, ọnwa, oshimiri, ọkọchị, kpakpando, ugwu, ụtụtụ, abalị, ọchịchịrị w.d.g. Ihe ndị a bụgbado ọrụ aka Chineke. Ọ bụ ya ji ihe dum a wee chọọ ụwa mma. Nke ọbụla nwere ọrụ pụrụ iche ọ na-arụ. Nke ọbụla nwere uru ọ bara. N’ụbọchị, n’izu, n’ọnwa, n’afọ ihe dum a e kere eke na-arụ ọrụ dịịrị ya. Iji maa atụ, chi foo, anyanwụ apụta nye ụwa ife, ebe dum agbakee. Otu aka ahụkwa, chi jie, ọchịchịrị agbaa, ebe dum agbajie, onye ọbụla asọwa isi lakpue gaa izu ike. N’oge udummiri, mmiri zoo, ụmụ mmadụ akọwa nri n’ubi. N’oge ọkọchị, ala akpọọ nkụ, onye ọbụla ewere ihe ọ kụrụ n’ubi. Ọnwa na kpankpando na-apụtakwa n’oge abalị, nye ụwa ìhè, mee ka ebe dum na-amụke. Ihe dum e kere nwere ọrụ ọ ga-arụ ka okike e kere ya wee baa uru dị ka e siri nye ya ike nke ya. E kere ọrụ eke.

Na nnyocha a, e lebara anya n’abụ okike atọ ndị dị n’akwụkwọ abụ Echebima nke ọ kpọrọ Akọ Na Uche (2001). Abụ okike ndị ahụ bụ; Ọkọchị, Udummiri na Ọchịchịrị. N’abụ ndị a, e gosipụtara etu ihe dum e kere eke si maa mma ma na-enye mmadụ ihe ha chọrọ mgbe ọbụla oge ya ruru. E gosipụtakwara uru na ọghọm ha dị icheiche ma mekwaa ka a mara na uru dị ya karịrị ọghọm. Otu ihe pụtakarịrị ihe n’ebe abụ okike niile dị bụ na ha niile nwere ọrụ pụrụ iche ha na-arụ. Ọzọ bụkwa na ha na-arụkwa ọrụ ahụ dịịrị ha maka na e kere ọrụ eke. Onye rụọ nke dịịrị ya, udo adị, ihe niile a na-aga nke ọma mana mgbe nke ọbụla arụghị ọrụ nke ya maọbụ rụọ ya n’oge ekwesịghị ekwesị, ezigbo nsogbu na ọgbaaghara na-esokwa ya. N’udummiri ka e ji akọnye mkpụrụ ubi n’ala, n’oge ọkọchị onye kụrụ mkpụrụ ewere ihe ọ kụrụ n’ubi. N’otu aka ahụkwa, chi jie, ọchịchịrị daa, onye ọbụla alakpuo jee zuru ike. N’ụwa anyị nọ n’ime ya, onye ọbụla nwere ọrụ dịịrị ya. Nna kwesịrị ịmata na ọrụ ya bụ iweta ego nri, nne ga na-elekọta ezinaụlọ, ụmụaka nwe ije ozi n’ụlọ.

A bịa n’ụlọakwụkwọ, ọrụ nwata akwụkwọ bụ ịgụsi akwụkwọ ya ike ma gafee n’ule ọbụla e nyere ya. Ndị nkuzi ga-ahụ na ha na-akụziri ụmụaka ihe nke ọma. Ya mere, onye ọbụla nwere uche kwesịrị ịmata ọrụ dịịrị ya ma rụọ ya nke ọma. E lee anya n’ụwa taa, ihe dum Chineke kere kemgbe ụwa bidoro na-arụ ọrụ e jiri kee ha, naanị mmadụ bụ ihe anaghị arụ ọrụ dị ka Chi kere ha si kechaara ha ọrụ. Chineke kechara ihe dum mana taa onwe ya ụta ihe o jiri wee kee mmadụ (Gen. 6vs6). Mmadụ na-enupu isi, mmadụ anaghị anụ ndụmọdụ, mmadụ anaghị edewe ihe e nyere n’iwu, ọtụtụ mmadụ anaghị arụ ọrụ Chi ha kenyere ha. Ọtụtụ ndị nna anaghị eweta ego n’ezinaụlọ ha ma na-achọ ka e nye ha nri ụtụtụ, nri ehihie na nke abalị. Ọtụtụ ndị nne anaghị elekọtazị ụmụ ha anya; ndị odibo na-elekọtaziri ha ụmụaka anya. Ụmụaka anaghị aga ozi n’ụlọ; ọ bụzị ndị odibo ka a hapụụrụ ọrụ niile. Ọ bụ ihe ndị a bụ na obodo adịghị mma taa. Onye ọbụla na-eme ihe dị ya mma, chefuo na e kere ọrụ eke na onye ọbụla nwere ọrụ dịịrị ya ọ ga na-arụ ka ihe dum wee na-aga nke ọma. Ọ bụrụ na ọkọchị, udummiri na ọchịchịrị anaghị apụta arụ ọrụ e jiri kee ha, ọgbaaghara ga-adị n’elụ ụwa. Ihe omimi na amamihe ndị a ka abụ okike ndị a gosipụtaara ọhanaeze iji mee ka onye ọbụla gbanwee ma rụọ ọrụ e kenyere ya n’elu ụwa. Nke a ga-eme ka obodo dịkwa mma, nwee agamnihu.

 

Abụ

N’agụmagụ, e nwere iduuazị, ejije na abụ. Abụ bụ ngalaba agụmagụ na-eji okwu une, okwu na-akpalite mmụọ mmadụ ma jirikwa nka na okwu miri emi kọwapụta ebumnuche odee. Abụ edererde na-ejupụtakwa n’eziokwu, n’amamihe, e ji ya akọwapụta ihe na-emegasị n’ụwa n’ụzọ ọ ga-esi metụtakwa onye na-agụ ya n’ahụ. Uche (2009) kọwara na odee abụ nọchitere anya onye na-echemi echiche, onye na-akpọlite mmụọ ndị mmadụ, onye na-ejikwa amamihe depụta ma hazie ihe, onye nwere anya nka e ji ahụ echiche dị ka o si metụta n’ahụ ma n’ime mmụọ ya na onye nwere uche n’ebe ihe na-emegasị n’ụwa anyị nọ n’ime ya dị. E nwere ọtụtụ abụ ederede dị icheiche – Abụ ikpe, abụ gbasaara ọchịchị obodo, abụ akwa arịrị, abụ nkọcha, abụ otito, abụ ibu amụma w.d.g. A ga-eleba anya n’abụ Ekere abụọ ndị a: Udummiri na Ọkọchị nke Maazị G. N. Echebima dere n’akwụkwọ abụ ya bụ Akọ na Uche (2001).

 

Abu Ekere

Abụ ekere bụ abụ ndị ahụ gbasara ihe e kere eke a na-ahụga anya na gburugburu mmadụ, ihe ndị ahụ Chi kere o ji chọọ ụwa mma. Nke ọbụla n’ụdị nke ya. Ha nwere ike maa mma ma dịka omimi n’ụdị nke ha mana ihe kachasị apụta ihe bụ na ihe ndị a e kere eke nwechara uru ha bara, ha nwechara ọrụ ha na-arụ n’elu ụwa e ji wee kee ha. Ụfọdụ abụ ekere bụ ndị a n’akwụkwọ abụ Ụtara Ntị (1979), e nwere Abalị nke Mmadụbuihe dere, Onyinyo nke Obodo dere, Mmadụ nke Obienyem dere. N’Akpa Uche (1975), e nwere egwuregwu nke Amasike dere, Ọnwa, Kpakpando, Udo na Ọṅụ   – Akọnuuche, e nwere ọtụtụ abụ ekere ndị a; Mmiri, Ụra, ndị Onuọha J. dere, Ehihie, Osimiri ndị Vincent Arua dere, Ikuku, nke Okeokwu dere, Mmadụ, nke Nwadike, Udummiri na Anyanwụ, ndị Ndunagum dere. N’akwụkwọ Abụ Echiche Amamihe nke Agwụna dere, e nwere abụ Anyanwụ ụtụtụ, Ikukundụ w.d.g. Nghọta abụ adịghị ese n’elu. A na-echemiri ya echiche ime makana nkọwa ya na-adị omimi. Ọ bụ ezie na ihe a na-ekwu maka ya bụ ihe Chineke kere n’ụwa o ji chọọ ya mma, mana o nwere ihe mmụta, ihe nkuzi na amamihe so nke ọbụla.

 

Nkọwa ihe bụ Udummiri

Udummiri na-ebido n’ọnwa Maachị wee rue n’ọnwa Septemba. Mmiri ozuzo na-enye ụwa dum ndụ ọhụụ. Okpomokụ lachaa, ndị mmadụ na-eji ọṅụ anabata udummiri. Ihe a kọrọ n’ubi na-eme pọkọpọkọ. Ukwu osisi, ahịhịa, ihe dum na-achacha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ na-atọkwa ụtọ ile anya. Ebe dum na-ajụ oyi, ikuku ndụ a na-eku. N’oge a, ahịhịa ụmụanụmanụ ga-ata na-eju na-amacha pọkọpọkọ. Ihe ọ bụla e kere eke na-echekwudo oge udummiri makana ahụ na-ajụ mmadụ oyi. Oge mmiri na-eru, eluigwe na-agbaji oji, ikuku a na-eku, ahịhịa dịga n’ukwu osisi a na-ekugharị aka nri aka ekpe. Ihe ndị a na-eme mmadụ ana-ekiri ihe mara mma dịga n’ihe Chineke kere wee chọọ ụwa mma. Mmiri ozuzo bido, o zochaa, eluigwe agbachaa. Mana oge ụfọdụ, mmiri ruchaa, ọ gaghị ezokwa. Ọtụtụ oge, ọ bụkwa oge a ka egwurugwu ji apụta iji kọwapụtara mmadụ na mmiri ahụ agaghịkwa ezo. Mmiri zoo ụmụ mmadụ enwee mmiri. Ihe dum na-eku ume ji mmiri adị ndụ. Ọ na-enye onye ọbụla aṅụrị ịpụta n’ebe mmiri na-ezo. Ụmụ mmadụ na-eji oge a na-eche mmiri, gbajuchaa ihe niile. Ụmụaka na-egwurikwa egwu na-amakwa ogoogo mmiri ma mmiri na-ezo. Mmiri ka mmadụ ji adị ndụ. Mmiri ozuzo ka oshimiri, ezu, mmiri ala na anyịm ji eju eju, mee ka ụmụanụmanụ bi na mmiri nwee ndụ. Ewezuga mmiri ozuzo, ha ga-anwụcha.

N’aka nke ọzọ, udummiri na-etinye ndị mmadụ egwu n’anya makana mmiri na-eburu mmadụ, chụpụ mmadụ n’ebe obibi ya, buru ụlọ, kwatuo ukwu osisi, ukwu osisi adado ụgbọala, tigbue mmadụ. Mmiri na-eju olulu, mmadụ agaghị amakwa nke bụ ala na nke bụ olulu makana ide tojuru ebe dum. N’oge a, ọtụtụ ọrịa na-atụrụ mmadụ makana olulu na-ejupụtachaa n’atịtị na unyi. Ọ na-ebukọrọ atịtị dịga n’ọwa mmiri bupụta n’ezi wee na-eke ụmụ mmadụ ọrịa dịka afọ ọsịsa, otolo, ọgbụgbọ na ọnyụnyụ, azụzụ, oyi, ịba na ịba ojii. Ka o sila dị, udummiri nwere oge, oge ya rue, ọ rụọ ọrụ ya dịka Chi si kee ya.

 

Nkọwa ihe bụ Ọkọchị

Ọkọchị na-ebidokarị n’ọnwa Oktoba rue n’ọnwa Maachị. N’ọkọchị, ụbọchị na-adị ọkụ. Ekpomọkụ na ọsịsọọ na-anyụ mmadụ anya. Oshimiri ataa. Anwụ na-achawacha mmadụ ụbụrụ. Ụmụanụmanụ anaghị ahụkwa ahịhịa akwụkwọ ndụ ha ga na-ata dịka ha si ahụ ya n’oge udummiri. Nri ọbụla a kụnyere n’oge a, agaghịkwa emenwu belụsọ ma onye ahụ eji aka ya wee na-agba ihe ahụ mmiri, makana mmiri adịghị n’ọhịa, ọkụ na-agbakarị n’oge a. Ọrịa na-efekarị ebe ndị mmadụ bikọchara ebikọ n’oge ọkọchị dịka ọrịa arụbara, ọrịa nrọpịa olu. Na ndụ ndị Igbo, o nwere ndị na-aza ‘Ọkọchị’ dịka aha nakwa aha otutu. Ọkọchị pụtara ndị a maara amara, ndị aha ha na-ada ụda, ha amaghị ihe ụkọ makana ha chutechara uchu n’oge o kwesịrị (udummiri) ha bịa n’ọkọchị ha zuru ka e mee. Oge ọbụla a kpara ha aka, ihe dị. Ma n’ọkọchị ma n’udummiri ihe e chutere n’uchu dị, ihe ụkọ adịghị

 

Udummiri

Udummiri apụla

Onye ọbụla jikerekwa

Were hambọrọda ya pụtakwa

 

Udummiri apụla

Onye ọbụla lezie anya ya

Egwu ga-adikwa

 

Udummiri apụla

Onye ọbụla jikerekwa

N’ihi oke ikuku na-efekwa

 

Udummiri apụla

Onye ọbụla leziekwa anya

Ụlọ na-ada, ụmụ ọkụkụ na-efu

 

Udummiri apụla

Onye ọbụla jikerekwa

Okporo ụzọ emebiela, abalị adịla egwu

 

Udummiri apụla

Onye ọbụla lezie anya ya

Ohere adighịkwa e ji eme ihe

 

Ebegbukwala onwe gị

Agbarukwala iru gi

N’ihi na udummiri apụla

Ihe ọ bụla Chineke kere

Nwere ọrụ ya na oke ya.

 

Jeruo n’ubi gi

Lee ihe ị kụrụ n’ala

Lee ka ha si eto, na-ama abụba

Na-amị mkpụrụ na-aba ụba

Nke a bụ uju na obi ụtọ

Ndụ ọma na nriju afọ

 

Olee maka ndị ụkọ mmiri?

Ndị okenye na ndị arụ na adịghị

Ha ga-añụkwa mmiri?

Ha ga-adịkwa ndụ saa arụ ha?

Ka ha ga-añụgide gbarugbaru igwe

Nọọrọ n’ite kamgbe Adam nọ n’ogige Iden

 

Adọgbula onwe gi

Udummiri dị ngọzị

Iwe gi bụ nke efu (Echebima G. N., 2001)

 

Abụ a nke Echebima G. N. dere n’afọ 2001 na-egosipụta ihe ndị dị mma na ndị adịghị mma n’udummiri. Isiokwu dị na ya hibere isi n’ihe ndị a:

  1. Nkwado ọrụ
  2. E kere ọrụ eke
  3. Ịrụsi ọrụ ike
  4. Uru na ọghọm dị n’udummiri.

Abụ a gosipụtara na onye ọbụla kwesịrị ịna-adị nkwadowe chebiri mgbe udummiri ga-apụta, zụta nchemmiri nke a na-akpọ ‘hambọrọda’. Ọ kọwapụtakwara na udummiri na-ebu oke ikuku, ụlọ nwere ike ịda, okporo ụzọ ga-emebisikwa, ihe mmebi na-esote udummiri na-adịkwa egwu. Ọ bụ ya ka odee abụ ji wee na-ama ya dịka ọkwa ka onye ọbụla ghara ibegbu onwe ya n’akwa maọbụ gbarụwa ihu n’ihi na ihe niile Chukwu kere kwesịrị ịrụ ọrụ ya ma oge ya rue. Udummiri kwesịrị ịbịa ka a rụọ ọrụ ugbo wee kọpụta erimeri. Mmadụ n’otu aka ahụkwa kwesịrị ikulite, rụsie ọrụ ya ike n’adaghị mba. Onye ọbụla jikerekwa ma kwadokwa akwado makana udummiri bụ oge ọrụ makana ọ bụ nkụ onye kpara n’ọkọchị ka ọ na-anya n’udummiri. Onye nọrọ nkịtị kpakọwa aka, agụụ egbue ya maka na ngana kpuchie ute, agụụ ekpughee ya.

E gosipụtara na onye ọbụla ga-arụsi ọrụ ya ike, site n’ịkụnye ihe n’ala ma lerue ya anya nke ọma ka o wee too nke ọma, maa abụba ka ọ ga-abụ mgbe a ga-ewere ihe ubi, nri a bụrụ atụrụ tawa, onye ọbụla erijuo afọ. Odee abụ mara ọkwa ma gwa onye ọbụla sị:

Jeruo n’ubu gị

Lee ihe ị kụrụ n’ala (ahịrị 8)

N’oge udummiri ka e ji akọnye nri n’ala, mmiri ozuzo bịa, ala adị nro, a kọnye ji, ede, agwa, ọna, unere, akwụkwọ nri, akịdị maọbụ ihe ọbụla a na-eri eri ga-amịpụta mkpụrụ n’ebe ọ bara ụba. Ọ bụrụ na udummiri apụtaghị nsogbu ga-adị, ụganị ga-adị makana ala ga-akpọ nkụ, o nweghịkwa ihe ọbụla a ga-akọnye n’ala. Ọ bụ ya ka odee abụ ji kwue sị:

Ihe ọbụla Chineke kere

Nwere ọrụ ya na oke ya (ahịrị 7)

 

Udummiri rụọ ọrụ Chineke kenyere ya site n’ịpụta, zoo nke ọma, ala ewee dị nro wee jikere imepụta nri, mmadụ ewee gaa n’ubi kọjue ihe oriri n’ubi, ị mara na agụụ ga-agba ọsọ n’obodo a. Onye elu na onye ala ga-enwe ihe oriri makana onye rụọ o rie. Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ. Onye kpakọba aka, agụụ egbue ya. Nwa ọkụkọ bọọ abọọ, o rie erie. Mmadụ nwe ịkụnye ihe ma na-agba ya mmiri ka o wee pue, Chineke agọzie ya site n’iweta mmiri ozuzo ka ihe a kụrụ wee mụbaa, dị ka ọ dị n’akwụkwọ nsọ “Mụ onwe m kụrụ osisi, Apolos kwọsara ya mmiri ma ọ bụ Chineke na-eme ka ihe a kụrụ na-aba ụba” (1 Cor 3 vs 6).

Onye rụrụ ọrụ dịịrị ya n’oge udummiri, kụnye mkpụrụ n’oge udummiri, ọ ga-agba aka? Ọtụtụ mmadụ ekwuela ọtụtụ ihe gbasaara mmadụ ịrụsi ọrụ ya ike. Agwụna (2014) kọwara na n’omenaala ndị Igbo, onye umengwụ adịghị enwe ugwu na nsọpụrụ ebe ọbụla ọ gara. Naanị ndị a na-akwanyere ugwu bụ ndị ejighị ọrụ ha egwuri egwu. Nke a pụtara ihe n’ụfọdụ aha ndị Igbo na-aza dịka; Dike, Ikedimma, Akubuike, Ezechi, Nwadike, Ike, Ikemefuna, Ikebundu, Nwike. Aha ndị a na-egosi na mmadụ ịdị ike bụ ezigbo ngọzi pụrụ iche. O nweghị ihe ọma onye dị ngana na-erite n’elu ụwa a kama ọ bụ naanị nsogbu, ọghọm na ịta onwe ya ụta bụ ihe onye ngana ga-ahụ n’ikpeazụ. Ka o sila dị, Akụnna (2011:80) kọwapụtakwara na ndị Igbo dị ike ọrụ nke ukwuu, o siri ike ịhụ onye Igbo ebe ọ na-arịọ arịrịọ ma ọ bụrụ na ahụ na uche ya zuru oke. Kama ha agaa buwe ibu dị ka ‘onye buru’ maọbụkwanụ ndị ‘anamachọọrụ’. Ha na-achọgide ihe ha ga na-arụ oge ọbụla. Ha kpọrọ ngana na ịnọ nkịtị asị. Anọzie (2005) kọwakwara uru ọ bara mmadụ dum itinye aka n’ọrụugbo. N’abụ ya, Ọrụ Ugbo, o kwuru na ọ dị mwute na ndị ọgbara ọhụụ anaghị achọkwa ịrụ ọrụ ugbo, ha achọghị ka aka ha detụ aja, ha na-akwụba mbọ, yiri akpoola n’ụkwụ, na-aga ije ngala, kwụrụ ọnụ agụụ na-arafu onwe ha, chefuo na agụụ na-ebute ohi mana aka niile rụwa ọrụ ohi alaa. Odee abụ a gara n’ihu kọwaa na uru ọzọ a na-enweta n’udummiri bụ na o nweghịkwa onye mmiri na-akọ ma nke e ji asa ahụ ma nke a na-aṅụ aṅụ, mmiri dọju ebe dum. Udummiri abụghị mgbe mmadụ ji atagbu onwe ya n’ahụhụ ije zụta mmiri maọbụ chuwe iyi makana mmiri zoo, ma onye elu ma onye ala agbajupụ mmiri ebe dum. Dịka odeabụ si kwuo ya;

Ndị okenye na ndị arụ na-adịghị …

Ha ga-adịkwa ndụ saa arụ ha?

Odeabụ kwuru nke a makana a bịa n’udummiri, onye àhụ́ adịghị ma onye agadi ga-ahụ mmiri o ji saa ahụ, ha agaghị achọ mmiri achọ makana mmiri zoo, mmiri eju ebe dum.

Na nchịkọta, o mere ka a mata na udummiri dị ngọzi (ahịrị 10). E lee anya, a ga-ahụ ngọzi niile udummiri ji abịa tụmadụ n’ebe ime ka ihe a kụrụ n’ubi too ma mee nke ọma ma mmadụ ma anụọhịa enwee nri oriri. Ndunagum (2006) n’abụ ya ọ kpọkwara Udummiri hụkwara udummiri dị ka ngọzi wee kọwakwaa na udummiri magburu onwe ya na mma. “ọ dị nnọọ ezigbo mkpa’’, na udummiri mekata laa kpam kpam na ụwa ga-emebi makana ọ dị nnukwu mkpa na ndụ mmadụ, na ndụ ụmụ anụmanụ ma n’ihe akụkụ, ọ bụkwa “isi sekpụ ntị n’ihe niile”.

Agwụna (2004) n’abụ nke ya ọ kpọkwara Udummiri kọwapụtara na e wepụ udummiri, agụụ ga-anyụ ma mmadụ ma osisi ma anụ ọhịa ịkpakwụ, ọ bụkwa n’udummiri ka erimeri ji abụ atụrụ tawa. Udummiri nwere uru nwee ọghọm ma ihe dị iche n’abụ Udummiri nke Ezeuko na Anọwaị (1989) dere bụ na ọ gbadoro ụkwụ naanị n’ọghọm a na-enweta n’udummiri. Ọghọm ahụ bụ na ọ na-ejide okporoụzọ na ụgbọala mmadụ zụtara mebichaa. N’ime ihe dum a kọwapụtara gbasaara udummiri, ihe pụtara ihe bụ na ọ bụ oge e ji agba mbọ, chue uchu, ma kọnye ihe n’ala ka o wee mịtara onye ahụ ezi mkpụrụ. Udummiri bụ enyi ndị ọrụ ugbo. Agwụna (2016) kọwara na nnukwu ihe na-efunarị obodo anyị bụ Naịjirịa ma anyị leghara ọrụ ugbo anya makana ọrụ ugbo ga-enye aka belata ụbịam, mechapụtara anyị ego, mee ndị ntorobịa na-akwụgharị, enweghị ọrụ, ha e nwee ọrụ soro na-akwalite obodo, na-enye ụmụ ogbenye nri ma belata ihe isi ike, nhụsi anya, na obi mwute na-esite na mmadụ ibu ọnụ. Nke a bụ eziokwu makana mmadụ iwere agụụ nabaa ụra n’erighị nri ọbụla maọbụ edetụghị mmanụ ọnụ bụ ihe juru obodo anyị taa. Mba ọbụla ga-akawa ahụ chighaa azụ jee makụọ ọrụ ugbo. Nke a ga-eme ka nri bụrụ nsị ọbọgwụ ma tinyekwara mmadụ ego n’akpa.

 

Nka E Ji Dee Abụ Udummiri

Ọtụtụ atụmatụokwu ka odee ji chọọ abụ ya mma iji maa atụ:

 

Nkwunwe: Ahịrịokwu ndị a ka e kwunwere ugboro ugboro iji mee ka abụ dị mma ọgụgụ na ntị dịka:

  • ‘Udummiri apụla’

Onye ọbụla jikerekwa (Ahịrị 1, 2, Ahịrị 7, 8, Ahịrị 13, 14)

  • Udummiri apụla

Onye ọbụla lezikwa anya (Ahịrị 4, 5, Ahịrị 10, 11, Ahịrị 16, 17)

E lee anya n’ahịrịokwu nke mbụ pụtara n’ahịrị 1, 2, Ahịrị 7, 8 na Ahịrị 13, 14 ebe ahịrịokwu nke abụọ pụtara n’ahịrị 4, 5, Ahịrị 10, 11 na ahịrị 16, 17. Nke a mere ka ọ dịka egwu, tọọ ụtọ na ntị. E gosipụtara nkwunwe ọzọ n’ebe a:

Lee…   (Ahịrị 25)

Lee … (Ahịrị 23)

 

Mbụrụ: Nke a bụ atụmatụokwu na-ekwu ihe ihe bụ kpọm kwem. Ịmaatụ:

  • Nke a bụ uju na obi ụtọ (Ahịrị 28)
  • Iwe gị bụ nke efu (Ahịrị 38)

Ajụjụ Nzaraonwe: Ajụjụ nzaraonwe bụ atụmatụokwu nke a jụrụ ajụjụ mana ajụjụ ahụ achọghị ọsịsa. A jụrụ ya iji bupute ebumnobi odeabụ na ihe ọ chọrọ ịkọwa nke ọma. Ịma atụ:

  • Olee maka ndị ụkọ mmiri? (Ahịrị 30)

Ndị okenye na ndị arụ adịghị

Ha ga-aṅụkwa mmiri?

Ha ga-adịkwa ndụ saa arụ ha? (Ahịrị 30 – 34)

  • Okwu e bitere ebite: Odeabụ ji okwu e bitere ebite na Bekee ‘hambọrọda’ (umbrella) wee mee ka ihe a na-ekwu tọọ ọchị. Ọ kaara ịkpọ ya ihe ‘nchemmiri’ mana ọ kpọrọ ya na Bekee ma dee ya etu ọ ga-esi tọọ ọgụụ ụtọ na ntị.

 

Ọkọchị

Ọkọchị abịala

Anyị agbakọrọla

Ọkọchị abịala

Ala adịla korokoro

 

Ọkọchị abịala

Ụjọ mmiri alaala

Ọkọchị abịala

Ọdịda ụlọ akwụsịla

 

Ọkọchị abịala

Mkpụrụ osisi achachaala

Ọkọchị abịala

Ụmụ nnụnụ efegharịwala

 

Ọkọchị abịala

Njem adịla mfe

Ọkọchị abịala

Ọṅụ adịla ebe niile

Ọkọchị abịala

Enyi ụwa dum

Ọkọchị abịala

Obi adịla m ụtọ                                    (Echebima, G. N. 2001)

 

 

N’abụ Echebima bụ Ọkọchị, o gosipụtara ihe ndị dị mma na ndị adịghị mma dị n’ọkọchị. Ọkọchị bụ ihe Chineke kere dị ka o siri kee udummiri. Oge nke ọbụla ruo, ọ rụa ọrụ dịịrị ya. Isiokwu ndị a pụtara ihe n’abụ a:

  1. Ọtụtụ uru dị n’ọkọchị
  2. Ịghọrọ mkpụrụ ubi
  3. E kere ọrụ eke

Odeabụ gbadokarịrị ụkwụ n’uru dịga n’oge ọkọchị. Ọ bụ n’ọkọchị ka ala ji akpọ nkụ sichaa ike makana udummiri alaala. Ịtụ ụjọ ụlọ mmadụ ịda nke na-adịkarị n’udummiri ma ikuku mmiri na-eku na ide iburu ụlọ mmadụ adịghịzị, ya mere ụjọ adịghịzị. A bịa n’okporo ụzọ ebe dum adịla mma. Mgbe mmiri na-ezo, ụzọ dum mebichara, tiwachaa, mmiri dọjuchaa ụzọ ma mebichaa okporo ụzọ niile mmadụ si aga.

N’ọkọchị, njem na-adị mfe n’ihi na ụzọ dị mma. Ọ bụkwa mgbe a ka ụmụ nnụnụ igwe ji efegharị na-atụrụ ukwu na-enwere aṅụrị makana ọ bụrụ mgbe mmiri na-ezo, ha ga-alakpucha. Ọṅụ na-adịkwa n’oge ahụ n’ihi na ụjọ niile mmadụ na-atụ n’oge udummiri alaala dị ka – mmiri ịma mmadụ n’ụzọ ma o mewe njem, mmiri ịma ndị na-eme mmemme dị ka ịgba nkwụ, ịgba akwụkwọ, ịkwa ozu, asọmpi/egwuregwu bọọlụ w.d.g. Oge a na-akanye ihe mmemme bụ n’oge ọkọchị, ụjọ mmiri anaghị atụ ndị mmadụ n’ihi na ha maara na mmiri agaghị emebiri ha ihe. Ọtụtụ ndị mmadụ na-akpachara anya chere ka udu mmiri laa tupu ha akanye ihe ọbụla bụ mmemme ka mmiri ghara ịghasara ha ihe na mmemme ha. Onye ji ụgbọala maọbụ ụgbọelu eme njem agaghị atụ ụjọ mmiri, ụkọ ide iburu mmadụ, ụjọ egbe eluigwe maọbụ ụgbọala imebi n’okporoụzọ adịghị. Ndị ngwa ahịa ha dị n’ahịa anaghị atụkwa egwu maka ọwa mmiri tiwara baa ebe ha dọwara ngwa ahịa ha dịka a na-ahụ n’afọ ọbụla ma oke mmiri ozuzo zoo. Ụjọ mmiri adịghịkwa na ụmụaka jere akwụkwọ nwere ike jewe maọbụ lọtawa akwụkwọ mmiri zoo, o buru ha. Ọ bụ ihe ndị a ka odeabụ lechara anya wee kwuo na “Ọkọchị abịala, enyi ụwa dum” (ahịrị 18). Ọ bụ enyi ụwa dum makana ọkọchị abụghị udummiri nke na-ebunwu ụlọ ma burukwa mmadụ, nke na-ejide okporo ụzọ ma ụgbọala ọhụrụ pịtọkọchaa mee ebe niile ọ na-asọ oyi. Mgbe ọkọchị bịara njem adị mfe, okporo ụzọ dum adịchaa larị n’enweghị mpịtọ ọbụla. Odeabụ kwukwara sị na

Ọkọchị abịala

Mkpụrụ osisi achachaala

Ọṅụ adịla ebe niile (ahịrị 10 & 16)

 

Ihe nke a gosiri bụ na mkpụrụ ahụ a kụrụ n’oge udummiri amịchaala, mkpụrụ osisi wee chaa. Onye a kụnyeghị ihe ọbụla n’ubi n’oge udummiri ọ gaghị enweta mkpụrụ osisi ga-achara ya ma ya fọdụ nke ọ ga-aghọrọ. St. Paul kwuru sị, “Onye ọbụla arụghị, ya erilaa”. Ọ bụ nkụ onye kpatara n’ọkọchị ka ọ na-anya n’udummiri. N’oge udummiri ka ndị kọrọ ihe na-ewere ihe ubi – ji, ede, ụdara, ube, icheku, na-ejupụta ebe dum. Ọṅụ adịkwa ebe niile. Onye di ike rụọ ọrụ ya n’oge udummiri, ọkọchị rue, obi adị ya ụtọ makana a rụọ n’anwụ, e rie na ndo.

Onye ọbụla gbawa mbọ n’ụwa ma nwoke ma nwaanyị makana ọkụkụ hapụ kwọm kwọm, ọ ga-eji gịnị wee zụọ ụmụ ya. A na-ewere ehihie chọwa ewu ojii n’ihi na chi jie, agaghị ahụkwa ya. Oge anaghị eche mmadụ. Mmadụ kwesịrị iji n’oge mee ihe mgbe o kwesịrị ka e mee ya n’ihi na ohere ihe ahụ gaa, ọ gaghị enwezị isi. Ezeuko na Anowai (1989) n’abụ ha – Ọkọchị, kọwara na oge ọkọchị bụ oge ọsịsọọ, ọ na-ebutekwa agụụ mmiri, mee ka aka gharakwa ịsọ oyi. Ọkọchị na-eme ka ndị ọrụ ugbo nọrọ nkịtị, mee ka mkpụrụ ihe a kụrụ n’ubi kaa aka. Ndị odeabụ a na-ekwukwarịị otu ihe gbasara ọkọchị. Ha gbadokwara ụkwụ na mkpa ọ dị mmadụ iji oge a na-arụ ọrụ rụọ ọrụ ọ ga-abụ a bịazie n’ọkọchị, onye ọbụla aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ, erimeri abụrụ nyafụ nyafụ. Ya mere ka onye ọbụla ghara ịnọ nkịtị n’oge a na-akụnye mkpụrụ n’ubi n’oge udummiri makana onye nọrọ nkịtị, agụụ egbuo ya, onye nọrọ nkịtị, agụụ anara ya ụra rahụ. Onye umengwụ ọbụla kulie n’ụra makana onye nọdụ kpukọba aka, ihe ụkọ abata onye ahụ aghọọ ọgbanje. Onye maara ihe na-eji n’oge eme ihe ka oge ghara ịganarị ya. Ebe ihe ọbụla nwere oge – oge udummiri, ọkọchị, ụtụtụ, abalị, oge ịkọnye ihe na iwere ihe ubi, onye nwere uche ga-eji oge ya kpọrọ ihe mata na mmiri dọ n’eju dọọrọ nwa nkịta. Afọ ekweghị ụkwụ zuru ike. Ya mere, onye tara ahụhụ rụọ ọrụ dịịrị ya, gbaa okpofufu, ezughị ike n’oge udummiri agaghị emekata kwaa ‘m gaara mara’ maka nri ga-ejupụta ebe dum. Ihe onye chutere n’udummiri ka ọ ga-eri n’ọkọchị. Nkụ a kpara n’agbọghọ ka a na-anya n’agadi. Ihe ụwa bụ ka onye siri tọọ ute ya, ka ọ ga-esi rahụ na ya.

Anozie (2005) n’abụ ya Ọrụ Ugbo nyere ọhanaeze ndụmọdụ sị:

Dike maara ihe jiri aka chịrị aja

Jiri umeala na nrube isi pịkọba aja..

Ngana ajọka…

Aka niile gaba n’aja

Aka niile gburibe aja

Aka aja aja

Ọnụ mmanụ mmanụ (ahịrị 2, 3, 25, 35 – 38).

N’oge ugbua, ọ na-enu onye ọbụla ka ọ kpata ego, ma ụzọ e siri kpata ego ahụ o ziri ezi ma o zighị ezi, agụụ, oke ọchịchọ na inweta ego, maọbụ akụ n’ataghị ahụhụ bụ ọrịa anyị na-arịa taa. Ya mere onye ọbụla kulie mara nke ọ ga-arụ ka ọ rụwa ya ozigbo ụgbọ emee ghara ya n’elu ụwa a. N’ụtụtụ ụtụtụ, ụkụkọ akpajuo afọ, ọkụkọ bọọ abọọ o rie e rie. Onye nwere ntị, ya nụrụ.

 

Nka E Ji Dee Abụ Ọkọchị

Odeabụ ji ọtụtụ atụmatụokwu dị iche ichewee chọọ abụ a mma. Ịmaatụ:

Nkwunwe:       Odeabụ kwuru na ‘ọkọchị abịala’ ugboro iri na abụọ (ahịrị 1, 3, 5, 7, 9, 11, 13, 15, 17, 19)

Ọkọchị abịala (ahịrị 3)

Ọkọchị abịala (ahịrị 7)

Ọkọchị abịala

Ọkọchị abịala (ahịrị 9, 11, 13, 15, 17, 19)

Nke a mere ka abụ nwee ndakọrịta n’ahịrị, mee ka ọ tọọ ụtọ na ntị.

 

Mmemmadụ: Atụmatụokwu bụ nke na-ewere ihe enweghị ndụ mee ya o nwee ndụ dịka ọ bụzị mmadụ. Ịmaatụ:

  • Ọkọchị abịala

Ọkọchị enweghị ụkwụ o ji aga ije mana e mere ya ka o dị ka mmadụ nke a na-ekwu na ọ bịala.

  • Ọkọchị abịala

Enyi ụwa dum (ahịrị 17 & 18)

Ọkọchị abụghị mmadụ nke na-enwe enyi mana a kpọrọ ya enyi mmadụ niile. Ọ dịka a ga-asị na ọ bụ mmadụ nke na-enwe enyi.

 

Egbeokwu: Atụmatụokwu a na-eme ka ihe e kwuru bue isi karịa ka o kwesịrị. Ịmaatụ: ‘Enyi ụwa dum’ (ahịrị 18). O nweghị ihe ọbụla ga-abụrụ ụwa dum enyi. O siri ike.

 

Bịabịamụdaume: Atụmatụokwu a na-ekwunwe mkpụrụ ụdaume yitewere onwe ha ugboro ugboro mee ya ọ na-aga were were n’ọnụ. Ịmaatụ:

  • kch abịala

Any agbakrla

  • kch abịala

Ụjọ mmiri alaala

  • kch abịala

Ọṅụ adla ebe niile

 

N’ebe a ụdaume ndị a pụtawagara ihe – ọ, a, u, ị

 

Nsinụụda: Atụmatụokwu a bụ nke e sitere n’ụda ụdara wee mebe okwu ahụ. Ịmaatụ: “Ala adịla kọrọkọrọ” – Kọrọkọrọ a gosipụtara ala kpọrọ nkụ.

 

Etu Abụ Ekere – ‘Udummiri na Ọkọchị si Metụta Mmụta

            N’abụ ekere, a na-egosipụta ihe dịgasị mma n’ihe Chineke kere ma na-ekwukwa otu ihe dị ọkpụrụkpụ – na ihe niile e kere nwere ọrụ e kenyere ha ka ha rụọ. E lezie abụ ekere ndị a, a ga-ahụ ebe ndị odee abụ na-ekwu otu okwu ahụ gbasaara “ọrụ e kere eke”. Ịma atụ, Ogunjiofor (1975) n’abụ ya Osisi na Ndụ Anyị kọwara na

Ọrụ e kere eke mara mma

            Akwụkwọ rere ere zụọ ala

            Ala a zụrụ azụkwaa nri (ahịrị 27 – 29)

Echebima (2001) n’abụ ya, Ọkọchị dere, “Lee ka Chukwu si kee ihe niile, o kee abalị, kee ehihie, kee anwụ, kee ọnwa na kpakpando, nke ọbụ;a n’ọrụ nke ya (ahịrị 1 – 4).

Ndunagum (2006) n’abụ ya Anyanwụ kọwara na anyanwụ anaghị ehi ụwa; ọ na-arụgide ọrụ ruo abalị (ahịrị 11 – 12), Echebima (2001) n’abụ ekere ya – Kpakpando kwuru na Chineke kere nke ọbụla n’ọrụ ya, dịka e siri nye ya ike nke ya (Ahịrị 18 – 19).

A gbado ụkwụ n’abụ abụọ ndị a Echebima dere – Udummiri na Ọkọchị, a ga-ahụ amamihe dị ya mgbe o kwuru maka udummiri sị, ihe ọbụla Chukwu kere nwere ọrụ ya na oke ya (ahịrị 22 – 23). Ọ bịakwara n’abụ Ọkọchị kwuo sị,

 

Ọkọchị abịala

Ụjọ mmiri alaala (ahịrị 5, 6)

 

Nke a gosiri na o nwere oge ọkọchị ji abịa na oge udummiri ji ala. Ebe e kere ọrụ eke n’ụwa, ọ dị mkpa ka onye ọbụla rụọ ọrụ nke ya ka agamnihu na udo wee chịa.

 

Ụmụakwụkwọ

A bịa n’ụlọakwụkwọ, ọ bụ ọrụ nwata akwụkwọ ịgụsi akwụkwọ ya ike, a na-akụzi ihe ọ na-ege ntị, mee ihe omume n’ụlọ, na-etinye uchu, na-amụ anya abalị wee na-eleba anya n’ihe a kuziri. E rue n’oge ule, nwata ahụ ga-aghọrọ ezi mkpụrụ maka ọ rụrụ ọrụ dịịrị ya. Ọ ga-emekwa nke ọma n’ule ya. Mana nwata akwụkwọ were oge ya na-ala n’iyi, na-akụgharị asịrị, na-aga ebe a na-agba awantịlọ na awịlo, ọ naghị anọ n’ụlọakwụikwọ, oge ọbụla o si Ọnịcha, ọ gaa Legọọsị, o si ya gaa Abuja ma obodo oyibo. Ebe ọ na-esogharị ndị ga-enye ya ego. Onye ahụ ọ na-arụ ọrụ kwesịrị ka ọ rụọ? Ndị ntorobịa na-ekponye mmanya n’afọ, na-amị anwụrụ ọkụ, na-ebi ajọ ndụ, soro n’otu nzuzo wee na-eme nke a sị sị emela eme, na-emebisi onwe ha chee na ha wara anya nke ukwu ma ha amaghị na nwa ọkụkọ na-erekpe ọ sị na ya na-agbapụta mmanụ. Onye dị otu a, ọ na-arụ ọrụ ya? A gbachaa egwu, ọ laa n’ukwu.

 

Ndịnkuzi

Onyenkuzi ọbụla a zụrụ azụ na nkuzi kwesịrị ịkwado ihe ọ ga-akụzi akwado, bịa kụzie ya n’oge. Ọ bụrụ na o nwere ndị agwa ụmụaka a hanyere ha n’aka adịghị mma, ọ bụ ọrụ onyenkuzi inye ha ndụmọdụ kwesịrị ekwesị ma gbaziere ha ụzọ. Ọ bụrụ ụmụakwụkwọ praịmarị maọbụ sekọndịrị, e nwere ike pịa ha ihe ma ha mee ihe ekwesịghị mana ọ bụghịkwa n’ụdị imerụ onye ahụ ahụ maọbụ ịkụ ha ụtarị n’isi maọbụ nke nkụgbu. Ọ bụ ezie na ugbua dịka Anedo (2010) siri kọwaa na ọtụtụ ndị nne na nna na-agazị eje akpọrọ ndịnkuzi pịara ụmụ ha ụtarị ndị uweojii. Ndị na-eme etu a ha amakwa na otu onye adịghị azụ nwa. E kwuru n’okwu sị, onye hụrụ ọkụkọ ebe ọ na-abọ nsị ya chụpụ ya n’ihi na ọ maghị ma e gbue ọkụkọ ahụ ma sie ya, ka ọ bụ ya ga-ata ụkwụ ya. Ịzụ nwata bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla; ọ bụghị naanị ọrụ ndị mụrụ ha. Akparamaagwa onyenkuzi kwesịrị ịdị mma nṅọmị. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-ewe omume ndịnkuzi ha dịka nke kwesịrị ha, ihe ha hụrụ onye nkuzi mere, ha emee ozigbo. Ọ bụ ya ka o ji dị mkpa na ha na-eduzi, na-akụzi ma na-ahaziri ụmụaka a hanyere ha n’aka ụzọ ziri ezi ma na-egosipụtakwara ha etu ha ga-esi wee na-esonye nke ọma n’ihe e dewere n’iwu. Ezi aha ka ego.

N’ụlọakwụkwọ dị elu ugbua, tụmadị na mahadum, ọtụtụ ndịnkuzi na-anakọ ụmụakwụkwọ ego ka ha wee gafee n’ule n’agụghị akwụkwọ ọbụla. Ụfọdụ ndị nwoke a eduru ụmụakwụkwọ ha ndị nwaanyị labaa n’ụdị inwe mmekọrịta naanị ka e wee gafee ha n’ule n’ihi na ha achọghị ka ha daa n’ule. Ụdịrị ọrụ a ọ bụ ọrụ e kenyere ha ka ha rụọ? Agwụna (2014) tụrụ alo wee kwue na ndị ọchịchị kwesịrị ileba anya tụmadụ n’ụlọakwụkwọ mahadum wepụta ndị ga na-ahụ maka etu ọtụtụ ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị si eje ala, n’ụdị iweta ego maọbụ inwe mmekọrịta tupu ha agafee n’ule. A ga-atakwa ụdị ndị a ahụhụ ka ugwu na nsọpụrụ wee werekwa ọnọdụ n’ụlọakwụkwọ dịga elu.

 

Ndị Nne na Nna

Akwụkwọ nsọ sị, “zụlite nwata n’ụzọ ọ ga-esi dị mgbe o mere okenye, ọ gaghị esi n’ime ya wezuga onwe ya” (Pro. 22:6). A ga-ebido na nwata kụziwere ụmụaka mkpa ọ dị ige okwu Chineke ntị ka ihe ụwa wee gaara ha nke ọma. Taa egwu adagharịala. Site n’oke ihe isi ike dị taa, ọtụtụ ndị nne na nna hapụrụ ndịnkuzi na ụmụodibo ka ha zụwaziere ha ụmụaka. A naghịzị eleru ụmụaka anya etu o kwesịrị. O gosiri na ọ na-eleru nwa ya nwaanyị anya dịka nna. Mana taa, ọtụtụ ụmụagbọghọbịa na-agbara ọtọ sị na ha yi akwa pụọ ma ndị mụrụ ha agaghị abara ha mba maọbụkwa nye ha ndụmọdụ. Ụwa wee na-aghatọkọ. Nne chụrụ ego gbagoo, nna achụrụ nke ya gbadaa. Ihe a wee bụrụ nnukwu agbatauhie n’obodo anyị taa. Ọ bụ makana ụmụntorobịa ugbua enwetaghị ezi ọzụzụ n’aka ndị mụrụ ha ka ọtụtụ jiri ghọọ ndị ‘o ji egbe ezu,’, ndị abalị dị egwu’, ‘ndị ntọrị’, ‘ndị na-aṅụ anwụrụ ike’ ma ndị na-eme na obodo adịghị mma taa. Ha enweghị nsọpụrụ na egwu Chineke, ha enweghị afọ ojuju, ha enweghịkwa egwu n’ihe e tiri n’iwu, ha wee na-akpa agwa ka o siri masị ha. Ọtụtụ ndị nne na nna leghaara inye ụmụ ha okwu ndụmọdụ na ezi ọzụzụ n’ihi na ọ bụ agwa ha na-akpa ka ụmụ ha na-eṅomi makana nne ewu na-ata agbara nwa ya a na-ele ya anya n’ọnụ. Ihe agwọ mụrụ ga na-eto ogologo. Ka o sila dị, ọ ga-esi taa dịwa mma ma ndị nne na nna laghachite azụ n’ọrụ ha, zụọ ụmụaka Chineke nyere ha ezi ọzụzụ.

Ọzọkwa, nne na nna ndị anaghị akwụrụ ụmụaka ha ụgwọ akwụkwọ n’oge anaghị eme nke ọma makana a bịa n’oge a ga-ele ule akwụkwọ, a chụpụ ha n’ezi. Nke a bụkwa ihe na-enye ụmụaka nsogbu. Onye mụọ ya zụọ.

 

Ndị Gọọmentị  

     Ndị gọọmentị na-achị obodo anaghị enye ndị gụchara akwụkwọ ọrụ, ha wee na-agagharị ka atụrụ enweghị onye nche. Ha ga-agba nnukwu mbọ na-ewube ụlọọrụ iji nyere ndị gụchagoro akwụkwọ aka inweta ọrụ. A ga-agba mbọ laghachị azụ n’ọrụugbo, kwalite ya n’ụdị ga-eme ka onye ọbụla nwee mmasị, tinyewe aka na ya, tụmadị ndịntorobịa gụchagoro akwụkwọ chọkata ọrụ oyibo ma ha abụghị. Nke a ga-eme ka ha ghara ịnọ nkịtị. O nwere mgbe ha na-eji ndịnkuzi ụgwọ ọnwa ọtụtụ oge, Ọ na-adị mwute na ndị lagoro ezumike ọrụ na-anọ ọtụtụ afọ tupu ndị gọọmentị akwụọ ha ụgwọ ezumike ọrụ. Nke a bụ ahụhụ nyeere ndị agadi na-ezu ike ọrụ ha rụchagoro. Ndị na-achị achị kwesịrị itinyekwuru ndịnkuzi ego n’ụgwọ ọnwa ugbua ihe dum tinyechara ego. Nke a ga-enye onye ọbụla obi aṅụrị.

 

Alo

Site na nnyocha e mere n’abụ ekere ndị a – Udummiri na Ọkọchị ndị Echebima dere, a chọpụtara na ihe ọbụla nwere ọrụ e kenyere ya n’elu ụwa. Udummiri rụọ ọrụ ya, ala adị nro, mmadụ akọnye nri n’ala, ọkọchị rụọ ọrụ ya, mkpụrụ a kụrụ n’ubi achaa, mmadụ aghọta mkpụrụ ọ kụrụ. Mmadụ anaghị anọrọ nkịtị nri e si n’eluigwe daa. Ọrụ ọbụla a hanyere mmadụ n’elu ụwa kwesịrị ka ọ rụọ ya nke ọma maka agamnihu nke onwe na nke ọha obodo. Akwụkwọ nsọ sị “Onye matara ime ihe ọma ma o meghị ya, ọ bụụrụ onye ahụ mmehie (James 5:17). Onye mara ihe o kwesịrị ime, ya mee ya. Ịma atụ, dibịa Bekee rụọ ọrụ ya, ndị ọrịa agbakee, ha arụghị, ndị mmadụ anwụsịa. Onye uweojii, onye ọkaikpe, ndị na-azụ ahịa ka a na-agwa ka onye ọbụla ghara iji ihe ọ na-arụ wee gwuri egwu. Onye churu uchu ga-enweta uru, onye echughị, agaghị enweta. Nwataakwụkwọ gbasie mbọ ike, ọ baara onwe ya uru baara ndị mụrụ ya na ọha obodo uru. Ndịnkuzi rụọ ọrụ ha nke ọma, ọ baara ha, ha enwetakwa ngozi Chineke. Nne na nna zụọ ụmụ Chineke nyere ha nke ọma, ha erie uru dị na nwa. Ndị gọọmentị rụọ nke ha, udo na ọṅụ eju mmadụ obi. Onye ọbụla rụọ ọrụ dịịrị ya dịka udummiri na ọkọchị si arụ nke e kenyere ha.

Ọzọ, anyị ahụla na a na-amụta ọtụtụ ihe n’abụ, nke ga-eme ka amamihe mmadụ na-abawanye. Ka anyị ghara ileghara ya anya gaa tinyekarịa anya naanị n’iduuazị na ejije makana ihe omimi na mmụta dị egwu jupụtara n’ihe ọmụmụ abụ. Iji wee kwalite ọmụmụ agụmagụ, a ga-ebido na praịmarị wee kụziwere ụmụaka ihe ọmụmụ abụ, etu ahụ e si akụziri ha agụmagụ ejije na iduuazị, ọ ga-abụ ha rue sekọndịrị na mahadum ọ na-adịzịrị ha mfe na nghọta. E mee nke a, a ga-esikwa na mmụta e nwetara n’abụ wee dozie obodo, ihe e wee na-agakwa were were.

 

Mmechi

Iji wee kwalite agụmagụ abụ Igbo ma mee ka ndị mmadụ nwee mmasị ịmụ agụmagụ abụ Igbo, a na-agwa ndị mmadụ ka ha kabakwa ahụ gaa n’ihu bido mewe nchọpụta dịgasị iche iche n’ọtụtụ abụ ndị ọzọga dị omimi ma na-arụtụkwa aka n’ihe ga na-akụziiri ọhanaeze ezi uche, ezi akparamaagwa na amamihe dị oke ọnụ dịka e mere n’Udummiri na Ọkọchị. E mee nke a amamihe ndị mmadụ ga-abawanye n’ike n’ike.

 

 

Edensibịa

 

Achebe, C. (1958). Things Fall Apart. London: Heinemann.

Agwuna, S. O. (2014). “Inyocha Abụ Ime Mpụ na Ngana Dịka Enyo E Ji Ahụ Ụwa Taa. In Anedo, A. A. & Udemmadụ, T. N. (Eds). Ekwe Jọnal. Vol. 2 Awka: Besing Book.

Agwuna, S. O. (2014). Echiche Amamihe. Onitsha: Lincel.

Agwuna, S. O. (2014). Okwu A Kpụnọnụ: Oke Ọchịchọ, HIV/AIDS, Ụmụnwaanyị Isonye na Ndọrọndọrọ Ọchịchị”. In Agwuna, S. O. & Anidobe, C. J. Igbo Amaka Akwụkwọ Igbo G. S. 2. Onitsha: Veritas.

Agwuna, S. O. (2016). “Transculturalism: Reflections on Selected Igbo Poems”. In Nwankwo, B. C. et al, International Bi-Lingual Journal of Anti-Corruption, Law, Humanities, Social Sciences and Development Studies (IBJACLASSDS). vol. 7, No. 1. Onitsha: Golden Value.

Akunne, J. J. C. (2011). Igbo Philosophy & Genealogy: The Place of Fade ATAN ANIH. In Chronicles of Igbo Philosophers. Onitsha: St. Stephen.

Anedo, A. A. (2010). “Nkwenye ndị Igbo n’Ịzụlite Nwa n’Ụzọ Omenaala” In Osinomumu, E. C.. Ibiowotisi, B. R., Agwuna, S. O., Ekwealor, C. C. Readings in Igbo & Other Nigerian Languages. Onitsha: Midfield.

Anozie, C. C. (2005). Uche Bụ Akpa. Onitsha: Varsity.

Echebima, G. N. (2001). Akọ na Uche. Ibadan: Evans Brothers.

Ekechukwu, E. M. (1975). Akpa Uche. Ibadan: UPL

Emenanjo, N. E. (1979). Ụtara Ntị. Ibadan: Evans Brothers.

Ezeuko, R. O. & Anowai, J. I. (1989). Echiche, Onitsha: Elite.

https://en.m.wikipedia.orgdryseason.retrieved 2006

Ndunagum, U. (2006). Anyanwụ. In Nwadike, I. U. Akọnuche. Onitsha: Pacific.

Nwadike, I. U. (2006). Akọnuche. Obosi: Pacific.

Ogunjiofor, M. C. (1975). “Osisi Na Ndụ Anyị”. In Ekechukwu Akpa Uche. M. C. Ibadan: University Press.

Uche, O. (2009). “The Poet As A Wise Man”. In Eyisi, J. Odimegwu, I., Ezenwa-Ohaeto, N. (Eds.). African Literature and Development In the 21st Century. Owerri: Living Flames.

www.goggle.com.ng.indiacetebralnig.com.retrieved2016.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Mmekọrịta Jenda, Nzọkọta na Ikikere Ọchịchị: Mpụtara Ndịna Nkọkịrịkọ Igbo nke Nne Mgbaafọ na Nne Inyang Ọlụgụ

 

Ikeokwu, Enyinnaya Samuel

na

Ezebube, Chinedu

Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

enyinnaya.ikeokwu@unn.edu.ng; chinedu.ezebube@unn.edu.ng

08066736976; 070305565592/08171253789

 

Ụmịedemede

E kwuola nta na imo gbasara nsonye ụmụ nwaanyị n’ọchịchị ime obodo na nke mba ụwa. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụrụ na ụmụ nwoke kwado ụmụ nwaanyị, ha ga-eme nke ọma n’ọchịchị na nchịkwa karịa ụmụ nwoke. Ya mere, ha ji na-agba mbọ ma na-atụkwa anya ịnọ n’ọchịchị ma n’ogo ezi na ụlọ ma n’obodo. Ndị ọzọ, n’aka nke ọzọ, na-ekwu na ụmụ nwaanyị esighi ike ọkpụkpụ aka nakwa n’obi, ya mere ha agaghị akwudosi ike na nsogbu ma ọ bụ nramahụ dị n’ọchịchị. Ọ bụ n’ihi echiche ndị a ka akwụkwọ a ji wee na-elebanye anya n’echiche nke ọchịchị ka mma nke ụmụ nwaanyị na-eweta karịa ụmụ nwoke site n’iji atụmatụ Ntụcha Ụbụbọ Mpụrụiche (Critical Discourse Analysis, CDA). Nchọcha a na-elebanye anya n’akọmakọ nkọkịrịkọ nke ụfọdụ ụmụ nwaanyị nọ n’ọchịchị na ntụlekọrịta ha na agwa di ha na agwa ụmụ nwaanyị na-achị ọchịchị kensonye, ụmụ nwoke na-achị ọchịchị nke ngụpụ. Ya mere, anyị na-achịkọta na usoro akọmakọ ụmụ nwaanyị nke emume na nkiri na-abụkarị nke na-anara ndụmọdụ karịa nke ụmụ nwoke nke na-adịkarị n’ụdị akaike na nke anabataghị ndụmọdụ.

 

Ọkpụrụkpụ okwu: Jenda, Ọchịchị, Ikikere Ọchịchị, Nkọkịrịkọ Igbo, Ntụcha Ụbụbọ Mpụrụiche

 

Mkpọlite

Ọchịchị dịka ihe a na-ahụ n’ebe ọ bụla mmadụ topụtara ma ọ bụ hụrụ onwe ya, bụ ihe ọ bụla e mere maka nhazi ma ọ bụ mkpakọta onwe mmadụ na gburu gburu ya. Ọ na-arụ ọrụ ka ihe nṅomi, ntụgharị uche tinyere ikikere na nlere anya maka mmepe, agamnihu na udo nke obodo. E nwere ike ịkọwa ọchịchị dịka ụzọ e si eduzi ndị mmadụ maka iru ebe a chọrọ iru ma ọ bụ inweta ihe a na-achọ na ndụ obodo ọ bụla. Ọ gụnyere mkpokọta, mmetụta, nkwagide, nhazi na mgbanwe agwa ndị ọzọ ndị bụ ndị na-eso ụzọ maọbụ ndị a na-achị. Ya mere, ọ bụrụ ọchịchị, a gaghị enwe obodo; ọzọkwa, ọ bụrụ na e nweghi obodo, a gaghị enwe ọchịchị. Ndị na-eso ụzọ nakwa onye ndu bụ ihe dị mkpa inwe ka ọchịchị wee were ọnọdụ. Ka o sila dị, ndị Igbo na-eweta ihe ndịiche n’etiti onye ndu na onye ọchịchị. Chemers (2000) kọwara na ọchịchị, o pekata mpe na-anọ n’anya ndị na-eso ụzọ. Ọzọ, ọkwa ọchịchị n’obodo abụghị ihe ndị mmụọ na-anọ, kama ọ bụ ihe ndị mmadụ na-anọ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Ya bụ, e nwere ahụghị ebule ma sị elila dike nke jenda na ọchịchị n’obodo mmadụ nọ na ya. Nwobodo (2008) kwuru na jenda na ọchịchị dịka echiche gbadoro ụkwụ n’ajụjụ abụo: kedu ihe na-akpata ndịiche n’etiti nwoke na nwaanyị na ndị na-ewere ọkwa ọchịchị nakwa n’ime akparamagwa ọchịchị; kedu ka ọchịchị siri bụrụ echiche nke jenda? Nke a ga-eduba anyị n’ime nkọwami ihe jenda pụtara na ka e si ahazi ya.

Haavind (1994) hụrụ jenda dịka akpụrụakpụ mgbanwe kenjikọ ma gakwaa n’ihu ikwu na ụdịdị mgbanwe mgbanwe ya bụ nke a na-ahụ n’ọnọdụ ebe ha dị iche n’ime omenala. Ọ kọwara na, e nwere ike ịhụ ọmụmaatụ n’ọtụtụ omenala ndị ọcha ebe a na-ahụ jenda dịka ndịiche gbara ọkpụrụkpụ nakwa ihe gbasara ike. Ọ kwadoro na, abụmoke bụ nnọọ ihe a na-akọwa dịka nhagide abụmnne ebe abụmnne bụ mweda nghọta nke abụmoke. Nke a pụtara na, a na-emepụtagharị jenda n’obodo site n’oke na nne. Ya bụ, mmekọrịta ya na obodo na-eṅomi usoro ọchichị dị iche iche dịka jenda dị iche iche si emepụta ha. Hannan (2001) rụtụụrụ aka na jenda dịka ihe e jiri mara obodo ọ bụla na, oke na ọrụ nke ọbụbụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Akparamagwa na oke na ọrụ bụ ihe obodo wepụtara ma na-atụ anya ka e mejupụta ha. Nwobodo (2008) kọwara na jenda pụtaara obodo ọ bụla, omenala na akparamagwa keụbụrụ maọbụ keobi nke na-ahụ mmadụ dịka nwoke maọbụ nwaaanyị ma bụrụkwa ihe na-agbanwe agbanwe site n’omenala gaa n’omenala. Maka mbunuche nchọcha a, naanị ihe mweta mgbanwe abụọ ndị a, obibi ndụ na omenala obodo nwere ike ịkọwa echemeche ma ọ bụ mbunuche mba Afrịka maka jenda. Mana mweta mgbanwe abụọ ndị a ga-abịakọta ọnụ iji kọwaa ma weta mbunuche Afrịka maka jenda na mmezu.

Ebe ọ bụ na agụmagụ na-eṅomi obodo mụpụtara ya, a na-eji akwụkwọ agụmagụ etinyeghachị nkenụdị akparamagwa mmadụ dị iche iche na emume nke na-eweta jenda na ọchịchị. Agụmagụ n’ọnọdụ nghọta a pụtara ọrụ nka ekemekeuche nke na-egosipụta echiche, mmetụta obi na ọnọdụ obi nke omee nka dịka o metụtara gburu gburu ya. Ọ na-esite n’ọchịchọ na ịhụnaanya si n’ime obi ịkọ akụkọ na-egosipụta ihe mmadụ hụrụla n’ụwa nke gụnyere nturuugo na ọdachi. Ya bụ, e nwere ike ikewa agụmagụ n’ụdị ekwurunọnụ ma ọ bụ ederede.

N’akwụkwọ a, ebe anyị gbadoro ụkwụ bụ n’agụmagụ ọnụ, ọ kachasị na nkọkịrịkọ. Agụmagụ ọnụ bụ ọrụ nka si n’ekereuche mmadụ pụta, bụ nke na-adị n’ụdị ekwumekwu nke asụsụ mmepụta ya na-abụkarị n’olundị nwe ya bụ agụmagụ. Nkenụụdị ya gụnyere; nkọkịrịkọ, nkọmịrịkọ, soromchịa na njakịrị, okwu ntụhị, ilu, akụkọ ifo wee gawazie. Okebalama (2003) n’okpuru ihe anyị na-ahụ dịka ‘akọmakọ akụkọala,’ kọwara na e nwere nkọmịrịkọ na nkọkịrịkọ. Okebalama (2003) kewara akụkọ nkọkịrịkọ n’ụzọ nke gụnyere nkenụụdị nke mbụ ka nkọkịrịkọ nke na-ahụ maka nsipuru ihe, ebe nkọkịrịkọ nke ọzọ na-ahụ maka akọmakọ nturuugo na oke ike ndị odogwu kpara, ndị rụrụ ọrụ ọtawaike maọbụ mee ihe na-ekweghi omume. O kewakwara nkọkịrịkọ n’ụzọ ọdịnala na ọlọrọọhụụ maọbụ ugbu a. N’akọrọakọ nkọkịrịkọ ọlọrọọhụụ, ihe na-eme na ndụ agwa nọ n’ime ya na-abụ nke na-ekwe omume karịa nke na-adị n’ọdịnala. Ụfọdụ ndị odogwu ọlọrọọhụụ gụnyere Nnamdị Azikiwe, Ozulumba Mbadiwe, Ọdụmegwu Chukwuemeka Ojukwu, Michael Iheọnụkara Ọkpara na ndị ọzọ. N’ebe ndị odogwu ọdịnala nọ, ihe na-eme na ndụ ha na-abụkarị nke omenanrọ karịa nke a na-ahụ na ndụ, nke na mmadụ nwere ike inwe ọbịbịa agwa nzọpụta (deuụ-eụ-machina) n’akọmakọ ha. Ụdịrị ndị odogwu a bụ Ameke Okoye, Onoja Oboli, Igu nke Mbanọ, Onyeama Amụshị nke Imeezi-Ọwa (Ọmụmaatụ ụmụ nwoke nọ n’ọchịchị), Nne Mgbaafọ, Ojebe-Ogene, Anaedo, Igwuedo, Nwanyereụwa Ojim nke Ọgụ Ụmụ Nwaanyị Aba (Ọmụmaatụ ụmụ nwaanyị nọ n’ọchịchị) na ndị ọzọ. Ebe nchọcha a gbadoro ụkwụ bụ na nkọkịrịkọ ọdịnala. Ya mere edemede a, ji enyocha usoro ọchịchị ụmụ nwaanyị Igbo nọ n’ọchịchị n’akukụ ntụlekọrịta ha na nke ndị ụmụ nwoke Igbo nọkwa n’ọchịchị. Ọ chọkwara ikọwa etu e si egosipụta ọchịchị na jenda n’ihe gbasara ikikere ọchịchị n’akọmakọ nkọkịrịkọ e nwere n’Igbo.

Ntụlegharị Agụmagụ

Nchọcha e mere gbasara jenda na ikikere ọchịchị ọ kachasị n’ihe gbasara ọrụ ụmụ nwaanyị na nsonye n’okwu ọchịchị enwetala ọtụtụ mmasị, n’agbanyeghi na ọ na-agbadokarị ụkwụ n’amụmamụ azụmahịa, nnọchite anya keotu, mmekọrịta ụlọ ọrụ mmepụta akọrọ ngwa na ihe ndị ọzọ yiri ha, ịkọwapụta ngwa ahịa na azụmahịa keonwe. A na-ekwu nke a maka mmasị dị ọsọ ọsọ ụmụ nwaanyị nweterela n’oge na ọgbọ ugbu a, emume dịka nkwalite ụmụ nwaanyị n’akụkụ nke mmadụ nke fọrọ obere ka ọ gazuo ebe niile. Ọzọ, ọtụtụ nchọcha a na-agbadokarị ụkwụ n’ebe ụmụ nwoke na-akpakọrọ ihe niile ha na ụmụ nwaanyị so nwere; na mmegbu ụmụ nwaanyị nke na-agbadokarị nnọọ ụkwụ n’ọchịchị nke ụmụ nwoke bụ nke na-etinye ụmụ nwaanyị naanị n’ọrụ ezi na ụlọ. Chemers (2000) depụtara nkenụdị ndịiche atọ na-apụta ihe n’etiti ndị ndu ụmụ nwoke na ndị ndu ụmụ nwaanyị, bụ ndịiche nke nnatarachi (bayọlọji), ndịiche nke omenala, na mkpebi nke ndokọ. Ndịiche nnatarachi gbadoro ụkwụ na homoonu na usoro ebimndụ mmadụ; ndịiche nke omenala na-ahụ maka ọrụ obodo na ezi na ụlọ nye jenda ọ bụla ebe mkpebi nke ndokọ na-ahụ maka etu ihe si kwụrụ na ndokọ otu.

Barnett (2008) kwuru na site na chi, ndịiche nke ọchịchị a na-ahụ n’etiti nwoke na nwaanyị dị adị, maka na ụmụ nwoke nọ n’isi ma bụrụ ndị ndu mbupụtaụwa ebe ụmụ nwaanyị nọ n’okpuru ma bụrụkwa ndị na-eso ụzọ kemgbe ụwa bidoro. Ọ gara n’ihu ịchọpụta na site n’echiche nke mbupụtaụwa, ụmụ nwoke na-anọ n’isi ebe ụmụ nwaanyị na-akpachara anya. Ya bụ, ụmụ nwaanyị nọ n’ọkwa ọchịchị bụ ndị a na-ahụta dịka ndị yi azụ akwa ma bụrụkwa ndị dara iwu ebe ọ bụ na ha emeghi ihe mbupụtaụwa kwuru. Nke mbụ, ọ tụchara ndụ ọzọdimgba na nhagide anụmanụ bonobo, ebe a na-enwe obodo ụmụ nwaanyị na-achị karịa nke ụmụ nwoke. Ọ rụtụrụ aka na ọzọdimgba ụmụ nwoke nwere ogo ọchịchị okenye ụmụ nwoke dị elu. Barnett (2008) kwuru na ụlọ ọrụ mgbasaozi US emenyerebeghi ụmụ nwaanyị ebe ọ bụ na ha na-ekwunwo echiche ochie na ha enweghi obi, amachaghị ihe, etozughi oke ịbụ ndị ndu nakwa na nnọchite anya, a bịa na ntuliaka ọchịchị, ha adịghị ka ụmụ nwoke. N’ihe gbasara nke a, ọ chọpụtara na mmasị ndị mmadụ na ndị ndu ụmụ nwaanyị na-arị ọsọ ọsọ.  Shvedova (2005) chọpụtara na ogo dị elu nke a na-enye ụmụ nwaanyị na senchuri iri abụọ na otu na-enye ha ikikere nke ọchịchị onye kwuo uche ya, dịka ike nke ntuli aka elu na ịzọ ọchịchị. Obi adịghị ha mma, n’ihi n’ụfọdụ mba ka na-anapụ ụmụ nwaanyị ikikere ọchịchị na nke onye kwuo uche ya. Shvedova (2005:35) depụtara agwara ndị gbara ọkpụrụkpụ na-arụ ọrụ dịka ọgbatauhie nye nsonye ụmụ nwaanyị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha gụnyere:

  1. Nganihu nke ‘usoro abụmoke’ nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke otu gọọmentị a họrọ ọchịchị.
  2. Enweghi nkwado na-esi n’aka otu. Omụmaatụ bụ obere nkwado n’ụdị ego maka ụmụ nwaanyị na-azọ ọchịchị, obere ohere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nye ịmata ndị nọ n’ọchịchị, nakwa ụkpụrụ na ntozu oke tara akpụ e mebeere ụmụ nwaanyị.

iii. E nweghi mmekọrịta na mmetụta na-adịgide nye otu ọha ndị ọzọ dịka otu azụmahịa na otu ụmụ nwaanyị.

  1. E nweghi ohere inwe ezigbo agụmakwụkwọ bụ ịgba na usoro ọzụzụ maka ọchịchị   ụmụ nwaanyị n’izugbe, na ịzụ ụmụ agbọghọbịa na ndụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na
  2. Ụdịdị usoro ntuli aka, nke nwere ike dabara maọbụ agaghị adabara ụmụ nwaanyị na-achọ ịzọ ọchịchị.

Shvedova (2005) chịkọtara echiche ya site n’isi na ụmụ nwoke na-akpakọrọ ọgbọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma na-anọkwa n’isi ihe niile mgbe ọbụla, dịka n’imebe iwu maka usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma na-ewepụta kwa mgbe ụkpụrụ nnyocha. Site n’ime nchọcha n’ikikere jenda na nchekwa Yunaịted Kịndọm (United Kingdon (UK)), Dunn (2010) kọwara etu e si akpaso ụmụ nwaanyị na-arụ ọrụ agwa n’otu nchekwa UK. O kwuru na iwu nchekwa na-agụpụ ụmụ nwaanyị n’ọgụ ihu na ihu, site n’ịgbado ụkwụ nnọọ n’ike ọkpụkpụ aka nke dịwagara iche n’ihe a na-ahụ n’Izreli na ndị agha Chaịna ebe a na-enye ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke otu ụdị ohere dị nhatanha. Ọzọ, a na-anagha ọrụ agha dị mkpa nke gụnyere ọgụ e ji ngwa agha eme, dịka mweta udo na ọnọdụ metụtara inyere mmadụ aka. Dunn (2010) gara n’ihu ikwu na ngalaba ndị a bụ ọnọdụ nke ndị agha chọrọ mkparịtaụka nke ndị agha ụmụ nwaanyị ga-arụ nke ọma. O kwuru na ndị agha ụmụ nwaanyị nwere ike ịrụ ọrụ dịka ndị ezigbo nṅomi nye ụmụ nwaanyị ndị so n’emereme ahụ. Dunn chọpụtakwara na nkewa a na-eweta echiche nke enweghizi okwukwe n’onwe n’etiti ụmụ nwaanyị, nke na-eme ka ha na-ahụ onwe ha dịka ndị nọ n’okpuru ụmụ nwoke. Dunn (2010:151) kwuru na “nhagideokwu dị na ya bụ na a na-enwe ihe mgbaama na-egosi na ụmụ nwaanyị nwere anya nke usoro ọchịchị mgbanwe, ntụnye ha enyela aka iweta ihe ọhụrụ, ma weta ihe nturuugo na nkụzi mmegide ọgbaghara nke Amerịka (United States).” Georgescu-Paun (2010) kwuru na ọgbakọ ụmụ nwaanyị bụ ihe a na-ahụta dịka nke nwere usoro e si eme ihe kempụnụdị na ndabere n’usoro keụdị, nke dị iche n’ebe ọgbakọ otu ụmụ nwoke dị. Hofstede (2001) bụ nke e depụtara na Georgescu-Paun (2010:208), kọwapụtara akparamagwa metụtara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị n’ọrụ dị iche iche. Hofstede (2001) kọwara na ụmụ nwoke nwere akparamagwa dịka agamnihu, mweta akụ, ọzụzụ na ịma ihe na-eme ugbu a, ebe ụmụ nwaanyị nwere nke ọnọdụ keenyi, ọnọdụ nchekwa na ezi mmekọrịta.

Growe na Montgomery (2000) kwuputara na ụmụ nwaanyị nwere usoro kensonye n’ọchịchị karịa ụmụ nwoke. Ha kwuru na ụmụ nwaanyị nọ n’ọchịchị nọ n’okpuru ihe mmesiike na nnyocha karịa ụmụ nwoke, ya bụ, enweghi nhatanha. Ha gara n’ihu ikwu na usoro ọchịchị ụmụ nwoke dịwagara iche na nke ụmụ nwaanyị. Ha chọpụtara na ụmụ nwaanyị nọ n’ọchịchị dịka ha enwere ezigbo mmekọrịta, na-anabata nnọkọta, ikekọrịta ihe na mmekọrịta ebe ụmụ nwoke na-elekwasakarị anya na nruzu ọrụ, iru ogo a tụrụ anya, izokpu ozi na mmeri. Ha kwekọrịtara na, n’agbanyeghi na usoro ọchịchị nke jenda abụọ ndị a dị iche, na o ruola oge mgbe obodo ga-anabata ndịiche a ma doziere ya ọnọdụ.

Matland (1998) chọpụtara mgbanwe, a na-enwe n’omenala na agamnihu na mwulite a na-enwe n’ihe gbasara jenda nwaanyị n’ọchịchị. O kwuru na mgbe e nyere ụmụ nwaanyị ihe ndị dị mkpa dịka agụmakwụkwọ, mmata n’ọrụ ngo, na ọzụzụ n’ọrụ ndị na-anọkarị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha nwere ike iweta ọchịchị ka mma. Ndlovu na Mutale (2013) gosiri mbawanye, a na-enwe na nsonye ụmụ nwaanyị na nnọchite anya n’ọchịchị dịka ọ dị n’Afrịka. Ha chọpụtara na ụfọdụ ihe ndị nyerela aka n’iwulite ụmụ nwaanyị Afrịka n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ mmụbawanye otu na-akwalite ụmụ nwaanyị, usoro mmebe otu ụbara (multiparty system), ogo agụmakwụkwọ na nkwalite nke akụ na ụba, obodo, nkwekọrịta mba ụwa, ọgbakọ na usoro oke nke kwota. Ha chọpụtara na e wepu nke a, nsonye ụmụ nwaanyị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka nwere ụfọdụ ihe ịma aka, ọ kachasị n’usoro ọchịchị ụmụ nwoke nke ka dị ire n’Afrịka. Ya mere, nchọcha a ji achọ ịmata nsogbu ụmụ nwaanyị na-enwe n’ọchịchị ụmụ nwoke, ma matakwa usoro ọchịchị pụtara ihe na jenda ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị dịka o si dị n’akọmakọ nkọkịrịkọ.

Ntụcha Ụbụbọ Mpụrụiche (NỤM) bụ atụmatụ a gbadoro ụkwụ na ya n’ọrụ a. Site n’ibikwasa aka na nkọwa NỤM nke Van Dijk (2001:352) nyere, ọ bụ “ụdịrị nchọcha ntụcha ụbụbọ nke na-amụ etu e si emebe, emegharị, ma kpachie ikikere nke obodo, mmebi, mkpakọrọ, na-enwe nhatanha site n’edemede na okwu n’ọnọdụ obodo na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ntụcha Ụbụbọ Mpụrụiche pụrụ iche n’ụdị na ọ na-atụcha etu asụsụ si emepụta ma na-emepụtagharị mkpakọrọ na mmebi ikikere, mkpagbu ikpe aka nkwụmọtọ na-enwe nhatanha (Van Dijk, 2001). Site n’echiche Gee (2005:21), ụbụbọ bụ ụzọ e si emekọta ma na-etinye asụsụ, emereme, mmekọrịta, usoro echiche, nkwenye, nnabata, na iji ọtụtụ ọdịmara, ngwa ọrụ na ihe maka mmebe njirimara obodo a ga-arụtali aka kpọmkwem. Okwu a dị n’elu gosiri na ụbụbọ metụtara asụsụ na omenala, ya bụ na akọmakọ nkọkịrịkọ na-emebe ụbụbọ nchọcha anyị. Fairclough na Wodak (1997:271-80) depụtara ụkpụrụ NỤM ndị gụnyere:

  1. NỤM na-elebara nsogbu nke obodo anya
  2. Ihe gbasara ike bụ nke na-adachapụ n’isiokwu
  3. Ụbụbọ gụnyere obodo na omenaala
  4. Ụbụbọ na-arụ ọrụ nke nkuzi
  5. Ụbụbọ bụ nke akụkọala
  6. A na-enweta njikọrọ di n’etiti edemede na obodo
  7. Ntụcha ụbụbọ na-akọwa ma na-atapịakwa
  • Ụbụbọ bụ ụdị nke emereme obodo

N’ịga n’ihu, Van Dijk (2003: 353) gbakwụnyere ọtụtụ ihe a tụrụ anya n’aka onye na-eji NỤM eme nnyocha iji wee nweta ihe ọ na-achọ. Ha bụ:

Dịka o si adịbu maka omenala nchọcha nkewapụ, nchọcha NỤM kwesịrị ‘ịka mma’ karịa

nchọcha ndị ọzọ ka e wee nabata ya.

  1. Ọ na-elekwasakarị anya na nsogbu nke obodo na ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, karịa usoro na ntụ ndị ọlọrọọhụụ maọbụ ugbu a.
  2. N’ụzọ a hụrụ anya, ezigbo ntụcha mpụrụiche nke nsogbu obodo na agụnyekarị akụkụ mmụta ndị ọzọ.
  3. Karịa ịkọwa naanị ọdịdị ụbụbọ, ọ na-agba mbọ ịkọwa ha n’ụdị agwara nke mmekọrịta obodo ọkachasị , ndokọ obodo.
  4. NỤM na-elebanye anya kpọmkwem n’ụzọ e si emebe ndokọ ụbụbọ, kwado, nye ya ihe, mepụtagharịa, ma maa ihe metụtara ike na mkpakọrọ n’obodo aka n’ihu.

NỤM dịka usoro ntụcha anaghị ahụ naanị maka asụsụ kama ọ na-elebakwa anya n’ọdịdị nke ike obodo na mkpakọrọ. Gee (2011:9) kwadoro okwu a dị n’elu mgbe o kwuru:

NỤM abụghị nnọọ naanị ịkọwa etu asụsụ si arụ ọrụ maọbụ inye nkọwa miri emi, n’agbanyeghi na ha chọrọ ime ya. Ha na-achọkwa ikwu ma eleghi anya, bata n’ihe gbasara obodo na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nsogbu na ọgbaghara dị n’ụwa. Ha na-achọ itinye ọrụ ya n’ụfọdụ ụdị.

Ya bụ, iji ụbụbọ nke akọmakọ nkọkịrịkọ sitere n’Igbo, nchọcha a na-achọ ịghọta, ịgba n’anwụ enwe nhatanha dị n’obodo; na ịgba isi akwara ya site n’ilekwasa anya na mmekọrịta jenda n’akọmakọ ndị a họọrọ site n’ịgbado ụkwụ na mmebere Ntụcha Ụbụbọ Mpụrụiche (NỤM). Iji mezuo mbunuche nchọcha a, anyị weere usoro nkọwa, nke na-achọ ilebanye anya n’usoro ọchịchị nke ndị odogwu ụmụ nwaanyị Igbo na ntulerịkọta agwa nke ndị di ha na agwa ụmụ nwoke ndị ọzọ nọ n’akọmakọ. A ma ụma họrọ ndị odogwu abụọ ebe e nwetara akọmakọ ha site n’amamihe na nghọta ndị ọchọcha nwere maka ịkọ akụkọ nke e nyefere ha n’ụdị ekwurunọọnụ nakwa mwere na mmegharị sitere n’akọmakọ ndị odogwu Igbo na mbipụta Azụonye (1992 na 1994).

Ntụcha Njatụle maọbụ Data

Jenda na nsogbu ikikere ọchịchị n’ime nkọkịrịkọ Nne Inyan Ọlụgụ

Akọmakọ nkọkịrịkọ nke Inyan Ọlụgụ na-ekpughe usoro ọchịchị ụmụ nwoke a na-ahụ n’Afrịka. Azụonye (1992) kọrọ akụkọ na di Ọlụgụ bụ efulefu ma bụrụkwa akalogeli. Nke a na-ewetara ya na ezinaụlọ ya ihe ọgbatauhie maka na nnabata na nkwanye ugwu nke obodo n’obodo Ọhafịa n’oge ahụ na-esikarị n’igbuta isi mmadụ n’agha. Ndị mezuru nke a ka a na-echi ‘ufiem’ ebe a na-eleghara ndị na-emeghi nke a anya ma na-akpọ ha ‘ụjọ.’ Azụonye (1994:147) kọwara nkọkịrịkọ Nne Inyan Ọlụgụ o nwetara site n’aka otu onye ọgụụ abụ ọnụ.

  1. Inyan Ọlụgụ bụ onye Amaeke ma bụrụkwa onye Eyen.
  2. Ogbuu-nyere-di-ya-ugwu, Inyan Ọlụgụ
  3. Nwagbọghọ, Inyan Ọlụgụ!
  4. Oke nwa nwaanyị, nwagbọghọ onye Eyen, Inyan Ọlụgụ e!
  5. Di ya egbuteghi isi ọbụla n’agha ya mere ndị ọgbọ ya akpachie/ekpokọrọ ji ya dịka nha maka nzuzu ya
  6. Amaeke Abam na ndị Nkalụ-ndị-anaghị-asụ-Igbo-maọbụ-asụ-nsụ nwere nsogbu.
  7. Onye ọbụla zutere nwa agbataobi ya na-egbu ya.
  8. Ya mere, Inyan Ọlụgụ rapụtara di ya n’ezi: “Biko, bịa gbuoro m akwụ n’ọhịa Nkalụ.
  9. Itenta Ogbulopia kwetara ịga gbutere Inyan Ọlụgụ akwụ n’ọhịa Nkalụ.
  10. Ọ hụrụ ma wepụta egbe.
  11. Inyan Ọlụgụ hụrụ ma buru egbe di ya.
  12. O sụjuru ya ntụegbe ruo mgbe o juru n’ọnụ.
  13. O bu ụzọ, gaa gosi di ya ukwu akwụ.
  14. O wee gwa di ya.
  15. “Lee akwụ ị ga-egburu m ebe a.”
  16. Di ya na-arị elu ukwu nkwụ ahụ.
  17. Ọ nọ ebe ahụ na-arị ukwu nkwụ ahụ.
  18. Ọ nọ ebe ahụ na-arị ukwu nkwụ ahụ.
  19. Mgbe ndị Nnong-Ibibie bidoro na-achụ ha ọsọ.
  20. Inyan Ọlụgụ, onye nọ n’ala, weere egbe ya wee gbaa ndị Nnong-Ibibie.
  21. Ọ gbara ndị Nnong-Ibibie egbe.
  22. Ọ gbara ma gbuo ndị Nnong-Ibibie, ụmụ nwoke ise.
  23. O gbupuru isi ha niile ma nye ha di ya.
  24. Ogbuu-nyere-di-ya-ugwu, Inyan Ọlụgụ!
  25. Nwagbọghọ nke Eyen, ọ bụ etu a ka o si gbute isi n’agha wee nye di ya otito nke agha.
  26. Ya mere Inyan Ọlụgụ nyere di ya otito nke agha.
  27. Nwaanyị onye Eyen Ezhiakụ, Inyan Ọlụgụ e!
  28. Oke nne Inyan Ọlụgụ, Ogbuu-nyere-di-ya-ugwu.

Nke a dị n’elu na-egosi ndọrọ ndọrọ ikikere ọchịchị na ndọlị dị n’obodo Inyan Ọlụgụ ebe ọchịchị bụ ihe ụmụ nwoke kpakọọrọ. Ọchịchị a na-ekwu okwu ya abụghị naanị maka ụmụ nwoke niile, kama naanị ndị garala agha ma gbute isi mmadụ buru ha lọta. Ndị na-esoghi n’ogo a ka a na-ahụta dịka ụmụ nwaanyị ma bụrụkwa ndị a jụrụ ajụ na ndị anaghị akwanyere ugwu, ha bụ ndị, a na-eleda anya. Ọchịchị ụmụ nwoke dị n’obodo Ọhafịa nọ n’ogo dị elu dịka onye ụjọ na-ezute mkparị ma n’aka ụmụ ma ndị ohu na ụmụ odibo ndị ufiem. Usoro ọchịchị a na-ahụkarị n’akọmakọ a bụ ọchịchị otu onye (autocracy), ebe ndị ufiem na-enwe ikikere igosipụta ike ha etu ọbụla o si masị ha. Mgbochi a na-egbochi onye ụjọ inwe ọba nke aka ya na-egosipụta mkpagbu na mmegbu n’ebe erimeri nọ. Ọ gara n’ihu igosi na, a naghịụ anya na onye ụjọ ga-emetụ isi akụmakụ bụ ji, ma ya fọdụkwa inwe ya enwe. Ji na nhụrụụwa ndị Igbo bụ ihe e ji ama nwoke, ebe ede bụ maka nwaanyị. Nke a bụ maka na ụmụ nwoke na-aka enwe ọba ji ma bụrụkwa ndị na-akọ ya. A na-ejikwa ya egosi ụba na ike maka nwoke Igbo ọbụla. Nke pụtara na, ya bụ nwoke tozuru etozu ituru ugo echimechi diji.

Tupu ndị mbịarachịwa abịa n’ala Igbo nakwa mgbe ha bịara, ndị ji juputara n’ọba ha ka a na-asọpụrụ ma na-akwanyere ugwu; a na-eke ji ndị ahụ n’ukwu narị anọ. Nke a mezukwara ihe nchọcha NỤM ji bụrụ nke na-ahụ maka mmebe, nkwado, mmepụtagharị na ọmụma mmetụtara ikikere na mkpakọrọ obodo aka. Ọ bụkwa iwu nye ezi na ụlọ nwoke nọ inwe ọba. Ma mgbe onye ụjọ na-akọ ma na-ewere ji ya, ma ọ bụrụ na o nwere onye ufiem, ọ kachasị ndị ọgbọ ya ga-awakpo ọba ya werechaa ji ya. A naghị eme nke a na nzuzo, kama a na-eme ya n’ihe site n’iji usoro ntaramahụhụ a na-akpọ iri ji ụjọ. Nke a gosiri usoro ọchịchị otu onye nke ọchịchị na gọọmentị, ebe ikikere na-anọ n’aka ndị siri ike ebe ndị na-esoghi n’ọgbọ a ka a na-ahapụ ka ha nọrọ lewe ihe chi bọtara.

Mkpakọrọ a na ọchịchị ụmụ nwoke bụ ihe nwere ike ịkpasu Inyan Ọlụgụ iji ngwa nzuzo wee rata di ya n’ogbe ndị iro nwa nwa tota o tokwuru ha bụ ndị Nnong-Ibibie. Site n’ime nke a, ọ na-eduba di ya na ya onwe ya n’ime nsonye. Ọ nọghị na ndọrọ ndọrọ ọgbọ dị n’obodo. Nke a mere ya ka ọ maa di ya, Itenta Ogbulopịa aka n’ihu, ịga gbuore ya akwụ n’otu ala nke dị na ndọrọ ndọrọ n’etiti ndị Ọhafịa na ndị agbataobi ha bụ ndị Ibibio. Ọ dịkwa mkpa ikwu n’ebe a, na a bịa na nhụrụụwa ndị Igbo, ụmụ nwoke na-enwe ukwu nkwụ, ọ bụghị ụmụ nwaanyị. Azụonye (1992:14) kwuru na Inyan Ọlụgụ ji ụdị dị iche iche dịka agụụ iji gbaa di ya ume ime ihe ọ gwara ya, ma Itenta, di ya mechara kweta ime ihe ọ sịrị ya mee. Dịka Azụonye (1992) si kọwaa, Itenta na-arị ukwu akwụ, ndị Ibibio bụ ndị iro ha batara n’ọgbọ, site n’ebe o zoro, Inyan Ọlụgụ gbara egbe wee gbuo ise n’ime ha. Ọ bụghị naanị na o nyere di ya isi mmadụ ise ndị ahụ kama o tuuru ugo ahụ tunye di ya, ma nke a wetaara ya aha etutu, Ogbu-otuwui-di-ya.’ Nke a bụ ihe ngosi doro anya maka ọchịchị ‘onye kwuo uche ya’ ebe e kwesịrị ịkpọ echiche mmadụ ihe n’agbanyeghi ogo, mpe ma ọ bụ jenda ya. Amamihe, nka, mmụta, ike, nkwusiike na adaghị mba Inyan Ọlụgụ nyere aka iwetara di ya na ezi na ụlọ ya otito, ugwu na nsọpụrụ bụ nke ẹ ji echeta ya ruo ta a.

Ọzọ, Inyan Ọlụgụ n’akọmakọ nkọkịrịkọ a dị n’elu na-egosi onye ndu, onye obi adịghị mma banyere enwe nhatanha jenda na ekwezughi oke dị n’obodo ya. Onye ndu kara obi mezuo mbunuche ya ma ọdịmma ndị mmadụ. O meghere ụzọ, dịka ọ dị, na-agba ụmụ nwaanyị ma ụmụ nwoke ume nọ n’ụdị mmekpa ahụ a iwere ngwa ọgụ ma lụọ ọgụ maka mmeri, na-abụghị maka ha onwe ha naanị kama maka obodo niile. Ọrụ nne Inyan Ọlụgụ rụrụ n’akọmakọ a, bụ nke nsonye, ọ bụghị nke ọgbọ ma ọ bụ ogo.

Jenda na nsogbu ikikere ọchịchị n’ime nkọkịrịkọ Nne Mgbaafọ

Akụkọ nkọkịrịkọ nke Nne Mgbaafọ yitere nke Inyan Ọlụgụ. Akọmakọ a gbadoro ụkwụ na nwaanyị na-adịghị atụ ụjọ ma nwekwaa obi siri ike. Ụfọdụ ngụpụta ọnụ akọmakọ a gosiri na ndị Ọhafịa na-eme usoro ọgbọ ufiem na ụjọ mgbe e kwenyere na akọmakọ Mgbaafọ mere. Ngụpụta ndị a kwuru na Nne Mgbaafọ anabataghị etu e si emeso di ya omume maka na ọ bụ onye ụjọ, onye na-agabeghi ọgụ gbute isi ma ọ bụ n’ogbugbu isi. Anyị na-egosipụta akọmakọ a n’okpuru etu a:

  1. Nne Mgbaafọ bụ onye Ọhafịa.
  2. Aha di ya bụ, Ndukwo, Eme Awa!
  3. Nwaanyị ọbara juru ahụ onye Ọhafịa, Nne Mgbaafọ e!
  4. Oke nwa nwaanyị, nwaanyị ọbara juru ahụ onye Ọhafịa, Nne Mgbaafọ e!
  5. Ọ gara ịchọ di ya onye na-esoghi n’otu ndị lọtara n’agha dị n’etiti ha na ndị Nnong Ibibie.
  6. N’agbanyeghi arịrịọ niile a rịọrọ ya, ọ gbara isi akwara ịga n’ihu n’ọchịchọ ya.
  7. Ya bụ, a gwara ụmụ nwoke anọ si n’ụmụnna anyị ka o soro ya.
  8. Ọ chọrọ n’ozu niile tọgbọọrọ n’ihu agha mana ọ hụghị nke di ya.
  9. Ọ natara ozi na e ji ụfọdụ ụmụ nwoke dịka ndị a dọtara n’agha otu ebe wee na-achọzi ire ha n’ohu.
  10. Nne Mgbaafọ ruru n’ọnụ ụzọ ebe ahụ wee jụọ maka di ya.
  11. Ndị na-echekwa ya zoro n’ime ọhịa mgbe ọ na-ajụ ase.
  12. Ndị na-anọ n’ọnụ ụzọ gara gwa onye isi ha na e nwere nwaanyị kwụ n’ọnụ ụzọ na-ajụ maka di ya.
  13. Ha jụrụ ya aha ya, ọ sị “Ndukwo, Eme Awa.”
  14. Ha kpọnyere ya ya.
  15. O duuru ya laa tinyere isi e gbutere egbute.

A naghị ekwe ndị ụjọ n’obodo Ọhafịa ka ha ndị ufiem (ndị ji mmeri na isi wee lọta n’agha), nọkọọ ma ọ bụ mekọọ. Nwoke ọ bụla nọ n’otu ụjọ na ụmụ nwaanyị na-anọkọ ma a na-eme ọgbakọ obodo. Ụdịrị nwee akpamoke a na-akpalite nsogbu mmụọ ikikere na ọchịchị n’ime ụmụ nwoke n’obodo. Di Nne Mgbaafọ, Ndukwo, Eme Awa mechara gaa agha mana ọ lọtaghị. Ngụpụta Azụonye (1994) gbasara akọmakọ a na-ekwu maka ụdị ịhụnaanya dị n’etiti Ndukwo, Eme na nwunye ya, Nne Mgbaafọ. Nke a kpaliri mmụọ Nne Mgbaafọ ime ụdịrị njem nke ịchọga di ya bụ onye na-alọtaghị site n’ọgbọ agha Nnong Ibibie. Ngụpụta Azụonye gara n’ihu rụtụ aka na ụmụ nwoke anọ ndị bu ụzọ n’agha ka a gwara ka ha soro Nne Mgbaafọ maka na mgbe ahụ bụ oge e ji egbu isi, naanị ya ịga n’onwe ya ga-abụ iberibe ma ọ bụ nzuzu nye ndị ufiem. Ọ dịkwa mkpa ikwu na ụfọdụ ụdịdị akọmakọ, e tinyeghi nke a. Azụonye (1994) kọwara na ihe mere o ji atụghị egwu ọ bụla gakwuru ndị iro ha ma chọọrọ onwe ya ọnwụ gawa bụ maka nlọghachi di ya. N’ihi nkwudosi ike ya na obisi ike na-enweghi atụ, ndị tụrụ di ya mkpọrọ site n’ibu n’obi na ha ga-ere ya n’ohu hapụrụ ya, o wee kpọrọ ya laa ụlọ n’aṅụrị, nyekwara isi ndị e gbutere. Ụfọdụ akụkọ nke akọmakọ a kwuru na ọ chọrọ ma hụ ahụ di ya na-eweghi isi ma lie naanị ya. Ka nke a mechara, o ji ahụ nwoke o wetara n’obodo ọzọ wee chụo aja n’ili di ya.

N’agbanyeghi ọtụtụ akụkọ a na-akọ gbasara akọmakọ a, agwa na emume Nne Mgbaafọ n’akọmakọ a gosiri ụmụ nwaanyị dịka ndị kara hụ ọchịchị nsonye n’anya karịa ọchịchị esonye. Emereme Nne Mgbaafọ site n’ọchịchọ ya ime ka di ya soro na ndị a na-akwanyere ugwu n’obodo. Ịhụnaanya o nwere n’ebe ọ nọ mere ya ka ọ hapụ ịkwanye di ya n’igbute isi naanị, kama o mekwara ya ịchọ ya karịa ịnọ ọdụ na-ezu ike n’ụlọ; na-atamu ma na-akparịkwa ya. Usoro emereme akọmakọ a gosiri ọchịchị ụmụ nwoke, ebe ụmụ nwoke nọ n’ọchịchị ọ kachasị, n’ihe nturu ugo na igbute isi. Ike ya na obi adaghị mba ya pụtara ihe n’egwu iri agha Ọhafịa – ikpirikpi ọgụ maọbụ iri aha. Njikere ya makaha, n’agbanyeghi ndụmọdụ ndị mmadụ ka ọ hapụ ịga n’ihu agha, kama igbuda mmụọ ya, ọ kpalie ya nke na-enweghi njide aka n’ebe ihe ọ chọrọ ime nọ. Ihe nke a pụtara bụ na ụmụ nwaanyị bụ ndị na-enwe ntagide obi n’ihe ha chọrọ imezu, ma na-agbasikwa mbọ ike imezu ya.

E nwere ụfọdụ ihe myiri na ndịiche dị n’akọmakọ Nne Inyan Ọlụgụ na Nne Mgbaafọ. N’akọmakọ Inyan Ọlụgụ, ọ ratara di ya n’ogbe ndị iri ma gbuo ndị mmadụ n’onwe ya, mana, na nke Nne Mgbaafọ, naanị di ya na ụmụ nwoke ndị ọzọ gara agha, o nweghi onye so ya. Nke a pụtara na di Nne Mgbaafọ alụtụla agha nke na ọ fọrọ obere ka ndị dọtara ya n’agha refuo ya n’ohu. Nke a adịghị n’akọmakọ Inyan Ọlụgụ maka na ọ bụ ya kpara nkata niile n’onwe ya. Ọzọ, akọmakọ Nne Mgbaafọ kwuru maka agha na ndọta n’agha ebe nke Inyan Ọlụgụ ekwughi maka ya, kama o kwuru maka nkwado nzuzo. Akọmakọ abụọ ndị a yitere n’ihi na ha na-ekwu maka ndị odogwu ụmụ nwaanyị ndị mere oke ihe ịtụnaanya iji zọpụta ndị ha hụrụ n’anya. Agwa Inyan Ọlụgụ na Nne Mgbaafọ na emereme ha dabara n’echiche nkenụụdị agwa ‘ọchịchọ ọhanaeze’ (idealist character) nke Ikeokwu (2015:10) nke mbunuche emereme ya na-ebu ụzọ tinye ọdịmma ndị ọzọ n’uche tupu nke ya.

Nchịkọta

Akwụkwọ tụchara akọmakọ nkọkịrịkọ abụọ, ndị bụ nke Nne Inyan Ọlụgụ na Nne Mgbaafọ. Ọ chọpụtara na ụmụ nwaanyị adịghị ka ụmụ nwoke n’ihi na ha na-agbaso ọchịchị nsonye, nke na-akwalite nsonye na mbata nke ndị otu niile nke obodo karịa mkpagbu na akpamoke nke otu na-emezughi ihe a tụrụ anya n’aka ha. Site n’ịtụcha nkọkịrịkọ Ọhafịa Igbo, nchọcha a ji akọmakọ ndị a gosipụta ogo nnapụ na nkụda mmụọ nke ezinaụlọ onye ụjọ na-ahụ. E mebeghi mmanye egwu naanị maka ụmụ nwoke ndị ụjọ, kama a gụnyekwara ndị nwunye ha na mmanye a, n’ihi na ha na-atakwa ahụhụ n’aka ndị ufiem.

Nchọcha chọpụtara na akọmakọ abụọ a tụchara na-eto jenda ụmụ nwaanyị na ọrụ ha dịka ụmụ nwoke. Akọmakọ gosiri na ụmụ nwaanyị bụ ezigbo enyi, ha anaghị achọ nke onwe ha naanị, ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụta ha n’obi; ha na-egosipụta mmetụtaobi ha ebe ụmụ nwoke na ezinaụlọ ha dị. N’aka nke ọzọ, ụmụ nwoke na-ewepụ onwe ha n’ebe ụmụ nwaanyị nọ, na-eme ndị nna ukwu, na-akpakọrọ ihe niile, ma na-etikwa iwu nke ụfọdụ n’ime ha enweghi ike idobeli. Nchọcha chọpụtara na ụmụ nwoke (ndị ufiem) n’akọmakọ na-achị n’onwe ha dịka usoro ọchịchị ha si dị, ebe ụmụ nwaanyị na-agbaso usoro ọchịchị ‘onye kwuo uche ya’ na nke nsonye.

Edensibịa

Azuonye, C. (1992). Power, marginality and womanbeing in Igbo oral narratives. In R. Granọvist & N. Inyama (Eds.), Power and powerlessness of women in West Africa Orality. Sweden: Printing Office of Umea University.

Azuonye, C. (1994). Oral literarcy criticism and the performance of the Igbo epic. Oral Tradition, 9(1), 136-161.

Barnett, R. C. (2008). Gender, leadership and the natural order. A Paper Presented at the 4th Annual Iowa Women’s Leadership Summit Held in April, 25 at Iowa State University.

Chemers, M. M. (2000). Leadership research and theory: A functional integration. Group Dynamics: Theory, Research and Practice, 4, 27-43.

Dunn, M. D. (2010). Power and gender in UK defence. In L. Husu, J. Hearn, A. Lamsa & S. Vanhala (Eds.), Leadership through gender lens: Women and men in organization (pp. 139-155). Helsinki: Edita Prima Ltd.

Fairclough, N. & Wodak, R. (1997). Critical discourse analysis. In T. A. Van Dijk (Ed.), Discourse studies: A multidisciplinary introduction (pp. 258-284). London: Sage.

Gee, J. P. (2005). An introduction to discourse analysis: Theory and method (2nd ed.). New York: Routledge.

Gee, J. P. (2011). An introduction to discourse analysis: Theory and method (3rd ed.). New York Routledge.

Georgescu-Paun, P. (2010). The dynamics of gender and leadership in non-governmental organisations. The case of Chij-Nacopa. In L. Husu, J. Hearn, A. Lamsa & S. Vanhala (Eds.), Leadership through gender lens: Women and men in organization (pp. 207-218). Helinski: Edita Prima Ltd.

Growe, R. & Montgomery, P. (2000). Women and the leadership paradigm: Bridging the gender gap. National Forum, the Phi Kappa Phi Journal, 17, 1-10.

Haavind, H. (1994). Kjonn i forandring-som fenomen og forstaelsesmate. Tidsskrift for Norsk Psyklogiforening, 31(9), 767-783.

Hannan, C. (2001). Gender mainstreaming: Strategy for promoting gender eọuality. Office of the Special Adviser on Gender issues and advancement of women. Available at http//www.un.org/womenwatch/osagi/pdf/factsheet. Accessed 20/11/2016.

Hofstede, G. (2001). Culture’s conseọuences in comparing values, behaviors, institutions and organizations across nations. Thousand Oaks, CA: Sage.

Ikeokwu, E. S. (2015). Langauge and national development: A literary perspective. A Lead

Paper Presented on Language and National Development at the 4th National Conference of the School of Languages, Nwafor Orizu College of Education, Nsugbe, Nov. 10-13.

Matland, R. E. (1998). Women’s representation in national legislatives: Developed and developing countries. Legislative Studies ọuaterly, 23(1), 109-25.

Ndlovu, S. & Mutale, S. (2013). Emerging trends in women’s participation in politics in Africa. American Internation Journal of Contemporary Research, 3(11), 72-79.

Nwobodo, I. B. (2008). Gender issues and leadership effectiveness in Nigeria labour union activities: An appraisal. Paper presented at the 3rd NLC gender conference in Kaduna on 10th and 11th March, 2008.

Okebalam, C. N. (2003). Mkpọlite agụmagụ ọnụ Igbo. Enugu: Snaap Press.

Shvedova, N. (2005). Obstacles to women’s participation in parliament. In J. Ballington & A. Karam (Eds.), Women in parliament: Beyond members (pp. 33-82). Stockholm: International Institute for Democracy and Electoral Assistance.

Van Dijk. T. A. (2001). Critical discourse analysis. In D. Tannen, D. Schiffrin & H. Hamilton (Eds.), Handbook of discourse analysis (pp. 352-371). Oụford: Blackwell.

Van Dijk, T.A. (2003). Critical discourse analysis. In D. Schiffrin, D. Tannen & H. E. Hamilton (Eds.), The handbook of discourse analysis (pp. 352-371). MA, USA: Blackwell Publishing.

 

 

 

 

 

Ntinye ụdangwe dika usoro ndozi hiatus

Si n’aka

Evelyn Mbah, George Iloene Na Nkechi Ukaegbu

Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages

University of Nigeria

Nsukka

 

 

Ụmịedemede

Nnọkọ ụdaume abụọ ma ọ bụ karịa na njejiokwu abụọ dịdobere onwe ha na mmebe okwu ma ọ bụ n’usorookwu ka a kpọrọ hiatus. Anyị nwekwara ike ịsị na hiatus pụtara ụdaume iche ọyọ kenkejiokwu abụọ n’ịgbo. Nke a bụ ọnọdụ a hụtara n’asụsụ mba ụwa dị iche iche. Site na nchọpụta ndị odee na ndị otu nchọpụta dị iche iche, o doro anya na ụfọdịụ asụsụ mba ụwa na-achọ ihe ha ga-eme iji gbochie ọnọdụ a ebe ndị ọzọ na-ezere ọnọdụ dị etu a ka ọ ghara ịpụta ihe n’asụsụ ha. Asụsụ Igbo dị ka otu n’ime asụsụ nke a pụtara ihe na ya na-agbasi mbọ ike ịhụ na a na-eme ka hiatus ghara ịdị na-adị ire. Otu ụzọ asụsụ Igbo ji edozi hiatus bụ ntinye. Akwụkwọ nchọcha a na-eleba anya ụzọ ụmụafọ maara asụ Igbo nke ọma si e tinye mgbochiume n’etiti ụdaume iche ọyọ kenkejiokwu abụọ. A chọpụtara na mgbochiume a na-etinye ebe ahụ bụ ụdangwe nke nwere ike ịbụ ụdayịị ma ọ bụ ụdawịị. Ihe na-ekpebi ma ntinye a ga-abụ ụdayịi ka ọ ga-abụ ụdawịị bụ ụdị ụdaume nke mbụ na hiatus ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ ụdaume elu keihu bu ụzọ, a na-etinye ịjṅ, ma ọ bụrụ ụdaume elu keazụ, a na-etinye ịwṅ. Iji mee ka nchọcha a dị mma ma doo anya, e ji atụtụ ọptimaliti wee rụọ ọrụ. Atụtụ ọptimaliti gosiri na iwu ndị gbasaara ịriba ama kacha dị ire karịa iwu ndị ntụkwasị obi. Ya bụ na asụsụ Igbo na-esonyere ọtụtụ asụsụ mba ụwa agbarụ ihu n’ebe Hiatus dị.

Ọkpụụrụkpụ okwu: hiatus, nkejiokwu, ụdangwe, ụdayịi, ụdawịi, atụtụ ọptimaliti.

Ndubata

Mgbe nwaamaala Igbo maara asụ asụsụ ya nke ọma na-ekwu okwu, ọ kachasị n’okwu ọsọ ọsọ, o nwere ike ọ hapụ ịkpọpụtacha ụda ụfọdụ dị n’okwu ahụ nke ọma. Mgbe nke a metụtara ụdaume, a na-asịkarị na e nwere olilo, ma ọ bụ ndapụ ụdaume. A na-enwe olilo ụdaume mgbe mgbe otu ụdaume gbanwere ọdidị ya ma were ọdidị ụdaume nọ ya nso. Ụdị olilo atọ pụtara ihe n’Igbo. Ha bụ olilo nlocha, mmakọ, na ndapụta (Emenanjo 2010). N’aka nke ọzọ, mgbe ụdaume abụọ nọdebere onwe ha na mpkụrụokwu abụọ, n’okwu ọsọ ọsọ, e nwere ike iwepụ otu ụdaume. Mgbe nke a mere, a na-asi na e nwere ndapụ ụdaume. Mgbe anyị lere anya n’ọtụtụ ọmụma atụ olilo ma ọ bụ ndapụ ụdaume Igbo e deputaraala n’ụfọdụ akwụkwọ, otu ihe anyị chọpụara bụ na ha na-apụtakarị ihe ebe e nwere nkejiokwu abụọ nọ onwe ha nso. Nkejiokwu nke mbụ na-akwụsị n’ụdaume ebe nkejiokwu nke abụọ na-amalite n’ụdaume. Mgbe anyị tụlere ọnọdụ a na ihe a na-ahụ n’ụfọdụ asụssụ mba ụwa, anyị chọpụtara na ọtụtụ asụsụ mba ụwa anaghị anabata ụdaume abụọ dị iche ịnọ n’agbata nkejiokwu abụọ. Ụdaolu abụọ na-eyighị onwe ha nọ n’agbata nkejiokwu abụọ ka a kpọrọ Hiatus. Hiatus bụ okwu si n’asụsụ Latin. Ọtụtụ asụsụ anaghị anabata hiatus. Ọtụtụ asụsụ mba ụwa na-agba mbọ igbochi ma ọ bụ izeere hiatus. Ụzọ ndị e si egbochi ma ọ bụ edozi ọnọdụ hiatus gụnyere ibugharị ụdaume ka ọ banye na nkejiokwu ọzọ (ya bụ nkegharị nkejiokwu), ụdaume mkpị, ntinye mgbochime, ndapụ ụdaume, mmebe ụdangwe, mmakọ ụda dgz.

Asụsu Igbo dịka asụsụ ọtụtụ mba ụwa ndị ọzọ na-ebu agha emegide hiatus. Anyị ga-atụle n’akwụkwọ a ma e nwere ike ịsị na asụsụ Igbo na-eji ntinye ụangwe n’etiti nkejiokwu abụọ iji gbochie hiatus. Nke a ga-apụta ihe ma anyị nwee ike ịza ajụjụ nchọcha ndị a na-esote:

  1. Kedu ka ntinye ụdangwe ga-esi gbochie ọnọdụ hiatus n’aụsụ Igbo?
  2. Olee ka atụtụ optimaliti ga-esi gosipụta ndozi hiatus site na ntinye ụdangwe n‘asụsụ Igbo?

Ebe e jiri mee nchọcha a bụ ala Igbo n’ihi na ọ bụ n’ala Igbo ka a na-asụkarị asụsụ Igbo. Asụsụ Igbo a gbadoro ụkwụ na ya wee mee nchọcha a bụ asụsụ Igbo Izugbe n’ihi na ọ bụ ya ka e ji akuzi nkuzi, ede edemede, agbasa ozi ma bụrụ asụsụ Igbo onye Igbo ọ bụla na-aghọta ma a sụọ ya. Mkpụrụokwu/okwu ndị e jiri mee nchọcha bụ okwu Igbo Izugbe e wekọtara n’akwụkwọ ederede n’ihi na o nweghị mpaghara ala Igbo a ga-asị na ọ bụ ha nwe ma ọ bụ na-asụ Igbo Izugbe. Nke a pụtara n’Igbo Izugbe bụ asụsụ edemede ndị Igbo.

Ntụlegharị agụmagụ

Atụtụ ọptimaliti

Iji gosipụta nke a ka o doo anya nke ọma, anyị ga-eji atụtụ ọptimaliti wee nyochaa ya. Atụtụ ọptimaliti a bụ atụtụ Alan Prince na Paul Smolensky wepụtara n’afọ 1993, nke Prince na McCarthy (1993) mere ka ọ gbasapụ aka. E nwekwara ike iji atụtụ a rụọ ọrụ n’usorookwu na amụmamụ echiche n’agbanyeghị na ebe ndị mmadụ kacha gbado ụkwụ bụ n’amụmamụ mkpụrụ ụdaasụsụ n’ihi na ọ bụ n’amụmamụ a ka e ji ya rụọ ọrụ mbụ. Prince na Smolensky (1993) na nkọwa ha kwuru na ndịịche dị n’asụsụ gbadoro ụkwụ kpọmkwem na etu ha si edozi ọgbaghara dị n’etu ma ọ bụ n’ụzọ ha si ahụta ọkọtọ izugbe a n’ịgbado anya n’usoro ndị a. Ụtọasụsụ asụsụ ọ bụla bụ ụzọ ha si edozi ọgbaghara ndị pụtara ihe n’ọkọtọ izugbe ndị a. Atụtụ a na-atụ anya ịga n’ogo dị elu n’ọrụ ịka na ịkọwa ebumnuche atụtụ ụtọasụsụ. Prince na Smolensky (1993) kwukwara na atụtụ a wepụtara ụzọ ihe abụọ bụ ebe mgbado ụkwụ. Ha gụnyere: 1. Ụtọasụsụ ahụ ga-enwe ‘GEN’ na-arụ ọrụ nke na-ewepụtara ihe ọ bụla a ga-eji rụ ọrụ nnukwu ohere inwete ihe ndị ha ga-eji rụ ọrụ site n’igosipụta n’onwe ya usoro ndị kacha mkpa. 2. Ọkọtọ ga-abụ ihe izugbe dị nnukwu mkpa, nwekwaa otu ụdị ọdịdị ma nwekwa ikike mgbaghara dị ukwu n’ebe ntụcha dị mma nke ọma dị. Ọmachọnụ (2007:18) kọwapụtara na ụtọasụsụ nke ọ bụla na-edozi ọkọtọ ndị a n’ogogo n’ogogo nke na-edozi ọgbaghara ọ bụla dị n’etiti ha ka ọ laara ọkọtọ nke kacha ibe ya n’ogo. N’uche nke ya, Kager (2004) hụtara atụtụ ọptimaliti dịka atụtụ e ji atụle ma na-enyocha etu asụsụ si arụ ọrụ.

McCarthy na Prince (1993, 1994 & 1995) kọwapụtara na atụtụ ọptimaliti ji usoro ise were arụ ọrụ. Usoro ise ndị a gụnyere: izuzugbe, mmebirịta iwu, ogogo, nsonyerịta, na nnọkọrịta. Site n’etu odee ndị ọzọ si hụta atụtụ a, o doro anya na ọ bụ atụtụ a ka mma iji nyochaa amụmamụ ụdaasụsụ n’uju iji mata etu ọkọtọ ndị dị n’asụsụ si dị, iwu na-achị usoro ndoko asụsụ nke ọ bụla na etu na ebe ndoko asụsụ nke ọ bụla si rie mperi site n’imebi usoro iwu na-achị ọkọtọ asụsụ ahụ. A hụtara atụtụ ọptimaliti dị ka atụtụ nwere ike ịgbanwe ma ọ bụ inwe mmekọrịta n’ebe atụtụ amụmamụ ụdaasụsụ dị (Oyebade 1998).

Ọ dị mkpa ịkọwapụta usoro iwu ise a atụtụ ọptimliti ji arụ ọrụ iji nye aka na nghọta ha.

Izuzugbe: Nke a bụ usoro iwu atụtụ ọptimaliti na-egosi na ọkọtọ ndị ahụ zuru ụtọasụsụ asụsụ mmadụ ọnụ. N’izuzugbe, ọkọtọ niile anaghị ahacha nhatanha n’ọrụ ha n’asụsụ niile maka na asụsụ dị iche iche nwere ụzọ dị iche iche ha si edozi ọkọtọ ha n’ogogo n’ogogo. Iji maa atụ, otu ọkọtọ nwere ike ịpụta ihe n’otu asụsụ ma ọ gaghị apụta ihe n’asụsụ ọzọ.

Mmebirịta iwu: Nke a dị ka Kager (1999) si kwuo pụtara na ọkọtọ na-emebi iwu na-achị asụsụ kama mmebi iwu a anaghị ebu ibu. Na nkọwa ya, ọkọtọ anaghị akpacha anya emebi iwu; ọ ga-enwerịrị ihe kpatara ọkọtọ ọ bụla ji mebi iwu. Otu ihe dị mkpa o jiri mebie iwu nwere ike ịbụ ka ọ ghara imebi iwu nke ka n’ogogo.

Nnọkọrịta: Nke a bụ usoro atụtụ ọptimaliti na-akọwa na ọkọtọ kwesịrị ntụkwasị obi na ọkọtọ ịrịba ama nwere ike ịnọkọ n’otu ahịrị ma ọ bụ ogo. Nke a pụtara na ọkọtọ niile dị n’ụdị dị iche iche nwere ike ịnọkọrịta n’otu ogogo dị ka Kager (2004) siri kwuo.

Ogogo: N’atụtụ ọptimaliti, a na-enye ihe ọ bụla e wepụtara akara etu o si mebi iwu ọkọtọ, akara a na-enye ya na-ebido n’efu gawa. Usoro a ka a na-akpọ ogogo.

Nsonyerịta: Site na nkọwa Oyebade (1998), usoro ọkọtọ na-enyocha ihe ndị a nabatara na ntụgharị uche niile banyere ọdịdị dị mma.

E jirila atụtụ ọptimaliti a wee mee nchọcha banyere hiatus nakwa ntinye ụdangwe kpọmkwem. Isiokwu na-esote ga-eleba anya n’ụfọdụ nnyocha gbasara hiatus na ntinye ụdangwe.

Hiatus na ntinye ụdangwe

Hiatus dika anyị kọwara n’ụmị na ndubata akwụkwọ a bụ ụdaume abụọ eyighị onwe ha bịakọtara ọnụ n’agbata nkejiokwu abụọ nwere ike ịbụ mkpụrụokwu abụọ bịakọtara ọnụ iji mebee otu mkpụrụokwu, nkebiokwu, nkebiasụsụ ma ọ bụ ahịrịokwu. Hiatus dị ire n’asụsụ mba ụwa dị iche iche mana ụfọdụ asụsụ na-agba mbọ iji gbochie ya ịpụta ihe n’asụsụ ha, ndị ọzọ na-agba mbọ ịchọ ụzọ ha ga-esi hazie ma ọ bụ dozie ndị pụtara ihe n’asụsụ ha ka ha nwee ike inwe mgbochiume dabara adaba ga-ekewa ha (Sabao, 2015). Casali (1997), na nkọwa ya kwuru na ihe a na-ahụta dị ka hiatus bụ ụdaume abụọ dịwagara iche nọdebere onwe ha na nkejiokwu abụọ. Ọ gara n’ihu kwuo na ụfọdụ asụsụ anaghị anabata hiatus, ebe ndị ọzọ na-egbochi ihe ụfọdụ ndị ga-eme ka hiatus pụta ihe, ma ụfọdụ na-ewere usoro amụmamụ mkpụrụ ụdaasụsụ edozi mpụta hiatus. Kwambehar (2014) kwuru na Tivi na-ekegharị nkejiokwu amaliteghị na mgbochiume ma mee ka e nwee ụdaume mkpị. Mudzingwa na Kadenge (2011) na nkọwa nke ha banyere ọnọdụ hiatus n’asụsụ mba ụwa dị iche iche kwukwara na ụfọdụ asụsụ anaghị anabata ya ebe ụfọdụ na-anabata ya nke ọma; a na-akpacharakwa anya egbochi ya n’ụfọdụ asụsụ. Iji nye aka ime ka hiatus a ghara ịpụta ihe, e wepụtara ụfọdụ usoro a ga-eji gbochie ya. Ụzọ dị iche iche asụsụ dị iche iche si egosipịụta mgbe na etu ha si edozi hiatus mere ka usoro ndozi ndị a pụta ihe: nkegharị nkejiokwu, ntinye, olilo ụdaume, ndapụ ụdaume, mkpọso, mmakọ ụdaume, mmebe ngwe na mmebe ụdamkpị (Myers 1987; Casali 1996; Rosenthel 1997; Mtenje 2007; Sibanda 2009). Site n’usoro ndozi ndị a e depụtara ka asụsụ ọ bụla na-achọghị hiatus si edozi nke ha.

E gosipụtara nke a site n’ọmụma atụ (1) na-esote dịka ọ dị na Casali (1996:1). Mkpuchi kpọm kpọm (:) na-egosi na ndapụ ụdaume, mmebe ụdayịị na mmakọ ụdaume nwere ike inwe mgbatị ụdaume dịka nnatara asụsụ a na- enyocha siri dị.

  1. a. Nkegharị nkejiokwu: CV1+V2 > .CV1.V2.
  2. Mmebe ụdaume mkpị: CV1+V2 > .CV1V2.
  3. Ntinye: CV1+V2 > .CV1.CV2.
  4. ndapụ ụdaume: CV1+V2 > .CV2(:). or .CV1(:).
  5. Mmebe ụdangwe: CV1+V2 > .CGV2(:).
  6. Mmakọ: CV1+V2 > .CV3(:).

Ntinye ụdangwe (NỤ) dịka Hasan na Rasheed (2016) siri kọwaa bụ otu n’ime iwu amụmamụ ụdaasụsu na-anabata iwebata mgbochiume n’agbata ụdaume abụọ. Nke a bụ usoro ụdịdị ụda e ji eme ka mgbochiume na-adịbughị n’agbaala nwee ike dị n’agbaelu (Zygis, 2010). N’usoro a, a na-etinye ụdangwe ụdawịị, ịjṅ ma o bụ ịwṅ n’etiti ụdaume. ịjṅ na ịwṅ bụ ụda ndị a na- ahụta dịka ụda na-abụghị ụdaume nke ha ji abụ mgbochiume bụ ndị nwere ebe mkpọpụta abụọ: ebe mkpọpụta /j/ bụ ime ọnụ na azụ ọnụ nke bụ ịCoronalṅ na ịDorsalṅ, ma ebe mkpọpụta /w/ egbugbere ọnụ na azụ ọnụ nke bụ ịLabialṅ na ịDorsalṅ (Nevins na Chitoran, 2008). Nevins na Chitoran (2008) gara n’ihu kọwaa na ụdangwe dị iche n’ụdaume n’ihi na a na-enwe obere mkpachi mgbe a na-akpọpụta ụdaume, ebe a na-enwekari mkpachi na mkpọpụta ụdangwe. Ozo, ụdaume so emebe isi nkejiokwu ebe ụdangwe esoghị. Uffman (2007) kwenyere na ebe e nwere ụdaume dị iche nọdebere onwe ha na nkejiokwu abụọ, na ụda a na-achọkarị iji kebie ha bụ ụdangwe. Ọ kọwara na nke a bụ maka na ụdangwe bụ naanị ụda ka yie ụdaume. Ụdangwe na ụdaume nwere otu mma ma ewepụ naanị myiriụdaume n’ụmị nkejiokwu. Gbasara ebe nakwa ụdị mkpọpụta, ụdaume na ụdangwe yiri.

N’aka nke ọzọ, ọtụtụ asụsụ mba ụwa na-achọ ka ezi nkejiokwu malite na mgbochiume (Uffmann, 2007; Molczanow, 2008; Blevins, 2008). N’ihi nke a, a na-eji udangwe egbo mkpa iji mgbochiume amalite nkejiokwu . Nke mere na ntinye ụdangwe na-enye ụdaume nke abụọ mgbochiume. Ọ bu eziokwu na e nweghị nkenudị ụdangwe na ntule e meerela. Booij (1996) depụtara ndịiche dị n’etiti ebe mkpọpụta ụdangwe ịjṅ na ịwṅ n’asụsụ Dutch. O kwuru na etu e si amata ụdị ụdangwe a ga-etinye bụ site ụdaume nke mbụ. A na- etinye ịjṅ n’azụ ụdaume elu keihu (2a) ebe ịwṅ na- abanye n’azụ ụdaume elu keazụ (2b).

2.a- ree-en ịrejənṅ (mmebi)

b- boaz ịbowasṅ (id).

 

Ụdị ụdangwe ọzọ bụ nke e nwere ike itnye ụdangwe ọ bụla na-agbanyeghị ụdị ụdaume na-eso ya. E nwere ike ịkpọ nke a ụdangwe na-eyighị n’ebe mkpọpụta. N’Uyghur (Vauụ, 2001), dika ọmụma atụ, ntinye ụdangwe agbasoghị myiri ebe mkpọpụta maka na e tinyere /j/ na- agbanyeghị ụdị ụdaume abụọ nọdebere onwe ha. Lee 3 dị ka ọmụma atụ:

3.a. ou+al- ịouyal-ṅ (inwe ike igụ ihe)

  1. islä+al- ịisläyäl-ṅ (inwe ike ịrụ ọrụ)

(Hahn, 1991 hụtara na Vauụ, 2001:5).

Na Guajiro (Vauụ, 2001), olundị Abajero na-etinye ụdangwe eyighị n’ebe mkpọpụta. Ọ na-etinye /w/ na-agbanyeghị ụdị ụdaume dị n’okwu dịka n’ọmụma atụ 4:

4.a. atpanaa+ee+chi atpanaaịwṅeechi (ọ ga-abụ oke bekee)

  1. ke+kii+ee+shi kekiiịwṅeeshi (ọ chọrọ inwe (ezi) isi)

(Vauụ, 2001: 8)

Ụdangwe dị n’ọtụtụ asụsụ dịka Dutch (Booij, 1996); Inhala dị na Shona (Zygis, 2010); Persia (Dehghan, 2012) nakwa Bekee Amerika (Davidson & Erker, 2014); n’ịgụ naanị obere n’ime ha. N’asụsụ ndị a niile, ụdangwe na-apụtakarị ihe n’usoro ụdaasụsụ nke ọnọdụ ya na-apụta ihe nke ọma: a na-etinye ịjṅ n’ọnọdọ tupu ma ọ bụ ngafe ụdaume ihu ma ịwṅ na-abanye n’ọnọdọ tupu ma ọ bụ ngafe ụdaume ala. Ọ na-enyekwa aka igbochi hiatus ma mee ka mgbochime dị n’isi nkejiokwu. Zygis (2009), na nyocha usoro ụdaasụsụ asụsụ 400 gosiri na a na-enwe ntinye ụda nke m̀má ha na-esite na mgbatị ụdame nọ ya nso ma na mkpọpụta ya, e nweghị ụda e tinyere. Nke a gosiri na ọ bụ naanị nnụta mgbanwe ndamụda nke ụdaume nọ nso na-eweta nnụta ụda ọhụrụ. N’iji nwewanye nghọta n’isiokwu a, ọ gara n’ihu ime nchọcha ọnụnụ nke gbadoro ụkwụ na mbugharị mgbanwe ụda ịiaṅ. Mgbanwe dị n’agbata ịiṅ na ịaṅ ka agbatịrị malite na 50 rue 230 ms niime usoro 30 ms, nke mere na e nwere usoro 7. Oge ole o were n’ịkpọpụta ịaṅ ka kwụbara otu ebe. E tinyeere ya site n’obere igwe kọmputa   ma mee ka mmadụ 10 asụsụ ha bụ German, mmadụ atọ ndi Poland, nakwa maadụ atọ ndị Bekee gee. A gwara ndị njime nchọcha ahụ ka ha detue ihe ha nụtara. Ha niile nụtachara ịjṅ n’ọsịsa ha n’oge ngafe dị iche iche. N’aka nke ya, Staroverov (2014), tụpụtara na ntinye ụdangwe adịghị ire n’usuro ụdaaụsụ, kama na ọ bụ nrapa a na-enwe mgbe mwebanye otu ụda mụtara mwepụta ụda abụọ. Ịma atụ, mgbe e nwere ụdaume /e+a/, /e/ na-abụ /ej/na mwepụta. Ihe ndapụta si n’atụtụ a bụ na mgbakwụnye mgbochiume na-rube isi n’iwu nrube isi. Ya bụ na nrapa mwebanye na mwepụta, mgbakwunye ụda na-achọ n’ụzọ a bụla ụzọ ka o rubere mwebanye isi. Ya mere na /e/ n’ọmụma atụ dị n’elu ghọrọ /ej/ kama ighọ /ew/ maka na /j/ ka rubeere /e/ isi karịa /w/. N’ikpeazụ, ọ dị mkpa ịmata ihe dị iche n’ụdayịị na mmebe ụdayịị dịka ọ dị n’asụsụ ole na ole iji gbochie hiatus. N’asụsụ Russia (Molczanow, 2008), mmebe ụdayịị ụdaume elu keihu bụ ihe e ji egbochi hiatus ebe e nwere #iV, Vi# na ViV . Ịma atụ, agbaala /ia/ (ja ‘mụ’) na-abụ ịjaṅ, bụ ezi nkejiowu malitere na mgbochiume bụ ụdayịị. Molczanow kwuru na mgbanwe ụdaume ka ọ ghọrọ ụdayịị pụtara nkagbu mora nke agbaala, ma ọ ka mma ịkagbu mora karịa nkejiokwu na- amaliteghị na mgbochiume.

Ntinye ụdangwe n’Igbo

            Ụzọ ọzọ pụtara ihe ndị Igbo si arụ ọrụ iji gbochie ụdaume abụọ ma ọ bụ karịa bịakọta ma ọ bụ ịnọkọta ọnụ na mkpụrụokwu, nkebiokwu, nkebiasụsụ ma ọ bụ ahịrịokwu bụ site n’iji ntinye ụdangwe rụọ ọrụ n’okwu ahụ. Ntinye ụdangwe na-enye aka iji dozie usoro ụdaume-iche-ọyọ kenkejiokwu abụọ n’asụsụ Igbo. N’asụsụ Igbo, ụdị ụdangwe a na-etinye bụ udayịị na ụdawịị. Ha bụ mkpọnakpo ịjṅ na mkpọnegbugbere ịwṅ. Ndepụta banyere nke a dị na 5 n’okpuru:

 

 

Ntinye mkpọnakpo

Nkebiokwu

  1. a. isi + akwụ /isi/ + /akwʊ/             >          ịi.si.ja.kwʊṅ

head     palm fruit                     palm fruit head

  1. asị + ọcha                    /asɪ/ + /ɔʧa/                       >          ịa.sɪ.jɔ.ʧaṅ

lie        white                            blunt lie

  1. ntị + ewu /ntɪ/ + /ewu/             >          ịn.tɪ.je.wuṅ

ear       goat                              goat ear

  1. mpi + ehi /mpi/ + /eɦi/               >          ịm.pi.je. ɦiṅ

horn     cow                            cow horn

  1. isi + ọma /isi/ + /ɔma/               >       ịi.si.jɔ.maṅ

head     nice/good                     lucky

Ahịrịokwu

  1. Anyị sịrị asị /aɲɪ sɪɹɪ asɪ/                    >          ịa.ɲɪ.sɪ.ɹɪ.ja.sɪṅ

we lied lie                                we lied

  1. g. Ada biri ego /ada biɹi ego/              >          ịa.da.bi.ɹi.je.goṅ

Ada borrowed money              Ada borrowed money

  1. ha bi ebe a /ɦa   bi   ebe     a/      >          ịɦa.bi.je.be aṅ

they live where this                  they live here

 

Ntinye mkpọnegbugbere

Nkebiokwu

  1. ukwu + akwụ           /ukwu/ + /akwʊ/ > ịu.kwu.wa.kwʊṅ

waist/tree   palm fruit  palm fruit tree

  1. ukwu + azịza           /ukwu/ + /azɪza/ >         ịu.kwu.wa.zɪ.zaṅ

bunch     broom                       bunch of broom

  1. ntu + igwe                 /ntu/ + /igwe/ >          ịn.tu.wi.gweṅ

nail      iron                            ịron nail

  1. nkwị=ụ + ọkụ /nkwʊ/ + /ɔkʊ/        >          ịn.kwʊ.wɔ.kʊṅ

wine          hot                          hot drink

 

ị.          ọnọdụ + ugo                /ɔnɔdʊ/ + /ugo/       >          ịɔ.nɔ.dʊ.wu.goṅ

place         eagle                       place of the eagle

  1. mkpụrụ + anya      /mkpʊɹʊ/ + /aɲa/            >          ịm.kpʊ.ɹʊ.wa.ɲaṅ

nut(s)          eye(s)                   eyeball

 

Ahịrịokwu

  1. ha pụrụ ezi /ɦa   pʊɹʊ ezi/                     >          ịɦa.pʊ.ɹʊ.we.ziṅ

they went outside                    they went outside

  1. Obi gburu agụ /obi gbuɹu agʊ/          >          ịo.bi.gbu.ɹu.wa.gʊṅ

Obi killed lion                          Obi killed a lion

  1. Nnedị chụrụ aja          /nnedɪ ʧʊɹʊ aʤa/ >  ịn.ne.dɪ.ʧʊ.ɹʊ.wa.ʤaṅ

Nnedị offered sacrifice                        Nnedị offered a sacrifice

  1. Ọjị ahụ puru epu   /ɔʤɪ aɦʊ puɹu epu/ >          ịɔ.ʤɪ.ja.ɦʊ. pu.ɹu.we.puṅ

kolanut that germinate(pst) germinate                 that kolanut germinated

Ntụcha Nchọcha

Ndepụta dị na 5 n’elu bụ otu niime usoro asụsụ Igbo ji edozi hiatus Nke a bụ itinye ụday/wịị n’etiti ụdaume abụọ ma ọ bụ karịa bịakọtara ọnụ site na nkejiokwu abụọ nọ nso. Asụsụ Igbo na-eji mkpọnakpo /j/ ma ọ bụ mkpọnegbugbere /w/ ekewa ụdaume abụọ ma ọ bụ karịa bịakọtara ọnụ n’asụsụ ahụ. Nke ọ bụla ha ga-eji rụ ọrụ sitere na-esite na mkpọpụta ụdaume nke mbụ (Ụ1) na ụdaume abụọ ahụ nọ onwe ha nso na nkejiokwu abụọ ndị ahụ. A na-eji mkpọnegbugbere arụ ọrụ mgbe ebe mkpọpụta Ụ1 metụtara egbugbere ọnụ ị+LABIALṅ dị ka anyị kwuru na mbụ, ebe a na-eji mkpọnakpo arụ ọrụ mgbe ọ bụla ebe mkpọpụta ịỤ1 metụtara akpo ị+CORONALṅ. Iwu ndị anyị ga-eji rụ ọrụ nkọwami nchọcha a bụ ndị di na 6.

  1. Iwu ndị gbasara nnyocha a:
  2. *HIATUS: A nabatala nkejiokwu abụọ ụdaume ha nọdebere onwe ha ma dị iche (a nabatala hiatus)
  3. ONSET: Nkejiokwu ọ bụla ga-amaliterịrị na mgbochiume (Itȏ, 1989; Prince and Smolensky, 1993)
  4. PARSEịF’ṅ: Chekwaa mmaịFṅ mwebanye na mwepụta ya (Casali, 1996, 1997; Tanner, 2007).
  5. IDENTị±highṅṅ: mwebanye na mwepụta ga-eyi onwe ha na mma ị+highṅ na/ma ọ bụ ị-highṅ     (Sabao,     2009).
  6. DEP-IO(C): Ntinye ga-adị na mwebanye nakwa mwepụta ga-abụrịrị mgbochiume (Archaengeli na Langendoen, 1997).

Ihe nrịba ama ndị a ga-eji lebara ‘tableau’ ntụcha a anya bụ ndị a

7a.        na-egosi ọkaibe. Ya bụ olee kacha mma

  1. * na-egosi mmebi/ịda iwu
  2. *! na-egosi oke mmebi/ịda iwu, ya bụ mwepụ kpamkpam

 

Dịka usoro ndozi hiatus, a na-enwe ntinye ma o bụrụ na ogoogo iwu ONSET karia DEP-IO. Ka anyị zipụta nke a site na tableauụ 1-2 na-esote. Ọkọtọ iwu ndị ahụ dị na 6 bụ 7.

 

  1. *HIATUS, ONSET>>DEP-IO(C)

Ọmụma atụ dị na 7 na-akọwa na iwu *HIATUS na ONSET ka n’ogogo karịa DEP-IO(C). Nke a pụtara nrube isi nye *HIATUS na ONSET ka mkpa karia nrube isi nye DEP-IO(C). Ya bụ na mkpọpụta okwu Igbo na-agbalịsi ike ịhụ na e nweghị ụdaume dị iche kwụsịrị nkejiokwu ka ụdaume dịkwazị iche mebere nkejiokwu na-eso ya. Mgbe e nwere ọnọdụ dị otu a, nkejiokwu nke abụọ ahụ na-enupụụrụ *HIATUS isi. Ọzọ, usoro ezi mmebe nkejiokwu kwadoro ka ezi nkejiokwu na-amalite na mgbochiume bụ iwu ONSET. Ụdaume nke abụọ na-enweghị mgbochiume na mmalite nkejioukwu ahụ dakwara iwu a. Nkọwa ndị a ga-apụtakarị ihe ma anyị hazie iwu ndi a na tableauụ 1 na 2 na-esote:

Tableau 1: ntinye ụdangwe ịjṅ

/m.kpʊ.ɹʊ.o.kwu/ *HIATUS ONSET PARSEịF’ṅ IDENTị±highṅ DEP-IO(C)
a. m.kpʊ.ɹʊ.o.kwu *! *
b. m.kpʊ.ɹo.o.kwu *! * *
ch.m.kpʊ.ɹʊ.wo.kwu *
d. m.kpʊ.ɹo.kwu *! *

 

Site na tabul 1 ahụ dị n’elu, anyị ga-achọpụta na olee (a) dara iwu *HIATUS nakwa ONSET bụ ndị ka DEP-IO(C) n’ogoogo. m.kpʊ.ɹʊ.o.kwu dara iwu *HIATUS maka na nkejiokwu abụọ a-ɹʊ.o- bụ ụdaume abụọ dị iche iche n’agbata nkejiokwu abụọ bụ nke hiatus na-asọ nsọ. N’aka nke ọzọ, ONSET na-achọ ka nkejiokwu ọ bụla malite na mgbochiume, ma olee (a) dakwara iwu a. Ọdịda iwu abụọ a mere o jiri nweta akara *! na * n’iwu abụọ ndị ahụ. Akara *! na-egosi ndawa ukwu. Olee (b) na-agbanyeghị na ọ lafere n’ule *HIATUS kachasị n’ogoogo dara iwu ONSET maka na mgbochiume a maliteghị nkejiokwu nke anọ. Ọ dakwara PARSEịF’ṅ na IDENTị±highṅ n’ihi na ochekwaghị ụdaume kenkejiokwu atọ. N’aka nke ọzọ, olee (d) nuụrụ isi n’iwu PARSEịF’ṅ na IDENTị±highṅ. Ndị olee (a) na (b) enupụghịrị DEP-IO(C) isi maka na ha ewebataghị mgbochiume ọ bụla na mwebanye. Olee (ch) bụ oka ibe n’ihi na ọ dara naanị iwu DEP-IO(C) bụ nke ogoogo ya pekarịrị ibe ya. E gosipụtara na ọ bụ ọka ibe site na 

Mkpọnakpo

Tableau 2: Tableau ntinye ụdangwe ịwṅ

/i.si.o.kʷu/ *HIATUS ONSET PARSEịF’ṅ IDENTị±highṅ DEP-IO(C)
a. i.si.o.kwu *! *
b. i.so. o.kwu *! * *
ch.i.si.jo.kwu *
d. i.so.kwu *!

 

E lee anya na tableau nke abụọ, a ga-chọpụta na o yiri tabul ahụ n’otu ha siri hube isi ma dakwaa n’ụfọdu iwu.

E lee anya na data nakwa tabul ndị a dị n’elu, a ga-achọpụta na ntinye ụdangwe ndị pụtara ihe n’asụsụ Igbo bụ mkpọnegbugbere na mkpọnakpo. A bịa na mkpọnegbugbere, ọ na-apụta ihe mgbe ụdaume elu ebe mkpọpụta ha metụtara egbugbere ọnụ, ya bụ /u/ na /ʊ/ na ụdaume ọzọ bịakọtara ọnụ n’okwu. Mgbe ụdaume ndị a na ụdaume ọzọ bịakọtara, a na-etinye mkpọnegbugbere /w/ n’etiti ha abụọ ka o nwee ike ikwe ịkpọpụta ọsọọsọ. N’otu aka ahụ, a na-etinyekwa mkpọnakpo /j/ mgbe ụdaume elu ebe mkpọpụta ya metụtara akpo, ya bụ /i/ na /ɪ/ nakwa ụdaume ọzọ bịakọtara ọnụ. Ụdaume ndị a ga-ebu ụzọ tupu ndị ọzọ esowe ha, ya bụ na ha ga-abụ Ụ1 ebe nke na esote ya ga-abụ Ụ2. N’etiti ha abụọ dị ka anyị siri hụ n’ọmụma atụ 5 dị n’elu ka a ga-etinye ụda ndị a. Nke a pụtara na ọ bụ agwara Ụ1 ga-egosipịụta agwara mkpọso a ga-etinye iji kewaa ụdaume abụọ ka ha ghara ịbịakọta ọnụ.

Asụsụ Igbo bụ asụsụ nwere ụdịrị nkejiokwu atọ: ụdaume (dịka o), myrirụdaume (dịka m) na mgbochiume+udaume (dịka dị). Mkpụrụokwu Igbo nwere ike ịmalite ma ọ bụ kwụsi n’ụdị nkejiokwu ọ bụla. A bịa n’etiti okwu, ụdaume bụ naanị ụdị nkejiokwu e nweghị ike ịnọ naanị ya. Ya bụ na e nwere ike inwe myiriụdaume (N) na mgbochiume+ụdaume (CV). Ọ bụ n’ihi nke a mere na mgbe e nwere okwu abụọ; okwu nke mbụ kwụsị n’ụdaume ma nke abụọ amalite n’ụdaume, mgbe a na-akpọpụta ha, ebe mkpọpụta ha anaghị enwe ike akpọpụta ha iche iche. Mkpọpụta ụdaume ndị ahụ iche iche ga-ekwe omume ma e nwee ntinye mgbochiume n’etiti ha abụọ. Naanị onye asusụ Igbo abụghi asusụ ara nne ya ma ọ bụ ndị nwere asụsụ Igbo dịka ara nne ha ma ha amaghị asụ ya bụ ndị nwere ike ịkpọpụta ụdaume dị otu ahụ iche iche. Dị ka Casali (1996, 1997); Orie na Pulleyblank (2000); Pulleyblank (1998) na Rosenthel (1994, 1997) si kọwapụta, a na-ahụta ọnọdụ hiatus na mmebeokwu ma ọ bụ n’usorookwu e jikọtara ọnụ. Site n’ihe ndị odee dere, ha na-akọwapụta na asụsụ mba ụwa anaghị anabata hiatus. Nke a mere na ndị nwe asụsụ na-achọ ụzọ ma ọ bụ chọrọ ụzọ ha ga-esi wee dozie ya ma ọ bụ kewaa ụdaume ndị a. Mana otu ihe doro anya bụ na ọ bụghị otu ụzọ ka ha dum si eme nke a; nke pụtara na asụsụ ọ bụla nwere ụzọ o si agba mbọ idozi nke ya. Iji maa atụ, asụsụ Tivi dị ka Kwambhehar (2014) siri kọwapụta na-emepụta myịnaabọ/ụdamkpị dị ka otu usoro ha ji edozi hiatus mana ọ dịghị etu a n’asụsụ Igbo. Site na nkọwa Casali na Rosenthel, ihe a ga-eji tịụnyere ndozi a bụ usoro nkejiokwu dị mma. N’aka nke ha, Orie na Pulleyblank (2000) kwuru na ọ bụ nhịahụ dị na mkpọpụta ụda nwere ike iweta ntinye mgbochiume n’etiti hiatus. Nke a bụ eziokwu n’asụsụ Igbo. Usoro ezi nkejiokwu hụtara ndozi hiatus n’ụdị usorookwu adịghị mma nke na-enweghị ONSET (nkejiokwu nke abụọ anaghị amalite na mgbochiume). N’aka nke ọzọ, usoro mkpọpụta kwuru na ọ bụ nhịa ahụ dị n’idozigharị ebe mkpọpụta site n’otu ụdaume dị gaa n’ọzọ dịkwa iche bụ ndị na eyighị onwe ha. Kawu (2000) kwuru na usoro mkpọpụta megidere hiatus bụ *HIATUS ma ọ bụ NOHIATUS. Iwu atụmatụ ọptimaliti dabara n’ogo abụọ nke gụnyere; ntụkwasị obi na ịrịba ama/nnwenzi. Ihe iwu ntụkwasị obi chọrọ bụ na ihe a ga-enweta na ihe e tinyere ga-abụ otu ihe na nke e wepụtara. Ọkọtọ ịrịba ama/nnwenzi na-akọwa na ọdịdị ụfọdụ ka ibe ha mma. Mmekọrịta ịrịba ama/nnwenzi na ntụkwasị obi n’ogogo na-ezipụta ntụcha ọkaibe n’ihe ọ bụla e nyere. N’atụtụ ọptimaliti, ụdi ntinye ọ bụla na-enupụ isi n’iwu ntụkwasị obi. Nke a bụ eziokwu n’ihi na ụda ọ bụla e tinyere na mwepụta na-eme ka e nwee ndiiche na mwebanye bụ nke na-adịghị na ndepụta mkpụruokwu ahụ (Archaengeli na Langendoen, 1997).

Mmechi

Akwụkwọ a e lebanyela anya na ntinye mgbochiume dịka otu ụzọ asụsụ Igbo si ebu agha megide hiatus. Ọ dị nnọọ mkpa inwe ezi usoro ụdaasụsụ nwere ezi nkọwa. Ọ bụ eziokwu na nkọwa ndị nchọcha ufọdụ gbasara nnọkọ ụdaume abụọ n’etiti okwu gosiri na ntinye ụda, olilo, na ndapụ ụdaume bụ site n’ikwu okwu ọsọ ọsọ. Nchọcha a gala n’ihu ime ka o dowanye anya ihe mere ede ibe nwịị gbasara ntinye ụdangwe. Ya mere nchọcha a na-ekpebi na ọ bụ n’ihi ịgba mbọ ihụ na nkejiokwu ọ bụla na mkpọpụta ga-amaliterịrị na mgbochiume. Nke a bụ nkwenye zuru asụsụ mba ụwa ọnụ maka na o nwegghị asụsụ na-enweghị nkejiokwu mgbochiume na ụdaume mejupụtara. Ọ bụ n’ihi nke a mere asụsụ Igbo ji etinye ụdangwe na mkpọpụta okwu nkejiokwu abụọ nọdebere onwe ha nso; ma ọ bụrụ na nkejiokwu nke mbụ kwụsịrị n’ụdaume elu nkejiokwu nke abụọ nọ nke mbụ nso amalite n’ụdị ụdaume ọ bụla msasịrị ya. Ntinye ụdangwe bụ iji hubeere iwu ọptimaliti zuru mba ụwa ọnụ sịrị na nkejiokwu ọ bụla ga-amaliterịrị na mgbochiume (ONSET). Nrube isi nye ONSET pụtara na ọkọtọ nnwenzi ka nke ntụkwasị obi ogo ma pụtakarịa ihe na ntinye n’ọtụtụ asụsu mba ụwa.

 

Edensibịa

Archaengeli, D., Langendoen, T. (Eds.). (1997). Optimality Theory, an Overview. Blackwell Publishers, Malden, MA.

Blevins, J. (2008). Consonant epenthesis: natural and unnatural histories. In Jeff Good (ed.), Language universals and language change. Oụford: Oụford University Press. 79-107.

Booij, G. (1996). Cliticisation as prosodic integration: the case of Dutch. The Linguistic Review, 13, 219-242.

Casali, R., 1996. Resolving Hiatus (Unpublished Ph.D thesis). University of California, Los Angeles.

Casali, R.F. 1997. Vowel elision in hiatus conteụts: Which vowel goes? Language 73: 493-533.

Davidson, L., & Erker, D. (2014). Hiatus resolution in American English: the case against glide insertion. Language, 90 (2), 482-514.

Dehghan, M. and Kambuziya, A. K. Z. (2012). A Short Analysis of Insertion in Persian. Theory and Practice in Language Studies, 2, (1), 14-23.

Emenanjo, E. N. (1978) Elements of Modern Igbo Grammar Ibadan: Oụford University Press.

Emenanjo, E. N (2010). Fnlji na mflgi n’Igbo. Onitsha: Vasity publishing company

Hasan, A. M. & Rasheed, A. R. (2016) Glide insertion and dialectal variation in Kurdish. European Scientific Journal. 12, 289-307 doi: 10.19044/esj.2016.v12n14p289 URL:http://dụ.doi.org/10.19044/esj.2016.v12n14p289.

Itȏ, J., 1989. A prosodic theory of epenthesis. Natural Language & Linguistic Theory 7, 217-260.

Kager, R. 1999. Optimality Theory. Cambridge: Cambridge University Press.

Kager, R.W.J. (2004). Introduction: constraints in phonological acọuisition. In R. Kager & J. Pater (Eds.), Constraints in Phonological Acọuisition (pp. 1-53). Cambridge, UK: Cambridge University Press.

Kawu, A. N. (2000). Hiatus resolution in Nupe. Journal of West African Languages.ụụụ111 (2) 27-43.

Kwambehar, S. T. (2014). Hiatus resolution strategies in Tiv. An M.A Dissertation. Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka

McCarthy, J. & Prince, A. (1993). Prosodic Morphology 1. Constraint interaction and

satisfaction Ms University of Massachussets, Armherst and Rutgers University, New Bruncewick, New Jersy.

McCarthy, J. & Prince, A. (1994). The emergence of the Unmarked Optimality in Prosodic Morphology. In MELS 24 Proceedings of the North East Linguistic Society, Mercy Gonzalez (ed.) University of Massachussets, Armherst.

McCarthy, J. & Prince, A. (1995). Faithfulness & reduplicative identity. In: Beckman, et al. (Eds.), University of Massachusetts Occasional Papers in Linguistics 18: Papers in Optimality Theory, pp. 249-384. ROA-60. http://ruccs.rutgers.edu/roa.html.

Molczanow, J. (2008). Gliding in Russian. Lingua, 118: 1080–1108

Mtenje, A. (2007). On recent trends in phonology: Vowel seọuences in Bantu languages. SOAS Working Papers in Linguistics 15(2007): 33-48.

Mudzingwa, C. & Kadenge, M. (2011). Comparing hiatus resolution in Karanga and Nambya: An Optimality Theory account. Nordic Journal of African Studies 20(3): 203-240.

Myers, S. P. 1987. Tone and the structure of Shona words. PhD dissertation, University of Massachusetts.

Nevins, A. and Chitoran, I. (2008). Phonological representations and the variable patterning of glides. Lingua, 118:1979-97.

Omachonu, G.S. (2007). From rule based to constraint based analysis: Issues in English Suprasegmental Phonology. A Ph.D Thesis in the Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka

Oyebade, F.O. (1998). A course in phonology. Ijebu-Ode: Shebiolimo Publishers.

Prince, A. & Smolensky, P. (1993). Optimality Theory, Constraint Interaction in Generative Grammar. Technical Report 2. Rutgers University Centre for Cognitive Science, Rutgers Optimality Archive (ROA 537)

Pulleyblank, D. (1998). Yoruba vowel patterns: Deriving assymetries by the tension between

opposing constraints. Ms. University of British Columbia.

Rosenthall, S. (1994). Vowel/Glide Alternation in a Theory of Constraint Interaction. Unpublished PhD dissertation, University of Massachusetts.

Rosenthall, S. (1997). The distribution of prevocalic vowels. Natural Language & Linguistic Theory 15(1): 139-180.

Sabao, C., (2009). Constraint Interaction and Ranking in Vocalic Hiatus Conteụts in Three Bantu Languages (MPhil thesis). Midlands State University, Gweru.

Sabao, C. (2015). Resolving hiatus in (isi)Ndebele: An optimality theoretic account. Ampersand 2, 122-135.

Sibanda, G. (2009). Vowel seọuences in Nguni: Resolving the problem of unacceptable VV seọuences. In M. Matondo, F. McLaughlin and E. Potsdam (eds.) Selected proceedings of the 38th Annual Conference on African Linguistics: Linguistic Theory and African Language Documentation. Somerville, MA: Cascadilla Proceedings Project. pp. 38-55.

Staroverov, P. (2014). Splitting theory and consonant epenthesis. PhD Thesis. The State University of New Jersey

Tanner, D. S. (2007). Conteụt Insensitive Vowel Hiatus Resolution in Ciyao. Rutgers Optimality Archive (ROA 458). Available at: http://roa.rutgers.edu/files/903-0307/903-TANNER-0-0.PDF.

Uffmann, C. (2007). Intrusive ịrṅ and optimal epenthetic consonants. In Language sciences 29, 451-476.

Vauụ, B. (2001). Consonant epenthesis and hypercorrection. Ms., Harvard University, Cambridge, MA.

Zygis, M. (2009). A perceptual study on glide insertions. ZAS, Berlin. Ms.

Zygis, M. (2010). Typology of consonantal insertions. ZAS papers in linguistics, 52. 111-140

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Nsogbu Ụmụakwụkwọ Na-enwe N’ide Edemede Leta N’Igbo N’ule Sinịọ Sekọndịrị

                                                Nke

                              Onwuka, Gloria T. (Ph.D)

          Ngalaba Mmụta Nka, Mahadum Naịjirịa, Nsukka

gloria.onwuka@unn.edu.ng

Ụmịedemede

Nchọcha a lebara anya na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n’ide edemede leta n’Igbo n’ule siniọ sekọndịrị. ọ bụ usoro sovee nkọwa ka e ji mee nchọcha a. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ ndị nkụzi asụsụ Igbo dị iri atọ na ise n’ọnụọgụ. E ji ajụjụ ederede njụmaza wee nweta ihe e ji mee nchọcha a. Ọ bụ usoro miin na standad divieshọn ka e ji hazie ihe a chọpụtara na nchọcha a. Nchọpụta nchọcha a gosiri na ụmụakwụkwọ na-eme ndehie n’edemede leta Igbo n’ule SSCE n’ebe ndị a: ekele mmeghe na ekele mmechi anaghị adaba, ha anaghị etinyecha ntụpọ ebe o kwesịrị ịdị, ha ne-eme ndehie n’ebe nsupe mkpụrụokwu Igbo ụfọdụ dị tinyere na ha na-ewebata olundị n’edemede leta n’Igbo. Nchọputa nchọcha a gosikwara na ihe na-ebute nsogbu ndị a bụ ụkọ ndị nkụzi a zụrụ nke ọma n’asụsụ Igbo, ejighị ezigbo nka nkụzi kụziere ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo, ụkọ ngwa nkụzi Igbo n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị, ọnọdụ akụnaụba ndị nne na nna ụmụakwụkwọ nakwa enweghị ezigbo mmasị ụmụakwụkwọ n’ebe ihe ọmụmụ asụsụ Igbo dị. Site na nchọpụta ndị a, onye nchọcha chere na ihe ga-enye aka belata nsogbu ndị a bụ : ndị gọvụmenti ịhụ na ndị nkụzi asụsụ Igbo a zụrụ nke ọma na ngwa nkụzi e ji akụzi asụsụ Igbo zuru oke n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị niile.

 

Mkpọlite na Ntụlegharị Nchọcha

Asụsụ bụ ihe dị oke mkpa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. ọ bụkwa ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe mmekọrịta. Ezeuko (2006), kọwara asụsụ dịka okwu e kwuru n’ọnụ ma ọ bụ e deturu edetu site na mkpụrụ edide ya. Ọ bụ site n’asụsụ ka mmadụ si egosipụta ihe dị ya n’obi. Asụsụ ọbụla ga-enwerịrị ndị na-asụ ya ma sikwa na ya na-aghọta onwe ha. E nwere ọtụtụ asụsụ na Naịjirịa nke asụsụ Igbo bụ otu n’ime ha.

Asụsụ Igbo bụ olu ndị Igbo na-asụ nke ndị na-asụ ya bụ ndị Igbo na steeti ndị a: Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu, Imo, na ụfọdụ mpaghara Delta, Rivas, Cross Riva, Akwa Ibom na Benue. N’ime steeti iri a hụtara ndị Igbo, ise n’ime ha ka ndị Igbo bicha naanị ha. N’ime steeti ise fọrọ afọ bụ ha na agbụrụ ndị ọzọ bikọtara. Steeti ise ndị Igbo nwe kpọmkwem bụ: Anambra, Abịa, Ebonyị, Enugu na Imo. Onye nchọcha hụtara asụsụ Igbo dịka olu ndị Igbo naanị ha nwe ma na-asụ. N’ala Naịjirịa, asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ atọ pụtakarịchara ihe n’asụsụ e nwere ma bụrụkwa nke gọvụmenti kwadoro ka a na-agu n’ụlọakwụkwọ ma na-elekwa n’ule sekọndịrị. N’ihi nke a, ụmụakwụkwọ sekọndịrị ọ kachasị n’ala Igbo na-ele ule asụsụ Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị a na-akpọ “West African Senior School Certificate Eụamination (WASSCE)” n’asụsụ Bekee. N’ule a a na-enye ụmụakwụkwọ isiokwu ise nke ha ga ahọrọ otu masịrị ha ma dee edemede na ya, nke edemede leta na-abụ otu n’ime ha.

Edemede bụ otu ụzọ e si anwale ụmụakwụkwọ n’amụmamụ asụsụ Igbo iji mata etu ha si ghọtadebe ihe a kụziri ha. Ọ bụ ụzọ mmadụ si akọwa ihe e nyere ya ka ọ kọwaa. Na nkọwa ya, Emenanjo (2005) gosipụtara na edemede na-adị n’ụdị nkọwasị, nchemina ma ọ bụ n’ụdị ide leta. N’aka nke ya, Nwadike (1993) kọwara edemede dịka akọrakọ ma ọ bụ ederede nka nke na-egosipụta ụzọ e si were asụsụ dịka ngwa ọrụ iji kọwapụta ihe e bu n’uche nke ọma. Edemede dị mkpa nke ukwu, nke a mere o ji dị mkpa na onye nkụzi ga-enye ụmụakwụkwọ ọzụzụ na ya iji asụsụ nne ji mụọ ha wepụta ihe ha bu n’uche nke ọma dịka etu o siri metụta ha, mkpa ha, echiche ha, amamihe ma ọ bụ mmụta n’ihe na-amasị ha. N’otu aka ahụ kwa, onye nkụzi ga-agba mbọ inye ụmụakwụkwọ nkwalite na ohere maka ụdị edemde dị iche iche tinyere ndị ahụ metụtara nhụrụnuche na nsirinuche onye pụta.

Edemede ọ bụla nwere usoro na nhazi nke ya. Etu e si ahazi edemede leta abụghị etu e si ahazi edemede ndị ọzọ dịka edemede akọmakọ, mkparịtaụka dgw. Edemede leta bụ edemede a na-edegara onye anọghị nso iji gwa ya ihe odee gaara ịgwa ya ma ọ bụrụ na ọ nọ nso. Nhazi edemede leta na-adị n’ụdị a: adreesị (ebe leta si na oge e dere ya), ekele mmalite, ahụ leta na ekele mmechi na aha onye dere leta. Nwata akwụkwọ ọ bụla kwesịrị ịhazi usoro edemede ya nke ọma bido na adreesị rue na mmechi.

Ọtụtụ mgbe, ụmụakwụkwọ na-enwe nsogbu dị iche iche mgbe ha na-ede edemede n’Igbo ọ kachasị leta. Ha na-eme ndehie dị iche iche mgbe ha na-ede edemede leta. Ndehie bụ ụzọ niile onye na-ede asụsụ si edehie ihe ọ na-ede n’ụdị ọ bụla. O nwere ike ịpụta ihe na nsụpe mkpụrụokwu, etinyeghị akara edemede dịka; kpọm, rịkọm, ịhapụ mkpụrụokwu ma ọ bụ akara edmede e kwesịrị ka e denye. Ndehie dịka Ubahakwe (2002) si kọwa nwere ụdị abụọ. Nke mbụ bụ nke ọ kpọrọ ‘ndehie na-esite n’otu asụsụ gafee n’asụsụ ọzọ. Nke abụọ bụ nke na-apụta ihe mgbe onye na-ede asụsụ ahụ amachaghị ma ọ bụ edobechaghị iwu asụsụ ahụ mgbe ọ na-ede ihe odide asụsụ ahụ. Ndehie dị n’ụdị nke abụọ nwere ike isite n’aka onye nkụzi, nke a bụ maka na oge ụfọdụ ndị nkụzi na-akụzi asụsụ Igbo amachaghị iwu nsupe na mmebe okwu dị n’asụsụ Igbo. Ọtụtụ ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’edemede Igbo na-abụkarị n’ebe ndezita dị. ọtụtụ ihe bụ ihe na-ebute ọnọdụ a dịka: mkpọhie mkpụrụokwu nke sitere na mmekọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee, ụmụakwụkwọ iwebata olundị ha nke dịwagara iche n’Igbo izugbe na amaghị usoro ndakọrịta ụdaume. Ndehie nke a na-apụtakarị ihe n’ebe mkpọpụta, iwu mmebe okwu Igbo na mkpụrụasụsụ (Oluikpe, 2008). N’ịkwado nke a onye isi asụsụ Igbo n’ule WASSCE n’afọ 2014 kwupụtara na ihe dịka pasenti iri asatọ na ise enwetaghị ma otu maakị na ndezita n’edemede ha n’ule WASSCE n’afọ 2014. ọ gara n’ihu kwuo na ọ dị mkpa na ụmụakwụkwọ ga-ewepụta oge ma tinye uche n’ọmụmụ etu e si asupe mkpụrụokwu Igbo nakwa iwu odide Igbo ma o bụrụ na ha ga-eme nke ọma n’edemede ha n’oge ọdịniihu.

Nsogbu ozọ ụmụakwụkwọ na-enwe n’ide leta n’Igbo bụ na ha anaghị ewepụta ndịna dị n’isiokwu ha na-ede maka ya nke ọma. Ewepụtaghị ndịna ndị a ma kọwaa ha nke ọma ga-eme ka edemede ha hapụ inye ọgụụ afọ ojuju nke ga-eme ka ha ghara ime nke ọma n’edemede Igbo ọ kachasị leta. Enweghị mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo bụkwa nsogbu ọzọ ụmụakwụkwọ na-enwe n’ide edemede leta n’Igbo. Nke a dịka Umo (2006) siri kọwa, esiteghị n’asụsụ Igbo n’onwe ya kama o nwere ike isite n’ụdị nka ndị nkụzi Igbo ji akụzi ya nakwa ngwa nkụzi e ji akụzi asụsụ Igbo. Nwadike (1993), hụtara ejighị ezigbo nka nkụzi akụzi edemede leta dịka otu nsogbu na-adọghachi nkụzi na ọmụmụ edemede leta n’Igbo azụ n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị. ọ kọwara na nka nkụzi ọtụtụ ndị nkụzi na-ejikarị akụzi leta bụ nka okwukwu, nke ọ bụ naanị onye nkụzi na-ekwu, ụmụakwụkwọ anaghị etinye echiche nke ha. Iji naanị nka a kụziere ụmụakwụkwọ edemede leta adịghị mma maka na ha nwere ike ha agaghị aghọtacha ihe onye nkụzi na-akụzi. Nke a ga-eme ka ha ghara inwe mmasị ma mee ka ha ghara ime nke ọma n’ule.

Mbunuche nchọcha a bụ ileba anya na nsogbu ụmụakwụkwọ sekọndịrị na-enwe n’ide edemede leta n’ule sinịọ sekọndịrị. Nchọcha a lebara anya kpọmkwem na:

  1. Ụdị ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’ide edemede leta n’Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị.
  2. Nka ndị nkụzi ji akụziri ụmụakwụkwọ sekọndịrị edemede leta n’Igbo.
  3. Ụdị ngwa nkụzi e nwegasịrị n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị.
  4. Ka ụmụakwụkwọ sekọndịrị si nwe mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo.

E wepụtara ajụjụ anọ maka nchọcha a:

  1. Kedụ ụdị ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’ide edemede leta n’Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị?
  2. Kedụ ụdị nka ndị nkụzi ji akụziri ụmụakwụkwọ sekọndịrị edemede leta n’Igbo?
  3. Kedụ ụdị ngwa nkụzi e nwegasịrị n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị?
  4. Kedụ ka ụmụakwụkwọ sekọndịrị si nwe mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo?

 

Usoro Nchọcha

       Ụdị nchọcha e jiri mee nchọcha a bụ nke sọvee. ọ bụ nchọcha nke sọvee maka na e ji usoro sọvee lebaa anya na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n’ide edemede leta n’ule asụsụ Igbo na sinịọ sekọndịrị. Nchọcha nke sọvee dịka Nworgu (2006) kọwara, bụ ebe e ji mmadụ ma ọ bụ ihe ole na ole nweta ihe njiri mee nchọcha nke nọchitere anya mmadụ ma ọ bụ ihe niile a chọrọ iji mee ya bụ nchọcha.

Ebe onye nchọcha mere nchọcha a bụ n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị n’okpuru ọchịchị Mgbago ugwu Igboeze nke steeti Enugu. Ndị Mgbago ugwu Igboeze nwere ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị iri na asaa n’ọnụọgụ. Ndị agbataobi ha n’ọdịda anyanwụ bụ ndị Ndịda Igboeze nke steeti Enugu, na ndịda ugwu bụ ndị Amaka nke steeti Kogi, n’ọwụwa anyanwụ bụ Udenu dị na steeti Enugu ebe agbataobi ha na Mgbago ugwu bụ ndị Adapi nke steeti Benue. Ndị Mgbago ugwu Igboeze bụ ndị e ji ịkọ ọrụ ugbo mara, nri ha na-akọpụta gụnyere: ede, ji, akpụ, ọka na ụmụ nri ndị ọzọ nke ha na-eri ma na-erekwa n’ahịa.

Ndị nkụzi asụsụ Igbo dị iri atọ na ise n’ụlọakwụkwọ niile dị n’okpuru ọchịchị Mgbago ugwu Igboeze , ka e ji mee nchọcha a. E meghị nsere ọbụla n’ihi na ọnụọgụ ha pere mpe.

Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ njụmaza, nke isiokwu ya bụ Njumaza Nsogbu ụmụakwụkwọ N’ide Edemede Leta N’Igbo (NNUNELI). Ọ bụ onye nchọcha ji aka ya mepụta njụmaza ahụ. Ọ bụkwa ndị ọkammụta nọ na nnukwu ngalaba Edukeshọn na Mahadum Naịjirịa, Nsụkka tulere ya. Ajụjụ dị iri abụọ na ise nke ndị nkụzi zara mebere NNUNELI. E ji miin na ndịpụ n’izugbe (Standard Deviation) wee hazie ma tụchaa ihe njiri mee nchọcha e nwetara na nchọcha a. Akara miin bidoro na 2.50 gbagowe ka a nabatara dịka ọsịsa dabara n’ihe a na-achọ, ebe akara miin pekarịrị 2.50 bụ ndị a nabataghị na nchọcha a.

Nchọpụta

Ajụjụ

Nchọcha nke Mbụ

           Kedụ ụdị ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’ide edemede leta n’Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị?

Tebul 1: ọsịsa Miin na Standad Divieshọn ụdị ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’ide edemede leta n’Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị (N =35).

Ọnụọgụ Ndịna SD Nkọwa
1 Ekele mmeghe ha na nke mmechi anaghị adagba. 3.51 0.88 Nnabata
2 Ụmụakwụkwọ a naghị etinyecha ntụpọ ebe o kwesịrị. 2.97 0.74 Nnabata
3 Ụmụ akwụkwọ na-emekarị ndehie n’ebe nsupe mkpụrụokwu Igbo dị . 3.14 0.79 Nnabata
4 Ụmụakwụkwọ a naghị eme ndehie n’ebe nsupe mkpụrụokwu Igbo dị. 2.17 0.54 A nabataghị
5 Ụmụakwụkwọ na-ewebata olundị n’edemede leta ha. 2.86 0.71 Nnabata
6 Ụmụakwụkwọ na-ahapụ mkpụrụokwu ma ọ bụ akara edemede ebe e kwesịrị ka e denye ha. 2.51 0.63 Nnabata
7 Ụmụakwụkwọ na-agwakọta asụsụ Bekee na nke Igbo n’edemede ha. 2.89 0.72 Nnabata
Nchịkọta 2.86 0.72 Nnabata

 

Tebul nke mbụ gosiri ọsịsa miin na standad divieshọn ụdị ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’ide edemede leta n’Igbo. Site na tebul a, ndị zara ajụjụ nabatara ndịna ajụjụ 1, 2,3,5,6, na 7. Ajụjụ ndị a nwere akara miin 3.51, 2.97, 3.14, 2.86, 2.51, na 2.89 n’otu n’otu. N’aka nke ọzọ, ndị zara ajụjụ anabataghị ndịna ajụjụ 7 nke akara miin ya bụ 2.17. Na nchịkọta, akara miin 2.86 gosiri na ndị zara ajụjụ kwenyere na ụdị ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’ide edemede leta n’Igbo gụnyere na: ekele mmeghe ha na nke mmechi ha anaghị adagba, ha anaghị etinyecha ntụpọ ebe o kwesịrị ịdị, ha na-emekarị ndehie n’ebe nsupe mkpụrụokwu Igbo dị. Ọzọ kwa, ụmụakwụkwọ na-ewebata olundị n’edemede leta ha, ha na-ahapụ idenye mkpụrụokwu ma ọ bụ akara edemede ebe o kwesịrị ka e denye ha ma na-agwakọtakwa asụsụ Bekee na nke Igbo n’edemede ha.

 

 

 

 

 

 

 

Ajụjụ Nchọcha nke Abụọ

Kedụ ụdị nka ndị nkụzi ji akụziri ụmụakwụkwọ sekọndịrị edemede leta n’Igbo?

 

Tebul 2: Ọsịsa Miin na Standad Divieshọn ụdị nka ndị nkụzi ji akụziri ụmụakwụkwọ sekọndịrị edemede leta n’Igbo (N =35).

Ọnụọgụ Ndịna SD Nkọwa
8 Ndị nkụzi Igbo na-eji usoro arụmarụ na nchọpụta akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo . 3.09 0.77 Nnabata
9 Ndị nkụzi Igbo na-eji usoro akụkọ akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo. 2.71 0.68 Nnabata
10 Ndị nkụzi Igbo na-eji usoro mkparịtaụka akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo . 2.77 0.69 Nnabata
11 Ndị nkụzi Igbo na-eji usoro asọmpi akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo. 2.86 0.71 Nnabata
12 Ndị nkụzi na-eji usoro nkọwapụta akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo. 3.11 0.79 Nnabata
13 Ndị nkụzi na-eji usoro egwuregwu akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo. 2.66 0.66 Nnabata
14 Ndị nkụzi na-agwakọta nka dị iche iche oge ha na-akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo. 2.97 0.74 Nnabata
Nchịkọta 2.88 0.72 Nnabata

 

Tebul nke abụọ gosiri ọsịsa miin na standad divieshọn ụdị nka ndị nkụzi ji akụziri ụmụakwụkwọ sekọndịrị edemede leta n’Igbo. Ihe njiri mee nchọcha e gosipụtara na tebul nke abụọ na-egosi na ndị zara ajụjụ kwenyere na ndịna ajụjụ nke asatọ rue na nke iri na anọ. Nke a pụtara na ndị nkụzi asụsụ Igbo na-eji nka arụmarụ na nchọpụta, usoro akụkọ, mkparịtaụka, asọmpi, nkọwapụta, egwuregwu na ngwakọta nka dị iche iche mgbe ụfọdụ na-akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo.

 

 

 

 

 

Ajụjụ Nchọcha nke Atọ

Kedụ ụdị ngwa nkụzi e nwegasịrị n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị?

 

\Tebul 3: Ọsịsa Miin na Standad Divieshọn ụdị ngwa nkụzi e nwegasịrị n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị (N =35).

Ọnụọgụ Ndịna SD Nkọwa
15 Akwụkwọ ọgụgụ ụtọasụsụ Igbo. 3.03 0.76 Nnabata
16 Igwe kọmputa. 2.41 0.60 A nabataghị
17 Akwụkwọ ọkọwa okwu Igbo. 2.37 0.59 A nabataghị
18 Eserese kaadị. 2.11 0.53 A nabataghị
19 Flannelgraph e ji anyado eserese kaadị na mgbo odee. 2.11 0.53 A nabataghị
Nchịkọta 2.41 0.60 A nabataghị

 

Tebul nke atọ gosiri ọsịsa miin na standad divieshọn ụdị ngwa nkụzi e nwegasịrị n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Site na Tebul a, ndị zara ajụjụ kwenyere na ndịna ajụjụ nke iri na ise, nke a pụtara na e nwere akwụkwọ ọgụgụ ụtọasụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Sitekwa na Tebul a, ndị zara ajụjụ ekwenyeghị na ndịna ajụjụ nke iri na isii rue na nke iri na itọolu. Nke a pụtara na igwe kọmputa, akwụkwọ ọkọwa okwu Igbo, eserese kaadị nakwa flannelgraph e ji anyado eserese kaadị na mgbo odee kọrọ ụkọ n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Na nchịkọta, akara miin 2.41 gosiri n’eziokwu na ngwa nkụzi asụsụ Igbo kọrọ ụkọ n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị.

Ajụjụ Nchọcha nke Anọ

Kedụ ka ụmụakwụkwọ sekọndịrị si nwe mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo?

 

 

Tebul 4: Ọsịsa Miin na Standad Divieshọn ka ụmụakwụkwọ sekọndịrị si nwe mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo(N =35).

Ọnụọgụ Ndịna SD Nkọwa
20 Ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghị ezigbo mmasị n’ihe ọmụmụ asụsụ Igbo n’ihi na enweghị nkwekọrịta n’otu ọtọgrafi e ji ede asụsụ Igbo. 3.11 0.78 Nnabata
21 Ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghị mmasị n’ihe ọmụmụ asụsụ Igbo n’ihi na ha a naghị enweta ezigbo nkwado site n’aka nne na nna.. 2.97 0.74 Nnabata
22 Enweghị ezigbo ngwa nkụzi e ji akụzi asụsụ Igbo na-eme na ụmụakwụkwọ enweghị ezigbo mmasị n’ihe ọmụmụ Igbo. 2.97 0.74 Nnabata
23 Enweghị ndị nkụzi a zụrụ nke ọma zuru oke n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị na-eme na ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghị mmasị n’ihe ọmụmụ asụsụ Igbo. 3.43 0.86 Nnabata
24

 

25

Ọ na-eme ụmụakwụkwọ ihere ịsụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị.

Ụmụakwụkwọ sekọndịrị nwere ezigbo mmasị n’ihe ọmụmụ asụsụ Igbo.

2.66

 

2.11

 

0.66

 

0.53

Nnabata

 

A nabataghị

Nchịkọta 2.88 0.72 Nnabata

 

Tebul 4 gosiri ọsịsa miin na standad divieshọn ka ụmụakwụkwọ sekọndịrị si nwe mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Site na tebul, ndị zara ajụjụ kwenyere na ndịna ajụjụ nke iri abụọ, iri abụọ na otu, iri abụọ na abụọ, iri abụọ na atọ na iri abụọ na anọ ndị akara miin ha bụ 3.11, 2.97, 2.97, 3.43, na 2.66 n’otu n’otu. Nke a pụtara na e nweghị nkwekọrịta n’otu ọtọgrafi e ji ede asụsụ Igbo, a naghị enweta ezigbo nkwado site n’aka nne na nna, enweghị ezigbo ngwa nkụzi e ji akụzi asụsụ Igbo, enweghị ndị nkụzi a zụrụ nke ọma zuru oke na ihere ime ụmụakwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo na-eme n’ọtụtụ n’ime ha enweghị mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo. N’aka nke ọzọ, ndị zara ajụjụ ekwenyeghị na ndịna ajụjụ nke iri abụọ na ise nke na-egosi na ụmụakwụkwọ sekọndịrị nwere ezigbo mmasị n’ihe ọmụmụ asụsụ Igbo.

Mkparịtaụka

                   Nchọpụta nchọcha a gosiri na ụmụakwụkwọ na-enwe nsogbu n’ide edemede leta n’Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị. Site na nchọcha a, ụmụakwụkwọ na-eme ọtụtụ ndehie dị iche iche n’ide edemede leta n’Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị. Ekele mmeghe ha na nke mmechi ha anaghị adagba, ha anaghị etinyecha ntụpọ ebe o kwesịrị ịdị, ha na-emekarị ndehie n’ebe nsupe mkpụrụokwu Igbo dị. ọzokwa, ụmụakwụkwọ na-ewebata olundị n’edemede leta ha, ha na-ahapụ idenye mkpụrụokwu ma ọ bụ akara edemede ebe o kwesịrị ka e denye ha ma na-agwakọtakwa asụsụ Bekee na nke Igbo n’edemede ha. Ndehie ndị a na-eme na ụmụakwụkwọ anaghị eme nke ọma n’ule asụsụ Igbo ọ kachasị na sinịọ sekọndịrị. Nke a kwadoro ihe onye isi asụsụ Igbo n’ ule WASSCE n’afọ 2014 kwupụtara na ihe dịka pasenti iri asatọ na ise enwetaghị ma otu maakị na ndezita n’edemede ha n’ule SSCE.

Nchọpụta nchọcha a gosikwara na ndị nkụzi asụsụ Igbo na-eji nka arụmarụ na nchọpụta, usoro akụkọ, mkparịtaụka, asọmpi, nkọwapụta, egwuregwu na ngwakọta nka dị iche iche mgbe ụfọdụ na-akụziri ụmụakwụkwọ edemede leta n’Igbo. Nchọpụta a adabaghị na nke Nwadike (1993) nke na-egosi na nka nkụzi ọtụtụ ndị nkụzi na-ejikarị akụzi leta bụ nka okwukwu, nke ọ bụ naanị onye nkụzi na-ekwu, ụmụakwụkwọ anaghị etinye echiche nke ha. Na nchọcha a, a chọpụtara na ndị nkụzi na-agwakọta ọtụtụ nka ọnụ na nkụzi ha, kama onye nchọcha na-eche na ọ bụ enweghị mmasị ụmụakwụkwọ n’asụsụ Igbo butere anaghị eme nke ọma ha n’edemede Igbo n’ule SSCE.

Nchọpụta nchọcha a gosikwara na ọtụtụ ngwa nkụzi kọrọ ụkọ n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Ngwa nkụzi dị mkpa na nkụzi na ọmụmụ asụsụ Igbo. Ọ bụ ihe na-enyere onye nkụzi aka na nkụzi ya ime ka ihe ọ na-akụzi doo ụmụakwụkwọ anya nke ọma. Ọ bụrụ na nke a adịghị, ọ ga-eme ka ụmụakwụkwọ hapụ ịdị na-eme nke ọma n’ule asụsụ Igbo nke edemede leta bụ otu n’ime ya. Nchọpụta a dabara na nke Umo (2006) na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n’ide leta n’Igbo bụ site n’ụdị ngwa nkụzi ndị nkụzi ji akụziri ha ihe.

Ndị zara ajụjụ kwenyere na nchọcha a n’ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghị mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo maka na e nweghị nkwekọrịta n’otu ọtọgrafi e ji akụzi asụsụ Igbo. Ha kwenyekwara na a naghị enweta ezigbo nkwado n’aka nne na nna, enweghị ezigbo ngwa nkụzi e ji akụzi asụsụ Igbo, enweghị ndị nkụzi a zụrụ nke ọma zuru oke na ihere ime ụmụakwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo bụcha ihe na-eme na ha enweghị mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ enweghị mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo, ọ ga-emetụta ha n’ule ya, maka na ọ bụ ihe mmadụ nwere mmasị na ya ka ọ na-etinye uchu ime. Nke a mere o ji dị mkpa na ndị nkụzi ga-ebido n’oge kụziwere ụmụakwụkwọ uru ọ bara ịmụ asụsụ Igbo n’ogo praịmarị, nke a ga-eme ka ha nwee mmasị ịmụ ya na sekọndịrị. ọ ga-emekwa ka ha na-agụ, na-ede ma na-emekwa nke ọma na ya n’ule ọkachasị na nke WASSCE.

Mmechi, Mpụtara na Ntụnye Aro

Ụmụakwụkwọ na-enwe ọtụtụ nsogbu n’ide edemede leta n’Igbo n’ule sinịọ sekọndịrị. Ha na-eme ndehie n’edemede n’ebe ndezi dị, ndị nkụzi asụsụ Igbo na-eji nka nkụzi dịka usoro arụmarụ na nkọwapụta akụzi edemede Igbo. Ngwa nkụzi e ji akụzi asụsụ Igbo nke edemede ọkachasị leta so n’ime ya ezuchaghị oke n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị tinyere na ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghị ezigbo mmasị n’ebe ọmụmụ asụsụ Igbo dị.

Ndehie ụmụakwụkwọ na-eme n’ide edemede Igbo ọ kachasị edemede leta emeela ka ha hapụ ịdị na-eme nke ọma n’ule edemede Igbo. Ụkọ ngwa nkụzi e ji akụziri ụmụakwụkwọ ihe n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị emeela ka ụmụakwụkwọ ghara ịghọta ihe a na-akụziri ha nke ọma nke na-emetụta ha n’ule. Enweghị nkwekọrịta n’otu ọtọgrafi e ji akụzi asụsụ Igbo, anaghị enweta ezigbo nkwado n’aka nne na nna, enweghị ezigbo ngwa nkụzi e ji akụzi asụsụ Igbo, enweghị ndị nkụzi a zụrụ nke ọma zuru oke na ihere ime ụmụakwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo emeela ka ọtụtụ ụmụakwụkwọ ghara inwe mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Ụmụakwụkwọ ga-akwụsị iwebata olundị ya na ịgwakọrịta asụsụ Igbo na nke Bekee ọnụ mgbe ha na-ede edemede. O kwesịrị ka ha jiri naanị asụsụ Igbo (Igbo Izugbe) were na-ede edemede n’Igbo. ọ bụrụ na ha mee nke a, ha ga na-eme nke ọma n’edemede Igbo niile tinyere nke leta. Ndị nkụzi asụsụ Igbo ga-agba mbọ hụ na ha na-enye ụmụakwụkwọ edemede na klaas ka ha dee iji mee ka ha mụta nke ọma otu e si ede ma na-asụpe ihe otu o kwesịrị. Nke a ga-enyere ha aka ide ihe were were n’Igbo izugbe ma na-asụkwa ya etu o kwesịrị.

Nrụaka

Emenanjo, E.N.(2005). Ule Igbo Maka Sinịọ Sekọndịrị. Ibadan: Spectrum Books Ltd.

Ezeuko, R.O. (2006). Edemede Igbo maka Ndị Sinịọ Sekọndịrị. Ibadan: Macmillan Nigeria Ltd.

Nwadike, I.U. (1993). Nka na Usoro Nkụzi Igbo. Nsukka: Ifunanya publishers.

Nworgu, B.G. (2006). Educational Research: Basic Issues and Methodology. Nsukka: University Trust Publishers.

Oluikpe, B. (2008). Teaching the Art of Continuous Writing in Tertiary Education. In Ubahakwe, E.(Ed). The Teaching of English Studies; Reading for Colleges and Universities. Ibadan: Ibadan University Press.

Ubahakwe, E. (2002). Linguistics Inputs and Three Models of Presentation and Determinants of Students’ Achievements in Senior Secondary School Essay Writing. Unpublished B.A Project University of Nigeria,Nsukka.

Umo, U.C. (2006). Combined Effects of Game Srategy and Location as Factors of Academic Achievement in Igbo Grammar. International Journal of language, Society and Culture. Issue 18

West African Eụaminations Council (2014). Chief Eụaminers Reports’ Nigeria. Lagos: WAEC

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

AGỤMAGỤ ỌNỤ ỌDỊNAALA DỊKA AKỌRỌNGWA IDUUAZỊ: ILEBA ANYA N’AGỤMAGỤ NDỊ A HỌỌRỌ

 

 

Ifeka, O. R. PhD

Department of Igbo Language    

Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam Campus

 

 

Ụmịedemede

Tupu ọbịbịa ndị Bekee, ndị Igbo nwere agụmagụ dara ụda ha na-agụrụ onwe ha, nwee oge ha ji agụ nke ọbụla n’ime ha. Ihe ndị Bekee mere bụ iwebatara ndị Igbo usoro ọgụgụ na odide, nke nyeere ha aka ịmalite agụmagụ ederede. N’ezie, ọ bụ n’agụmmagụ ọnụ ọdịnaala ka ndị odeiduuazị siri kụrụ ike wee detuo iduuazị n’oge a. N’edemede a, a ga-ewere agụmagụ ọnụ ọdịnaala dịka ihe gụnyere akụkọ ifo, akụkọ okike, akụkọ ndịichie, abụ ọdịnaala, mbe na egwu. Ihe ndị ọzọ so n’agụmagụ ọnụ ọdịnaala bụ akpaalaokwu, ụkabụilu, ilu, agwụgwa, asịniilu, soromchịa. A ga-atụle ihe ọtụtụ ndị ọkammụta kwuru banyere isiokwu a ma nwalee ha n’otu n’otu. A ga-ahọrọ agụmagụ ederede ụfọdụ dị na mgbe ochie were mere ntụzi aka n’ụdị ọbụla iji zipụta na agụmagụ ọnụ ọdịnaala bụ akọrọngwa agụmagụ ugbua maọbụ iduuazị. Edemede a ga-abara ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ nọ na ngalaba amụmamụ asụsụ na omenala Igbo uru. A na-atụ alo ka ndị odee agụmagụ Igbo na-agbadokwasị ụkwụ n’agụmagụ ọnụ ọdịnaala were ede iduuazị n’ozuzu oke iji chekwaa ọdịnaala Igbo ka o wee site n’aka fere n’aka wee na-agbasa.

 

Mmalite

Agụmagụ bụ otu ngalaba ọmụmụ Igbo nke ọtụtụ ndị mmadụ na-agba mbọ itinye aka nka ha n’ide na ibipụta akwụkwọ. ọtụtụ ndị odee na-akụrụ agụmagụ ọnụ ọdịnaala tinye n’agụmagụ ekereuche ha na-ede n’ụdị akụkọ arọrọarọ, ejije na abụ. N’edemede a, anyị ga-ewere Elelịa na Ihe O Mere na Ala Bingo ndị D. N. Achara dere mere ọmụmaatụ n’igosipụta ụzọ dị iche iche agụmagụ ọnụ ọdịnaala siri nye aka n’ịmalite iduuazị. A họọrọ akwụkwọ ndị a maka ọmụmaatụ n’ihi na a chọba ndị odee Igbo ọrụ ha kacha hiwe isi n’agụmagụ ọdịnaala, D. N. Achara ga-abụ onye nke mbụ. Omenụkọ dịka akwụkwọ agụmagụ mbụ Igbo tuuru ugo na mbipụta mana Pita Nwana gbakwasịrị ụkwụ n’akọmndụ Igwegbe Odum were zipụta akwụkwọ ya, D. N. Achara kụụrụ ihe kpọmkwem n’akụkọ ifo were dee nke ya.

 

Kedụ ka agụmagụ ọnụ ọdịnaala siri bụrụ ide ji ndị odee iduuazị?

ọtụtụ ndị ọkammụta ekwuola ụzọ dị iche iche agụmagụ ọnụ ọdịnaala siri nyere ndị odee iduuazị aka n’oge a. Nwadike (1981) na-asị na agụmagụ ọdịnaala bụ mgbakwasa ụkwụ nke agụmagụ ugbua. ọ gara n’ihu na-akọwa na agụmagụ ọdịnaala dịka ogwe osisi, ebe agụmagụ ugbua bụ alaka ya. N’otu aka ahụ, ọ kọwara na ọtụtụ ndị odee anaghị enwe ike ede ihe ha chọrọ ide ma e wezụga agụmagụ ọdịnaala na-agbazinye ha ihe ha na-ede.

Finnegan (1970) tụlekọrịtara agụmagụ ọdịnaala na nke ugbua wee na-ekwu na uru agụmagụ ọdịnaala bara enweghị nkọwa. ọ kọwara n’aka ọrụ ya dị nnukwu mkpa n’iji ikpokọlata okwu niile odee ji ede abụ n’ihi na ọ bụ etu e si bụọ abụ ka onye odee si edepụta ya na nkebiabụ na nkebiabụ. Maduka (1980) na-ede na agụmagụ ugbua gbagidere ụkwụ n’agụmagụ ọdịnaala. ọ gara n’ihu na-akọwa na agụmagụ ọdịnaala na-ewepụtakarị akparamagwa onye mee ihe ọma, ọ nara ụgwọ ihe ọma ma onye mee ihe ọjọọ, ọ nara ụgwọ ihe ọjọọ. Otu aka ahụ kwa ka ụdị akparamaga ndị ahụ na-apụtakwa ihe n’agụmagụ ederede ugbua. Ọgbalu (1981) na-akọwa na “tupu ndị ọcha abịa na a na-enyi ụmụaka mmụta n’ala Igbo site n’ịkọrọ ha akụkọ ifo. A na-akụziri ha ọrụ dịịrị ha dịka irubere nne na nna na ndị okenye isi. ọ bụ site n’ụdị akụkọ ndị a ka ụfọdụ ndị odee si mụta ụfọdụ akụkọ wee detuo ha n’ime akwụkwọ dịka akwụkwọ agụmagụ”.

Dịka ndị a niile siri kọwaa, ọtụtụ ihe ha kwuru maọbụ na-ekwu gbadoro ụkwụ n’isiokwu ndị a: na agụmagụ ọdịnaala

  • dị mkpa na ndụ ndị Igbo, ọkachasị na ndụ ndị odee ugbu a,
  • dị mkpa n’ebe agụmagụ ugbua dị tụmadị n’abụ n’ihi na ọ bụ ihe a gụrụ n’ọnụ ka a na-ede n’akụkọ,
  • bụ ide ji agụmagụ Igbo niile n’ihi na ọtụtụ agụmagụ Igbo bụ site n’agụmagụ ọdịnaala ka e si wee dee ha,
  • ka e si akụziri ụmụaka ọrụ dịịrị ha dịka irube isi nye nne na nna ha na ndị okenye.

Dịka anyị chọpụtara na e ji akụkọ ọdịnaala akọwapụta ihe dị n’ime akwụkwọ agụmagụ nke na-enye aka ewepụta ihe mmụta sitere n’ime agụmagụ ahụ. Ihe kpatara e ji akpọ ha agụmagụ ọnụ ọdịnaala maọbụ agụmagụ ọdịnaala bụ maka e deghị ha ede oge ndị gboo ahụ chepụtara ha n’ala anyị. N’oge ugbu a, a na-edepụtazị agụmagụ ọdịnaala ndị mbụ edepụta. ọmụmaatụ Mbedịọgụ nke F. C. Ogbalu dere.

 

Nnabata akụkọ ifo n’edemede agụmagụ Iduuazị

Akụkọ ifo bụ akụkọ gbasara ihe mere n’ala ndị mmadụ, n’ala ụmụ mmụọ, n’ala anụmanụ nakwa n’ala dị n’agbata mmadụ, mmụọ na anụmanụ. ọ bụ akụkọ ndị gboo chepụtara wee na-akụziri ụmụ ha ihe. ọ bụ ọdịnaala nke bụ nwa tote o tokwuru ma bụrụkwa enyo ndị Igbo ji egosi ụmụ ụmụ ha ntọala gbasara ndụ ha. O nweghị onye a ga-asị chepụtara ya n’ihi na e debughị ya n’akwụkwọ mgbe e chepụtara ya. ọ na-ezipụta ndụ ụmụ anụmanụ, ụmụ mmadụ, ihe ndị na-adịghị ndụ na ndị mmụọ.

ọ bụ n’akụkọ ifo ndị a ndị o nweghị onye chepụtara ha maọbụ kpokọbara ha ka ndị odee ugbua na-agbado ụkwụ wee na-ede agụmagụ ha. Akụkọ ifo niile a maara maọbụ a nụrụla bụ agụmagụ ọnụ ọdịnaala. Akụkọ ndị e dere n’akwụkwọ dịka na Mbedịọgụ nke F. C. Ogbalu dere, ọkamgba nke J. O. Iroaganachi dere, Nza na Obu nke F. C. Ogbalu dere na ndị ọzọ bụcha akụkọ ifo. Ọmụmaatụ, na Nza na Obu a kọrọ otu akụkọ ihe kpatara na ụmụnwaanyị anaghị agbazị afụọnụ. A sị na otu nwaanyị aha ya bụ Nkemdịiche zuru ọla otu eze n’obodo ahụ zoo ya n’afụọnụ ya. E mesịa chọpụta na ọla eze dị n’afụọnụ nwaanyị ahụ, eze wee ma iwu ka a kpụchapụsịa ụmụnwaanyị niile afụọnụ ha were nsị egbe tee n’agba ha ka ọ ghara iputekwa ọzọ. Kamgbe ahụ, ụmụnwaanyị anaghị agbazị afụọnụ. ụdị akụkọ a bụ agụmagụ ọnụ ọdịnaala e deturu n’akwụkwọ.

N’oge gboo, onye na-akọ akụkọ na-eji ọnụ akọ ma werekwa imegharị ahụ nke a na-eji aka, ụkwụ, iku anya, egbugbereọnụ, ntụgharị olu, ile anya, iweli olu elu, iweda olu ala, isi, afọ na akụkụ ahụ ndị ọzọ wee na-ezipụta. Ma ndị ọka n’edemede iduuazị ji asụsụ ezipụta ihe ụfọdụ na-abụkarị site n’ikwunwe ihe e kwubugoro ọtụtụ mgbe dịka ọ bụrụ na a chọrọ izipụta ebe dị anya, a na-asị o wee jekata jekata, o wee gaa mmiri naasa na agụ naasa. Ọ bụrụ ihe mere mgbe dị anya a na-asị mgbe elu bụ ala ọsa, mgbe akwụ na-acha n’ọdụ igu. Asụsụ ndị a ka e ji ezipụta akụkọ ifo n’iduuazị.

 

Igozipụta ụzọ Agụmagụ ọnụ ọdịnaala Siri Nyere D. N. Achara Aka n’Idepụta Ala Bingo na Elelịa na Ihe O Mere

Anyị ga-atụle akwụkwọ abụọ ndị a site n’ileba anya n’ihe ndị a:

  • Ndịnaya
  • Setịn
  • Isiokwu
  • Agwa
  • Nkaasụsụ
  • Mmụta

Ndịnaya

N’Ala Bingo, e kere ihe mere n’ime ya ụzọ abụọ; ihe ndị mere n’ala mmadụ na ihe ndị mere n’eluigwe. Eze ha na-ebi n’ala mmadụ na-ebikwa n’eluigwe n’otu aka ahụ. ọ na-abụ o bie n’ala mmadụ n’oge ọkọchị, n’udummiri ọ rịgoro n’eluigwe biri. N’otu oge ka eze ahụ (Eze ọgara ọlụ n’afọ lọta n’afọ) hụrụ nzọụkwụ mmadụ n’akụkụ osimiri Bingo. ọ malitere chọwa onye nwe nzọụkwụ ahụ n’ihi na ọ gbara ya gharị. ọ bụ site n’aka otu ohu ya ọ chụpụrụ n’ihi oke nrịanrịa ka o siri mata ebe ọ ga-esi chọpụta onye nwe nzọụkwụ ahụ. Sitekwa n’aka ohu ọzọ ọ chụpụrụ n’ihi ọrịa ekpenta ka o siri mata ụzọ ọ ga-esi jide ada eze bi na mmiri, onye nwe nzọụkwụ ahụ. Tupu eze ahụ enweta ihe ọ chọrọ, e mere ka ọ bụrụ onye nwere obi ume ala. Site n’ọzụzụ e nyere ya, ọ bụ onye mpako na onye na-ebuli onwe ya elu. O ji ụkwụ ya wee gakwuru ndị ohu ahụ ọ ga-anata enyemaka n’aka ha n’otu n’otu n’ebe ọ chụpụrụ ha mgbe ha nọ na nsogbu. ọzọ bụ na eze bi n’ọwụwa anyanwụ ekweghị anabata ya. O wee site na nkụzi o nwerela banyere obi umeala wee rịọ ma rịọtuo eze ahụ. Eze (ọ gara ọlụ n’afọ lọta n’afọ) ghọtara mkpa ọ dị mmadụ iwetu onwe ya ala, ghọtakwa na amamihe abụghị ihe dịịrị naanị otu onye. A kụziri ya na ọ dị mkpa ịkpọkọta onye ọbụla mgbe a chọrọ ịtụ alo ọbụla dịka na ikwunaibe na ndị ohu iji tụpụta ezigbo alo. Nke a nyeere ya aka iji mata n’ime ụmụ ya, nwa ya nke ga-anọchite anya ya ma ọ nwụọ. Ndị ohu ya nyere ya atụmatụ iji were nwachapụta otu n’ime ụmụ ya, onye ga-anọchite anya ya. Site n’atụmatụ ahụ o wee chọpụta na nwa ya bụ ọgụ (bụ diọkpara) ga-anọchite ya na ọ bụghị Mgba.

Site n’akụkọ a, anyị ga-achọpụta na ihe niile mere n’akwụkwọ agụmagụ a bụ Ala ABingo nwere ike ime n’ụwanrọ, ebe ihe niile nwere ike ime eme. Ihe niile mere ebe a bụ ihe na-eme n’akụkọ ifo. Adaeze bi n’ime osimiri Bingo; Eze Ala Bingo na-ebi n’ala na-ebikwa n’elu igwe. A kọkwara ihe mere na ọ bụ diọkpara na-anọchi nna ya.

N’Elelịa na Ihe O Mere, anyị agụtala ihe na-eme n’ụwanrọ na akụkọ njem na ihe egwu. D. N. Achara malitere agụmagụ a site n’ịkọ etu Eze Amaghị Ihe ọma siri chọọ iji agwọ gbuo onye isi na-abịa arịọ ya ihe. Agwọ ahụ mechara tagbuo otu nwa nwoke eze ahụ mụtara nke zipụtara nkwenye ndị Igbo na “ọ bịara egbu m ga-egbu onwe ya”. Eze Amaghị Ihe ọma kweere nwa ogbenye bụ Elelịa ọnya ọnwụ. Chineke wee si n’aka ụmụanụmanụ ọ na-emere ebere zọpụta ya site n’ime ka ọ hụkwa kalarị nwunye eze furu efu. Eze zipụtakwara Elelịa ka ọ gaa lụta ada Nwọgọ, ebe o chere na Elelịa ga-ezute ọnwụ ya n’ihi na o nwebeghị onye gara ebe ahụ were ndụ ya pụta. Ndị niile Elelịa nyeere aka hụrụ na ije ahụ erighị isi ya. Ha nyeere ya aka mezue ihe Nwọgọ chọrọ. N’ikpeazụ Elelịa lụrụ ada Nwọgọ. Mgbe Elelịa nwụrụ ụmụnnụnụ buuru ozu ya dịka o kweburu ha na nkwa.

E lee anya n’akụkọ a, a ga-ahụ na ihe ndị mere na ya bụ ihe ndị nwere ike ime naanị n’ụwanrọ dịka ọ na-adị n’akụkọ ifo. Odee wepụtakwara ihe nkuzi e nwere n’akụkọ a dịka o si adị n’akụkọ ifo – onye na-eme mma na-emere onwe ya, onye na-eme njọ na-emere onwe ya.

N’iduuazị abụọ ndị a, a chọpụtara na akụkọ dị n’ime ha gbadoro ụkwụ n’akụkọ ifo. ọ dị ka a ga-asị na D. N. Achara bu n’uche wee deere ndị e ji nwayọọ edubanye n’agụmagụ ederede, ndị naanị agụmagụ ọdịnaala doro anya wee na-eduba ha n’agụmagụ ederede dịka ụmụaka.

 

Setịn

Nke a bụ ebe ihe nọrọ mee na oge ihe mere. Ebe ihe ndị a e depụtara nọrọ mee bụ n’Ala Bingo bụ n’ụwa mmadụ na eluigwe. Emenyeonu (1978) kọwara na ihe ndị mere n’ụwa mmadụ mere na mpaghara ụzọakoli, Ozuitem na Item. Dịka o si kwuo mmereeme ndị niile bụ n’ụzọakọli, Ozuitem na Item ka ha nọrọ mee, ebe ndị a maara nke ọma, ma o sitere n’ebe ahụ banye n’ụwanrọ. Akụkọ a dị n’ụzọ abụọ n’etu e si kọọ ya. Mmereeme niile dị n’otu ụzọ bụ n’ala mmadụ ebe n’akụkụ nke ọzọ bụrụkwa n’ụwanrọ ka ọ nọrọ mejupụta”.

Nkọwa Emenyeọnụ bụ ihe a na-eche na ọ jụtara D. N. Achara n’ihi na ọ maara nke ọma ma matakwa na ọ gụrụ akwụkwọ n’ụzọakọli ma rụkwaa ọrụ na mpaghara ahụ. Anyị na-eche ma na-ekwu na ihe mere n’agụmagụ Elelịa na Ihe O Mere bụ akụkọ ụwanrọ nke nọrọ n’ụwanrọ mee. ọ bụ naanị n’ụwanrọ ka ihe ọbụla nwere ike imezu.

ọzọ, ihe a kọrọ n’Elelịa na Ihe O Mere nọrọ na mpaghara Krọọsụ Riva mee. ọ bụ eziokwu na odee kọwara na ihe ndị a mere na Krọọsụ Riva, ma ọtụtụ ihe mere ebe a apụghị ime n’ụwa mmadụ. Ha bụ iduuazị a gbadoro ụkwụ n’akụkọ ifo wee dee.

 

Isiokwu

Site n’ihe a gụtara n’Ala Bingo, D. N. Achara na-ezipụta na “obi ume ala dị nnukwu mkpa na ndụ mmadụ”, ma e wepụ mpako. E ji ụzọ siri ike wee kụziere Eze (ọ gara ọrụ n’afọ lọta n’afọ) na mpako anaghị enyere mmadụ aka kama obi ume ala na-eduga mmadụ na ndụ ọma. Eze ji nkuzi ahụ e nyere ya wee kpokọta ndị ezinaụlọ ya, ha wee tụnyere ya alo ịchọpụta na ọ bụ diọkpara ya bụ ọgụ ga-anọchite anya ya ma ọ nwụọ. E leghị anya Achara chọrọ iji akụkọ a wee zipụta ihe kpatara diọkpara ji anọchite anya nna ya n’ala Igbo. D. N. Achara gbakwasara ụkwụ n’akụkọ ifo wee dee iduuazị a.

N’Elelịa na Ihe O Mere, odee wepụtara isiokwu ya nke ọma, o mere ka a ghọta na “onye mere ihe ọma meere onwe ya”. Nke a bụ nkuzi gbasara ime ezi omume oge niile, ka anyị wee gbanarị nsogbu n’ụdị ọbụla. “O nweghị omume ọjọọ na-agbanarị ntaramaahụhụ; n’aka nke ọzọ, ezi omume ọbụla na-enwete ezigbo x́gwq́ọrụ”. Isiokwu a pụtara ihe na ndụ Eze Amaghị Ihe ọma na Elelịa. Elelịa natara ezigbo ụgwọọrụ n’ihi obi ọma ya n’ebe ụmụanụmanụ na mmadụ ibe ya nọ, ebe Eze Amaghị Ihe ọma natara ntaramahụhụ dị egwu site n’agwọ dị ndụ o kechiri ka ọ tagbuo onyeisi gazịrị tagbuo otu nwa nwoke ọ mụtara. ọ bụ ụdị nkụzi a gbasara ezigbo omume a na-ahụkarị n’akụkọ ifo ka D. N. Achara webatara n’Elelịa na Ihe O Mere. N’ezie, D. N. Achara gbasoro agụmagụ ọdịnaala n’ịhọrọ isiokwu agụmagụ ya abụọ ndị a.

 

Agwa

N’akụkọ ifo, a na-enwe mmadụ, ndị mmụọ, ụmụanụmanụ dịka agwa ga. ọzọ, n’akụkọ ndị a, a kpaghị oke n’etiti ụwa mmadụ, ụwa mmụọ na ụwa ụmụanụmanụ. Aha ha na-egosipụta agwa ha ozigbo. Achara kewara agwa ụzọ abụọ, agwa larịị na agwa nnwogharị, Foster (1927). Na nkọwa Foster, agwa larịị bụ agwa ndị ahụ anaghị agbanwo akparamagwa site na mmalite akụkọ maọbụ ejije ruo na njedebe ya. Ha anaghị abụkebe isiagwa ma ọ bụ agwa dara ụda. Agwa nnwogharị bụ agwa ndị ahụ akparamaagwa ha na-agbanwo agbanwo. Ha nwere ike ime ihe ịtụnaanya. Ha bụ ndị nwere ọgụgụ isi nke na-enyere ha aka ịchọpụta ihe kwesịrị ka ha mee n’ọnọdụ ọbụla.

A bịa n’agwa dị n’Ala Bingo na Elelịa na Ihe O Mere, D. N. Achara gbakwasịrị ụkwụ n’agwa ndị na-adị n’akụkọ ifo were webe agwa ha. O nyere ọtụtụ n’ime ha aha site n’akparamagwa ha. Iji maa atụ, n’Ala Bingo, a kpọrọ Eze Ala Bingo (ọ gara ọlụ n’afọ lọta n’afọ) n’ihi na ọ na-ebi n’ụwa n’ọkọchi, na-ebi n’eluigwe n’udummiri. A kpọrọ nwaagbọghọ ahụ nwe nzọụkwụ a hụrụ n’akụkụ osimiri Bingo, Adaeze bi na mmiri n’ihi na o bi n’ime mmiri. Otu aka ahụ, e nwekwara Onye ukwu bi n’ọwụwa anyaanwụ; onye ọzụzụ atụrụ bi n’ọdịdịda anyaanwụ. A kpọkwara ụmụ Eze Bingo “Mgba” na “ọgụ” dịka akparamaagwa ha siri dị.

N’Elelịa na Ihe O Mere, a kpọrọ Eze ahụ afọ tara mmiri, “Eze Amaghị Ihe ọma” kpọkwara Onye ìsì aha gbasoro ọnọdụ ya dịka mmadụ. Agwa ndị ahụ nyeere Elelịa aka nwekwara aha site n’ọrụ ha dịka Anyaukwu (ọ na-ahụ ihe zoro ezo), Afọ-Afọ (o nwere nnukwu afọ o ji eri nnukwu nri), Ntị Anụnụ ( o nwere ntị o ji anụ ọbụladị ihe a ghara n’izu), Atịmkpara (o toro nnukwu ogologo). Ihe ọzọ D.N. Achara webatara n’Iduuazị ndị a dịka o siri metuta agwa bụ agwa ndị abụghị mmadụ, dịka, ụmụnnụnụ buuru ozu Elelịa na nnụnụ zọpụtara Elelịa n’aka Eze Amaghị Ihe ọma site n’inyere ya aka chọta kalarị ahụ furu efu.

N’ịga n’ihu, ọ bụrụ na a gbakwasị ụkwụ na nkọwa Foster (1927) were tulee agwa ndị dị n’Iduuazị ndị a, a ga-ahụkwa na ha dum bụcha agwa larịị dịka ndị na-adị n’akụkọ ifo ma e wepụ Elelịa, Eze Amaghị Ihe ọma na Eze ọ gara ọrụ n’Afọ lọta n’afọ.

 

Nkaasụsụ

N’Iduuazị abụọ ndị a, D.N. Achara gbasoro nka dị icheiche e ji akọ akụkọ ifo. ọ malitere Ala Bingo n’usoro e si amalite akụkọ ifo ọbụla n’asụsụ Igbo,

“ N’ala Bingo, otu onye dị                                                                                                                    ọ bụ onye nwere ike n’ebe                                                                                                                 Ihe niile dị….”

Nkaasụsụ a gbasoro n’ide akwụkwọ abụọ ndị a dị mfe dịka ọ na-adị n’akụkọ ifo iji hụ na onye ọbụla ma okenye ma ụmụaka ga-aghọta ihe e dere nke ọma ma nwee mmasị ịgụrụ ya ruo n’ọgwụgwụ.

 

Ihe Mmụta

            Iduuazị a ji ihe mmụta were mechie dịka o si adị n’akụkọ ifo. N’Iduuazị ndị a, e webatara akụkọ yaamere iji gosi etu ihe ụfọdụ na mmemme ụfọdụ siri malite na ndụ ndị Igbo maọbụ n’elu ụwa.

N’Elelịa na Ihe O mere, nke bụ ụgwọọrụ ihe ọjọọ bụ ihe ọjọọ, na-egosipụta mkpa ọ dị ka mmadụ na-eme ihe ọma oge niile n’ihi na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla agaghị eketa ntaramaahụhụ.

Onye mere ihe ọma mere onwe ya                                          Onye mere ihe ọjọọ mere onwe ya

A bịa n’Ala Bingo, o nyere nkuzi maka obiumeala ma nyekwa nkọwa gbasara ihe ụfọdụ na-eme n’ụwa dịka ihe mere ihu anyanwụ ji adị ka azịza na ihe mere diọkpara ji anọchi nna ya ma ọ nwụọ dịka ọ dị na ndụ ndị Igbo.

 

 

 

Mkpokọta na Mmechi

N’Iduuazị abụọ ndị a anyị tulere, a hụrụ D.N. Achara dịka odee jiri agụmagụ ọnụ ọdịnaala ọ kachasị akụkọ ifo wee mere akọrọngwa. O dere Iduuazị ndị a na mmalite oge e sitere n’agụmagụ ọnụ na-abanye n’agụmagụ ederede. ọrụ ndị a kuziiri anyị mmekọrịta dị n’etiti agụmagụ ọnụ na agụmagụ ederede. ọrụ abụọ ndị a kụụrụ ike site n’agụmagụ ọnụ ọdịnaala dịka ọ siri gbasa isiokwu, setịn, agwa, ndịnaya, nkaasụsụ na ihe mmụta.

Anyị chọpụtara na ọtụtụ ndị odee ọzọ webatara agụmagụ ọnụ ọdịnaala n’agụmagụ ederede iduuazị ha n’ụzọ dị iche iche, dịka T. U. Ubesie; ụkwa Ruo Oge na Jụọ Obinna, Pita Nwana; Omenụkọ, J. U. T. Nzeako; ọkụkọ Agbasaa Okpesi na Jụọ Chi na ndị ọzọ ga. Ha niile webatara ejirimara agụmagụ ọnụ ọdịnaala dịka ilu, ụkabụilu, asịnilu, akpaalaokwu, nhagide okwu, mmemmadụ, mbụrụ, ndịka na ndị ọzọ ga.

ọzọ, ndị odee agụmagụ Igbo na-ewebata ọdịnaala ndị Igbo n’agụmagụ ha na-ede nke ha tụrụ anya na ndị Igbo ga na-agụ iji mata ihe ndị ha amaghị, cheta ihe ndị ha chefuru sizie n’ụzọ dị etu na-echekwa omenaala na ọdịnaala ha.

N’ikpeazụ, ọdịnaala ndị Igbo na agụmagụ ọnụ ọdịnaala bụ a hụghị ebule ma sị elina dike n’edemede iduuazị Igbo e deere ndị Igbo. Edemede a zipụtara na iduuazị Igbo malitere ndụ site n’agụmagụ ọnụ ọdịnaala Igbo.

 

 

 

 

 

 

Edensibịa

 

Achara, D. N. (1933). Ala Bingo. Ibadan: Longman Group.

Achara, D. N. (1964). Elelịa na Ihe O Mere. Ibadan: Longman.

Ekwealor, C. C. (1999). “Agụmagụ ọnụ dịka Akọrọngwa Iduuazị”. Akwụkwọ a gụpụtara n’ọgbakọ nkụzi otu SPILC chịkọbara na Ministri Keedukeshọn na Steeti Anambara na 28th – 30th Epeel, 1999.

Emenyonu, E. (1978). The Rise of the Igbo Novel. Ibadan: Oụford University Press.

Finnegan, R. (1970). Oral Literature in Africa. London: ọ. U. P.

Foster, E. M. (1927). Aspects of the Novel. Great Britain: Reaguine Books.

Nwadike, I. U. (1993). Nka na Usoro Nkuzi Igbo. Nsukka: Ifunanya Press.

Nwadike, I. U. (1998). “Imminent Death of Literature in Indegenous Languages”, in Daily Times of 3rd March, 1998.

Nwana, P. (1933). Omenụkọ. Onitsha: University Press.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Iji Asụsụ, Agụmagụ na Omenaala Kwalite Udo na Adịmnotu n’Ọgbọ Globalaịzeshọn dịka E Zipụtara n’Iduuazị Igbo Abụọ

 

Nke

 

Nsolibe, Obiageli Theresa (PhD)

Ngalaba Lịngwistiks na Igbo

Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu

Kampus Igbariam

+234(0)8035795591

 

 

 

Ụmịedemede

N’ihe ọbụla mmadụ na-eme n’ụwa, udo tọrọ atọ kacha mma ma dị mkpa ka e were nwee ezi mmepe na agamniihu. Ederede a nabatara globalaịzeshọn ka ihe na-eweta ezi agamnihu nke e kwesịrị ka e si na mpaghara asụsụ, agụmagụ na omenaala legara anya, n’ihi na e gosịrị mkpa asụsụ, agụmagụ na omenaala dị n’iweta udo na ịdịnaotu n’ọgbọ globalaịzeshọn a. E kwukwara na globalaịzeshọn bu n’obi ịkwalite agụmagụ na nkwụdosi ike n’omenaala. Ịmụtakwu ọtụtụ asụsụ abụghị asụsụ nke gị ga-eweta udo na ịdịnaotu na mba ụwa maka na mmadụ na-enwewanye mmasị n’ebe onye na-asụ asụsụ ya nọ. Ọrụ asụsụ, agụmagụ na omenaala dịka ngwa ịkwalite udo na ịdịnaotu pụtara ihe n’akwụkwọ agụmagụ Igbo abụọ e lebara anya ma tụlee. Ederede a na-egosịkwa na a bịa na mbawanye achọm udo na ịdịnaotu na ndịgịde nke mmadụ na asụsụ bụ isi sekpụ ntị n’ihi na asụsụ bụ ihe e ji enwe mmekọrịta, ahazi ihe, inyefe na ndịgịde omenaala ndị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

 

Mkpọlite

Omenaala ndị ọcha dịka ihe na-eweta agamnihu na-abawanye. Ụzọ ebim ndụ ndị ahụ gụnyere asụsụ, agụmagụ, nhụrụwa ya na mmụbawanye inweta ndị ọrụ, mgbasa ozi na ihe ndị ọzọ bụ ya wepụtara ihe a a kpọrọ globalaịzeshọn (Radharkrishnan, 2004). Globalaịzeshọn metụtara ụwa nke taa ebe ọ dị ukwuu na n’ọtụtụ ụzọ. Mana dịka ihe na-eme n’ụwa taa, udo dị mkpa karịchaa ihe niile n’ebe mmekọrịta ndị mmadụ dị na asụsụ na omenaala ha.

N’ịkwado glabalaịzeshọn, a hụtara ya dịka ezi ihe na-eweta udo, agamniihu n’azụmahịa, nzikọrịta ozi na mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’agbanyeghị agbụrụ na mba ha si. Ihe e si na globalaịzeshọn enweta dịka ndị nkwado ya si kwu gụnyere agamniihu ụzọ ime njem, ihe e ji ezikọrịta na mgbasa ozi, mmụbawanye n’usoro izirịta ozi site n’iji igwe ọkụ, eriri ọkụ na akọrọngwa ọhụụ e ji ezirịta ozi dịka ịntaneet, na ekwentị. Ihe ndị a na-ebutekwa mmekọrịta n’akụnaụba , omenaala ma na-eweta udo. Udo so n’otu ihe kacha dị mmadụ mkpa. Ụfọdụ mmadụ na-eme ihe ọbụla a sị ka e mee ka udo were dị. Udo e nwetara n’ụzọ edochaghị anya ka mma karịa agha a lụrụ maka ikpe nkwụmọtọ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ọtụtụ ekwetaghị n’ihe bụ nkọwa udo. Udo nwere mpụtara n’ogo dị iche iche dịka ọnọdụ siri dị. Udo bụ ntụgharị agha na mbibi. Nke a mere na e gee ntị ebe niile ugbu a, naanị agha ka a na-alụ. Ọ bụ n’ihi enweghị udo. E nweghị udo na-adịkwa na ndụ mmadụ. Onye enweghị udo na ndụ ya enweghị mgbe udo ga-adị n’etiti ya na ndị ụlọ ya, ndị agbatobi ya nakwa ndị obodo ya. Mmadụ kwesịrị isi n’ụlọ dịrị mma wee pụta ezi, ka udo na ịdịnaotu were dị nke ga-enye aka weta ezi mmepe na agamnihu n’obodo, tụmadị n’ọgbọ a chọrọ udo na mba ụwa gbaa gburugburu.

Mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ asụsụ ka e ji eme ya. Asụsụ bụ ya ka e ji ezipụta agụmagụ na omenaala na nhụrụụwa ndị. Ihe ndị a ka a na-enyefe site n’ọgbọ ruo n’ọgbo ebe e nwere udo. Ọ bụrụ na e nyefeghị asụsụ, agụmagụ na omenaala ndị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ n’ihi enweghị udo, nke a ga-eme ka njirimara ndị ahụ fuo. Ndị njirimara ha furu, ha n’onwe ha efuola. Asụsụ dị nnukwu mkpa dịka ụzọ e si ezisa omenaala. Nke a mere na ọ bụrụ na asụsụ na omenaala ndị fuo, ị mara na nke ndị nwe ya agwụla.

Nkọwa Ọkpụrụkpụ Okwu Ga

Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-ewere okwu adabaghị were kọwaa ihe. Nke a na-eme ka a ghara izipụtacha ihe a chọrọ. Iji gbochie nke a, okwu ụfọdụ ka a kọwara n’ederede a ka o were mee ka nghọta ya dị mfe ma gaa ọsọ ọsọ. Okwu ndị dịka globalaịzeshọn, asụsụ na omenaala ka a kọwara.

 

Globalaịzeshọn

Okwu a bụ globalaịzeshọn akarịala narị afọ anọ o jiri pụta. Mana nzipụta ya ebe ọ bara uru malitere ọhụụ ka e mechara ihe nzipụta maka mgbasa ozi n’ọgbọ 1960. Globalaịzeshọn dịka Vidya (2015:241) si-kwu pụtara, “Mmepe akụnaụba maka ahịa mba ụwa site n’iru ogo ịma aka na ya”. Ị kọwa ya ebe ọ dị mfe, nke a na-egosị mmekọrịta mba ụwa mepegoro emepe na mba ụwa ndị na-emepe emepe ebe ọ gbasara mmepụta ngwa ahịa, ịzụ ahịa na ego, iweta udo na ịdịnaotu.

N’ihi nke a, globalaịzeshọn nwere ntụ anọ: ikwe ka e nwee ohere ngwa ahịa ịdị na-aga sịrịrị werere n’etiti mba site n’inwe udo na n’iwepụ maọbụ belata mgbochi ngafe ha, imebe udo, ezi ọnọdụ na ohere ego ịdị na-ehugharị n’etiti mba ụwa ndị na-enwe mmekọrita a, ikwe ka a na-enyefe nkanaụzụ nakwa, imebe ezi ọnọdụ na ohere ngagharị ndị ọrụ n’etiti mba ụwa nke ga-eme ka a hụta ụwa ka otu obodo ebe udo na-achị (Adamu, 2003). N’echiche nke ya, Robertson (1992: 46) hụrụ globalaịzeshọn dịka ime ka a hụ ụwa niile dịka otu ebe udo na-achị. A hụtara ya ka ebe e jikọrọ ụwa ma mee ka a mara na ụwa bụ otu ihe.

Globalaịzeshọn na-ejikọlata ndị mmadụ na omenaala ha. Na mbụ, mmekọrita na-abụ n’etiti ụmụ obere otu na ogbe. Ma kemgbe afọ narị atọ, steeti bụ ya kacha ejikọta ụdị usoro otu a. Ma n’agbanyeghị nke a, globalaịzeshọn mere a na-abanyenwu steet ga karịa ka ọ dị oge mbụ ọ na-ara ahụ ịbanye. Globalaịzeshọn na-eme na a naghịzi amakwa oke (Norberg-Hodge, 2006). Nke a gosirị na oke na oge nahụ ehichapụ. Ite aka site na steeti ruo steeti adịghịzii (anwụọla). Ụwa na-epewanyezị mpe. Ụwa anyị na-ahụbu ka mba ọzọ tere ezigbo aka ka anyị na-ahụtazị ọtụtụ n’ime ha ka ụwa anyị na ya nọ nso ugbu a. Na nke nke, globalaịzeshọn bụ njikọta mba ụwa site n’usoro ịgbanwekọrịta echiche, akọrọngwa na omenaala ndị ọzọ nke ga-adị ire ma udo dị. Ka nke a wee bịa na mmezu, asụsụ dị mkpa. Nke a bụ maka na asụsụ ka e ji enwe mmekọrịta.

Asụsụ

Asụsụ bụ akọrọngwa doro anya mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta nke na-eme ka mba ụwa nwee udo na ịdịnaotu. Dịka Abdullahi (1999:42) si kwu, “Asụsụ bụ akọrọngwa ihe osise nke ndị mmadụ na-eji etejụ ndụ na omenaala ha. E jikọọ ya na nhụrụụwa ndị mmadụ, asụsụ na-ete mmanụ na njin mmekọrịta ndị mmadụ ma mee ka mmụta gbasara agụmagụ nka, akụkọala na mmụta izuzugbe kwudosie ike na mmụọ mmadụ. Ọ bụ akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ oku, ihe na-eme ka a mata maka mmadụ na-abụghị sọ ndị dị ndụ taa mana ma mkpọrọgwụ ha sitere n’oge gboo, ndị nnanna anyị ha ndị bu anyị ụzọ”.

Sanusi (2007:64) kọwara asụsụ site n’ihe ọ na-arụ n’ọha obodo nakwa n’ihe ọmụmụ sayensị gbasara mmụọ mmadụ. Ọ hụrụ asụsụ dịka, “Mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’ọha obodo nke so usoro ndị si ebi ndụ ha, mmemme ha, ngwa ha ji eme ihe, edetụ ihe, enye iwu na mmụta ọhụrụ ga-emetụ ndụ mmadụ, ga-enyere mmadụ aka ịkọwa onwe ya na inyere ya aka gosịpụta echiche ya”.

A hụkwara asụsụ dịka ụzọ ime ka omenaala, nkwenye, nhụrụụwa ndị si esi n’ọgbọ ruo n’ọgbọ (Eke, 1989). Asụsụ bụ isi sekpụ ntị n’ọnọdụ mba ọbụla. Nke a kwadoro nkwenye Isayev (1977, 1999) na asụsụ bụ ihe kacha mkpa mba nwere. Nkọwa asụsụ ndị a niile na-arụtụ aka n’ọrụ ijikọ ihe ọnụ asụsụ na-arụ. Asụsụ na-ahụ na omenaala na-aga n’ihu, na-ahụkwa maka udo na ịdịnaotu.

Omenaala

E nwere ọtụtụ nkọwa omenaala. Omenaala bụ ka ndị si ebi ndụ, akparamagwa, nkwenye, nhụrụụwa ha na akara ha kwenyere na ya ha na-eme baarala ha ime, nke na-esi n’aka fere n’aka, site na mmekọrịta nakwa njije (Hofstede, 1997). Omenaala dịka ume asụsụ na-eku bụ nne asụsụ. Nke a kwadoro nkọwa omenaala sịrị na omenaala bụ mmekọrịta, mmekọrịta bụrụ omenaala. Nke a bụ eziokwu maka na asụsụ bụ ụzọ e si ezisa omenaala site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

Karakowsky (2001: 172) na nkọwa nke ya hụrụ omenaala ka, “Mkpokọlata amamihe, nhụrụụwa, nkwenye, akparamagwa, nghọta, ekpemekpe, ka e si hụ oge, ihe ikwesịrị ime, ihe i kwesịrị ịma, ngwa a hụrụ anya, ihe òtú nwetara site n’ọgbọ, site n’aka otu onye maọbụ ọha obodo ndị na-agba mbọ iweta udo na ịdịnaotu”.

E nwekwara ike sị na omenaala bụ gbakọ nzukọ mmụta nke òtù n’ọha obodo ndị e were ka ndị ahụ si eme nke a na-esi n’otu ọgbọ nyefee n’ọgbọ ọzọ. Ọtụtụ ihe dị n’omenaala. O nwere omenaala bụ nke a na-ahụ ka ihe e ji ebi ndụ kwa ụbọchị nke dị iche n’omenaala dịka nke òtù n’ọha obodo. E nwere ike sị na mmadụ bụ ogboju maọbụ na ọ bụ Okereeke/Mgbeeke, o gosịrị na onye ahụ amaghị omenaala maọbụ na ọ maghị akpa agwa (Edewor, 2003).

Taylor (1970: 40) sịrị na omenaala bụ ihe mmụta niile, agwa ọma, nkwenye, nka, ọdịnaala na nkanaụzụ nke a na-eke ma zisaa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ. Ọ gara n’ihu kwuo na omenaala bụ ụzọ niile ndị si ebi ndụ ha. Site n’ihe anyị zipụtara ebe a, anyị hụtara na tupu a nabata akparamagwa onye, ọ ga-adabarịrị ka ọha obodo si eme nke na-esi n’ọgbọ fere n’ọgbọ. Nke a mere na isi sekpụ ntị n’omenaala nke a hụtara na nkọwa ndị anyị nyere ga-abụrịrị ka ọha obodo si emekọ ma na-ekwukọ ma na-ebi n’udo na ịdịnaotu.

Agụmagụ

Nkọwa agụmagụ bụ ụzọ a gaarala ọtụtụ ugboro ma ebe e rurula ma ọ bụrụ na e ruru, ejubeghị afọ/edochabeghị anya. Nkọwa ya ọtụtụ oge na-adị obosara ma ọ naghị edocha anya ma na-agbanwegharị ka oge na-aga. Otu ihe doro anya banyere nkọwa agụmagụ bụ na nkọwa ya ga-agbanwe. Na nkowa ya, ihe ị ga-asị na o nweghị ihe ọ bụ n’ọgbọ a, ka e nwere ike hụta ka isi sekpụ ntị n’ọgbọ ọzọ. N’eziokwu, agụmagụ sitere na mkpụrụedemede, edereede maọbụ e kwuru n’ọnụ mana ọ bụghị ihe ọbụla e dere ede bụ agụmagụ.

N’obosara, agụmagụ bụ ihe e dere ede maọbụ e kwuru n’ọnụ n’ụzọ nka. Ma ebe adịghị obosara, ọ bụ ederede maọbụ e kwuru n’ọnụ e were ka ọrụ nka, zipụtara echiche miri emi nke e ji asụsụ dee n’ụzọ nka n’abụghị iji asụsụ dee ihe n’ụzọ abụghị ụzọ nka. Agụmagụ bụ aha e nyere ọrụ nka dịka abụ ọdịnaala na agụmagụ (prose) ọdịnaala nke odee kpachapụrụ anya dee iji zipụta echiche miri emi na nkamma ya. Agụmagụ dị oke mkpa n’ọha obodo maka na ọ bụ enyo na-egosị ihe na-eme maọbụ ihe mere n’ọha obodo. Agụmagụ ka e nwekwara ike were dịka ụzọ ndị si amụ maka ngalaba ha ma bụrụkwa ụzọ ndị mmadụ si ebelata nsogbu na ndụ ha. Nsogbu belata na ndụ mmadụ, udo na ịdịnaotu abata n’ọha obodo.

Udo

Udo so n’otu ihe ndị mmadụ chọkarịchara n’ụwa. Ụfọdụ mmadụ nwere ike ime ihe ọbụla ka ha were nwee udo. Udo e nwetara n’ụzọ akwụghị ọtọ ka mma karịa agha e ji ikpe nkwụmọtọ lụọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, ndị mmadụ ekwetaghị n’ozuzu oke ihe nkọwa udo bụ.

Ebe a nọ kwuo maka udo ga-eweta ka a ga-esi kọwa ya. E nwere ike hụta udo dị ka ntụgharị nsogbu, ọgbaaghara maọbụ agha. O nwere ike bụrụ ọnọdụ ime mmụọ (mmadụ/mba) maọbụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọ bụ mkpa udo dị na ndụ mmadụ nakwa ọnọdụ nsogbu jupụtara ebe niile na mba ụwa n’oge a mere ka ndị dịka Mikhail Gorbachev (Soviet Union), Nelson Mandela (South Africa), Lech Walesa (Poland), Mahatma Gandhi (India), Betly Williams (Ireland), Martin Luther King (America) na ndị ọzọ ji gbalịa oke ike há hà ịhụ na udo dị na mba ha dị iche iche nke ga-akwalitekwa udo na mba ụwa gbaa gburugburu maka na a na-esi n’ụlọ mara mma pụta iro.

Ndị Igbo, Asụsụ, Agụmagụ na Omenaala Ha

Na nkega nke a, anyị ga-eleba anya na ndị bụ ndị Igbo, asụsụ na omenaala ha.

Ndị Igbo

Ndị Igbo bi n’ala Igbo. Ha bụ ndị nwe asụsụ, agụmagụ na omenaala na mgbada ugwu Naịjirịa. Dịka be ha si dị, Oshimiri Naịja kere ha ụzọ abụọ ahaghị ịha- Ọwụwa anyanwụ Naịja (bụ nke kacha) na Ọdịda anyanwụ Naịja. Ka o si metụta omenaala, agụmagụ na asụsụ, oshimiri Naịja mere ka mmekọrịta na ịdịnaotu dị mfe n’etiti ndị Igbo n’akụkụ abụọ a ma kwalitekwa njekọrịta na azụmahịa n’etiti ndị Igbo na mba ụwa. Oshimiri Naịja akpaghị agwa mgbochi n’ijikọta omenaala, agụmagụ na asụsụ ha kama o mere ka mmekọrịta dị mfe ebe e nwere ndị bigasị na ya si n’agbụrụ dịga iche iche.

N’asụsụ Igbo, a na-akpọ ha ndị Igbo. Oge ụfọdụ, a na-esi n’ọlụndị ha eke ha, dịka Anịọma dị n’ọdịda anyanwụ na Ngwa dị n’ọwụwa anyanwụ. Steeti ndị Igbo nọkarịrị n’ọwụwa anyanwụ ala Naịjirịa- Abịa, Anambra, Ebọnyị, Enugu na Imo”, akụkụ Rivers, Delta na Cross-River. A ga-ahụkwa ndị Igbo ebe ọ dị ọtụtụ n’akụkụ ụwa niile. Obinna (2002: 124) kwuru nke a maka ndị Igbo.

Ndị Igbo, dịka ndị dị ike ma na-amụba amụba ebe ọdị ukwuu nwere nkwuwa okwu, ma bụrụ ndị a na-ahụ ebe niile. Olee ebe ị gara n’ahụghị ndị Igbo, ọ bụghị naanị na ha nọ ya kama ha nọ nke ọma, bizite ma gbanye mkpọrọgwụ?

 

Ndị Igbo dịka ndị na-akwụwa aka ọtọ bụ ndị hụrụ njepụ n’anya ma kwere n’ala Igbo ezughị ime ka ha nwetazuo ihe ha chọrọ. Ọ bụ nke a mere e ji ahụ ha ebe niile na n’ụwa niile nke mere e ji asị na ọ bụrụ na mmadụ na-ebi n’ọnwa na ndị Igbo nọ ebe ahụ.

Ndị Igbo na-eme nke ọma n’azụmahịa, ọrụ ugbo, mmepụta akụ na nka na ụzụ ya na n’ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-eme tinyere agụmakwụkwọ. Ha bụ ndị na-añụrụ mmadụ, anabata mmadụ ma na-agba mbọ.

Mmalite ndị Igbo bụ isiokwu a ka na-akọ ọtụtụ ihe maka ya. Dịka mba ndị ọzọ, ọ na-anụ ha ọkụ n’obi imata ntọala ha, ị ma ka ha si nọrọ ebe ha nọ. Nlebanye anya n’ihe na-arụtụ aka ebe ndị Igbo si malite (ihe ọkpụ, omenaala na agụmagụ ọnụ) mere ka e kwenye na e nwere ebe bụ be ndị Igbo- Owere, Ọlụ na Ọkigwe. Ndị a kwenyere na o nweghị ebe ha si. “Ọtụtụ ndị Igbo nwere afọ ojuju ịnabata na ha si n’agbụrụ ndị Juu pụta n’ihi na ha nwere ụdị amamihe, omenaala na ịgba mbọ ndị Juu. Ọtụtụ ihe ndị Igbo na-eme na ndụ ha ka ndị Juu na-emekwa. Ihe ndị a gụnyere: ịchụ aja, ibi ugwu, ịba nwa aha, ịkwa ozu, owuwe ihe ubi na ndị ọzọ. Akụkọ ọzọ na-ekwu na ndị Igbo malitere na Nri ebe diọkpara Eri onye Chukwu si n’eluigwe tụdata n’Omabala bi. Ihe nzipụta atọ ndị a- agụmagụ ọnụ, nkwagharị Eri na ihe e gwupụtara n’ala na-akwado nke a” (Ojukwu).

Ndị Igbo nwere ka ha si eji ejiji nke mere ha jiri pụọ iche n’agbụrụ ndị ọzọ. Ndị nwoke na-eyi afe elu ebe ndị nwaanyị na-ama ukwu akwa abụọ, uwe elu ahụ na ịchafụ isi.

Ndị Igbo nwekwara nri ha gụnyere ji, nri akpụ na ofe olugbu, ofe ọha, ofe egwusi na ofe ọkwụrụ.

 

Asụsụ Igbo

Asụsụ Igbo bụ isi mmekọrịta agbụrụ ndị Igbo. O so n’otu asụsụ ala Naịjirịa a maara ma bụrụkwa otu n’ime asụsụ ndị nta a maara n’Ikwetorịal Gini (Eọuatorial Guinnea). E nwere mmadụ dị ka nde iri abụọ na anọ bụ ndị Igbo bi n’ala Naịjirịa na-asụ Igbo (Wikipedia). E nwere olundị asụsụ Igbo karịrị iri abụọ tinyere otu olu Igbo izugbe e wubere n’afọ 1972 gbakwasara ụkwụ n’olu asụsụ Owere (Isiama) na olu asụsụ Ụmụahịa (Ọhụhụ) nke e wereghị mkpọnimi na mkpọnume dị na ha. Asụsụ ndị Igbo na-enyere ha aka ime ka e nwee ịdịnaotu n’etiti ha nakwa ndị mba ụwa ndị ọzọ na-asụ asụsụ Igbo.

 

Omenaala Igbo

Omenaala Igbo bụ ọdịbendị, emereme na ọdịnaala ndị Igbo bụ mmadụ ndị bi na mgbada ugwu ala Naịjirịa. Ọ bụ ụzọ niile ha si ebi ndụ ha. Ọ gụnyere emereme ọkpụ ha, nzipụta ha nke e tinyere n’omenaala ha site n’omenaala ha maọbụ nke sitere na mmekọrịta ha na omenaala ndị ọzọ. Ọdịnaala na omenaala ndị Igbo gụnyere ihe eserese, egwu ọgụgụ, egwu ọgbụgba, ejije ha, nri na asụsụ ha. Ndị Igbo bara ụba n’omenaala. Ha na-etinye ihe ndị a na ndụ ha na-ebi kwa ụbọchị iji gbalara nsogbu, kwalite udo na ịdịnaotu ma wulite agamniihu.

 

Agụmagụ Igbo

Ala Igbo so n’otu ebe a hụrụ ederede ọkpụ. Ọtụtụ ihe n’ime ederede a ka a hụtara na mmepụta agụmagụ. Ọ bụrịị eziokwu na ihe ndị a edere agụmagụ na ha abụghị ebe ndị e nwere ike iwepụta ha. Ebe ndị ahụ gụnyere n’okwute na n’akpụkpọ anụ. Mmalite edemede agụmagụ abịaghị ọsịịsọ mana e nwere agụmagụ ọnụ.

Ọnụkaọgụ na Onyeriọnwụ (2009: 58-69) sịrị, “N’agbanyeghị, ndị Igbo edeela ihe ebe ọ dị ọtụtụ bụ ihe a ga-asị na ọ bụ agụmagụ tupu ala anyị enwere onwe ya. Agụmagụ e dereede ka bụ ihe ọhụụ n’ala Igbo n’ihi na ha na-eche ka ha mụta ka e si ede ihe tụmadụ n’asụsụ ndị ọzọ tupu ha malite ide agụmagụ”. Mana nke a apụtaghị na ha enweghị agụmagụ n’ihi na ha ji agụmagụ ọnụ egosịpụta ka ha si ebi ndụ, hụ ụwa, echiche ha, na ihe ndị ọzọ iji zipụta imekọta ihe ọnụ. Agụmagụ so n’agụmagụ edereede izizi bụ Akụkọ ala Obosị nke Iwekanụnọ dere n’agbata afọ 1920 na 1930.

Agụmagụ Igbo na-arụ ọtụtụ ọrụ. Ọ na-eme ka anyị cheba echiche ime maka onwe anyị nakwa maka ọha obodo. Ọ bụ enyo anyị ji ahụ onwe anyị. Ọ na-eme ka anyị hụta mma na mkpa asụsụ anyị dị. Ọ na-eme ka anyị hụta ọnọdụ mmadụ ma na-akụziri anyị ihe. Ọ na-emekwa ka anyị si n’ihe odee dere anyị gụrụ hụta ụwa nke odee kere.

 

Ntụcha Ihe Onye Metere na Ọchụ Nwaọkụkọ Nwe Ada

Asụsụ, agụmagụ na omenaala na-eweta mmekọrịta na nghọta bụ ọkacha mma. N’ihi nke a, anyị na-akwado nkụzi nye mba ụwa na mmekọ omenaala, agụmagụ na nsụkọrịta asụsụ. Asụsụ bụ ngwa ọrụ mba ụwa ji enwe mmekọrịta n’ọha obodo nke na-emeghe mgbochi na-enweghị ntụkwasịobi n’etiti mba ụwa, ma kwalite udo na ịdịnaotu. Mmasị nakwa inwe ike ghọta ma sụọ asụsụ ọzọ n’abụghị asụsụ onye na-eme ka mmadụ mikpuo na mmụọ mmadụ, mara omenaala ya, nzipụta ya nakwa ka o si were ụwa nke agụmagụ na-ezipụta.

Ihe na-eme n’ụwa na kwa mmekọrịta n’ọha obodo kwenyere na o nwebeghị ndị mba ụwa kpacharala anya wepụta oge ha ịkwalite udo ma jikọọ mba ụwa ọnụ. Iji wulite udo na ịdịnaotu na mba ụwa, ndị mmadụ ga-aghọta onwe ha.

Asụsụ Igbo ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu N’Ime Ihe Onye Metere

Ebe ọ bụ asụsụ, tinyere asụsụ Igbo, ka ọha obodo ji emekọrịta, ọ dị nnukwu mkpa na a ga-eji ya kwalite udo na ịdịnaotu n’ọgbọ globalaịzeshọn a. Ịtụ aka na ịma aka n’ihu jupụtara n’ọgbọ globalaịzeshọn a. Nke a mere na e lere anya na onye ọbụla abụghị naanị na ọ ga-agụ akwụkwọ, kama na ọ ga-enwerịrị otu ihe nka ọ maara eme nke ọma. Otu ụdị nka dị mkpa n’ọgbọ a bụ ịma asụ asụsụ dị iche iche.

Ndị Igbo dịka ndụ ha siri dị n’ịchọ ebe ka mma bụ ndị a na-ahụ ebe ọbụla. Dịka ha bụ otu n’ime agbụrụ mba ụwa ka na-emepe emepe, ha na-agba mbọ ka ha too ma nwee ọńụ, udo na ịdịnaotu. Ndị Igbo ji asụsụ ha ewulite mmekọrịta na be ha nakwa na mba ụwa ndị ọzọ iji mee ka mmekọrịta ha sie ike. Azụmahịa so n’otu ihe na-eme ka asụsụ gbasaa ma weta ịdịnaotu. N’Ọfọmata (1996), e nwere agamniihu, udo na ịdịnaotu n’etiti obodo Alaukwu, Ụmụnka na obodo ndị ọzọ gbara Alaukwu gburugburu n’ihi azụmahịa. Ndị mmadụ si ma ebe tere aka ma ebe dị nso n’obodo Alaukwu na-abịa azụ ma na-ere ụbọchị Afọ bụ ahịa Alaukwu. Nke a nwere isi ma dị mfe n’ihi na ha na-aghọta ma na-asụ asụsụ Igbo. N’ogbugbu Nwọhịa, Okechi na Ọnwụha ndị Alaukwu gburu Ọhahụrụ onye Ụmụnka, ọ bụ asụsụ Igbo ka obodo ndị a ji kpagide ruo mgbe e doziri esemokwu dapụtara n’ogbugbu e gburu Ọhahụrụ ma wechighata udo na ịdịnaotu n’etiti ha. N’ime udo ma wechighata ịdịnaotu mịtara mkpụrụ bụ n’ihi nka Eze Iyiegbu, eze ndị Ụmụnka ji zipụ ndị gara na nke Eze Ụzọemezie, onye bụ eze ndị Alaukwu ịjụ ase Ọhahụrụ be ha gara ahịa Afọ Alaukwu nke alọtaghị. N’ọgbọ globalaịzeshọn a, asụsụ Igbo na-arụ ọrụ ijikọta ndị mmadụ ọnụ. Ọ na-eme ka ịzụkọrịta ahịa, imepụta na ikesakọrịta ngwa ahịa dị mfe n’etiti agbụrụ dị iche iche na mba ụwa.

Ọzọ, iji asụsụ ndị enwe mmekọrịta n’ọgbọ globalaịzeshọn na-eme ka e nwee ndịgide asụsụ ndị ma asụsụ Igbo nke a na-atụ egwu na ha nwere ike inwụ n’ihi globalaịzeshọn. Ụfọdụ na-eche na asụsụ Bekee na agụmagụ ha ga-anọchizi anya asụsụ mmekọrịta na mba ụwa niile gbaa gburugburu mana nke a bụ asị ma ọ bụrụ na ndị ọbụla were asụsụ ha na-enwe mmekọrịta. Ndị Igbo bụ ndị na-añụrụ mmadụ, na-anabata mmadụ, na-agba mbọ, ma na-eme njegharị ebe ọ dị ukwu. Nke a mere ha ji nọrọ n’akụkụ mba ụwa dum. N’ihi nke a, asụsụ ha nwere ike idị na-ejikọta ndị mba nwa ma kwalite udo na ịdịnaotu ma ha were ya na-enwe mmekọrịta.

Asụsụ Igbo nwere ike ijikọ ndị mmadụ n’ọgbọ globalaịzeshọn a. Asụsụ nwere ike mee ka ịzụ-ahịa na mkparịtaụka dị mfe nke ga-enye aka mee ka e nwee mmekọrịta n’etiti otu agbụrụ na mba ụwa ndị ọzọ. N’Ọfọmata (1996), e nwere ụdị ọmụmaatụ mkparịtaụka mgbe ndị Alaukwu kpọ Ọnwụha gaa n’arụsị obodo Dagburu iji chọpụta ma o so gbuo Ọhahụrụ n’ihi na ọ na-agọ na ya esoghị. E nwere mmekọrịta n’etiti omenaala abụọ n’ihi asụsụ, omenaala Alaukwu na nke Dagburu. Asụsụ Igbo nwere ike ijikọ mba ụwa ọnụ ma weta udo na ịdịnaotu.

N’ọgbọ globalaịzeshọn a, asụsụ na-eme ka asụsụ ndị a na-atụ anya na ha ga-anwụsị n’ihi na asụsụ Bekee na-achọzị ịghọ asụsụ mba ụwa niile, dịrị na-aga. Etu a ndị Igbo bụ ndị na-añụrụ, anabata mmadụ, ndị na-agba mbọ ma na-emesagharị ahụ, a na-ahụ ebe niile, e nwere ike iji asụsụ ha jikọta ndị mmadụ ma weta udo na ịdịnaotu na mba ụwa gbaa gburugburu. E nwere ike iji asụsụ ha enwe mmekọrịta na ịntaneet, ekwentị, ii-mel, satalaịtị, tiivii, dgz. Ihe nkanaụzụ ndị a na-adịwanyezị ọnụ ala ma nọrọkwa ndị mmadụ n’obibi aka.

Asụsụ Igbo ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu N’Ime Ọchụ Nwa Ọkụkụ Nwe Ada

Asụsụ dịka ọgwọ ọrịa udo na ịdịnaotu na-arịa pụtara ihe n’iduuazị Ọchụ Nwa Ọkụkụ Nwe Ada nke Ifeka dere. Mgbe ahụghị Ugoye nwunye di Amaoge oge ebulatara ozu Amaoge na ụmụ ya anọ. Ọ bụ asụsụ ka ụmụnna Mgbachi bụ di ha ji ziga ndị gara gwa ma kpụta Ugoye na ụmụ ya ebe ha gara nọrọ ma jiri asụsụ nye iwu ntaramahụhụ e nyere ya na ụmụ ya. E nyere iwu na mmiri a sachapụtara n’ozu Amaoge ka ha ñụọ ya dịka ntaramahụhụ maka na ndị ụmụnna Mgbachi sịrị na Ugoye ji ọgwụ mee di ya ka o gbuo nwunye ya Amaoge na ụmụ ya. Oge ụmụ nwaanyị kpọwara galị galị ihe mere o jiri bụrụ naanị Ugoye ka a na-ata ahụhụ ma ha ahụghị Mgbachi, di ya bụ onye gburu ọchụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka Okeọcha, onye be ha, ọkwọ ụgbọala ji ụgbọala ya bulata ozu ndị ahụ jiri kọwa na ndị uweojii kpọchịrị Mgbachi. Nkọwa o nyere mere ka mmụọ ụmụnwaanyị dajụọ ma mee ka udo na ịdịnaotu dị.

Nsogbu Ekwumma na Ugoye (nwunye di Amaoge) ịchọ ịtọrọ ma refuo Ọgọnna nwa Amaoge n’Ifeka (2015) bụ nke e ji nwayọ were asụsụ Igbo kpezie. Nsogbu a gaara ebute agha n’etiti obodo ebe a mụrụ Amaoge na ebe a lụrụ ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị ka e si jiri asụsụ kpezie ya maka na ndị Igbo na-asị na okwu dị nro na-eme ka ọnụma jụrụ. Site na mkparịtaụka, e doziri okwu a ma wetakwa udo na ịdịnaotu.

 

Omenaala Igbo Dịka Ngwa Udo na Ịdịnaotu

A kọwaala omenaala dịka, “Ihe omimi nke gụnyere mmata, nkwenye, ezi agwa, iwu, ọdịnaala, ikikere na akparamaagwa ndị ọzọ mmadụ mụtara dịka otu onye n’ime ọha obodo” (Mazrui, 2000: 168). Ọ bụ otu ụzọ njikọta na-eweta udo na ịdịnaotu n’ozuzu oke. Ọtụtụ ndị mmụta kwenyere na omenaala bụ isi sekpụ ntị n’iweta udo na ịdịnaotu n’obodo. Obodo ọbụla na-ekwu okwu udo na ịdịnaotu ejighị omenaala akwado ya na-aghọrị onwe ya. Ọtụtụ ọha obodo kwụ chịm maka na ha kwenyesiri ike na omenaala ha, na-akwalite ya ma were ya mere ebe mgbakwasa ụkwụ n’ịgba mbọ iweta udo na ịdịnaotu na be ha. Ndị Igbo so na ndị dị otu a maka na ha kwenyere n’ike omenaala Igbo na-akpa. Omenaala Igbo bụ enyo ahụmụzọ ha. Ọ na-egosị ka ha na gburugburu ha si emekọrịta. Omenaala ndị mba Afrika na-akwalite imekọ ihe ọnụ n’ọha obodo n’abụghị ime na nke onwe a na-ahụta na ndụ ndị ọgbara ohụụ. Ya mere ndị Igbo ji were asị “onye aghala nwanne ya” dị ka ha na-ezipụta n’omenaala ha na-egosị na ndụ mmem ha na-ebi.

 

Omenaala Alụmalụ ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu N’Ime Ọchụ Nwa Ọkụkọ Nwe Ada

Omenaala ịlụ nwaanyị n’ala Igbo na-eweta udo na ịdịnaotu. Ọ bụghị naanị ijikọ mmadụ abụọ, kama ijikọ ezinụụlọ abụọ, obodo abụọ, steeti abụọ, rijọn abụọ na mba abụọ. N’Ifeka (2015), e nwere njikọ alụmdi na nwunye na-abụghị naanị n’etiti Mgbachi na Amaoge, kama n’etiti ezinụụlọ abụọ na obodo abụọ. E nwere alụmdi n’etiti Nnake na Udumma nke na-abụghị naanị ha ka o jikọrọ kama ezinaụlọ abụọ ahụ nakwa obodo abụọ ha si. Alụmdi nke Nnake na Udumma weghachitere udo na ịdịnaotu n’etiti obodo abụọ ahụ. Nke a bụ maka na alụmdi a bụ imezu ihe agbara kwuru ka e were kwụsị nsogbu nọ na-adakwasa ndị obodo Nnake ha. Agbara sịrị na ihe na-eweta nsogbu a bụ ebubo ụgha e boro Mgbechi n’oge gboo na ọ ghọrọ ọjị. N’omenaala Igbo, ọ bụ nsọ ala nwaanyị ịghọ ọjị. Ha refuru ya na mgbere ohu n’ihi enweghị onye ga-ekwuru ya. Nwaanyị a si n’ezinaụlọ Nnake. Agbara sị na ihe ga-eweta udo bụ ịlụ nwaanyị hapụ n’ezinaụlọ ahụ iji dochie anya Mgbechi e rere iji weghachite udo na ịdịnaotu.

Omenaala Alụmalụ ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu N’Ime Ihe Onye Metere

Omenaala alụmdi na nwunye ka a rụtụrụ aka n’iduuazị Ihe Onye Metere nke Ọfọmata (1996). Alụmdi na nwunye a dị n’etiti Nwọhịa na nwunye ya. Alụmdi na nwunye a ka a rụtụrụ aka mgbe Nwọhịa onye ọjọọ n’akwụkwọ a lụrụ nwaanyị, mụta otu nwa nke o ji gwọọ ọgwụ. Alụmdi na nwunye a jikọrọ ezinaụlọ abụọ, ogbe abụọ maọbụ obodo abụọ ma weta udo na ịdịnaotu. Igbanwekọrịta omenaala n’ụdị alụmdi na nwunye na-akwalite nghọta na nnagide.

Omenaala Igbo Ịga N’Arụsị Dịka Ngwa Iweta Udo na Ịdịnaotu N’Ihe Onye Metere

N’iduuazị abụọ e ji mee nnyocha a, e nwere omenaala Igbo ịga n’arụsị na ịchụ aja ka e were meda ndị mmụọ obi ma weghachi udo na ịdịnaotu ebe e nwere nsogbu na nkewa. Ọfọmata (1996) kọrọ ka Ọnwụha si agọ agụgọ na aka ya adịghị n’ogbugbu e gburu Ọhahụrụ. Ndị be ha duuru ya gaa na nnukwu arụsị dị na Dagburu ịga jụọ ase ma mata nke bụ eziokwu. Ndị Alaukwu be ha mere nke a ka ọ ga-abụ ọ bụrụ na aka ya dị ya ka ha kpụnyekwuo ya ndị Ụmụnka otu ha si kpụnye ha Nwọhịa na Okechi iji kwụọ ha ụgwọ nwa ha nwoke bụ Ọhahụrụ ha gburu. Nke a bụ ka e wee gbalahụ nsogbu ma weghachi udo na ịdịnaotu n’etiti obodo ha nakwa ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Ọ bụrụ na ha edozighị okwu ahụ nke ọma, obodo niile na-abịa ahịa n’Afọ Alaukwu ga-akwụsị. Nke a ga-akpa ọnọdụ akụnaụba Alaukwu aka ọjọọ ma weta adịghị n’otu.

Omenala Ịga N’Arụsị ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu n’Ọchụ Nwa Ọkụkọ Nwe Ada

Ifeka (2015) gosịrị ka e si kpọga Ekwumma na Ugoye n’arụsị iji mata ma aka ha ọ dị na ntọrọ a tọọrọ Ọgọnna nwa nwoke Amaoge nke ha sị na aka ha adịghị. Arụsị tara ha na aka ha dị na ya. Iji weghachi udo na ịdịnaotu n’ezinaụlọ Mgbachi maka na Ugoye bụ nwunyedi Amaoge (ndị nwunye Mgbachi), a gwara ndị omekoome a ka ha ga rịọ Amaoge mgbaghara, chụọ aja maka ikpocha ala ma meda ndị mmụọ obi. Ha enweghị ike ime ihe afa kwuru nke wetaara ha ọnwụ dịka ntaramahụhụ. Aka obodo tinyere idozi okwu a weghachiri udo na ịdịnaotu.

Omenaala Ịgọ Ọjị ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu n’Ihe Onye Metere

Ọjị bụ ihe e doro nsọ n’ala Igbo. A na-echere ọbịa ọbụla bịara be onye Igbo ọjị. Ndị okenye Igbo kwenyere na ọjị, mkpụrụ osisi a gọziri agọzi e nyere onye ọbịa na-eme ka ọ mara na a nabatara ya. Igbo ji ọjị ekpe ekpere nye Chukwu, ụmụ obere chi na ndị ichie dịka e gosịrị n’akwụkwọ agụmagụ abụọ e ji me nnyocha. Site n’ikpere Chukwu, ha na-arịọ odudu na nchekwa Chineke, udo, ezi mmekọrịta na ịdịnaotu ha na nke mba ụwa gbaa gburugburu. Ha na-ekpere ụmụ obere chi ha ka ha rịọrọ ha Chukwu arịrịọ ma na-ekpere ndịichie ha ka ha gaa n’ihu na-elenye anya n’ezinaụlọ ha nakwa n’obodo ha. Ihe ndị a niile bụ ka e wee kwalite udo na ịdịnaotu na mba ụwa.

Ọfọmata (1996) gosịrị omenaala ịgọ ọjị mgbe Ọzọ Uruagwụ nke Dagburu gọrọ ọjị oge Maazị Nzeka na ndị ya na ya so kpọtụụrụ ya n’obi ya. Nke a mere oge ha bịara ịkpọtụrụ arụsị Dagburu ịchọpụta eziokwu ma aka Ọnwụha ọ dị n’ogbugbu e gburu Ọhahụrụ. O kpere maka udo na ịdịnaotu ndị obodo ya bụ Dagburu nakwa nke ndị bịara be ha. Ọ kpọkuru Chukwu ka o meere ndị O kere eke ebere, nye ha udo na ịhụnanya. Ọ kpọkukwara ndịichie ha ka ha chekwawa ha ma nye ụwa niile udo (56).

Omenaala Ịgọ Ọji ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu n’ Ọchụ Nwa Ọkụkọ Nwe Ada

E nwegasịrị ebe e chere ma kpee ekpere ọjị n’Ifeka (2015) iji nabata ndi ọbịa, ịchọ udo na ikele Chukwu maka ihe ọma o mere. Maazi Ejekam kpere ekpere ọjị were rịọ Chineke ka ọ gaa n’ihu na-azọpụta ma na-echekwa ya na ezinaụlọ ya. O kpere ekpere a wee kelee Chukwu maka nnapụta ọ napụtara ya na Maazi Emenike n’aka ndi ajọ mmụọ (28-29).

Izuagba, nwanna Amaoge wetara ọjị mgbe ya na ndi ụmụnna ya na ikwu na ibe gbakọrọ ịkpa ka ha ga-esi nyere Amaoge na nwa ya, Ọgọnna ha si be di ya dulata aka. Ọ bụ Uduadịmma gọrọ ma kpee ekpere ọjị ahụ.

Omenaala Mbikọ na Mmekọrịta ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu N’Ọchụ Nwaọkụkọ Nwe Ada.

Ihe e ji mara mba Afrika nke Igbo so na ya bụ ndụ ibikọ na imekọ ihe ọnụ. A hụtakwara nke a n’akwụkwọ agụmagụ abụọ a e lebara anya. Ihe e mereme maọbụ ihe ọbụla mere n’obodo bụ mmadụ niile mere ya ọ masị ya bụrụ otu onye ka ihe ahụ mere dara n’isi kpọmkwem, ọ ka gbasara ezinaụlọ ya nakwa ọha obodo. Otu a ka ọ dị ma n’anụrị ma n’iru ụjụ. Ya mere ndị Igbo ji asị, “Anya bewe, imi esoro ya bewe”. Ihe metụtara otu onye metụtara mmadụ niile. N’Ifeka (2015), a hụrụ na ndị be di ya na ndị be nna ya agbahapụghị Amaoge na mgbe mkpa. Mgbe Amaoge bilitechara n’ọnwụ, ndị be nna ya bịara kpọrọ ya laa, ka anya ha na-ezube ya. Mgbe Ekwumma na Ugoye tọọrọ Ọgọnna, ma ndị be di Amaoge ma ndị be nna ya nyere aka chọta ya.

Omenaala Mbikọ na Mmekọrịta ka Ngwa Udo na Ịdịnaotu N’Ihe Onye Metere

N’Ọfọmata (1996), ndị be Ọhahụrụ ahapụghịrị Udenkwọ nwanne ya nsogbu ịchọpụta ihe mere ya na ebe ọ nọ. Ndị Ụmụnka niile pụrụ ịchọ ya ma dị nkwadebe ime ihe ọbụla iji chọta ya. N’aka nke ọzọ, ndị obodo Alaukwu niile pụtara kwado Igwe ha bụ Eze Ụzọemezie n’ịchọpụta ndị gburu Ọhahụrụ. Mbọ ndị a niile bụ ka e were hụ na e nwere udo na ịdịnaotu. Ndị Dagburu agbahapụghị Ọzọ Uruagwụ mgbe mkpa ya. Ha bịara nyere ya aka memilaa Ọnwụha chọrọ igbu ya. Ọnwụha maara na ọ ga-anwụ maka na o soro gbue Ọhahụrụ ma na-agọ agụgọ mere ndị be ha ji hanye Maazị Nzeka na ndị ọzọ ka ha gaa n’arụsị Dagburu ije chọpụta ma Ọnwụha oso gbue Ọhahụrụ. Mgbe Ọnwụha wakporo Ọzọ Uruagwu na ndị ya na ya nọ, Ọzọ Uruagwụ tikuru ndị be ha. Ha gbataara ya ọsọ enyemaka ma gbuo Ọnwụha bịara igbu ya.

 

Agụmagụ Dịka Ngwa Udo na Ịdịnaotu n’Ọchụ Nwaọkụkọ Nwe Ada

Agụmagụ bụ enyo ọhanaeze ji ahụ ụzọ. Ọ na-eme ka anyị cheba echiche ime gbasara onwe anyị na ọha obodo. Ọ na-eme ka anyị nwee afọ ojoju na mma asụsụ anyị. Ọ na-ezipụta ọnọdụ mmadụ ma na-akuziri anyị ihe.

Ọrụ agụmagụ n’iweta udo na ịdịnaotu pụtara ihe n’akwụkwọ agụmagụ Ọchụ Nwaọkụkọ Nwe Ada. Ọ bụ agụmagụ na-eme ka ndị mmadụ mara omenaala ha nke na-akwalite udo na ịdịnaotu. Ọ na-eme ka ọha obodo mara ka ha ga-esi buso nsogbu bịara ha agha were mee ka udo na ịdịnaotu dị. Agụmagụ na-enye ha echiche ịga n’arụsị, ịgọ ọfọ na ikpe ekpere site n’ọjị, ibikọ na imekọ ihe ọnụ. A hụtara ihe ndi a n’Ifeka (2015) oge e nwere ọnwụ ndi ezinaụlọ Mgbachi. A gara n’arụsị, a tara ndị      ha sị na aka ha dị n’ọnwụ ahụ (Ugoye na ụmụ ya) ahụhụ ka ndị ọzọ si na ya mụta ihe. Ọtụtụ ebe ka e kpere ekpere ọjị. Ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ dapụtara n’obodo Ndiagụ nke agụmagụ nyere aka mee ka a mara etu nsogbu ndị ahụ si dapụta ma gosi ụzọ e si melaa nsogbu ndị ahụ dịka ịtọrọ Ọgọnna, irefu Mgbechi na nsogbu ndị ọzọ.

Agụmagụ Dịka Ngwa Udọ na Ịdịnaotu n’Ihe Onye Metere

Ụdị ọrụ ndị a agụmagụ rụrụ n’Ifeka (2015), ka ọ rụkwara n’Ọfọmata (1996). Ọrụ agụmagụ dịka ikuzi ihe pụtara ihe n’Ọfọmata. E gosiri ụzọ ndị Igbo si achọpụta eziokwu. Ndị Igbo kwenyere na ike dị n’arụsị ịchọpụta eziokwu ma mee ka a gbaa ndị omekoome maọbụ ndị ihe ọjọọ n’anwụ. Nke a pụtara ihe mgbe a kpọ Ọnwụha gaa na Dagburu iji mee ka agbara ha kwuo ma aka ya ọ dị n’ọnwụ Ọhahụrụ nke ọ na-agọ na aka ya adịghị ya.

Agụmagụ kụziiri anyị na ihe onye metere, o were isi ya buru. Ihe e ji egosi ihe ndị a bụ ka e gosị ikpe nkwụmọtọ ma weta udo na ịdịnaotu. Ndị Dagburu gburu Ọnwụha n’ihi na ọ chọrọ igbu ma Ọzọ Uruagwụ ma ndị be ha tupu ọ nwụọ. Nke a bụ n’ihi na ọ maara na o so gbuo Ọhahụrụ nke arụsị ha gaara ịta ya na o so ma ọ bụrụ na o ruru n’ihu arụsị mana o ruzighị n’ihu arụsị. Iji me ka e nwee udo na ịdịnaotu site n’agụmagụ, anyị hụrụ ka ndi Alaukwu sị kpụnye ndị Ụmụnka mmadụ abụọ doro anya aka ha dị n’ogbugbu e gburu Ọhahụrụ ka e wee were ha kwụọ ụgwọ isi Ọhahụrụ. Nke a bụ ka e wee kuziere ndị ọzọ ka ha zeere ụdị omume ahụ ma weghachi udo na ịdịnaotu n’etiti obodo abụọ ahụ na obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Ọrụ ndị a gosiri na agụmagụ Igbo so n’otu ụzọ a ga-esi me ka mba ụwa ndị ọzọ hụta ka ndị Igbo si ebi ndụ na uru asụsụ ha bara n’ịkwalite udo na ịdịnaotu na mba ụwa.

E nwere ike inwewaga ụzọ mgbasa ozi nwere ike mebe ụzọ ndụ na mgbanwe n’ọha na-eweta ịdịnaotu. TV, sinima na ụzọ mgbasa ozi ndị ọzọ na-emetụta omenaala. E nwere ọtụtụ ụzọ e si ezipụta ma na-emetụta omenaala ndị. Ihe e nwere ike ikwu hoohaa bụ na njikọta ihe emereme na mba ụwa na-eme ka e nwewanye mmekọrịta. Ya mere na ọrụ nka e dere n’asụsụ Igbo, omenaala Igbo dị na ya dịka anyị hụrụ n’akwụkwọ agụmagụ abụọ anyị lebara anya n’ederede a, ka e nwere ike were ụzọ mgbasa ozi nkanụụzụ zisaara mba ụwa niile ma si na ya kwalite udo na ịdịnaotu.

 

Mmechi

Ndị Igbo bụ ndị Chineke ji asụsụ pụrụ iche na ọtụtụ omenaala gọzie. Oge ọbụla, ha na-eji onyinye ndị a dị mkpa ha nwetara n’ụzọ ọ natara chi, were na-ebi ndụ ha kwa ụbọchị, na-egbokwapụ nsogbu sizie na ya na-akwalite udo na ịdịnaotu. Omenaala ndị a na-arụrụrị ha ọrụ, ka na-arụkwa were na-akwado okwu Igbo sị na nkụ dị na mba na-eghere mba nri. Mana, ederede a na-ekwu na ihe na-amasị otu onye na-amasị onye ọzọ. Onyinye ndị a na-egboro ndị Igbo mkpa ga-egbokwara mba ụwa niile mkpa.

Globalaịzehọn ka a hụtara dịka ngwa mmepe obodo. Asụsụ na omenaala Igbo nyere aka n’ịkwalite udo na ịdịnaotu n’ọgbọ globalaịzehọn a. Nke a bụ maka na asụsụ na omenaala bụ otu akụkụ ebe globalaịzehọn na-akpa ike ma na-enwe nzipụta tọrọ atọ.

Ederede a na-egosịkwa n’akụkụ nke anyị na globalaịzehọn na-akwalite asụsụ, agụmagụ na omenaala ala Naịjirịa nke asụsụ Igbo so n’ime ya. A ga-eji ngwa teknụụzụ were chekwaa asụsụ na omenaala Igbo na nke ala Naịjirịa ndị ọzọ. Nchekwa a ga-enye aka ebe ọ dị ukwuu mee ka ndị Igbo nye asụsụ na omenaala ha ezi nkwado. Nke a ga-enyekwa aka n’ikpeazụ chekwaa asụsụ na omenaala Igbo maka mmepe, ndịgide nakwa udo na ịdịnaotu nke ndị Igbo, ndị Naịjiria na mba ụwa gbaa gburugburu.

 

Edensibịa

Adamu, F. L. (2003) “Globalization and Economic Globalization in Northern Nigerian”. Paper Presented at the Development Studies Association Annual Conference. Globalization and Development, Scotland, September 9-12. Availableatwww.devstud.org.uk/publications/paper&conf03/dsaconfo3adamu.pdf.

Adbullahi, A. (1999). Organizational Culture as a Root of Performance Improvement. Journal of Occupational Behaviour 6(3), 243-244.

Edewor, P. A. (2003). Basic Concept in Culture. In Dopamu, P. A. (Ed) pp 195-199.

Eke, N. (1989) Culture and Society. Hampshire: New Prairie Press.

Hofstede, G. (1997) Culture and Organizations: Software of the mind. New York: McGraw Hill Publishers.

Ifeka, R.O. (2015). Ọchụ Nwaọkụkọ Nwe Ada.

Isayev. M. I. (1977). National Language in the USSR: Problems and Solutions. Moscow: Progress Publications.

Iwekanuno, (1927). Akụkọ Ala Obosi. Onitsha: Patmonic Printers & Publishers Ltd.

Karakowsky, L. (2001). Implication of Cultural Differences for Cross-Cultural Management and Research. The Journal of Psychology, 135(5), 501-517.

Mazrui, A.A. (2000) The African renaissance: A triple legacy of skills, values and gender. Lagos: Centre for Black and African Arts and Civilization (CBAAC).

Norberg-Hodge, H. (2006) “Globalization and Terror”. Available at www.globalizations3.htm. Downloaded October 18, 2006.

Ofomata, C.E. (1996). Ihe Onye Metere. Enugu: Format Publishers.

Obinna, J.I. (2002) Cultural and Religious Conflict Nsukka: Trith Peak Publishers.

Ojukwu, C.O. (1998). http://www.nigeriangalleria.com/portrait.

Onukaogu, A. & Onyerionwu, E. (2009). 21st Century Nigerian Literature: An Introductory Teụt. Ibadan: Craft Books.

Radharkrishnan, P. (2004) “Religion under Globalization”. Economic and Political Weekly March 27.

Sanusi, A.S. (2007). The African Palimpsest: Indigenization of Language in West Africa. Stanford: Stanford University Press.

Robertson, R. (1992) Globalization. Aberdeen: SAGE Publications Ltd.

Taylor, R. (1970). Good and evil. Amazon: Promentheus Books.

Vidya, S. (2015) “Globalization Paradoụ: Democracy and the Future of the World”. Journal of Hazardous Materials 149(2) 452-459.

Wikioedia, https://en.m.wikipedia.org/../Igbo

 

 

 

 

 

 

 

 

Nnwemagba Asụsụ Nye Echiche na Nsitihụ Asụsụ Igbo

Patrick Umezi                                                                                                                       Department of Igbo, African and Asian Studies                                                                                   Nnamdi Azikiwe University, Awka                                                               ikennaumezi@yahoo.com

 

medemede

Nchọcha a bụ maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta etu asụsụ si nwe agba nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. ọ gbasoro atụtụ Sapir na Whorf (1948) wee nye nkọwa ya. Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo pụtara ihe n’ebe ndị a: etu ndị Igbo si agụ ihe aha; Etu ha si agụ ihe ọkpụ aha dị iche na etu ha si agụ ihe mbịa mbịa aha, site n’ihe nhụrụnuche dị iche iche, okwu mbite, site n’imepụta ihe ọkpụ dị iche iche, na kwa site na nsịnakwụkwọnsọ. Ihe ndị a gosiri na asụsụ nwere agba nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo.

Mkpọlite

Fịlọsọfị asụsụ bụ akụkụ amụmamụ asụsụ na-agba mbọ ịchọpụta ma kọwaa ihe gbasara asụsụ n’ebe ọ na-agbagwoju ndị mmadụ anya. ọtụtụ ihe gbasara asụsụ bụ nke a na-agbagha na fịlọsọfị asụsụ. Otu n’ime ha bụ asụsụ na echiche kedu nke nwere agba nye ibe ya? Mgbagha a ka dị ruo taa. ụfọdụ sị na ọ bụ asụsụ ka echiche wee nwe agba maka na ọ bụ asụsụ na-amụta echiche, ebe ụfọdụ kwenyere na ọ bụ echiche na-amụta asụsụ. N’aka nke ọzọ ndị otu nke atọ sị na asụsụ na echiche na-agakọ ọnụ. Ihe ọ pụtara bụ na o nweghi nke ka ibe ya. Ha sị na e wepu echiche, asụsụ agaghị adị, e wepukwanụ asụsụ, echiche agaghị adị.

A bịa na ndị kwenyere na asụsụ nwere agba nye echiche, ha na-akọwa na ọ bụ asụsụ na-enye ndị mmadụ echiche ha ji achịkọba ihe ha na-eme na mmekọrịta ọha na eze. ọtụtụ ndị mmadụ edeela banyere nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ dị iche iche iji kwuwapụta na nkwenye ha bụ ọkaibe; mana o nwebeghi onye derela maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. Nke a gosiri na e nwere oghere e kwesiri imechi niihi na e kwesiri ịchọpụta etu nkwenye a si bụrụ eziokwu na nsirihụ asụsụ Igbo. ọ bụ nke a kpatara nwanchọcha ji kpebie ime nchọcha  n’isi okwu a.

Ntulegharị Agụmagụ

            N’ebe a nwanchọcha ga-atụlegharị nkọwa ndị mmadụ merela n’isiokwu na kwa ihe ndị ọzọ e derela n’isiokwu.

Nkọwa Asụsụ na Echiche

Van na Robert (2001) kọwara asụsụ dị ka usoro mmekọrịta nke ndị mmadụ si eji okwu ọnụ na akara ndị ọzọ eme ka a mata ihe ha bu n’obi.

Trask (2007) n’aka nke ya sị na asụsụ bụ ụzọ obodo maọbụ agbụrụ dị iche iche si emekọrịta site n’okwu ọnụ, ihe e dere ede maọbụ akara dị iche iche nke na-eweta ndịiche site n’otu obodo ruo n’ọzọ, maọbụ site n’otu agbụrụ ruo n’ọzọ.

Lyons (1981) na-ekwu na asụsụ bụ usoro nhazi mmekọrịta ọhanaeze nke ihe mejupụtara ya bụ ụda, mkpụrụokwu na asụmasụ site n’otu obodo ruo n’ọzọ.

Caianiello (1961) kọwara echiche dị ka ị nọdụ na mmụọ maka otu ihe, maọbụ ilegara otu ihe anya, ịtụ alo, maọbụ atụmatụ gbasara otu ihe maọbụ nke ọzọ.

Pinker (2008) n’aka nke ya sị na echiche bụ atụmatụ maọbụ ịchịkọta ọtụtụ atụmatụ nke ga-eme ka a chịgharịa mmụọ maka otu ihe maọbụ nke ọzọ.

Ndị niile kọwara asụsụ na echiche dị ka anyị si hụ n’ebe a gbarịrị nke ukwuu; mana etu o si metụta nchọcha a, asụsụ bụ ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si eji okwu ọnụ na omume nke nwere nghọta n’etiti ndị nwe ya wee eme mmekọrịta n’etiti onwe ha.

N’aka nke ọzọ, echiche bụ usoro mmadụ ji abanye n’ime onwe ya wee chịgharịa uche gbasara gburugburu na kwa ihe ndị ọzọ metụtara ya.

Ntụlegharị Ihe ndị E Derela n’Isiokwu

Whorf (1956) mere ka anyị mata na asụsụ dị iche iche na-eme ka ndị mmadụ nwee nsirihụ dị iche iche. ọ gara n’ihu kwuo na asụsụ bụ ugegbe ndị nwe ya (asụsụ) ji ahụ ụwa. Na nkọwa ya, ọ bụ asụsụ na-enye ndị mmadụ echiche maka ihe ndị dị n’ime ụwa ma ndị a na-ahụ anya na ndị a naghị ahụ anya.

Nchọcha Whorf bara uru nke ukwuu maka na o nyere aka wee kọwaa mmekọrịta dị n’etiti asụsụ na echiche ka o si metụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Nchọcha ya so wee tọọ ntọala maka nkwado na ịkọwa etu asụsụ si nwe agba nye echiche. O yitere nchọcha a maka na ha abụọ na-ekwu maka nnwemagba asụsụ nye echiche. Mana ọ dịkwa iche na ya maka na nchọcha Whorf na-arụtụ aka n’asụsụ ụwa niile, mana nchọcha a bụ maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. Ya bụ na nchọcha ya egboghi nsogbu nchọcha a.

Langacker (1991) n’aka nke ya na-akọwa na obodo ọbụla na agbụrụ ọbụla nwere nsirihụ e jiri mara ha. Nke a bụ etu ha si ahụta ụwa ma na-egosipụta ya site n’asụsụ ha. ọ bụ nke a kpatara na ndị ọbụla agaghị echeli echiche banyere okwu ọbụla adịghị n’asụsụ ha. ọ gara n’ihu kwuo na ka asụsụ na-ebitewanye okwu ka asụsụ ahụ na-etowanye, echiche ndị nwe ya a na-agbasawanye.

Nchọcha Langacker bara uru nke ukwu. ọ na-egosi na echiche gbadoro ụkwụ n’asụsụ. Ka asụsụ na-eto ka echiche ndị nwe ya na-agbasawanye, maka na ọ bụ asụsụ bụ ide ji echiche. Ihe adịghị n’asụsụ agaghị abatanwu ndị nwe asụsụ ahụ n’uche. Nchọcha ya yiri nchọcha a maka na ha abụọ na-ekwu maka nnwemagba asụsụ nye echiche mana ọ dị iche na nchọcha a maka na nchọcha a gbadoro ụkwụ na nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. Ya bụ na nchọcha Langacker egboghi nsogbu nchọcha a.

Anedo (2013) kọwapụtara na ọ dị ụzọ ihe atọ a na-ebu n’obi ma a na-eme nchọcha maka mmekọrịta dị n’etiti asụsụ na echiche. Nke mbụ bụ ndịnasụsụ ahụ bụ isi nchọcha. Nke abụọ bụ nkwenye n’etu mmadụ ga-esi ghọta asụsụ na echiche. Nke atọ bụ I bu n’obi na ime nchọcha ntụlekọrịta n’asụsụ si n’omenala dị iche iche na-ebute nsogbu n’usoro nchọcha nke mgbochi ya na-esi ike.

Nchọcha Anedo bara uru nke ukwuu maka na o nyere aka n’ịmatawanye mmekọrịta dị n’etiti asụsụ na echiche. O yiri nchọcha a maka na ọ na-arụtụ aka n’asụsụ na echiche. N’aka nke ọzọ, ọ dị iche na nchọcha a maka na nchọcha Anedo na-ekwu maka asụsụ niile ebe nchọcha a bụ maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. Nke a gosiri na nchọcha a ka dị mkpa.

Lehman (1993) chọpụtara na ọrụ asụsụ na-arụ abụghị naanị ịnabata ozi na kwa izipu ozi n’ụwa; mana ọ nọkwuazi ọrụ ịgbazi ka echiche ndị mmadụ si aga.

Nchọcha Lehman bara uru nke ukwuu niihina o nyere aka n’ịkọwami ọrụ asụsụ na-arụ nye echiche iji gosi n’ezie na asụsụ nwere agba nye echiche. O yitere nchọcha a maka na ọ na-akọwa etu asụsụ si agbazi echiche. ọ dịkwuazi iche na nchọcha a maka na nchọcha a gbadoro ụkwụ na nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo, ebe nchọcha Lehman na-arụtụ aka n’ọrụ asụsụ na-arụ nye echiche.

Ewelu (2010) na-akọwa na ọ dị ụzọ nkwenye atọ iji gosi na asụsụ nwere agba nye echiche. Nke mbụ bụ ụdịdị na agwara asụsụ ọbụla na-ekpebi etu ndị nwe ya (asụsụ) si eche echiche, erote ihe nakwa ahụ ụwa. Nke abụọ bụ nkwenye na asụsụ dị iche iche na-ahụ ụwa n’ụzọ dị iche iche na-agbazikwa etu ndị nwe ya si ahụ ụwa. Nke atọ bụ nkwenye na ndịiche dị n’asụsụ na-emetụta mmekọrịta ọhanaeze. Na nkwenye atọ ndị a, ọ sị na nke mbụ kacha wee sie ike, nke abụọ na-esote ya, ebe nke atọ esichaghị ike.

Akwanya (1999) na-akọwa na ọ bụ site n’asụsụ ka e ji enye ma ihe a na-ahụ anya, ma ihe a naghị ahụ anya echiche. Akụkọ ifo niile gbasara ala mmụọ maọbụ obodo ụmụ anụmanụ na ihe nhụrụnuche niile bụ asụsụ na-akpalite ha ma nye ha echiche n’obi mmadụ.

Nchọcha Akwanya bara uru nke ukwuu maka na ọ kọwara na e wepu asụsụ, ihe nhụrụnuche agaghị enwe echiche ọ bụla. Ya na nchọcha a yitere maka na ha abụọ na-ekwu maka nnwemagba asụsụ nye echiche. N’aka nke ọzọ, ha dị iche maka na nchọcha Akwanya na-ekwu maka etu asụsụ si enye aka n’ịmata ihe nhụrụnuche, ebe nchọcha a na-ekwu maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo.

Piaget (1968) na nkọwa o nyere maka uto ụmụaka na-akọwa na ọ bụ asụsụ na ihe ndị ọzọ ka echiche ji eto. ọ kọwara na asụsụ dị mkpa maka echiche ụmụaka itu uto. N’aka nke ọzọ, ọ sị na e wepugodu asụsụ, echiche ga-eto mana asụsụ na-enyere ya aka n’uto. Nchọpụta ya nyere aka maka ịchọpụta etu asụsụ si didebe mkpa maka uto echiche nwata ọ bụla.

Nchịkọta Ntụlegharị Agụmagụ

N’agụmagụ ndị a niile a tụlegharịrị, a chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ agbaala mbọ ime nchọcha iji kwado otu ndị na-ekwu na asụsụ nwere agba nye echiche. N’agbanyeghi mbọ niile ha gbara, o nwebeghi onye derela maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. ọ bụ nke a ka nwanchọcha ji kaa obi ịbagide ọrụ nchọcha a.

Atụtụ Nchọcha

Nchọcha a ga-agbaso atụtụ Sapir na Whorf (1948). Edward Sapir na nwata akwụkwọ ya bụ  Benjamin Lee Whorf bụ ndị bụ isi a hụrụ wee kwaba okpu n’atụtụ a. Ha na-akọwa na ọ bụ site n’asụsụ mmadụ ka onye ahụ sị ahụta ụwa. ọ bụ site n’asụsụ ka mmadụ si eche echiche. ọ bụ ebe asụsụ onye ọbụla jedebere ka echiche ya na-ejedebe. Ya bụ oge, gburugburu na nsirihụ dị iche iche na-adị iche site n’asụsụ ruo n’asụsụ.

Whorf chọpụtara nke a mgbe o mere nchọcha pụrụ iche site n’inyocha asụsụ Hopi na asụsụ ozurumbaọnụ nke ndị Iroopu. ọ chọpụtara na etu asụsụ ndị Hopi si dị iche n’asụsụ ozurumbaọnụ nke ndị Iroopu, etu ahụ kwa ka echiche ha si dị iche. ọ bụ etu a ka Whorf si gbado ụkwụ na nkwenye onye nkụzi ya bụ Sapir wee tụpụta atụtụ a.

Ka o si dị, atụtụ Sapir na Whorf gbara mkpị. Ha dị agba abụọ pụtara ihe n’atụtụ a. Ha bụ agba ike na agba nro.

1) Agba ike: Nke a bụ agba nke a kpọrọ mkpebi asụsụ. ọ bụ agba atụtụ na-akọwa na-asụsụ na-ekpebi etu ndị nwe ya si eche echiche nakwa etu ha si ahụta ụwa.

Agba a riri mperi nke ukwuu maka na ndị mmadụ katọrọ ya maka na ọtụtụ ndị mmadụ ekwenyeghi na asụsụ nwere mkpebi bụ ejechaa agwụ n’etu ndị nwe ya si eche echiche nakwa etu ha si ahụta ụwa.

2) Agba nro: Nke a bụ agba nke a kpọrọ nnwemagba asụsụ. Agba nke a na-akọwa na asụsụ ọbụla nwere agba nye etu ndị nwe ya si eche echiche. ọ bụ agba nke a ka ndị mmadụ ka wee nabata. ọ bụ nchọcha e mere n’agba nke abụọ a ka e ji nweta agba nke atọ bụ mmekọrịta asụsụ na echiche. ọ bụ eziokwu na agba nke atọ a apụtaghị ihe nke ọma, ọ na-adabere n’agba nro wee na-arụ arụ. ọ bụ ya bụ agba kacha dị nro. ọ na-akọwa na asụsụ dị iche iche na-akpata omume dị iche iche dị ka o si metụta asụmasụ. ọ na-akọwa na asụsụ nwere agba nye echiche.

ọ bụ atụtụ a ka ndị kwenyere na asụsụ nwere agba nye echiche ji arụ ọrụ ọtụtụ oge, maka na o nyere aka n’ịkọwami nnwemagba a nke ọma. Ya bụ na edemede a ga agbado ụkwụ n’agba nro wee na-enye nkọwa.

Mpụtara Ihe Nnwemagba Asụsụ Nye Echiche na Nsirihụ Ndị Igbo

Nnwemagba asụsụ nye echiche dị ka o si dị na nsirihụ ndị Igbo pụtara ihe n’ebe ndị a:

  1. a) Etu ndị Igbo si Agụ Ihe Aha

Etu ndị igbo si agụ ihe aha gosiri na asụsụ nwere agba n’ebe echiche nọ. Nke a pụtara ihe n’ụzọ ha si agụ ihe ọkpụ aha nakwa ụzọ ha si agụ ihe mbịa mbịa aha.

  1. i) Ihe ọkpụ

Ndị Igbo na-agụ ihe ọkpụ aha dị ka nsirihụ asụsụ ha si dị. Aha ndị a na-akwụrụ onwe ha na achọghị ihe mgbakasa ọbụla.

ọmụmaatụ: ekwe, ụlọ, ọgwụ, elu, ntị, nkata, ụgbọ, mmiri, ala, ọnwa, atụrụ, kpakpando, wdg. ọ bụ ihe ndị dị n’asụsụ ha ka ha si eche echiche. Ihe ndị adịghị n’asụsụ ha anaghị abịa ha n’echiche.

  1. ii) Ihe Mbịa Mbịa

Ndị Igbo na-esi n’ihe ndị dị n’asụsụ ọkpụ ha wee na-enye ihe mbịa mbịa aha; maka na echiche ha gbadebere ụkwụ n’ihe ndị dị n’asụsụ ha. ọ bụ nke a kpatara na aha ihe mbịa mbịa na-abụkebe okwu a gbakwụnyere ihe; mana a bịa n’asụsụ nwe ihe ndị ahụ (dị ka asụsụ Bekee), ha na-abụkarị otu mkụrụokwu kwụụrụ onwe ya. ọmụmaatụ:

Ekwentị – Hand-phone

ụlọọgwụ – hospital

ụlọakwụkwọ – school

ụlọahịa – Market

ụlọọrụ – Office

ụlọụka Church

ụlọezumezu – Auditorum

ụgbọala – motor

ụgbọelu – aeroplane

ụgbọmmiri – ship

ụgbọoroko  – train

ọmụmaatụ ndị a gosiri na ọ bụ ihe ọkpụ abụọ ka e jikọtara ọnụ wee nye ihe mbịa mbịa ndị a aha. Nke a gosiri na ọ bụ echiche si n’asụsụ ọkpụ ka e si nweta aha ọhụụ ndị a. O gosiri na ha adịbughi n’echiche ndị Igbo maka na ha adịbughi n’asụsụ ha. Ya bụ na e wepu echiche si n’asụsụ Igbo, a gaghị enwe ike ịgụ ihe mbịa mbịa ndị a aha.

  1. b) Ihe Nhụrụnuche dị Iche Iche

Ihe ndị a naghị ahụ anya nwegasịrị aha n’asụsụ Igbo iji gosi na ọ bụ n’asụsụ ka echiche si epulite. E wepu asụsụ, ihe ndị a agaghị adị n’echiche ndị Igbo maka na a naghị ahụ ha anya ọmụmaatụ: ndị mmụọ, eluigwe, ọkụ mmụọ, ịhụnanya, eziokwu, wdg.

ọ bụ echiche asụsụ nyere ihe nhụrụnuche ndị a ka ha na-enwe n’ebe ndị nwe asụsụ ahụ nọ. O nwebeghi onye hụrụ ndị mmụọ anya mara ka ha dị; mana ọ bụ site n’asụsụ ka ha si enwe echiche n’ime mmadụ. E wepu asụsụ, o nweghi onye ga-enwe echiche ọbụla maka ihe nhụrụnuche. Nke a gosiri na asụsụ nwere agba nye echiche.

Ch) Okwu Mbite

Okwu mbite bụ otu ụzọ ndị Igbo si egosi na asụsụ nwere agba nye echiche. Ha bụ okwu ndị adịbughi n’asụsụ Igbo nke pụtara na ha adịbughi n’echiche ndị Igbo.

ọmụmaatụ: Sayensi, kọmputa, osikapa, Bishọpụ, Aatị, fakọlti, Poopu, mango, windo, oroma, karọtụ wdg.

Otu ihe ọzọ pụtara ihe bụ na ọtụtụ okwu mbite na-ada iwu ndakọrịta ụdaume Igbo. Ha anaghị agbasocha iwu nsupe asụsụ Igbo dị ka o si metụta ndakọrịta ụdaume. ọmụmaatụ: Kpakpando, kukumba, kabeeji wdg.

ọ bụ mgbe asụsụ bitere okwu ka ha na-enwe echiche n’ebe ndị nwe asụsụ ahụ nọ. ọ bụrụ na asụsụ enyeghi ihe ndị a aha, ha agaghị enwe echiche ọ bụla. Mgbe okwu ndị a were aha, ha abanye n’echiche ndị Igbo nke na a kpọọ nke ọbụla aha, onye Igbo ọbụla aghọta ihe a na-ekwu maka ya.

  1. d) Site n’Imepụta Ihe ọkpụ

Etu ndị Igbo si emepụta ihe ọkpụ gosiri na asụsụ Igbo nwere agba nye echiche n’ebe ndị Igbo nọ. Tupu ọbịbịa ndị ọcha n’ala Igbo, ihe ọkpụ niile ndị Igbo mepụtara bụ site n’ihe ọ dị ka Chi si kee ya nke gosiri na ọ bụ n’ebe asụsụ ha jedebere ka echiche ha jedebere.

ọmụmaatụ:

1) Ha si n’igu nkwụ emepụta azịza e ji aza ụlọ.

2) Ha si n’osisi dị iche iche atụpụta ekwe, ikwe, ọdụ, ọja

3) Ha na-eji aja ụrọ arụ ụlọ ma were ahịhịa dị n’ọhịa kpuchie elu ya.

Nke a gosiri na n’oge ochie, o nweghi mgbe ndị Igbo ji eche echiche maka ịrụpụta ụgbọala maọbụ ịnyịnyaigwe, maka na ihe ndị ahụ adịghị n’asụsụ ha nke mere na ọ dịghị ha n’obi; mana ka afọ na-aga, ụfọdụ ihe mbịa mbịa na-ewere ọnọdụ n’ala Igbo, ndị Igbo a mụrụ n’oge ọgbara ọhụụ na-ahụta ihe ndị mbịa mbịa dị ka ihe ọkpụ. Nke a mere ka echiche ha na-agbanwe banyere imepụta ihe ọhụụ. ọ bụ ya mere ndị Igbo ji arụpụta ihe ọhụụ site na sayensi na nkanụzụ. Maka na ihe ndị ahụ adịla n’asụsụ Igbo nke pụtara na ọ dịkwu n’echiche ha.

 

  1. e) Nsinakwụkwọnsọ

A bịa n’akwụkwọ nsọ e gosiri na ntọala ndịiche dị n’asụsụ butere ndịiche dị n’echiche. N’akwụkwọ Mbido 11: 1-9, e gosiri etu ndị mmadụ si chọọ iwu ụlọ elu ga-etolu n’eluigwe ka ha hụ Chukwu anya. Chukwu tinyeere ha ọgbaghara site n’iwetere ha ndịiche n’asụsụ, ndịiche n’asụsụ a weteere ha ndịiche n’echiche. Nke a mere na ha anakwaghị aghọta ihe ibe ha na-asụ. Maka na echiche ha adịla iche niihina asụsụ ha dị iche.

Nke a gosiri na asụsụ nwere agba nye echiche, maka na ndị a e gosiri n’akwụkwọ nsọ na-asụbu otu asụsụ ma nwee otu echiche nke mere ha ji kwekọrịta, kpebie ịrụ ụlọ elu; mana mgbe e tinyere ndịiche n’asụsụ ha, ndịiche batakwuaziri n’echiche ha.

Nchịkọta

Na nchọcha a bụ maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo, a hụrụ ka ndị mmadụ si gbaa mbọ igosipụta na asụsụ nwere agba nye echiche. Mana n’ime mbọ ndị ahụ niile, o nweghi onye derela maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ ndị Igbo. Nke a mere ka nwanchọcha gbaa ọbara iji hụ na e mere nchọcha dị otu a na nsirihụ asụsụ Igbo. Mgbe e mechara nchọcha a, a chọpụtara na nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo pụtara ihe n’etu ndị Igbo si agụ ihe ọkpụ na ihe mbịa mbịa aha, nke a pụtakwara ihe site na ihe nhụrụnuche nwegasịrị aha n’asụsụ Igbo. E sikwuazi n’okwu mbite egosipụta nke a nakwa site n’etu ndị Igbo si emepụta ihe ọkpụ dị iche iche. ọzọkwa bụ ọmụmaatụ si n’akwụkwọ nsọ nke na-akọwa na ndịiche n’echiche sitere na ndịiche n’asụsụ.

Mmechi

Na mmechi, a chọpụtara na nwanchọcha mejuputara ebumnobi ya nke bụ ịchọpụta etu asụsụ si nwe agba nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo.

 

Nrụmaka

Akwanya, A. N. (1999). Language and habits of thought. Nsụkka: Afro-Orbis Publishers

Anedo, O.A.A. (2013). The interactions of culture, language and cognition. Igbo Scholars    Journal, Vọl. 1, 116 – 137

Caianiello, E. R. (1961). “Outline of a theory of thought-processes and thinking machines”.             Journal of Theoretical Biology.  204–35. Retrieved June 27, 2017.

Ewelu, B. I. (2010). Language and thought: A problematiọue in African philosophy. Enugu:            Delta publications. 

Langacker, R. W. (1991). Foundations of cognitive grammar 2. Standford: Standford           University Press.

Piaget, J. (1968). Le langage et la pensee chez l’enant. Neuchatel: Delachauụ et Niestle

Pinker,S. (2008). The stuff of thought: Language as a window into human nature. New York:           Penguin Books

Lehman, J. F., Newell, A., Polk,T. & Lewis, R. L. (1993). “The role of  language in              cognition: A conceptual inọuiry” In: Geirsson, H. &

Losonsky, M. Reading in language and mind. Oụford: Oụford University Press.

Lyons, J (1981). Language and linguistics. Cambridge: Cambridge University Press.

Trask, R. L. (2007). Language and linguistics: The key concepts New York: Harvester Press            Limited

Van, V. Robert, D. (2001). “Functional linguistics”. In: Mark Aronoff, M & Rees-Miller,      J. The handbook of linguistics. Oụford: Oụford University Press.

Whorf, B. L.(1956). Language, thought and reality. Cambridge, MA: MIT Press

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

NZI PỤTA NDỊNA N’ABỤ A HỌỌRỌ DỊ N’UCHE BỤ AFA

 

IFEKA, O. R. (PhD)

CHUKWUEMEKA ODUMEGWU OJUKWU UNIVERSITY,

IGBARIAM CAMPUS

DEPARTMENT OF IGBO LANGUAGE

 

 

Ụmịedemede

E nweela ọtụtụ abụ e nyochara iji zipụta ụdịdị ha dịka abụ ikpe maọbụ abụ echiche miri emi. A chọrọ ileba anya n’abụ dị n’Uche Bụ Afa, nke G. O. Onyekaonwu dere. Edemede a chọrọ izipụta etu Onyekaonwu siri site n’abụ ndị a họọrọ wee gbaa n’anwụ nsirihụụwa ndị Igbo naọtụtụ ihe ndị mmadụ na-agabiga n’ala Igbo nke nwere ike nye aka dozie agwa a na-akpa n’oge a. A họọrọ abụ anọ ndị a: “Akwa Onye Ụbịam”, “Olu Mmmọnwụ”, “Aga M Abụ Ikuku, na Iyoo M wee mee nzipụta n’ozuzu oke. A na-atụ alo ka e nwee ndagharị akwụkwọ a bụUche Bụ Afa iji weruo ụtọasụsụ dị n’ime ya n’ogo ụtọasụsụ ugbua niihina ụtọasụsụ Igbo na-eto kwaụbọchị. Ọzọ bụ ịgbazinye ndị odeabụ ego ha ga-eji na-edepụta ma na-ebipụtakwa akwụkwọ abụ dị n’ụdịUche Bụ Afa. N’ezie odeabụUche Bụ Afa n’echiche nwanchọcha gbọrọ ihe ewu na-eri n’edemabụ keoge ugbua.

 

Ndubanye

Odeabụ bụ onye na-amụanya banyere ihe ọbụla na-eme na gburugburu ebe ọ nọ. Ọ naghị eleghara ihe ọ hụrụanya. Ụda ọbụla ọ nụrụna ihe na-eme maọbụọ na-eche ga-eme n’ebe ọ nọ n’otu oge ahụ, etundị mmadụ si akpa agwa, nzuzu ha, ahụhụ ha na-ata maọbụọṅụ ha. Ọzọkwa, ọ bụ onye na-eji asụsụ akọwa ihe mmadụ na-eche banyere onwe ya na ebe o bi, ebe ha siri bịa. Ihe ha na-eme ebe ahụ? Ebe ha ga-alọghachi. Odeabụ n’ime ya nwere ọtụtụ echiche na nghọta ọ chọrọ ka ọhanaeze mata. Ihe ndị a niile ka o ji asụsụ ezipụta n’ụdị abụ. Odeabụ na-achọụzọ isi mee ka ọhanaeze chọpụta ihe na-eme n’okirikiri ha mana niihi na ihe ọbụla na-eme na-agbagwoju anya, asụsụ odeabụ bụrụkwa nke a na-akpị akpị,ọgụụ na-enwe nhịaahụịghọta ihe odeabụ na-ede mana onye nnyocha a zuru n’agụmagụ aghaghịịgbalịsi ike zipụta ezi nghọta dị n’abụ odeabụ dere.

Ọtụtụ abụ kaa ga-eji zipụta abụ ekereuche. Etundị odeabụ si ezipụta mmetụta site na nhọokwu na atụmatụ okwu ha na-ewere ede abụ na-egosi odeabụ dịka ọkaibe n’ihe e ji asụsụ eme. Site n’abụ ndịa họọrọ, a ga-eji ha wee gosipụta mkpa ọ dị mmadụ iji uche dị nkọ na-echepụta ihe o kwesiri ime n’oge ọbụla. Nchọcha a chọrọịgba n’anwụ etu odeabụ, Uche Bụ Afa siri site n’ịgba mbọ ya wee nyochapụta ihe na-eme na ndụ, nzipụta omenaala, nkwenye na nsirihụụwa ndị Igbo. Ọ hazikwaraọtụtụ ihe adịghị mma n’etiti anyị n’oge a.

 

Akụkọ Ndụ Odee

  1. O. Onyekaonwu bụ odeabụ ma bụrụkwa odeejije. Ọ bụ onye Nnewi dịna Steeti Anambara. Nna ya bụ Maazị Uzodoo Onyekaonwu, ebe nne ya bụ Odz. Akumkpọ Onyekaonwu lachagoro mmụọ. Ọ gara akwụkwọ Praịmarị n’ụlọakwụkwọ St. Lukes (CMS), Enugu Ezike. O mechara nwee ọtụtụ nzere mmụta n’ogo dị elu wee bụrụ ọkankuzi na ọkammụta. Ọ lụrụ nwaanyị mụta ọtụtụụmụ. Ọ laala ezumike ọrụna Mahadum Nnamdi Azikiwe ebe ọ nọrọ kụzi nkuzi ọtụtụ afọ. O deela ọtụtụ akwụkwọ n’Igbo, ọkachasị n’ejije.

N’inyocha abụ, echiche miri emi ndị a Onyekaonwu dere n’Uche Bụ Afa, a ga-agbaso usoro ọhụụ e si eme nnyocha abụ n’ụzọ ndị a;

  • Nkọwapụta ndịna agụmagụ
  • Nnyocha ihe mebere agụmagụ
  • Mkpebi ọnọdụ agụmagụ

A họọrọ abụ ndị a sitere n’Uche Bụ Afa:

  • “Akwa Onye Ụbịam”
  • “Olu Mmọnwụ”
  • “Aga M Abụ Ikuku”
  • “Iyoo M”

Abụ echiche miri emi bụ abụ ndị gboo ji azụlite ụmụ ha n’ebe ọdịnala dị n’ụdị nso ha na ihe a tụrụ anya onye ọbụla ime n’obodo. A na-esite n’ụdị abụa akụzi nkuzi a dị mkpa. Ka anyị gbasoo usoro e kwuru wee lebaa anya n’abụ ndị a họọrọ.

 

AKWA ONYE ỤBỊAM

Chi m ị gbuola m!

Gịnị ka I jiri mee m

Ka m were anya m na-ahụ ntị m;

Ka m were eze na-ekpe ekwere?

Gịnị ka I jiri mee m

Ka m na-elere ụwa naanị n’anya?

Gịnị ka m ga-eji bụrụ

Ọ dị ndụọnwụ ka mma?

Ọnụ m adịghị eru n’okwu

N’ihi na okwu baa n’ego

Nwa ogbenye esere ọnụ ya

Gịnị ka I jiri mee m

Aka akọta ụtara, aka akọta ofe nri?

 

 

Ọ bụ eziokwu na m garuo ụlọọgwụ

Hụọnọdụụmụ mmadụ ma ọ bụ

Nụrụ ekpere ha na-ekpe sị:

Ka anyị dị ndụ ma ya bụrụ ego

Bụrụkwa ezi okwu na m ji anya m abụọ

Na-ahụ ndịara nandịọrụsị dị iche iche –

Ndị na-abụghị ndụ ka ha dị

Wee chọwazie ikwu okwu ego

Ma ihe ndịa agaghị egbochi m

Akwa arịrị m na obi mgbawa m,

Nke e nweghị ego na-ewetara m

Kama ịdị ndụ osisi akpụ

Kama ịdị ndụ bụrụ ohu,

Ọnwụ kaara m mma

 

Abụ a bụ abụ echiche miri emi. Odeabụ ji asụsụ wee kụrụ mmụọọgụụ inwe ezi mmetụta site n’abụ a. Isi ihe ọ gbadoro ụkwụ bụ mkpesa. E kere abụ a na nkebiabụ abụọ. Nkebiabụ nke mbụna nke abụọ nwere ahịrịabụ iri na anọ, iri na anọ n’otu n’otu. Odeabụ họọrọ asụsụ nka dịike nke akụghị mmiri wee chọọ abụ ya mma, nkamma ya juru eju ma jupụtakwa na kwunkwukwasị. Odeabụ zipụtara ọnọdụ onye ụbịam a dịka ihe chi ya wetaara ya. E nwere ọtụtụ ajụasaaghịna nkwusara n’abụ a. Na nkebiabụ nke mbụọ jụrụ ajụjụ ndị a:

  1. Gịnị ka m bịara n’ụwa a ime? ahịrịabụ 2
  2. Gịnị ka I jiri mee m ka m? ahịrịabụ 3
  • Ka m were eze na-ekpe ekwere? ahịrịabụ5
  1. Gịnị ka m ga-eji bụrụọdị ndụọnwụ ka mma? ahịrịabụ 8 na 9
  2. Aka akọta ụtara, aka akọta ofe nri? ahiriabụ 14

 

Odeabụ na-ajụ Chi, onye o kwenyere na ya, ka o nyere ya aka ka ọ ghọta ụdị ndụọ hụtara onwe ya n’ime ya, nke amasịghị ya ma ọlị. Ọ na-ekpesa n’akwa arịrịna mwute ụdịọnọdụọ hụtara onwe ya n’ime ya. Na nkebiabụ nke abụọ, odeabụ gosipụtara ka ọnọdụ siri dowerendịọzọ ihu ebe nke ya pụrụ iche ma dị njọ.

Nkebiabụ nke abụọ, ahịrịabụ nke mbụ wee ruo na nke anọ.

Ọ bụ eziokwu na m garuo ụlọ ọgwụ

Hụ ọnọdụ ụmụ mmadụ ma ọ bụ

Nụrụ ekpere ha na-ekpe sị:

Ka anyị dị ndụ ma ya bụrụ ego

 

N’ebe a,ọ na-egosi na n’agbanyeghịọnọdụ ndị mmadụ nọ n’ụlọọgwụ na mwute na-achọ ma na-ekpe ka ha dị ndụ,ọ bụghị ya ka ọ ga-eji hapụịrịọ ka o nwee ezi ọnọdụ maọbụ hapụ mkpesa. Dịka o siri kwuo,

Kama ịdị ndụ osisi akpụ

Kama ịdị ndụ bụrụ ohu

Ọnwụ kaara m mma

 

Arịrịọ odeabụ n’abụ a zipụtara ilu (ilu bụ okwu amamihe na ekereuche). O zpụtara ezi ntụlekọrịta n’etiti ọchịchọ akụnaụba naọchịchọ ahụike. Ọbụladị mgbe ọ chọpụtara na ya ka ha mma,ọ na-ekwukwa na ndụ kwesịrị inwe ezi ihe e ji eleta ya n’ozuzu oke. Odeabụ site n’asụsụ nka o jiri mejupụta abụ a na kwunkwukwasị juputara n’ime ya na-agbadosi ụkwụ ike n’ihe ọ na-ekwu banyere a hụghị tụtụrụ rachaa. A bịa na nkebiabụ nke mbụ,

  • Gịnị ka I jiri mee m? ahịrịabụ 3
  • Gịnị ka I jiri mee m? ahịrịabụ 6
  • Gịnị ka I jiri mee m? ahịrịabụ 13

Isiokwu abụ a na-egosipụta “Chi” dịka onye pụrụ ime ihe niile. O nwere ikeịgbanwe ọnọdụọbụla mmadụ nọ. Abụ ekereuche a na-akụziri ọhanaeze ezi agwa.

 

OLU MMỌNWỤ

Mgbe mmadụ na-abụkwaghị onwe ya

N’ihi naọ dara iwu mmụọ,

Ọ dị olu pụrụ iche ọ na-anụ;

Nke na-akpọ, na-akpọ,

Na-ebigbokwa n’ike n’ike;

Nke a na-akacha n’etiti abalị,

Mgbe ọchịchịrị dọọrọụwa

Kpuchibido na ndagwurugwuru itiri

Mee ka ebe niile na-esi mmụọ mmụọ

Egwu egwu; ọnwụọnwụ; mfu mfu.

 

Mgbe olu a na-akpọ ya,

Ọ na-akpọ esepụghị aka

Ọ na-akpọ, na-aba, na-etigbo

N’ihi naọ bụ olu oke mmụọ

Mma ọchọnsịọ kpa n’aka ya

Na-apụọkụ, na-akwụ anwụrụ

Nke mere na onye ọ na-akpọ

Ahụ na-ama jijiji n’oke ụjọ;

Obi ya na-eti kpum, kpum, kpum

N’ihi na oku ahụ atọghị nkịtị

 

Ma onye ahụ na-ekpe, na-arịọ

N’imurimu ụka, ọ na-ekpesa, na-asị;

Ana m arịọ gị nna anyị ukwu,

Biko nyetụ m nwa ohere

Iji wee mata (otu ma otu ọ hala)

Ihe iwe gị jiri dịọkụ otu a

Ọ bụ ezokwu (amatara m) naọ dịghịọkwụkwa

Na m ga-azarịrị oku a (na nwa oge nta)

Ma biko kọwatụtụnụ m, biko,

Tutu olu mmọnwụ alaa.

 

Abụ a bụ abụ echiche miri emi dị mma n’ụdị e siri gosipụta njije nke nsirihụọnwụ n’ọdịnaala ndị Igbo. Abụ a dị nkebiabụ atọ, nkebiabụ nke mbụ dị ahịrịabụ iri, nke abụa dị ahịrịabụ iri, ebe nkebiabụ nke atọ dị ahịrịabụ iri na otu. Odeabụ zipụtara ebimndụ ndị nọ n’otu ebe na nke ndị nọ n’ebe ọzọ na nke ndị nọ n’ebe ọzọ na-ebikwa ndụ nke ha. Odeabụ na-arịọ olu mmụọ ka o nweere ya ndidi na ya maara nke ọma na ya ji ya ụgwọịza oku ọ na-akpọ. Odeabụ gosikwara na olu mmụọ anaghị enwe ndidi ma chọta mmadụ niihi na ngwaọrụ ya na-adị ya n’aka oge ọbụla, na onye ọbụla ọ kpọrọ na-anọ n’ụjọ niihi na oku ya anaghị abụ ka e rie maọbụ ṅụọ kama na ọ na-abụrịrịọnwụ. Onye ọ kpọrọ na-arịọ na-asị biko nna m ukwu wetuo obi gị biko ka m nweenụike chọpụta ihe bụ iwe gị n’ebe m nọ. Ama m na m ga-azarịrị oku a. Odeabụ ji nke a zipụta na mmụọ ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ na-akparịta ụka n’ụzọ abụla ụzọ. Ọ gbara n’anwụ nnwere onwe ndị mmụọ n’agbanyeghị ka o siri dịrị ndị dị ndụ. Lee ọmụmaatụ:

Nkebiabụ nke atọ, ahịrịabụ 9-11

Na m ga-azarịrị oku a

Ma biko kọwatụtụnụ m biko

Tutu olu mmụọ alaa

Olu mmụọ dị egwu mana asụsụ e jiri dee abụ a dị mfe. Ọ gbara n’anwụ ihe ọdachi a bụọnwụ nke na-adakwasị ma onye ukwu na onye nta. Abụ akwa a pụtara ihe etu odeabụ siri begide akwa wee ruo n’isi njedebe abụ a. Ọmụmaatụ nkebiabụ nke atọ, ahịrịabụ 3-7:

Ana m arịọ gị nna anyị ukwu

Biko nyetụ m nwa ohere

Iji wee mata (otu ma otu ọ hala)

Ihe iwe gị jiri dịọkụ otu a

N’ebe a,, e zipụtara etundị Igbo siri hụta ọnwụ, ọ bụghị naanị na ọ na-egbu onye ọbụla kama na ọ naghị eme ebere ma ọ chọọ igbu mmadụ. Isiokwu abụ a bụ,na ndụ bụ ihe na-agafe agafe nke anyị amaghị ihe nwere ike idapụtara anyị.

 

AGA M ABỤIKUKU

Oke bụrụ nke mmadụ

Ma ọ bụ a sị onye ọ bụla were

Ihe ọ ga-abụ n’ụwa ọzọ

M jee bịakwa, ọ ga-asọ m

Ka m bụrụ ikuku

 

Ee! Ikuku ka m ga-abụ

Inye ndụ ga-adị m n’aka;

Igbu egbu ga-abụkwa nke m

Ọ bụ mmadụ, ọ bụ anụọhịa

Aga m adịrịrị ya mkpa

Ọ bụ ogbenye, ọ bụọgaranya

Ọ ga-achọtarịrị m.

Ma ọ bụrụna o meghị nke a

Ekwe ga-akpọrịrị ya.

 

Ee! Aga m abụ ikuku

Dike ji mma, jide ji

Onye ọ wanyere, yaerie

Agaghị m na-awanye ji m mpụ

Dịka ikuku nke a si eme

Aga m akpara anya m n’aka

Na-ahụchapụta ndị ome mma

Naanị ha ka ji m ga na-erute aka

Ma ndị ome njọ niile

Ka ekwe ga na-akpọ

Ọ kpọpụ, ọ kpọkwa

N’ihi na ha agaghị na-anụ isi ji m

 

Ọ dịkwanụghị onye ga-ahụ m anya

Sị ya na-abịa ịrịọ m arịrịọ;

Ma ọ bụịbịa mee m aka azụ

Ma ọ bụ isiri m ọnya

Sị ya chọrọ ijide m, gbuo

N’ihi na abụ m ikuku

Adịghị m ama n’ọnya

Ọ bụ m na-enye ndụ

Ọ bụ m na-enye ọnwụ.

 

Abụ a bụ abụ echiche miri emi ma gbaa n’anwụ n’ebe dị egwu etundị mmadụ siri achọsi ọchịchịike. Ọzọ, etu mmadụ si chọọike imegide ndị iro ya. E kere abụ a na nkebiabụ anọ, nkebiabụ nke mbụ nwere ahịrịabụ ise, nkebiabụ nke abụọ nwere ahịrịabụ iteghete, nkebiabụ nke atọ nwere ahịrịabụ iri na abụọ, ebe nkebiabụ nke anọ nwere ahịrịabụ iteghete.

Odeabụ malitere mkparịtaụka n’etiti ndị amaghị ole ha dị, n’ikpebi na ya ga-abụ ikuku. Ka ọ na-aga n’ihu, o ji nhagideokwu wee nwachapụta naọ bụ uru maọbụịdị mma na ugwu mmadụ inwe ike ọchịchị.                                                                                   Ọmụmaatụ; nkebiabụ nke abụọ, ahịrịabụ nke anọ:

Ọ bụ mmadụ, ọ bụ anụọhịa       ahịriabụ 4

Ọ bụogbenye, ọ bụọgaranya     ahịriabụ 6

A chọpụtara na n’agbanyeghị etu odeabụ siri kọwa olu mkpebi ọjọọ dị n’abụ a, e nwere akpaalaokwu ndị o zipụtara ma gbaa n’anwụ abụghị naanịụdịdị ikuku kama etu ikuku siri dị umeala nke na onye ọbụla na-eketa oke n’ime ya. E nwere o peka mpe akpaalaokwu asaa n’ime abụ a, nke na ha niile na-ekwugide ezi omume, e ji ha zipụta mkpebi maọbụ mmetụta nke odeabụ.

Ọmụmaatụ;

Inye ndụ ga-adị m n’aka

Agaghị m awanye ji m mpụ

Aga m akpara anya m n’aka

Naanị ha ka ji na-erute aka

Ka ekwega-akpọ

Ma ọ bụịbịa mee m aka azụ

Ma ọ bụisiri m ọnya

Adịghị m ama n’ọnya

Odeabụ katọrọ agwa ndịọjọọ mana na-ekpecha ha niihi agwa ha site n’ịbọọbọ wee naghaa ihe ji ndụ mmadụ bụ ikuku. Na ha na-anwụ n’otu n’otu manandị ezi agwa ga-anọ na-ebi ndụ nke ikuku na-enyebiga oke. Ọmụmaatụ:

Nkebiabụ nke atọ, ahịrịabụ nke 7-11

Na-ahụchapụta ndị ome mma

Naanị ha ka ji m ga na-erute aka

Ma ndị ome njọ niile

Ka ekwe ga na-akpọ

Ọ kpọpụ, ọ kpọkwa

 

 

IYOO M

I yiri mmiri ọnụụtụtụ?

E-e!,Ọ na-adịkata gbarụọ

Ị bụzịnụụtụ chara n’ọhịa?

Mba! N’ihi naọ chakarịa ọ daa.

A ga-ejizi gị tụnyere ugo?

Ọ dịghị! n’ihi na ugo na-adịkata rie awọ

Ewo! mmaị mara enweghị atụ,

Ọ bụghị nke na-eme nsachapụ.

Ị bụghịọ mara mma n’ugbene

N’ihi na mma gị zuru oke

O sitere n’isi ruo n’ụkwụ;

Site n’ahụ ruo n’obi

Iyoo m, ị dị sam, i nweghị atụ;

I nwere ọnọdụ pụrụ iche n’ime obi m

 

Abụ a bụ abụ a na-akpọ sọnet nke nwere naanị ahịrịabụ iri na abụọ.Ọ bụ abụ echiche miri emi. Ọ dị mfe nghọta ma n’otu aka ahụ, e nwere mwebata atụmatụụwanrọ. Nke a bụ ezi ọmụmaatụ abụ okwu maọbụ abụịhụnanya. Odeabụ ji asụsụ nka wee zipụtachaa ezi echiche ya, ngwa o jiri mee ntụlekọrịta bụịgba, nsinụụda egwu ọdịnaala na ezi mkpali nke odeabụ ji wee sọpụrụ ma fee onye ọ hụrụ n’anya dị omimi.

Abụ a bụ ezi abụịhụnanya, odeabụ gbara n’anwụ etu o siri hụ “Iyoo M” n’anya nke ukwu.

Ọmụmaatụ: Ahịrịabụ nke atọ;

Ị bụzịnụụtụ chara n’ọhịa

Mba n’ihi na (sic) ọ chakarịa ọ daa

Ewo mma ị mara enweghị atụ         nkebiabụ 7

Ọ bụghị nke na-eme nsachapụ

Nkwusara mere ka abụ a bụrụ abụ dị mfe ma bụrụ atụmatụụwanrọ. Ọtụtụ ajụasaghịna nkwusara dị n’abụ a bụ Iyoo M. N’abụ a, e nwere ihe karịrị nkọwa isii n’ime ya, nke na nkọwa niile ndị a bụ naanị ajụasaghị ebe odeabụ ji wee zipụta mmetụta o nwere n’ebe onye ọ hụrụ n’anya nọ.

Ọmụmaatụ: Lee ahịrịabụ 3,5,9,11,12

I yiri mmiri ọnụụtụtụ? ahịrịabụ 1

Ị bụzịnụụtụ chara n’ọhịa? ahịrịabụ 3

A ga-ejizi gị tụnyere ugo? ahịrịabụ 5

Ị bụghịọ mara mma n’ugbene   ahịrịabụ 9

O sitere n’isi ruo n’ụkwụ         ahịrịabụ 11

Site n’ahụ ruo n’obi                 ahịrịabụ 12

 

Abụ a na-ezipụta na Iyoo M bụọkaibe n’ebe ụmụnwaanyị dịọzọ nọ dịka o siri bụrụ mkpebi odeabụ. Abụ a bụ ezi mmetụta obi siri ike nye odeabụ a niihi na ezi mkpebi o nwerela banyere onye ọ hụrụ n’anya. A hụbeghịụdị abụ a n’abụ Igbo n’ụdịọdịnaala maọbụ abụ kaogeugbu a.

 

Nchịkọta

Site n’inyocha abụ ndị bụ abụ echiche miri emi dị n’agụmagụUche Bụ Afa nke G. O. Onyekaonwu dere. Omenchọcha nwere ikike ikwuputa na G. O. Onyekanwu (odeabụ) sonyere ezi usoro e si ede abụ wee dee Uche Bụ Afa, o wee na-asị; Onyekaonwu bụọkaibe n’isite n’ezi ekereuche ma were asụsụ nka zipụta aka nka edemede ya n’ụdị agụmagụ abụ ederede. Ụdịaka nka a bụ ezi nkamma nye abụọbụla o dere n’Uche Bụ Afa.A sị m kwuo, onyekaọnwụ bụ ejechaaọgwụ n’ide agụmagụ. Abụ niile dị n’ime Uche Bụ Afa bụ ejiamaatụ. Ọ bụrụna edemede abụ bụ nri ewu, Onyekaonwu gbọtara nri ewu ga-eri.

 

 

 

Edensibịa

 

Akwanya, A. N. (Ed). Africa and World Literature. University of Nigeria Journal of Literary Studies, Nigeria: New Generation Books.

Eliot, T. S. (1873). The Metaphysical Poets. Oxford Anthology of English Literature vol. 2, London: OUP

Evans, I. (1979). A History of English Literature. Harmonds-Worth; Penguim.

Fryn, N. (1977). Anatomy of Criticism. Princeton: PUP

Gillie, C. (1992). Longman Companion to English Literature. London: Longman.

Isidore, O. (1983). The Heritage of African Poetry. Hong Kong: Longman

James, R. (1974). The Critical Sense. London: Heinemann

Madubuike, I. (1981). Ịghọta Abụ Igbo. Nigeria: University Press

Murphy, M.J. (1972). Understanding the Unseen. London: Allien and Unwin

Onyekaọnwụ, G.O. (1989). Uche Bụ Afa. Nigeria: Varsity Press

 

 

 

 

ÀKPỌ́ḾÓNWĒÁSỊ̀NÀ ḾGBÁKỤ̀TÁÁZỤ́: Ọ́RỊ́ÁJÍ ÁSỤ̀SỤ̀ NÀ

ÒMÉNÀLÁ ÌGBÒ

 

George E. Ọnwụdiwe, PhD

Ngalaba Amụmamụ Afrịka na Eshia

Mahadum Nnamdị Azịkiwe, Ọka

 

Ụmịedemede

 

Asụsụ na omenala bụ otu n’ihe kacha pụta ihe na njirimara mmadụ na agbụrụ ya. Asụsụ gakwara n’ihu bụṛụ ike mba maọbụ agbụrụ. Mgbe ụfọdụ kwa, asụsụ na-enye mba ọnodụ ịbụ isi n’etiti mba ndị ọzọ dị ka mba Latịn na Griik nọ n’oge gboo; na asụsụ Bekee n’oge ugbu a. Ọtụtụ mba ndị ọzọ dị ka Chaịna na Frans na-agbasikwa mbọ ike ịhụ na asụsụ ha jezuru mba ụwa ndị ọzọ ka ha wee nwee ike isonye n’ọchịchị mba ụwa. N’ihi ọnọdụ dị etu a, asụsụ ndị apụtaghị ihe nọzi ka asụsụ mkpuke, ebe ndị nwe ha nọkwa ka ohu na ndị mbịambịa. Ọtụtụ ndị mmadụ ji ihere na-achụso asụsụ ndị ha hụrụ ka ndị tozuru etozu, na ndị na-enye ugwu; ebe ụfọdụ tụmadụ ụmụaka Igbo danyere n’ịkpa agwa dị etu a n’ihi nne na nna, ndị nkụzi na ndị okenye ha ụfọdụ, ndị na-akụzi ma na-asụrụ ha asụsụ ndịọzọ tụmadụ asụsụ Bekee hapụ nke ha. A gbankịtị gaa n’ihu, asụsụ ndị a ga-abanye n’ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma maọbụ sina ya nwụnyụọ anya. Nchọpụta edemede a gbasara ihe wetere ajọ ọnọdụ a bụ asị ndị Igbo kpọrọ onwe ha nke mere ha ji gbahapụ omenala na asụsụ ha wee na-achụso nke ndị mba ọzọ. Ọ bụzi ọnọdụ ọjọọ dị etu a kpaliri ụfọdụ ndị ọka mmụta na ndị mmadụ na otu dị iche iche, dị ka UNESCO ịkpọwa oku ka ndị mmadụ na agbụru̩ ndị a chezie echiche gbasaraha,ndụ ha na nkwenye ha wee malitekwa ịsụ asụsụ ha na ibi ndụ ka ndị Igbo ha bụ. Edemede a na-esonye n’akpọm oku a site n’ịrụtụ aka n’ihe ọjọọ ndị Igbo ịjụ onwe ha naịgbahapụ asụsụ na omenala ha nwere ike ibute na ihe ndị e nwere ike ime iji gboo nsogbu ndị ahụ.Ọ na-akpọkwa oku mgbanwe na ịcho̩pụtanwo onwe dịka ụzọ ga-adịkarịcha ire n’igbo nsogbu a. Ntụpụta na ntụziaka ndị a ga-abakwara agbụrụ ọbụla nọ n’ọnọdụ ọjọọ dị etu a uru. Ha ga-abakwara ndị nkụzi na ndị ọka n’asụsụ uru n’ọrụ ha; ma bụrụkwa ihe ịgba ume n’ebe ndị ihe dị mma nọ.

 

Ndubanye

Ndị Igbo bụ agbụrụ isi ojii, bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa. Ndị Igbo bụkwa ndị e ji asụsụ Igbo mara dị kạ asụsụ nne na nna ha. Ọtụtụ nkọwa na-ekwu na ndị Igbo sitere mpaghara ọwụwa anyanwụ dị ka Izreel. Ụfọdụ kọwakwara na ndị Igbo sitere mba Ijipt. Nkọwa ndị a dum hiwere isi n’ụzọ obibi ndụ ndị Igbo bụ nke ya na nke mba ndị a yitere (Basden, 1986).

Ekwealor (1998) kọwara ụfọdụ ndị Igbo gboo, di ka ndị Arọ̣chukwu ka ndị riwara anya ma sikwa ike. N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị ọcha bịara ala Igbo n’oge gboo kwenyere na ndị Igbo sitere n’agbụrụ maara ihe nke ukwu. Dị ka Ekwealor (1998:11) si kọwa, nke a bụ “n’ihi ụdị mmepe na awamanya ha hụrụ n’etiti ndị Igbo mpaghara Arọchukwu na Nri n’oge ahụ”. Ọ bụkwa nke a mere nandị Igbo abụghị ndị a na-akpachapụ n’akụkụ n’oge ahụ. Ọ bụladị mgbe ndịọcha chakporo ha anya ma buso ha agha n’agbata afọ 1901 na 1902 iji wube ọchịchị ha, ọ dịghịịrị ha mfe n’ihi na ndị Igbo ji otu nzuzo ha dị ka Ekumeku na ndị Ịzaa na Izii nyụọ ha anya (Ekwealor 1998:17).

Oge a bụ oge mpi ndịIgbo dị̣ elu n’ihi na agbụrụ ndị ọzọ na-ahụta ha dị ka ndị na-eme nke ọma na ndị na-agba mbọ. Na nkọwa ya, Oguejiofor (2004) kwuru na a maara ndị Igbo dị ka ndị na-ekwu eziokwu, ndị na-agbasapụ aka n’imere ụmụnne ha na ndị ọzọ ihe, ndị nche ụmụnne ha, ndị udo, dgz. Oge ahụ bụkwa oge okwu a bụ ‘onyeaghala nwanne ya’ bụ nkwekọrịta ndị Igbo.Onye ọbụla kwenyekwarana ọ bụ ugo gbuzuo ọ chakee, ma na-echikwa ya dị ka echichi. N’eziokwu, a na-ahụ ndị Igbo dị ka ugo bere n’ọjị n’ihe gbasara mmụta, ọchịchị na akụnaụba n’obodo anyị bụ Naịjirịa n’oge ahụ. Onye Igbo ọbụla na-akpakwa nganga na ya bụ onye Igbo.Asụsụ Igbo bụkwa nke e ji nganga asụ n’ebe ọbụla ndị Igbo zukọrọ. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka okwu a bụ na ‘ilu bụ mmanụ Igbo ji eri okwu’ dị ire n’ihi na nwanne na nwanne nọkọọ ha akpaa ihe dịịrị ha, onye ọzọ agaghị aghọta ihe ha kpara.

Ma, elebaa anya na ndị Igbo taa, a ga-achọpụta na ya bụ isi akwa adighịzikwa ebe a rụnyere ya n’ihi ọtụtụ mgbanwe batara n’ụzọ ndụ ndị Igbo, tụmadụ ndị megidere nkwenye ndị Igbo. Nke jọgburu onwe ya bụ na ndị agbụrụ ọzọ ga tụgharịziri na-ajụ ndị Igbo ihe bụ nsogbu ha n’ihi na ya bụ onye bubu ụzọ na-achọzi ikpe azụ. Ụfọdụ kwa na-emere ndị Igbo ebere, ebe ndị ụfọdụ na-eme ha akaje n’ihi ọnọdụ ọjọọ a. Ajọ ikuku a bịara iburu ndị Igbo na asụsụ na omenala ha kpaliri ọtụtụ mmadụ na otu dị iche iche ikpọku ndị Igbo ka ha malie,chọpụtanwoo onwe ha ma buo agha chụpụ ya bụ ajọ ikuku na-achọ ikufu ha. Edemede a so n’akpọm oku ndị a.

 

Nkwenye ndị Igbo na usoro obibi ndụ ha

Ndị Igbo bụ agbụrụ Chukwu gọziri n’ụzọ pụrụ iche. Dị ka nchọpụta ndị ọcha bịara be anyị n’oge gboo mere, ndị Igbo maara ihe. Ha gbasikwara ike bịa bụrụ ndị na-agba mbọ.

Nkwenye ndị Igbo bụ na ‘aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ’. Ọ bụ ya mere na ha malitere n’oge dọwa àkànyà. Dị ka agbụrụ Chukwu gọziri na mbụ, ala ha na-emepụta ihe oriri ebe ọ dị ukwu nke mere na ha bụbu ndị ọrụ ugbo ma sikwa n’ihe ndị ha na-enwete n’ọrụ ugbo na-azụezinaụlọ ha ma na-egbokwa mkpa ndị dịịrị ha. Ọ bụ ka ọba ji onye Igbo ha ka e ji agbakọ ka ọgaranya ya ha. Ya mere ji jiri bụrụ isi erimeri na akụ ha ji agbanwerịta ngwa ndị ọzọ ha chọrọ.

E wepụkwa ọrụ ugbo, ndị Igbo na-adọ àkànyà site n’ụzọ ndị ọzọ dị ka ịkụ azụ, ịgba nta, ije ‘agha ngo’ (dị ka ndị Abam na mpaghara Ọhafịa). Ndị Igbo na-arụkwa ọrụ nka dị iche iche dị ka ịkpụ ụzụ, ịkpụ ite, ịwụ ihe ọwụwụ, ikwe akwa, ịtụ ihe, mbịa dibịa, dgz.

Ihe ndị a niile mere na ndị Igbo adịghị ada ngana. Ha adịghịkwa anapụ mmadụ ihe n’efu. Ha ejighị ịrịọ arịrịọ mere akaọrụ,kama ọ na-eme ha ihere ma na-ewute ha mgbe ha dabara n’ihe ọbụla ga-eme ka ha baa n’ịrịọ arịrịọ.

Ndị Igbo bụkwa ndị na-eme ihe n’usoro dị ka omenala ha si dowe ya. Nke a na-apụta ihe n’omenala ha dị ka alụmalụ, ịgụ nwa aha, ịmụ na ịzụ nwa, mmemme ntopụta, abamaba, dgz. Usoro a na-agbaso mgbe a na-eme mmemme ndị a so n’ihe ndị mere na ndụ ndị Igbo, tụmadụ n’oge gboo na-aga n’usoro a haziri ahazi.

Ihe ọzọ dị mkpa na nkwenye na usoro obibi ndụ ndị Igbo n’oge mbụ dị ka Onwudiwe (2012) rụtụrụ aka na-egosị: “E nwekwara nsọpụrụ na nrube isi ebe ha pụtara ihe. Ụmụntakịrị na-ekele ma na-enyekwa ndị okenye na ndị chiri echichi ugwu na nsọpụrụrubeere ha n’obodo”. Ọnọdụ dị etu ana-akwalite ọṅụ ma na-ewetere ụmụaka na ndị mmadụ ahụ ofufo nke na-aga n’ihu na-ewete agamnihu.

Gbasara ọchịchị, Isichei (1974) kọwara na ndị Igbo nwere usoro ọchịchị ọnụ na-eru onye ọbụla n’okwu. Na nkọwa ya, nke a bụ n’ihi na ha na-achịkwa onwe ha n’obodo n’obodo, ọ bụghị dị ka agbụrụ ụfọdụ dị ka Yoruba na Bini. E leghị anya, ọ bụ nke a mere ọtụtụ ji asị na ndị Igbo enweghị eze n’oge gboo. Ma, Afigbo (1981) hụtara usoro ọchịchị ndị Igbo n’oge gboo dị ka nke dị ụzọ abụọ ochịchị ọhanaeze na ọchịchị ndị Eze.

Etu ọ dị, ndị Igbo na-achịkwa onwe ha nke ọma ebe ọ bụ na udo na ị sọpụrrụ iwu nwere ọnọdụ n’usoro obibi ndụ ndị Igbo n’oge gboo. N’ezinaụlọ dị iche iche, dibiụlọ nwere ugwu na nsọpụrụ dị ka onyeisi ezinaụlọ; ndị Nze na Ọzọ nwekwara ọnọdụ dị elu na nke nwere nsọpụrụ. N’oge ahụkwa, ndị Igbo na-efe ma na-asọpụrụ Chukwu n’ebe ọ dị ukwu. Eziokwu na egwu Chukwu bụ nke onye ọbụla na-agbaso n’ihi na ha kwenyesiri ike na onye mee ihe ọjọọ Agbara ataa ya ahụhụ.

Ịgba mbọ ndị Igbo n’oge gboo mere ha ji ejepụ ejepụ ịchụta akụnaụba. Site na mbịa dibịa, azụmahịa, ọrụ nka, agha ngo dị ka akaọrụ na ịgba mbọ ndị Igbo, ha na-ejepụ ejepụ jee mba dị iche iche, ebe ha na-ezutekwa ụdị mmadụ na omenala dị iche iche. N’ụzọ dị etu a, ha na-amụta ọtụtụ ihe site n’aka ndị̣ ha na-ezute n’oge ndị a. Ụfọdụ kwa, dị ka Olauda Equiano sitere na mgbere ohu a gbara ha jepụ, mụta ihe ma were ihe ha mụtara lọta ala Igbo.

N’oge ndị a anyị na-arụtụ aka, ọ pụtaghị na ihe ụwa gbara ka ute n’ihi na e nwegara ihe ụfọdụ ndị a na-eme na-adịghị mma, dị ka ịgba mgbere ohu, osu, igbu ụmụ ejima, ịlụ agha, dgz. Ma ọtụtụ ihe ndị ahụ ha na-eme bụ maka na omenala ha kwadoro ha n’oge ahụ. Ha adịghị akpachara anya eme ha iji megidemmadụ. Ma ọ bụrụgodụ na onye ọbụla emee ihe ọbụla n’ụzọ arụrụ ala, dị ka izu ohi, ọ na-ezo ezo were eme ya n’ihi na ọmaara na aka kpara ya ọ taa ahụhụ. Dị ka Onwudiwe (2012:3) si gaa n’ihu kọwaa:

A na-akpa mmadụ n’oge ahụ, ma ọ bụkarị ndị na-eme ihe ọjọọ n’obodo na ndị isiike ka a na-akpara refuo na mgbere ohu. N’uche ha, nke a bụ iji kpocha obodo ma wepụ ndị ọjọọ n’ime ya.

 

Oguejiofor (2004) rụtụrụ asụsụ Igbo aka dị ka ihe na-echekwaba omenala na mmepe, ma bụrụkwa ihe e ji ebufe omenala n’aka ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo na agbụrụ ọbụla na-ehiwe asụnke ha maka mmekọrịta na ọdịmma ya, ya na iji na-ahafe omenala ya n’aka ọgbọ na-eso n’azụ (ihu 3). O kwukwara na ụfọdụ okwu ndị a dị ire ma na-eduzi ndị Igbo n’inwete ihe ndị ha na-achọ n’oge gboo. Gbasara echiche a, o kwuru na e nwere nzọụkwụ atọ dị na mbọ mmadụ na-agba na ndụ; ya na asụsụ na-anụcha nzọụkwụ nke ọbụla iji bịa na mmezu site n’ịtụpụta okwu njali na-akwagide nke ọbụla. Nke a sonyere na nkwenye Coupland (2007:126) ebe ọ na-adọ aka na nti ka mmadụ ọbụla ghara ileghara okwu ọbụla anya n’ihi na okwu ọbụla dị ire ma nwee ihe puṛụ iche ọ na-arụ mgbe ọbụla e kwuru ya.

Okwu njali ndị a, dị ka Oguejiofor (2004:6-7) si kọwa ha bụ:

 

  • “Nke m akọna m”: Na nkọwa ya gbasra okwu njali a, o kwuru na mgbe onwe onye Igbo juru ya afọ, o nwere ike ịgwa onye Igbo ibe ya okwu dị ka ndị a: “E si be gị aga be onye?, I na-achara m moto?, Ị na-enye m nri?” O kwukwara na okwu ndị a na-ajali onye ahụ n’ụdị ọ gaghị ama na ọ na-enye ya ume iji bagide ihe ọbụla chere ya n’ihu ma durue ya na nnwezu nke ihe ọ na-achọ
  • “Onyeaghananwanneya”: Okwu a bụoku ndị Igbo na-akpọ ibe ha dị ka nkwekọrịta sitere n’omenala na nkwenye ha na onye ọbụla ga-akpọro nwanne na-aga, tụmadụ mgbe ihe na-agara ya nke ọma. Ọ bụ oku a mere na mgbe gboo, onye Igbo hụ ihe ọbụla dị ka ọrụ na ahịa na-aga nke ọma, ha na-akpọrọ nwanne ha tinye na ya. Omume dị etu a na-enye onye Igbo gboo ọnọdụ dị elu n’obodo. Dị ka Oguejiofor (2004) gara n’ihu kwue, e nwere okwu njali ndị ọzọ na-akwara onyeaghananwanneya mma. Ha gụnyere oku ndị a: “nwanneamaka”, “nwanne ozu na-awụ ozu ahụ”, “nwanne na-ebu ebe ọ ka njọ”. Okwu Igbo ndị a niile na-arụtụ aka n’ịdị n’otu na ezi mmekọri̩ta.
  • “Akụlueụnọ”: Nke a bụ oku ọzọ na-ajali nwaafọ Igbo ọbụla ghọtara na ọ bụ naanị mgbe mmadụ weruru akụ ọ kpatara n’ụlọ ka a na-enye ya nsọpụrụ na ọkwa dị elu n’obodo. Ọ bụkwa naanị onye mere nke a ka a na-echi echichi, ọ bụghị onye akụ ya tọrọ na mba. Ọ bụ naanị akụ ruru ụlọ ga-abara ụmụ Igbo uru.

 

E lee anya na ndụ ndị Igbo n’oge gboo, obi ga-abụ nwaafọ Igbo ọbụla naanị aṅụrị n’ihi na ọ bụ onye na ndị agbụrụ a maara dị ka ndị na-eme nke ọma, ndị udo, ndị na-agba mbọ na ndị ọdịmma nwanne ha na-amasị. Ọ bụ nke a mere Oguejiofor (2004) jiri kọwa ndị Igbo gboo dị ka ndị agbụrụ ndị ọzọ ji ịgba mbọ na ezi ihe mara nke mere na ndị Naịjirian’oge ahụ na-ahụta ha dị ka “ugo belu n’ọjị” n’ihe gbasara mmụta, ịchụ nta akụnaụba na ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ kọwakwara oge ahụ dị ka oge ndị Igbo nwere ugwu ma jiri nganaga na-aga. Dị ka o sigaa n’ihu, ọ bụkwa mgbe ilu Igbo bụ mmanụ e ji eri okwu. Ọ bụ ụdị ndị Igbo ana usoro obibi ndụ ha ka Chinua Achebe kọwara n’ọtụtụ akwụkwọ ya, ndị dị ka Things Fall Apart, There Was A Country, dgz.

 

Ụzọ ndụ ndị Igbo taa

Akụkọ gbasara ndụ ndị Igbo taa, tụmadụ ka o si metụta asụsụ na omenala ha bụ ihe na-agba anya mmiri. Ọ bụ nke a wetere Oguejiofor (2004) ji kwa arịrị sị na ọ bụ ihe mwute na ọ dị ka ndị Igbo adịghị esonyezi n’ụkpụrụ ndị gboo tọọrọ ha site n’ịhapụ njirimara Igbo ka o fuo. A gbahapụla ihe ndị na-eduzi ndi Igbo gboo ime ihe n’usoro na ihe dị mma. Ka ọ dị taa, ndị Igbo ejizighi omenala ha bụ njirimara ha kpọrọ ihe ọbụla. Ọ kọwakwara na ndị Igbo taa akpụtọọla asụsụ Igbo bụ ihe na-agbazi ụzọ ndụ ha. Oguejiofor kwara arịrị na ndị Igbo taa ji asụsụ Igbo egwu egwu. Dị ka o si zipụta agwa ọjọọ a, o kwuru na ọtụtụ ndị Igbo na-eche na ha maara ihe adịghị amapụtara ụmụ ha ohere ịsụ asụsụ nne na nna ha nke bụ asụsụ ga-akụziri ha amamihe dị ka ụmụafọ Igbo. Ndị dị etu a na-eduhie ụmụaka ndị ha na-akọwara okwu Bekee n’ụzọ na-adabaghị.

Taa, o doro onye ọbụla anya na ndị Igbo na-ejizi asụsụ Bekee akọwa asụsụ nne na nna ha. Nke a mere naihe ọbụla a sụrụ n’asụsụ Bekee na etu ọbụla e si sụ ya, ha ga-achọ ka e sikwa etu ahụ sụọ ya n’Igbo. Nke a so n’ihe e ji asụ ihe ndị dị ka ‘Ụtụtụ ọmạ’ karịa ‘ị bọọla chi’ maọbụ ‘ị pụtakwara ụra’, bụ ekele ndi Igbo nabatara. Ọtụtụ ndịIgbo na-ekwukwa na asụsụ Igbo ezughị ezu. Igwe kọmputa anapụla ọtụtụ ndị Igbo taa uche n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-akpazi agwa ka ndị mba ọzọ. Ndị gọọmentị n’akụkụ nke ha pụtara ihe na mbọ igbu asụsụ Igbo taa. Nke a pụtara ihe na mwepụ e wepụrụ asụsụ Igbo n’asụsụ nwaafọ Igbo ga-agụ n’ụlọakwụkwọ ma kwado na onye agụghị asụsụ Bekee agụghị akwụkwọ. Ọ bụ mwute agwa a gọọmentị kpara megide asụsụ Igbo mere Anigbo (1992) ji kwuo na ọ bụrụ na asụsụ ndị bụ ngwa na-ezipụta ebumnobi ya, na ụta dị egwu ga-adị n’isi ndị ọchịchị wepụrụ asụsụ agbụrụ ndị n’asụsụ a ga na-amụ n’ụlọakwụkwọ.

 

Ndị Igbo na asụsụ na omenala ha n’oge ugbu a

Otu n’ihe na-ewete mgbanwe na ndụ na akparamamgwa mmadụ bụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ndị Igbo bụ otu agbụrụ na-ejepụ ejepụ dị ka e kwurula n’elu. N’otu aka ahụ, ha na-anabata onye ọbịa nke ọma. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-amụrụ ihe ndị ahụ na-eme. Mgbe ụfọdụ kwa, ha amụrụ ihe ndị na-adịghị mma tinye. Ihe ọzọ wetere mgbanwe n’usoro ndụ na nkwenye ndị Igbo bụ ọbịbịa ndị ọcha, nke bu usoro ọchịchị ọhuụ, usoro ekpemekpe ọhụụ, usoro achụm nta akụnaụba ọhụụ, usoro ejiji ọhụụ, ụdị nri ọhụụ na agha Naịjiria.

Ihe ndị a wetere mgbanwe dị iche iche, tụmadụ n’echiche, nghọta, akparamaagwa na nchịkwa ndị Igbo. Ha wetere mmepe, ma ndị edofọghị ahụ. Ọ bụ n’oge ahụ ka anyị nọ ugbu a. Oge ahụ wetere mmepe n’ụzọ azụmahịa na mmepụta ngwa ahịa. Oge a abụchazighi oge e ji anya agwa mmadụ okwu, ọghọta ya ozigbo n’ihi na echiche na amamihe ọtụtụ ndị Igbo aghọọla akụrụakụ. Ọ bụzi malite n’oge a ka ndị Igbo bidoro kpọwa onwe ha asị. Ebe mbụ ha buuru akpọmaasị a banye bụ n’asụsụ na omenala ha. Ha malitere jụwa onwe ha site n’ikwutọgharị ọnụ gbasara asụsụ Igbo. Ọtụtụ bidoro sụwara ụmụ ha asụsụ Bekee; ụfọdụ na-agwakọ asụsụ Bekee na asụsụ Igbo, ebe ọtụtụ kwusịrị iziga ụmụ ha n’ụlọakwụkwọ ebe a na-asụ asụsụ Igbo. Ejiji wee banyezie na nke ndị akwụna na nke ndị ara. Nwanyị amakwaghị na ọ bụ nwanyị ma n’ejiji ma n’akparamaagwa. Ha wee sote sodo ndị nwoke, tụmadụ ndị di ha. Ezinaụlọ na obodo wee na-agba aghara – a kpọọ ya mgbanwe so mmepe. Nke a bụ mgbe Igbo malitere gbuwe onwe ha mma n’ọkpa nke malitere ịba ọnya wee na-achọzi irejipụ ya ọkpa taa.

Agha Naịjiria butere nkewa, akpọmasị na mmegbụ n’etiti ndị Igbo na ndị mpaghara ala Naịjiria ndị ọzọ, tụmadụ ndị mpaghara ugwu. Nke ka nke bụ na o webatara nkewa na esemokwu n’etiti ndị Igbo n’onwe ha n’ihi na ọtụtụ sitere n’ihe isi ike nke oge agha gọnahụ ma mejọọ ụmụnne ha na ikwunaibe ha. Ọ bụ ụdị agwa dị etu a ka Tony Ubesie zipụtara n’akwụkẉọ Isi Akwụ Dara n’Ala, tụmadụ na mmekọrịta Ada na di ya bụ Chike. Ma n’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ka nọsi ike bụrụ ndị Igbo, n’echiche na n’omume, Chike zipụtara n’ebe ọ dị ukwu n’Isi Akwụ Dara n’Ala.

N’oge a zi, ụfọdụ ụmụafọIgbo malitere ịchụ nta akụnaụba n’ụdị ọ chaa sị gbute, ọ chaghị sị gbute. Nke a mekwara ka a malite nyowe ọtụtụ ndị Igbo enyo. Ugwu na nsọpụrụ ndị Igbo malitekwara kpụwa afọ n’ala. Ọtụtụ ụmụafọ Igbo jere mba ofesi ghọrọziri ndị a na-eze eze, ebe ugwu na nsọpụrụ e jibu mara ndị Igbo gara n’ihu na-aṅachapụ; a na-ahụtazi onye Igbo dị ka ọkpa atụrụ n’etiti ya na ndị mmadụ ndị ọzọ. Ọ bụ ọnọdụ dịetu a ka Maduka (1978) lechara anya wee bee akwa sị na ndị be anyị bụ ndị Igbo na-achọzi ịhapụ ndị ha bụ na mbụ ghọzie ndị e nweghị ndị e ji aka ha bụ.

Omenala Igbo ketakwara oke n’ajọ ikuku a malitere iku n’ihi na ọtụṭụ ihe mmadụ anaghịzi agbaso usoro ndị Igbo si eme ihe. Ọtụtụ na-eke nwa ha nwanyị di na mba, ọ kachasị mba abụghị ala Igbo. Ndị ntorobịa malitere na-efe nne na nna ha na ndị okenye aka n’ihu. O nwekwaghị onye na-asụ asụsụ Igbo n’olu Igbo, ebe ụfọdụ na-agbaso ihe asụsụ Bekee nyere were asụ, na-akọwa ma na-aghọta asụsụ Igbo. Onye ọbụla malitere ịmụ na ịsụ asụsụ ndị ọzọ dị ka asụsụ Bekee, na kwa rịị asụsụ Awụsa na Yoruba. ̣Ịsu̩ asụsụ Igbo ghọzie a maghị ihe, ebe ndị eze ọdịnala sokwu asụ asụsụ Bekee n’o̩gbakọ ha na nke ha na ndị ha na-achị. Ihe ndị a wetere ndaghachi azụ n’ebe asụsụ Igbo di, nke na amaliteziri gbakeriwe ala etu a ga-esi zọpụta ya n’ọnwụ nke ndị Igbo ji aka ha butere asụsụ ha.N’akụkụ ekpemekpe, e jighizi ekpemekpe ọdịnala aka, ebe ụfọdụ ji ekpemekpe ọgbaraọhụụeme ndị mmadụ o ji anya a hụ ụzọ.

 

Ụzọ mweghachi ezi ọnọdụ asụsụ na omenala ndị Igbo

Ọ bụ eziokwu na ihe adịla njọ nnukwu, ma naanị ihe a gaghị enwe mmekwata bụ ọnwụ. Mbụ bụna ndị Igbo ga-ebugodu ụzo kwete na ihe na-eme ma ha, ma asụsụ ma omenala ha si ha n’aka.Nke a pụtara mmadụ ịghọta onwe ya wee chegharịa. Nke a mere Osita Agwuna (n.d) ji kwuo hoo haa na ụmụafọ Igbo gụrụ akwụkwọ ndị na-akpaso asụsụ Igbo ajọ agwa dị mwute. Ọ kpọziri oku ka ha nwee mmenwo ọhụụ n’ebe ọdịnala ha dị. Oku a Osita Agwuna na-akpọ bụ isiokwu n’ebe nsogbu asụsụ na omenala Igbo dị n’ihi na onye amaghị ebe mmiri si mawa ya agaghị amakwa ebe ọ nọ kwụsị.

Ụmụ Igbo ga-eleghachikwa anya azụ gụrụkwa omenala ha n’ihi na omenala ndị bụ ndụ ha. Ha kwesịrị ịghọta na onye jụrụ onwe ya bụ onye nwụrụ anwụ. Ha ga-elekwasa anya na ndụmọdụ Oguejiofor (2004) dụrụ na nkọwa Coupland (2007) ndị na-ekwusi ike na nkụ dị na mba bụ ya ga-eghere ha nri. Asụsụ Igbo ga-ekwu maka ndị Igbo na ndụ ha, ọ bụghị asụsụ ọzọ ga-eme ya.

Ọ dị mkpa na ụmụafọ Igbo ga-echigha, bagidekwa echiche ndị a bụ onye aghala nwanne ya, akụ ruo ụlọ na nkemakọla m, ndị bụ okwu Igbo ji abagide agbam mbọ ha. Nke a pụtakwara onye Igbo ịdị na-ekupụta ume ndụ ndị Igbo nke bụ mmụọ mmeri ndị Igbo.

Ọzọ, nwaafọ Igbo ọbụla ga-ebelata tigbuo zọgbuo na mbọ achụm nta akụnaụba. Ka ha wepụkwa mmegbu n’ụzọ abụla ụzo.

Ndị Eze ọdịnala ga-abụ ezi ndị nnọchiteanya, ghara ịbụ ndị ga na-akpa agwa a ga-eji na-akọ ndị Igbo ọnụ. N’otu aka ahụ ka ụmụafọ Igbo kwụdosie ndị ọchịchị ha ike n’azụ. Ndị Igbo ga na-ejikọ aka na obi ọnụ were na-ewepụta ndị ọchịchị na ndị ga na-anọchite anya ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị jikọtara anyị na ndị ọzọ n’ala anyị.

Ndị Igbo ga-agbanwe omume ha n’ebe onwe ha na asụsụ na omenala ha dị, ma nwee ịhụnanya n’ebe onwe ha na asụsụ na omenala ha dị n’ihi na ọ bụ ajọ ihe mmadụ ịkpọ onwe ya na ihe o nwere asị. Ọ dịkwa mkpa ka ha mata na asụsụ bụ ike mba. Ọ bụ ya kpatara mbaụwa ndị dị ka Briten, Amerịka, Frans, Jamini, Chaịna ji ebuwe asụsụ ha ụzọ, ma mee ya iwu na onye ọbụla chọrọ mmekọ ha na ya, maọbụ chọrọ inwete ihe ọbụla n’aka ha ga-amụrịrị asụsụ ha.

N’ikpeazụ, ndị Igbo ga-amata na ha bụ agbụrụ Chukwu gọziri. N’ihi ya, ha kwesịrị iji amamihe na ike Chineke nyere ha na-eme ihe bara uru, hapụ mpụ, ohi, ntọ na ajọ omume ndị ọzọ ha na-eche bụ ịgba mbọ ka ha wee gbanahụ iwe Chineke wee nweteghachi ọnọdụ Chineke dewere ha.

 

Mmechi

Na mmechi, ndị Igbo bụ agbụrụ zuru oke dị ka ndị ọzọ. Ha nwere ihe niile ndị ọzọ nwere. Ma nke kacha bụ na ha dịbu na mbụ bụrụ ndị maara ihe na ndị a na-asọpụrụ n’ụwa. Ma akpọmonweasị batara n’etiti ha wee napụ ha ihena ọnọdụ Chineke nyere ha. Nke a meziri ha ji gbanwe site na ndị na-enye enye na-aghọ ndị a na-enye enye. Ha sitekwara na ndị a na-ekiri ekiri bụrụzie ndị bịara nkiri. Ọzọ, ha sizi n’ọnọdụ ndị na-ekwu ihe na-eme ghọzie ndị oje ozi.

Asụsụ na omenala Igbo sobu n’asụsụ a ma ama na Naijirịa na asụsụ a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ga. Ma n’ihi nleghara anya na akpọmonweasị asụsụ Igbo sozi n’asụsụ a na-agbara izu ma na-echeta n’ekpere ka ọ ghara ịnwụ. Nke a abụghị ka Chineke si dewe ya n’izizi.

Iji nweteghachi ọnọdụ rubeere ndị Igbo, ndị Igbo ga-achọpụtanwe onwe ha wee chegharịa ma chigharịa n’ọnọdụ Chineke deweere ha. Ha ga-ahụ onwe ha, asụsụ ha na omenala ha n’anya.

 

 

Edensibịa

 

Achebe, C. (1958) Things Fall Apart. London: Heinemann Educational Books.

Afigbo, Adiele (1981) The Ropes of Sand. Nsukka: University Press

Agwuna, Osita (N,D.) Igbo, a Language and a People. Onitsha: Pioneer Printing Press.

Anigbo, O. A. C. (1992) Igbo Elite and Western Education. Onitsha: Africana Fep Publishers

Basden, G. T. (1982) Among the Ibos of Nigeria. Onitsha: University Publishing Company.

Coupland, Nikolas (2997) Style: Language Varietion and Identity. Cambridge: University

Press.

Ekwealor, C. C. (1998) Omenala Na Ewumewu Ndị Igbo. Onitsha: Palma Publishing & Links.

Isichei, Elizabeth (1976) A History of the Igbo People. London: Macmillan Press.

Oguejiofor, Umeadi C. (2004) “Ndi Igbo and Their Language and Culture: How Far, So Far”.

Paper presented at the Seminar Organised by the Department of Afrcan Languages of Nnamdi Azikiwe University, Awka.

Onwudiwe, G. E. (2012) “Anya Ruo Ụlọ: Akpọoku Nwaamala Igbo Ọbụla Aghaghị

Ịza”.Akwụkwọ Ngụpụta na Mmemme Nnata na Mmechi Afọ Ndị Anambara.

Ubesie, Tnoy Uchenna (1973) Isi Akwụ Dara N’Ala…Ibadan: Oxford University Press.

 

 

 

 

 

 

 

 

NTỤCHA OKWU NJIRIMEE DỊ KA O SI METỤTA OKWU NNE GWARA NWA YA NA-AGA BE DI ỌHỤỤ

 

 

Nke

 

IBEH, FLORENCE UJU

Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia

Fakọlti Nke Aatị

MAHADUM NNAMDỊ AZIKIWE, ỌKA

 

Ụmịedemede

Nchọcha a bụ na ntụcha okwu njirimee dịka o si metụta agwa atọ okwu njirimee nwere n’ọrụ asụsụ nke bụ agwa nkwupụta ekwumekwu, agwa nke ọnụnụ na agwa adịmire nsinekwumekwu. Mbunuche nchọcha a bụ iji agwa atọ ókwú njirimee nwere n’ọrụ asụsụ wee tụlee okwu nne gwara nwa ya na-aga be di ọhụụ ma ịghọta ihe òkwú ókwú bu n’uche mgbe ọ na-ekwu okwu bụ nzikọrịta ozi. A gbasoro atụtụ okwu njirimee nke John L. Austin (1962) tụpụtara wee mee nchqchq a. Mgbe okwuu na-ekwu okwu, o nwere ihe o bu n’uche ọ chọrọ ka ọ gwa ọnụụ nke q ga-eji xzq nzikqr[ta ozi d[ mma wee mee. Onye amaghị ezikọrịta ozi na-etinye mgbagheri anya na nkafe n’ebe ọnụụ nọ. Okwu njirimee wee bụrụ ihe e wepụtara iji tụchaa okwu e kwuru ekwu na etu o si metụta agwa onye kwuru okwu na onye ọ na-agwa. A chọpụtara na usoro njirimee niile ndị a pụtachara ihe n’usoro mkparịtaụka dịka iji mejupụta ebumnuche onye na-akpa nkata. Ntụmanya okwuu nwere ike ịbụ ntimiwu, arịrịọ, nkwa, ajụjụ, ekele na izi ozi n’ebe ọnụụ nọ. Na mmechi, ọ bụrụ na ndị mmadụ amụta etu e si eji okwu njirimee akparụtaụka, ọ ga-akwalite mmekọrịta na nghọta n’etiti ndị na-asụ asụsụ Igbo. Ọzọ bụrụ na amụmamụ a ga-aba uru n’ọdịnihu makana ọ ga-abụ ebe mgbakwasa ụkwụ nye ndị ga-eme nchọcha n’ihe gbasaara isiokwu a iji wepụta akụkụ okwu njirimee ndị ọzọ apụtaghị ìhè na nchọcha a.

 

Mkpọlite

Ịghọta mbụnuche onye na-ekwu okwu bụ ihe kacha mkpa n’usoro nzikọrịta ozi. Nzikọrịta ozi bụ ihe na-ewulite mmekọrịta site n’iwepụta mpụtara echiche onye na-ekwu okwu ma mezie ka ya na nke ọnụụ dabaa. Ime ka nghọta dí̩ na nzikọrịta ozi na iji nghọta dí̩ na nzikọrtịta ozi ahụ rụọ ọrụ bụ ọrụ amụmamụ na asụsụ ndịnọrụ. Amụmamụ ndoko ahịrịokwu dị iche na nke okwu njirimee.

Na mbụ, e kwewara amụmamụ asụsụ ụzọ abụọ, amụmamụ usoro okwu na amụmamụ mkpụrụ ụdaasụsụ. Usoro okwu a lebara anya na ndokọ mkpụrụokwu na ahịrịokwu. Amụmamụ mkpụrụ ụdaasụsụ lebara anya na ndoko mkpụrụ ụdaasụsụ. Ihe kpatara na amụmamụ ndị a apụtaghị ihe bụ na Chomsky na ndị otu ya kwenyere na ihe ka mkpa n’asụsụ bụ onye nwe asụsụ ahụ ịma asụsụ ya nke ọma maka ya ka e ji leghara amụmamụ asụsụ lebara anya na nghọtaokwu na ndị ọzọ anya. Ihe butere nleghara anya e leghaara amụmamụ nghọta okwu bụ maka mgbagwojuanya ha nwetera na etu a ga-esi mụọ ya ka o wee doo anya. Ma e mechara ndị ọkammụta n’amụmamụ sayensị asụsụ hụrụ mkpa ọ dị iwe amụmamụ a dịka otu ngalaba n’amụmamụ sayensị asụsụ. N’oge ahụ ka e webatara ya dị ka otu ngalaba n’ime amụmamụ ndị ọzọ e ji amụ sayensị asụsụ.

Amụmamụ nghọtaokwu bụ ngalaba sayensị asụsụ na-amụ maka nghọta mkpụrụokwu na ahịrịokwu. Mbah (2013) na ndị otu ya kpọrọ ya amụmechiche. Amụmamụ nghọtaokwu dị ka a kọwara bụ ihe siri ike nkọwa. A hụtara amụmamụ nghọtaokwu n’asụsụ n’ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ nke na-akọwa na tupu a mata ihe bụ echiche ihe ọbụla n’asụsụ, a ga-achọpụta ihe ya bụ echiche na-arụgara aka, ebe nke abụọ bụ nke na-akọwa na mpụtara ihe bụ ihe na-agbata mmadụ n’uche mgbe a kpọtụrụ ya bụ ihe aha. A hụtara echiche abụọ n’ime atụtụ nrụgara aka na nke atụtụ nsinụbụrụ. Atụtụ nrụgara aka nke Ogden na Richard tụpụtara na-akọwa na echiche ihe bụ ihe ihe ahụ na-arụgara aka. Ọmụma atụ echiche ‘nkịta’ bụ ụdị anụmamụ nke okwu a na-arụgara aka. Mana atụtụ a riri mperi makana ụfọdụ ndị ọkammụta kwuru na ọ bụghị okwu niile nwere ihe ọ na-arụgara aka. Ọmụma atụ: ịhụnanya, ekele, nzuzu, ḿmā d.g.z. enweghị ihe ha na-arụgara aka mana ha nwere echiche n’ebe okwuu na ọnụụ nọ.

N’aka nke ọzọ, atụtụ nsinechiche bụ atụtụ nọchiri atụtụ nrụgara aka maka mperi ndị ọkammụta kwuru na oriri. Ihe atụtụ a bụ nsinechiche na-akọwa bụ na mpụtara ihe bụ ihe na-agbata mmadụ n’uche mgbe a kpọtụrụ ya bụ ihe aha. Atụtụ a weghara mkpụrụokwu ndị ahụ dị   ka ‘ịhụnanya’ nke atụtụ nrụgara aka akọwanwughị dị ka ihe e nweghị ihe ọ na-arụgara aka mana o nwere echiche n’ụbụrụ mmadụ mgbe ọbụla a kpọrọ ya aha n’etiti okwuu na ọnụụ. N’agbanyeghị inye aka na ịkọwa ọtụtụ ihe atụtụ nrụgara aka enweghị ike ịkọwa, atụtụ a rikwara mperi nke ya. Mperi o riri gụnyere na mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa anaghị enwe otu enyo nghọta nye okwu ọbụla. Ọzọ kwa, o nwere okwu ụfọdụ n’enweghị enyo uche ọbụla ndị mmadụ na-aghọta dịka ‘chi’, mamịwọta d.g.z. ndị nwere nghọta mana ọ dịghị mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa na-enwe otu enyo nghọta banyere ha. Ebe a na-agba mbọ ịchọpụta ụzọ ka mma a ga-esi gbochie mperi atụtụ abụọ ndị a bụ atụtụ nrụgara aka na atụtụ nsinaechiche riri ka ndị ọkammụta nọ kọwaa na echiche mkpụrụokwu na ahịrịokwu nwere n’amụmamụ sayensị asụsụ adịghị oke mkpa kama ọ bụ ihe okwuu bu n’uche na ọnọdụ o ji kwuo ya bụ ihe ka mkpa. Dị ka Iloene (2008) si kọwaa na ọ bụ akwụkwọ Austin a kpọrọ “Ka E si Eji Mkpụrụokwu Eme Ihe” na nke Searle bipụtara ka e si bido mụba amụmamụ echiche dị ka iji kọwaa nzikọrịta ozi. Nke a bụtere e ji webata atụtụ amụmamụ okwu njirimee. N’ebe a ka e si tụpụta amụmamụ ọzọ na sayensị asụsụ ọrụ ya bụ ịchọpụta usoro na ọnọdụ e ji kwuo okwu na ụbụbọ nke a kpọrọ asụsụ ndịnọrụ.

Nchọcha a hidoro isi n’iji okwu njirimee nke Austin (1962) wepụtara maka agwa atọ n’ọrụ asụsụ bụ nkwupụta ekwumekwu, agwa nke ọnụnụ na agwa adịmiire nsinekwumekwu wee tụlee okwu nne gwara nwa ya na-aga be di ọhụrụ.

 

Nkọwasị Okwu

Okwu Njirimee

Okwu njirimee dị ka Ndimele (2007) kọwara bụ nke Austin (1962) na Searle (1968) wepụtara. Na nkọwa ya, okwu njirimee bụ asụsụ e ji emepụta ihe nhụrụ n’anya. O kwuru na na otu ụzọ n’ọkpụrụkpụ ọrụ okwu njirimee na-arụ bụ ịtụcha ọrụ okwu e kwuru ekwu na-arụ na agwa onye a gwara ya na nkata ha abụọ na-akpara onwe ha.

Atụtụ okwu Njirimee nke Austin (1962) dị ka Ogbulogu (2005) si kọwaa bụ atụtụ nke na-akọwa ọrụ okwu e kwuru na-arụ na mgbanwe agwa ndị na-akpa nkata na mwulite mmekọrịta dị n’etiti ha. Ọ kọwara na ọ na-egosi ihe okwuu bu n’uche na ihe ọ chọrọ ka o mee n’ebe ọnụụ nọ. Dị ka ọ kọwara, mwere n’okwu njirimee bụ na okwu ọbụla e kwuru ekwu nwere ọrụ ọ na-arụ dị ka ọnọdụ e ji kwuo ya si wee dị.

Syal na Jindal (2013) kọwara na e nwere agwa atọ n’okwu njirimee. Agwa atọ a gụnyere; nkwupụta ma ọ bụ ekwumekwu, agwa nke ọnụnụ na agwa adịmiire nsinekwumekwu dị ka Austin (1962) na Searle (1968) si tụpụta.

N’ịkọwa agwa atọ ndị a dị ka Ndimele (2007) si kọwaa bụ:

  1. Agwa nkwupụta ma ọ bụ ekwumekwu: Nke a bụ mgbe okwuu kwupụtara ebumnuche ya ka onye ọ na-agwa nụ olu ya.
  2. Agwa nke ọnụnụ ma ọ bụ agwa njirimee: Nke a bụ agwa nke ọnụụ na-atapịa ekwumekwu okwu ma ghọta ihe a chọrọ n’aka ya. Agwa a chọrọ n’aka ya nwere ike ịbụ arịrịọ, nkwa, ntimiwu, mmanya, ịkpọoku w.d.g. Ọ bụ nghọta a ka ọ ga-eji mee ihe a tụrụ anya n’aka ya.
  3. Adịmiire nsinekwumekwu: Nke a bụ agwa ebe ihe okwuu kwuru na-adị ire n’agbanyeghị ma ọnụụ o kwere ma ọ bụ na o kweghị. Ọ bụ ụdị agwa a ka a na-ahụta n’agbamakwụkwọ, ịlụ di na nwunye, ịgụ aha, itinye mmirichukwu, ịkwọ aka n’isi, abụmọnụ, ite mmanụ nsọ na inye ọkwa dị iche iche.

Ebe Austin (1971) kọwapụtarala ụdị agwa atọ dị iche iche a ga-eji mepụta asụsụ, Cooper (1973) kọwara ndịiche dị n’etiti okwu nkọwazị na emereme dị n’okwu e kwuru ekwu. Okwu nkọwazị okwu e kwuru ekwu na-arụ ọrụ ịkọwa ihe ihe bụ, ebe emereme okwu e kwuru ekwu na-agba mbọ ime ka ọnụụ mepụta agwa ndị ahụ dị n’okwu e kwuru ekwu dị ka ọnọdụ e ji kwuo ya si dị. Ka o sila dị, Cooper (1973) kwenyere na okwu njirimee na-emepụta agwa ụfọdụ ma were nwayọọ na-akọwakwa agwa ndị ahụ. Na nkwenye agwa ndị a, okwu njirimee na-emepụta ka Lyons (1977) jiri were ụdị ahịrịokwu nke a kọwapụta ya. Ịmaatụ: “Emee m gị onye isi nlekọta ụmụ akwụkwọ ibe gị” nke onye e mere ya ga na-emezị ihe okwu e kwuru kọwara.

 

Amụmamụ Ndịnọrụ

Amụmamụ ndịnọrụ dị ka a kọwara bụ ihe na-ahụ maka mpụtara dị n’ime mkparịta ụka dị ka ọnọdụ siri dị. Levison (2003) kọwara amụmamụ ndịnọrụ dị ka ngalaba amụmamụ sayensị asụsụ ọrụ ya bụ onye ji asụsụ eme ihe inwe ike iwere ahịrịokwu e mere tinye ya n’ọnọdụ ka mma n’okwu. Amụmamụ ndịnọrụ na-akọwa asụsụ dị ka o si metụta onye na-asụ ya tụmadụ otu a ga-esi kwuo okwu n’ụzọ ka mma n’ọnọdụ anọ na ya na mpụtara okwu ha n’ebe ọnụụ nọ.

Ndimele (2007) kọwara na amụmamụ ndịnọrụ na amụmamụ echiche yiri onwe ha n’ihi na ha abụọ ji echiche eme ihe. Ihe dị iche na ha abụọ bụ na amụmamụ ndịnọrụ na atụle akụkụ echiche ndị ahụ amụmamụ echiche emenwughị nke na-akọwa na atụtụ amụmamụ echiche na-ele anya n’ihe ihe na-arụgara aka ma n’atụtụ amụmamụ ndịnọrụ, a na-amụ echiche site n’ihe ntụaka metụtara ndị na-asụ na ndị na-akọwa. Ọzọ bụ na amụmamụ ndịnọrụ na-atụle ihe a ga-ekwu na otu a ga-esi kwuo ya n’ọgbakọ ebe anọ na otu ọ ga-adị n’ebe ọnụụ nọ. Ya bụ na ọ bụghị ihe okwuu ga-ekwu n’ọgbakọ ndị okenye ka ọ ga-ekwukwa n’ọgbakọ ụmụaka.

Ka o sila dị, amụmamụ ndịnọrụ a nwere ebe ndị ọkammụta kọwara o riri mperi. Dị ka Horn (2000), na Horn (2005) siri kwupụta, amụmamụ ndịnọrụ enweghị usoro iwu doro anya ọ na-agbaso dị ka ụtọasụsụ siri nwee. Ụfọdụ kwuru na e kwesịghị ikepụ amụmamụ ndịnọrụ iche na sayensị asụsụ na o kwesịrị ka ọ dị n’ime amụmamụ echiche. Ụfọdụ sịkwa na o kwesịrị ka a mụọ amụmamụ echiche n’usoro sayensị asụsụ na o kwesịghị ka e were ọnọdụ na-abanyeghị n’usoro asụsụ wee mụọ ya.

N’agbanyeghị mperi Horn (2000) na Horn (2005) tụpụtara maka amụmamụ ndịnọrụ echiche dị iche iche e tinyere na mkpụrụokwu, ahịrịokwu na okwu e kwuru nke a gbasoro usoro agwa nkwupụta, agwa nke ọnụnụ na adịmire nsinekwumekwu nke emereme atụtụ okwu njirimee mekwara ọmụmụ amụmamụ ndịnọrụ ka ọ dị mkpa.

 

Atụtụ Nchọcha

            Atụtụ amụmamụ a gbadoro ụkwụ na ya bụ atụtụ okwu njirimee nke Austin (1962) tụpụtara. Ihe atụtụ a na-akọwa bụ na e ji asụsụ emepụta uche okwuu ma jiri ya na-eme ka iwu ọdịnala dị ire. E ji agwa atọ dị n’ọrụ asụsụ dị ka Austin kọwara wee rụọ ọrụ n’isiokwu a. Agwa atọ ndị ahụ bụ:

  1. Agwa nkwupụta ekwumekwu
  2. Agwa nke ọnụnụ ma ọ bụ agwa njirimee
  3. Agwa nke adịmire nsinekwumekwu ma ọ bụ nghọta ọnụnụ

Ihe mere e jiri were isiokwu a bụ na ọ bụ ya ka e ji tụchaa okwu nne gwara nwa ya na-aga be di ọhụụ iji hụ ka agwa ndị ahụ si pụta ihe n’isiokwu a.

 

Nkọwasị Ngwaọrụ

            N’amụmamụ a, a ga-eji atụtụ okwu njirimee wee tụlee okwu nne gwara nwa ya na-aga be di ọhụụ. A ga-eji agba okwu njirimee nwere bụ agba nkwupụta, agba nke ọnụnụ na agba nke adịmiire nsinekwumekwu were tụchaa okwu ndị ahụ nne gwara nwa ya na-aga be di ọhụụ.

 

Iji agwa atọ atụtụ njirimee nke Austine (1962) wee tụcha okwu nne gwara nwa ya          na-aga be di ọhụrụ      

                                              

  1. Nne

 

  Agwa nkwupụta Agwa ọnụnụ Agwa Adịmiire nsinekwumekwu
i “Nwa m, ugbu a ị na-aga isoro nwoke abụghị nwanne gị ma ọ bụ nwanna gị gaa biri n’ụlọ ebe i bighịbu na mbụ iji bido ezinaụlọ nke gị …” I kwupụta nke bụ eziokwu Ị nọ nwanyọọ gebe ntị
ii “Ị ma na ọ bụrụ na-asị na nwaanyị nwere ike ịnọ be nna ya anụghị di maka ego nna ya na ịhụnanya nne na nna ya nwere ebe ọ nọ, na anyị ga-asị gị alụla di ka anyị na gị nọrọ…” Ikwupụta nke bụ eziokwu Nnabata nkwenye
iii “Ma ọ dịghị etu ahụ maka nwoke ga-ahapụ nne na nna ya, nwaanyị ahapụkwa nne na nna ya gaa ya na nwoke ebiri dị ka di na nwunye” Ikwupụta nke bụ eziokwu Nnabata na nkwenye
iv “Ugbu a nwoke lụwagoro gị, ọ bụzị ya nwe gị, ị ga-anọzị ka odibo ya, ya nwa n’onwe ya ga-anọkwa ka odibo gị. Unu abụọ bụzị otu. Ikwupụta nke bụ eziokwu na ịdọ aka na ntị Nnabata na nkwenye
v Di gị enwebeghị akụ ka nna gị, Chukwu soro kwuo, unu ka ga-enwe akụ nke unu. Ihe dị mkpa bụ ka ndụ dị. Anaghị ebu obi ala be di. Ị dọ aka na ntị na ngọzi Ịgbasi mbọ ike na irube isi
vi Otu isi dobe be gị na di gị ka ọ ga-adị maka na ọ bụ nwaanyị na-emebe ezinaụlọ dị mma. Ndụmọdụ Ịgbasi mbọ ike na nnabata
vii Akpakwala ụkpa ndị nne nwaanyị anaghị eleru di na ụmụ ha anya Ndụmọdụ Nnabata
viii Gosi di gị nrube isi, ịhụnanya, na-ekwenye n’ihe o kwuru ka o wee hụ obibi gị na ya n’anya. Nwaanyị inupuru di ya isi nas-ebute akpọmaasị n’ebe di ya nọ. Ndụmọdụ Nrubeisi
ix “Ị ga na-akpachapụrụ di gị, ụmụ Chineke ga-enye unu na ụmụ odibo gị anya ka i were bụrụ ezigbo nne…” Ndụmọdụ na ngọzị Ị mụta nwa na ịgba mbọ
xi “Kawa ahụ na-eme ka di gị nwee udo n’ime mmụọ. Ọ ga-eme ka unu tọọ atọ ma hụ onwe unu n’anya…” Ndụmọdụ na arịrịọ Nrube isi
xii “Ị ga na-esi nri n’oge ma na-esikwa ya nke ọma…” Inye ndụmọdụ na iwu Isi nri n’oge
xiii “Nwaanyị na-eji ikike nwaanyị nwere ekpe di ya ikpe, na-achọ ka di ya na-atụ ya egwu dị ka onye ji ọkụ egwu egwu…” Ndụmọdụ na ọkwa Ịgba mbọ na ịgbanahụ okwu na ụka
xiv “Akpọbatakwala ndị enyi gị maka obere nsogbu i kwesịrị iji aka gị mezie. Onye na-eme otu a na-etinye onwe ya na nsogbu…” Ọkwa dị mkpa na iwu Ịgbanahụ esemokwu di na nwunye
xv “O nwee ebe edochaghị gị anya, ị jụọ m ka m gwa gị ka ị ga-esi mee ya ka ọ ghara ise okwu…” Ndụmọdụ Ịkwado ịjụ ajụjụ
xvi “Anwakwala anwa mewe ọyị nwoke ọzọ…” Ịdọ aka na ntị Uche ya ịdị ya na ịkatọ ụdị omume a.
xvii “Ị gbaa mbọ ihe niile ndị a ọ ga-adịrị gị na ezinaụlọ gị mma ma nwekwaa obi ụtọ na alụmdi na nwunye unu…” Ngọzi Ịgba mbọ n’imejupụta ihe ndị a
xviii “Unu ga na-ekpekọ ekpere ọnụ na-erikọ nri ọnụ makana ezinaụlọ na-ekpekọ ekpere ọnụ na-anọkọ ọnụ na ebi n’udo…” Inye ndụmọdụ Ikwudosi ike n’ekpere na nkwenye

 

  1. Ebe nne, nna na ụmụnne di gị nọ

 

 

I “Ị ga na-asọpụrụ nne na nna di gị…” Ntimiwu Ịgba mbọ
Ii “Ụmụnne di gị sokwa alụ gị di. Maka ya ị ga na-asọpụrụ ha…” Ndụmọdụ Nkwenye

 

Nchịkọta na Mmechi

            Na njedebe amụmamụ a, odee mejupụtara ebumnobi ya bụ iwepụta agwa okwu njirimee n’ederede a isiokwu ya bụ iji okwu njirimee wee kọwapụta okwu nne gwara nwa ya na-akwado ịlụ di ọhụụ. Odee wepụtara okwu ndị a ma hazie ha n’usoro agwa atọ ahụ okwu njirimee nwere bụ agwa nkwupụta, agwa ọnụnụ na agwa adịmire nsinekwumekwu.

Mmekọrịta asụsụ n’obodo nke okwu njirimee na-eweta so akwalite ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’obodo. Asụsụ njirimee ma ọ bụ okwu emereme dị ka e nwekwara ike ịkpọ ya na-enye aka igbochi mgbagheri anya, ọgbaaghara na nsogbu nke nwere ike ịdapụta n’obodo.

Okwuu na-eji nkọwaru asụsụ njirimee ewulite mmụọ ọnụụ n’ime ka o gee ntị ma ghọta ihe a chọrọ ka ọ ghọta. Nke a na-eweta ezi mmekọrịta n’etiti okwuu na ọnụụ.

 

Nrụmaka

 

Mbah, B. B., Mbah, E. C., Ikeokwu, E. S., Okeke, C. O., Nweze, I. M., Ugwuona, C. N., Akaeze, C. M., Onu, J. O., Eze, E. A., Prezi, G. O. na Odii (2013). Igbo adị Igbo-English, English dictionary of linguistics and literary terms. Enugu: University of Nigeria Press.

Ndimele, O. M. (1998). Semantics a frontiers of communication. Port Harcourt: University of Port Harcourt Press.  

Ogbulogu. C. (2005). Concepts in semantics. Lagos: Sam Iroanusi Publications.

Cooper, O. (1973). Philosophical and the nature of language. London: Longman Group.

Austin, J. L. (1962). How to do things with words. Cambridge: Harvard University Press.

Austin, J. L. (1971). Performative constatives: Readings in philosophy of language. Eaglewood Cliffs: prentice Hall Inc.

Iloene, G. O. (2008). Pragmatics. In Mbah, B. M. and Mbah, E. E. (Eds.) History of linguistics and communication (2008). Enugu: Paschal Communication.

Livinson, S. C. (2003). Pragmatics. Cambridge: Cambridge University Press.

Lyons, J. (1977). Semantics. Cambridge: Cambridge University Press.

 

Syai, P. and Jindel, D. V. (2013). An introduction to linguistics. Delhi: PHI Learning Private.

Horn, L. (2000). From IF to IFF: Conditional perfection as pragmatic strengthening”. Journal of pragmatics 32, 289 – 326.

Horn (2005). “Implications” in Horn, L. and Ward, G. (Eds.). The handbook of pragmatics. Oxford: Blackwell.

 

 

 

 

 

NKỌWA OKWU NHỌRỌ

 

 

Agwa adịmiire nsinekwumekwu          –           Perlocutionary act

Agwa nke ọnụnụ/agwa njirime            –           Illocutionary act

Agwa nkwupụta ekwumekwu              -Locutionary act

Amụmamụ echiche                              -Semantics

Asụsụ ndịnọrụ                                     -Pragmatics

Atụtụ nrụgara aka                                -Referential theory

Atụtụ nsinụbụrụ                                   –           Mentalistic theory

Mwere                                           –   Assumption

Okwu Emereme                                   –           Performative

Okwu njirimee/Okwu emereme           –           Speech act

Okwu nkọwazị                                    –           constative

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Mbịakọta Asụsụ Hausa na Igbo na Nsụ na mpaghara Abuja, Naịjirịa

nke

    

Crescentia Ugwuona

Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naijiria Ndị zọ                                                               (07036832566) crescentia.ugwuona@unn.edu.ng                                                                                                                                                                                                               Mahadum Naịjịrịa, Nsụka                                                                                                                                                                                                                                                                               (07036832566) crescentia.ugwuona@unn.edu.ng

 

Ụmịedemede

Dị ka ebe asụmigwe, isi ala Naịjirịa, nakwa azumahịa mba na mba, ndị mbịa mbịa si mpaghara asụsụ dị iche iche bịakọtara ọnụ na Abuja, nke na-otela asụsụ Igbo na nke Hausa bịakọtra ọnụ n’ebe mepere emepe na nsụ na mpaghara (speech kọmuniiti) ahụ, mana a na-elehere ọnọdụ a anya. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’inyoche ihe dị iche iche mbịakọta asụsu Hausa na Igbo n’ebe mepere emepe na nsụ na mpaghara Abuja na-ebute n’asụsu Hausa nakwa nke Igbo. Amumamu a gbadoro ụkwụ n’usoro asụsụ n’obodo nweta data site n’usoro nọrọlere nakwa ajụjụ ọnụ adịchaghị n’usoro agbara ndị Hausa na ndị Igbo bi n’ebe mepere emepe na Abuja. A chọpụtara na-ihe kpatara mbịkọta asụsịụ Igbo na Hausa n’Abuja bụ mmepe obodo, azụmahịa, isi ala, ọrụ bekee na ọrụaka, na njeje (traavl) iji chọta ọnọdụ ka mma. Ọzọkwa, Asụsụ Hausa na-emetuta asụsụ Igbo nke ukwu ebe asụsu Igbo na-emetutakwa nke Hausa n’okwu olenole. Nchọcha a ga-enye aka n’ikuzi nakwa ọmụmụ asụsụ Igbo na Hausa n’ụlọ akwụkwọgaị dị iche iche na Naịjirịa, nakwa n’ikwalite udo, na ịfụnanya n’etiti Igbo na Hausa na N’aịjirịa. Ọchọcha na-atụ arọ na ndị Igbo ga-ebido nwebe mmasị n’asụsuụ ha n’ebe ọ bụla ha nọ n’akụkụ mba ụwa dị iche iche, ka asụsụ ha na-etowanye.

 

Abstract

As highly multilingual and diverse region where people from different linguistic background converge for different reasons to interact, Igbo and Hausa have overtime witnessed language contact, but has not been given any attention. This work examines language contact between Hausa and Igbo in Abuja speech community. Every language of the world is spoken in contact with other languages. Language contact simply studies how two or more languages come together in a particular linguistics background and influence each other. The study investigates the factors that necessitated the contact of the language in question and the influence of the two languages on each other. This work adopts sociolinguistics approach and collects data through participant observation and unstructured oral interview, and analysed descriptively. The study revealed that migrations, capital city, business, employments, and travels to a large extent induced the Igbo-Hausa contact in Abuja. It was also discovered that Hausa has more influence over Igbo in the area than vise vasa. The study will help in the teaching and learning of Igbo and Hausa language in different schools in Nigeria, and also encourages peace and love between the Igbos and Hausas in Nigeria. The researcher recommends that as travelers, indigenous Igbo speakers should show positive attitude towards their language wherever they are in the world.

Ntọala

Dị ka ebe asụmigwe, isi ala Naịjirịa, nakwa ebe azumahịa mba na mba, ndị mbịa mbịa si mpaghara asụsụ dị iche iche na-bịakọtara ọnụ na Abuja, nke na-otela asụsụ Igbo na nke Hausa bịakọtra ọnụ n’ebe mepere emepe na nsụ na mpaghara (speech kọmuniiti) ahụ mana a na-elehere ọnọdụ a anya. Nchọcha nyochakwara asụmasụ dị iche iche sitere na mbịakọta nakwa mmekọrịta asụsụ abụọ a. Mmetuta asụsụ na-amụ etu asụsụ abụọ ma ọ bụ karịa si abịakọta ọnụ n’otu obodo ma na-enwe mmgbanwe. Ya mere na ọ dị ezigbo mkpa itule asụmasụ na mmetuta na-esi na mbịakọta asụsụ abụọ ma ọ bụ karịa apụta n’ọnọdụ dị etu a. Asụsụ ọ bụla dị n’ụwa na-enwe asụsụ ya na ya na-emetuta n’ebe ọ bụla a na-asụ ya.Ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọtụtu mgbe, ndị mmadị ọcha ndị Igbo na-eme njem site n’otu obodo rue na ọzọ. Ma mgbe ha na-ene njem a, asụsụ ha na nke ndị ọzọ na-enwe mmekorita. N’otu aka ahụ, o siri ike inwete asụsụ e nwere n’ụwa a na-asụ sọọsọ ya n’otu ebe na enweghị mmetụta ya na asụsụ ọzọ site na mmekọrịta ndị nwe asụsụ abụọ ndị a ma ọ bụ karịa. Ọtụtụ ihe dị iche iche na-eme ka ndị mmadụ si n’agbụrụ asụsụ dị iche iche bịakọta ọnụ na-enwe mmekọrịta. Ihe na-ebukote ndị mmadu ọnụ n’obodo nakwa asụmasụ dị iche iche na-esite na mbiakọta a ka a na-enyọcha ma na-akọwa n’usoro nchọcha a. Mmetuta asụsụ bụ ọnọdụ mmekọrịta asụsụ n’obodo ebe mmadụ abụo ma ọ bụ karịa ndị na-asụ asụsụ dị iche iche bịakọtara ọnụ n’otu ebe maka otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ iji nwe mmekọrịta nke ga-ebukota asụsụ ha dị iche iche ọnụ. Mgbe asụsụ ndị a metutara, a ga-enweriri ebe otu asụsụ ga-enwe nnabata ma ọ bụ mbuli elu karịa ndị ọzọ nke na onye ọ bụla ga-agbalị ịdị na-asụ otu asụsụ a karịa ịsụ ndị ọzọ. Mgbe ọ dị otu a, a ga-enwe okwu mbite (lingwistiik boroyiin) mmafenye asụsụ (kood swichiin), nhọrọ asụsu (langwueji chọịsi), nhapụba asụsụ (langwueji shiift), mgbanwe asụsụ (langueji cheenji), dgz n’etiti asụsu abụọ ma ọ bụ karịa. Emela nchọcha mmetuta asụsụ (Ugwuona, 2013, 2014) gosiri na otu asụsụ na enwe oke nnabata ndị mmadụ nakwa ọkwa dị elu ebe ndị ọzọ nọ mgbe asụsụ bịakọtara ọnụ site n’ọnọdụ mmadụ ịkarị mmadụ na ihe ha niile, agha, meri, mbịarachịwa, ohu, mmepe obodo dgz, mana nchọcha ya agbadoghị ụkwu n’Igbo na Hausa n’Abuja spiich kọmunitii. Ya kpara nchọcha a ji gbado ụkwụ na mbịkọta asụsụ Igbo na Hausa na Abuja spiichi kọmunitii. Amumamụ mmetuta asụsụ abụghị ihe taa, ọ bidoro na mbido 1950 dị ka ọ dị n’ọrụ Weinreich (1953) nke ọ nọrọ n’USA rụọ. N’afọ (1970) Labov wulitekwara ọnọdụ ọrụ a. Ọtụtụ ndị nchọcha e meela nchọcha na mbịakọta na mmetuta asụsụ n’etiti asụsụ dị iche iche. (Hụ, Weinreich, 1953;l Appel, L. & Muysken, 1987; Labov, 2001; Igboanusi & Isaac 2001, Ugwuona, 2013, 2015), ma kọwapụta mkpa ọ dị ịdị na-eme ụdị nchọcha a n’obodo dị iche iche n’ihi oke ihe nrite dị na ya. Nke a sokwa n’ihe nchọcha nke a ga-eji leba anya na mmetuta asụsụ dị n’etiti asụsụ Hausa na Igbo n’Abuja (speech kọmunitii) metropolis site n’usoro amumamu asụsụ n’obodo.

Asụsụ Igbo na Hausa bụ asụsụ abụọ n’ime asụsụ atọ gbara ọkpụrụkpụ n’ime ala Naịjirịa. Ndị Igbo bụ ndị bi na Steeti dị n’ọwụwa anyanwụ Naijirịa nke gụnyere Abịa, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo. Ebe ọzọ a na-enwete ụmụ afọ Igbo bụ na Steeti ndị ọzọ gbara ha gburugburu dị ka Delta, Rivers, Cross River, na Akwa Ibom. N’oge ugbua, a na-enwete ndị nwafọ Igbo na mpaghara Steet niile dị na Naịjirịa ọkacha Abụja. A na-enwetekwa ndị nwafọ Igbo n’akụkụ mba ụwa dị iche iche n’oge ugbua. Ọnụọgụ ndị n’asụ Igbọ na Naịjirịa dị na agbata nde iri anọ na nde iri ise. Asụsụ Hausa n’aka nke ya so n’otu n’ime asụsu atọ gbara ọkpụrụkpụ n’ala Naijirịa. Ndị Hausa bụ ndị bi na mgbago ugwu ebe a kpọrọ Ugwu Hausa. Steeti ebe a na-enwete ndị Hausa gunyere Kano, Sokoto, Maidugri, Gombe dgz. Ọtụtụ Steet dị na mgbago Ugwu Hausa na-asụ Hausa. Ọnụogụgụ ndị na-asụ Hausa kariri nde asaa na Naịjirịa (Ugwuona 2014), Abuja bụ otu steeti n’ime steeti dị n’ugwu Hausa ma bụrụkwa isi ala Naịjirịa. Abuja metropolis bụ ebe ụfọdụ okpuru ọchịchị ebe mepere emepe dị. Ha gụnyere ọkpụrụ ọchịchị Gwagwalada, Wuse, Apo, Maitama Duse, Kubam Gariki, Bari, na Areas 1&2. Ọ bụ n’okpuru ọchịchị ndị a ka ndị mbịa mbịa na-ebikari ma na-azukwa ahịa, arụ ọrụ, nakwa eme ihe ndị ọzọ ha ji enweta ego. A ga-eleba anya n’atụtụ dị iche iche dị n’isiokwu a nakwa nchọcha ndị ọzọ e mereela na ya bụ isiokwu. A ga-atụcha njatule e nwetara iji ziputa ụzọ dị iche iche asụsụ Hausa ji amafennye ma na-emetuta asụsụ Igbo na Abuja speech kọmunitii nakwa ụfọdụ asụmasụ ha na-ebute.

Ntulegharị Agụmagụ

Ebe a anyị ga-elebe anya na nchọcha emegoro n’isiokwu site na itule atụtụ dị iche na nchọcha ndị ọzọ n’ isiokwu akpụ n’ọnụ. E nwere atụtụ dị iche iche e jị amụ mmetuta asụsụ nke e jigoro mee nchọcha eri oge. Ha bụ atụtụ nnabata, ntuziaka, mbịakọ, ezi usoro.

 

Atụtụ Nnabata (accommodation theory)

Atụtụ nnabata n’amụmamụ asụsụ na-ebido mgbe onye na-ekwu okwu bịara meziwa otu o si asụ asụsụ ya iji mee ka ọ dabanye n’usoro asụsụ onye ya na ya na-akpa nkata. Ihe a bụ ihe mmadụ na-eme na amaghị ama. Mgbe ndị a na-ekwu okwu a, ha na-agbaso usoro asụsụ ha niile site na ndebe olu, ụdaasụsụ, mkpụrụokwu, usoro okwu (Holmes, 2008; Yule, 2006). Holmes (2008) kwuru na mgbe ndị mmadụ na-akparịta ụka, okwu ha na-abịa yitetube onwe ha. Nke a mee a na-asị na okwu ha na-anabata onwe ha. N’ọnọdụ mbịakọta asụsụ, ụfọdụ mmadụ na-esi n’asụsu ha na-eche na ọ ka mma ma ọ bụ na ọ ka dị elu, na-eweta asụsụ ndị ahụ na-etinye na nke ha. A na-ahụtakwa nnabata asụsụ n’azụm ahịa ebe onye na-ego ma ọ bụ onye na-ere na-asụba dị ka nke onye na-ere ma ọ bu ego, ka o wee dabara ya..

 

 

Atụtụ Ntụziaka (directionality theory)

Atụtụ a na-arụtụ aka n’asụsụ a na-esi na ya ebitekarị okwu nakwa etu o si aga mgbe asụsu abụọ ma ọ bụ karịa bịakọta ọnụ ma na-enwe mmekọrịta. Ugwuọna (2013) kwuru na okwu mbite na-adị ire mgbe omenaala abụọ ma ọ bụ karịa bịakọtara ọnụ n’otu nsụ na mpaghara (spiichi kọmunitii), ha na-emekorite ma na-akpakọrịta n’etiti onwe ha, na-ebite okwu n’asụsu ha na-eche na ọ bụ ya ka nwe ugwu. Ya bụ na ntuziaka ebe e si ebite okwu na-abukarị site n’asụsụ nke a na-ele anya na ndị nwe ya ka nwee ikikere ọchịchị, ego, ugwu, nakwa ikiere na ndọrọdọrọ ọchichị obodo. Higa (1997) mekwara ka a mara na mbite okwu abụghị ihe a na-ebiricha n’otu ugboro, kama n’ọbụ etu e si ebite okwu. Ọ gara n’iru kọwa na okwu ole a na-ebite na-adị iche site na ebe rue na ebe, nakwa site n’asụsụ rue na asụsụ dị ka ọrụ ha n’omenala, mmepe, ọchi agha, ndị, mmepe, na ike ọchịchị siri dị. Yule (2006: 209) n’ Ugwuọna (2013) kwuru na anyị na-ewebata ụdị echiche mbumugwu dị ka ụzọ e si akọwa etu ndị mmadụ si agbanwe okwu. Mgbe mgbanwe dị n’ụdị a, ibite okwu na-abụkari site na nke ndị ogo otu dị elu, ọkacha mgbe onye ọ bụla na-ahụta asụsu ahụ dị ka nke ka mma ma nabata ya na nsụ na mpaghara ahụ.

 

Atụtụ Ezi Usoro (systematic theory)

Gracia (2003) chọpụtara na mmetuta n’ụdị ọ bụla na-enwe ezi usoro, n’ihi ya mmetuta asụsụ na mbite okwu agaghị adị iche. Ọ bụ ọdịdị usoro mmebe okwu ndị na-abịakọrịta na etu ha si agakọrịta na onwe ha bụ ihe na-eziputa ụdị mmetuta. Gracia weputara iwu abụọ nke na-ekpebi ọdịdị ezi usoro na nkwekọrịta: iwu ezi usoro ndaba (principle of system compatibility) na iwu ezi usoro adabaghị (principle of system incompatibility).

 

Atụtụ Mbiakọ (convergence theory)

Mbịakọ bụ mgbe ndị mmadụ hapụrụ etu ha si asụ asụsụ ma were usoro asụsụ onye ha na-agwa okwu (Giles & Smith, 1979). E nwere ụdịdị ihe abụọ na-akpọlite mbịakọ: Mkpọlite ihe mmetụta obi na mkpọlite mmụọ akpamụbụbọ. Nke a bụ okwuu innabata usoro asụsụ okwuu iji wulite mmetuta mmụọ ga-ejiko ya na ọnụụ, iji mee ka ọnụụ ghọta ya. Ọtụtụ nchọcha gosiri na mbịakọ na-enye aka iwete echiche ọnụụ nso ebe okwuu nọ ma mekwa ọnụụ isonye nke ọma n’ihe okwuu na-ekwu (Giles et al., 1987; Jenkins, 2000; Bourhis et al., 2012). Mbiakọ a na-apụtakarị n’ogo mkpụrụ uda.

 

Ntulegharị Ihe Ederela N’Isiokwu

Bynon (1990) n’ Ugwuọna (2013) kwuru na ụdị mmetuta asụsụ ama ama bụ nke dị n’etiti omeputa ma ọ bụ ndị na-ebupu ihe e meputara na ndị na-azụrụ ihe ha mepụtara ndị nwere asụsụ dị iche iche. Ọ bụ ihe dị adị n’agụgụala asụsụ na aha ọtụtụ ihe e nwere n’ahịa mba ụwa dị ka tea, coffee, sugar ma ọ bụ tobacco na-abanye n’asụsụ ndị niile na-eri ha. Mmetuta a bụghị sọọsọ na mkpụrụokwu kama ọ na-emetutakwu ọdidị mkpụrụ ụda asụsụ na iwu ụtọasụsụ.

 

Na Abuja metropolis aha ihe ndị a na-eregasị ma ihe oriri na ihe ndị bụ aha ha na Hausa ka ndị Igbo na-akpọ ha. Ọ bukwa aha ndị Igbo nyere ihe oriri ha ụfọdụ dị ka ọgbọnọ,onugbu nchuanwụ, egusi ụzụza, ụgụ wdgz ka ndị Hausa na ndị ọzọ na- asụ asụsụ ọzọ dị iche iche na Abuja na-akpọ ha.

Agbedo (2007) kwuru na mmetuta asụsụ na-apụta mgbe ndị mmadụ nwere asụsụ dị iche iche biakọtara n’otu ebe maka ebumnuche ọ bụla iji nwe mmekọrita. Ugwuona (2014) kwuru na mmetuta asụsụ bụ mgbe asụsụ abụọ ma ọ bụ karịa bịakọritara ọnụ n’okwu ndị mmadụ na-enweghi otu asụsụ, nke na-eme ka otu asụsụ ma ọ bụ nke ọzọ na-emegide ndị ọzọ. Amụmamụ mmetụta asụsụ ka akpọrọ mmetụta amụmamụ sayensi asụsụ. Ụzọ asụsụ si emegide asụsụ ibe ya bụ site n’otu asụsụ igbanwo mkpụrụ okwu ya nke pụtara ibite asụsụ. Ugwuona, kọwakwara na e nwegasịrị ụzọ ndị ọzọ asụsụ si emetuta ibe ya nke na-ezipụta onwe ha n’ụdị mmafenye asụsụ, nhapụ asụsụ, mgwakọ okwu, mgbanwe olundị na omenala, asụsụ ogbi, pijin na mbiakọ ọwa. Nke pụtara na mgbanwe na ngaghari mmadụ na-enwe, na-emetuta asụsụ dị ka ngwa ọrụ mmadụ na ibe ya ji emekorita mgbe ọ bụla ha bịakọrịtara. Nelde (2000) kwuru na mgbanwe na mbawanye n’usoro ọha mgbe e nwere mbịakọrịta n’etiti ndị nwere asụsụ dị iche iche na-ebute mmetuta asụsụ dị ka etu o si dị na Belgium, France na Canada. O nyere ịmaatụ mmetuta ebe otu asụsụ nwere ọnọdụ dị elu n’etiti ndị ọzọ etu ọ dị na French na Belgium, Bekee na Canada. Asụsụ a na-achịkwa n’ọchịchị, ndọrọdọrọ ọchịchị, ndị na mmepe ma bụrụ agwara pụrụ iche nye onye ọ bula mara ihe ekwe na-akụ na ya bụ asụsụ mgbe ọ bụla ọ gara ebe a na-achọ ọrụ.

Ogo mbịakọta asụsụ n’asụsụ ndị asụm abụọ

 

 

                   Yidish- English                 Yidish – English

                 (mbite okwu)               (asụsụ obere na-emetuta)

Okwu                     nukwu mbite                    mbite okenabọ

ụda                           o sighi ike                                o siri ike

ahịrị                           okenabọ                                  o siri ike

 

 

 

Nsibia: Thomson and Kaufman 1988:40, tebuul 2

 

Windford (2008) kwuru na e nwere ike ikewe ma nwe ezi nghọta mmetuta asụsụ site na-itule ọnọdụ a nọ nwe mmetuta. Windford jiri nkeji dị ka nlekwata asụsụ, nketa asụsụ ọhụ, na nhapu asụsụ gosi ọnọdụ na ogo mmetuta dị iche iche a na-enwe.

 

Nchọcha N’isiokwu

Ọtụtụ ndị nchọcha emeela nchọcha banyere mmetụta asụsụ n’ụzọ dị iche iche nke anyị ga-eleba anya. Nwaozuzu, Agbedo na Ugwuona (2014) na nchọcha ha mmetuta asụsụ n’amụmamụ asụsụ n’obodo n’asụsụ Obollo dị n’Enugu State, Nigeria kwuru na e nwere ọtụtụ ihe na-ebute mmetuta asụsụ n’Obollo. Obollo nwere ụzọ ebe ọtụtụ ndị njem na-ezukorịte ọkachasị mgbe ha chọrọ izu ike. Nke a mere o jiri bụrụ ebe ahịa na-aga ọfụma. Ọtụtụ ndị mmadụ sị obodo dị iche iche ndị ha na Obollo bụ agbata obi bịakwara biri n’Obollo maka azụmahịa. Nchọcha a mere ka a mara n’asụsụ ndị si ebe dị iche iche dị ka ndị Idoma, Awka, Owerri, Hausa, Yoruba mmetutara asụsụ Obollo. Nke a wetara okwu mbite, ngwakọ okwu na oke mkpọbata. A chọpụtara ihe ndị na-eweta mgbanwe asụsụ n’asụsụ obollo nke gụnyere mgbam afọ, mmekọrịta, nnwe ugwu na ndị ọzọ.

Nchọcha Okorji na Ọmachọnụ (2007) gosiri mmetuta asụsụ asụsụ n’etiti Igala na agburu ọzọ dị na Najiria dị ka Edo, Yoruba, Igbo, Bassi, Kaduna, Ebira, Gwari, Idoma, Tiv and Junkun. Nke a bụ n’ihi na ọ nọ n’etiti ha niile. Site n’azumahịa ndị asụsụ Igbo metutara nke Ibaji na obodo dị ka Asaba, Ogurugu, Iga, Ọjọ, Otu, Anịoma, ndị dị n’Enugu na Anambra Steetị ha na ha nwere agbata obi. E depụtara okwu ndị a Ibaji bitere n’Igbo:

 

  1. Igbo Ibaji                Gloss
  2. nkịta ukita                dogs
  3. dimkpa idimkpa           strong man

iii.        nkàtà                ùkàta                basket

  1. mkpà ukpà                want
  2. òkpu òkpu                cap

Nchọcha Ibrahim (2014) kọwara na Naijịrịa bitere aha agwa (colour) dị iche iche site n’asụsụ bekee. Mbite a kpọbatara usoro ụda asụsụ ndị a dị ka blue nke a na-ede n’ụzọ dị iche iche n’asụsụ Naijiria. Agwa ndị ọzọ ebitere bụ yellow, silver, na gold. Ọzọ, a na-enwe mmafenye site na asụsụ Naijiria ga n’asụsụ bekee mgbe ọ bụla e nwetaghị aha agba n’okwu. Na nchọcha ndị a nille, o nweghi nke gbadoro ụkwu n’asụsu Igbo na Hausa. Ya mere nchọcha a ji hiwe isi na mbịakọta asụsu Igbo na Hausa n’isi ala Naịjirịa, bụ Abuja ebe ndị Igbo juru eju bara abara.

 

Atụtụ Ọnọdụ Nhụta Ọrụ a

Nchọcha a gbasoro atụtụ nnabata. Atụtụ nnabata dị ka Giles (1973) siri kwu bụ ọnọdụ mmadụ igbanwo olu ya iji mee ka ọ na-ada ka nke onye ma ọ bụ ndị ọ na-agwa okwu. Giles na Smith (1929) jikọtara mbughari ngwọolu a kpọ ya Atụtụ nnabata Okwu Speech Accommodation Theory (SAT) na bekee. Ọ chọpụtara na okwuu anaghị ahapụ ngwọolu ha sọọsọ, ha na-ahapu agwara okwu ndị ọzọ dị ka nchetu, ogo okwu na mkpọpụta okwu. Putman & Street (1984) kwuru na ndị ogba ajụjụ na-ebeleta etu ha si ekwu okwu iji mee ka okwu ha na-ada ka nke ndị ha na-ajụ ajụjụ. Giles na Coupland (1991) wulitere atụtụ nnabata okwu ọ bụrụ atụtụ nnabata nziritozi communication accommodation theory, (CAT). Atụtụ nnabata nziritozi gụnyere agwara asụsụ na nke asụsụ ogbi.

 

Nchịkọta Agụmagụ

E meela ọtụtụ nchọcha banyere mmetuta asụsụ n’amụmamụ asụsụ na obodo n’etiti asụsụ dị iche iche. E nwere atụtụ dị iche iche n’isiokwu a dị ka atụtụ nnabata, atụtụ ezi usoro, atụtụ mbiakọta, na atụtụ ntuziaka. N’agụmagụ anyị tulegharịrị, a chọpụtara na o nyere nsogbu inweta asụsụ a na-asụ sọọsọ ya n’otu obodo na-enweghi otu asụsụ ma ọ bụ karịa ha na ya na-enwe mmetuta site na mbikọta ọnụ ndị obodo ahụ na ndị ọzọ bi ebe ahụ nwere asụsụ dị iche iche. Nchọcha anyị gbadoro ụkwụ n’atụtụ nnabata.

 

Usoro Nchọcha

Na nchọcha a, ọchọcha gbasoro usoro ntụcha (descriptive method) maka na e ji ya achọpụta ihe gbasara mbịakọta asụsụ na ihe ọ na-ebute. Ọ na-adị mfe iji ya akọwa ihe e nwetere site na nọrọlere (participant observation) nakwa njụmaza ọnụ a -ahazuchaghị (unstructured oral interview). Usoro ntụcha a na-emekwa ka ihe a chọpụtara doo anya nke ọma.

Oke Nchọcha

Oke nchọcha a bụ iji atụtụ sosiolingwistiks wee nyoche mbịakọta asụsụ Igbo na Hausa n’Abuja spiichi kọmunitii ke Naịjirịa

 

Ndị e Jiri Mee Nchọcha

Ọ bụ ndị bi na mpaghara ebe mepere emepe n’Abuja (metropoliis) spiich kọmunitii nke gunyere Gwagwalada, Wuse, Maitama, Apo, Duse, Kuba, Gariki, Bari, na Area 1&2. Ọchọcha gara n’ebe ndị a ma letacha ma nụtacha ka asụsụ Igbo na Hausa si emetutacha onwe ha site na mbịakọta obodo abụa a. Oge ụfọdụ, ọ na-edetukwa ihe ọ nụtara na akwụkwọ ma teepukwa nke ọzọ. Odee na ndị Hausa ebiela ọtụtụ mgbe nke na ọ na-anụ ma na-asukwa Hausa. Nke a nwere ya aka na nchọcha a.

 

Usoro Nnweta Ndị e Jiri Mee Nchọcha

Ndị e jiri mee nchọcha bụ madụ iri ise ndị Hausa na ndị Igbo na-azị ahịa na ndị na-arụ ọrụ dịgasị iche iche n’obodo ndị a mepere emepe anyị kpọputagoro n’elu.

 

Ngwa Nchọcha

Na nchọcha a, ọchọcha jikarịrị usoro nọrọlere wee nwete ngwa nchọcha ya. Ọchọcha mere nke a site n’idepụta ihe ọ nụtara n’akwụkwọ, nke o mechere tụgharịa ma dezie ha nke ọma. Ọchọcha gagharịrị n’obodo iri ahụ ọ deputara n’akọtacha mgwa nchọcha ya. Ihe sotebere nke a bụ na ọchọcha haziri data nchọcha ya site n’ịkọwa ma tụcha ọkwu ndị ọ nakọtachara, ma dezie ya etu o kwesiri.

Nziputa na Ntụcha Njatule

Nkeji a lebara anya n’ịtụcha ọnọdụ mmetuta asụsụ Hausa na Igbo na Abuja spiichi kọmunitii n’ụzọ abụọ. Nke mbụ ihe ndị na-ebute mmetuta asụsụ n’ọnọdụ dị iche iche. Nke abụọ, ihe mmetuta asụsụ na-eweta n’usoro okwu asụsụ Hausa na nke Igbo.

 

Ihe Ndị na-Ebute Mmetuta Asụsụ na Abuja Metropolis

Anyị chọpụtara site na ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ adịchaghị n’usoro, na ọtụtụ ihe na-ebute mbịakọta nakwa mmetuta asụsụ na Abuja. Ha gunyere ndị a:

  1. Njenje: Mgbe mmadụ na-asụ otu asụsụ hapụrụ obodo ha ga n’obodo ọzọ nwere asụsụ dị iche na nke ha, a ga-enwe mmetuta asụsụ ha na asụsụ ebe ha gara. Ndị Igbo bidoro gawa Ugwu Awusa na ebe ihe dị ka 1950 n’ihi azumahịa. Ụfọdụ na-azuru nrị na-ebulata ebe ụfọdụ bi ebi. N’ihi mmekorita ha na ndị a, a na e nwe mmetuta n’etiti asụsụ Igbo na Hausa nke na-ezipụta onwe ya n’ọnọdụ asụsụ na obodo dị iche iche.
  2. Azụmahịa na ọrụ aka: Azụmahịa na ọrụ aka bụ aka ọrụ ma ọ bụ ihe mmadụ ji enweta ihe o ji ebi ndụ e nweghi ike ime ọfụma ma ewepu asụsụ. Iji hụ na ihe ndịa gara ọfụma a na-enwe nnabata asụsụ onye na-azụrụ ahịa na onye a na-arụrụ ọrụ. Nnabata asụsụ na-eweta mgbanwe asụsụ anabatara na ebe asụsụ onye nabatara ya.
  • Isi ala: Abuja bụ isi ala Naịjirị, n’ihi ya, ndị mmadu na-enuje ebe ahụ maka ọrụ bekee nakwa ọrụ ndị ọzọgasị.
  1. Abuja nọ n’etiti ala Naịjirịa, nke na ọ dịrị ọtụtụ ndị mmadụ mfe ịga ebe ahu biri.

 

Ngosipụta Mbite ole na ole (representative examples) N’Abuja Spiichi Kọmụnitii ke Metropolis

Na nkeji a, anyị ga-egosipụta mbite okwu ma ọ bụ ahịrị ole na ole (representation examples) dị ka anyị siri nakọta n’Abuja spiichi kọmunitii ke metropolis. Dị ka usoro n’add nchọcha a, anyị gosiri nanị okwu mbite ole na ole nọchitere anya ọtụtụ okwu mbite nakwa mmafenye anyị chọpụtara. Nke a bụ ka nchọcha a ghara ịgefe oke karịa etu o kwesiri.

 

 

 

 

 

                      Hausa Igbotupu mmetuta Igbo mgbe e nwere mmetuta Gloss
i.         Kudi Ego Kudi Money
ii.        Nagode

iii.      Zo

iv.      Tofi

v.       Kawo

Imeela Bịa Pụọ Wete Nagode Zo TofiK awo Thankyou Comego out wete
vi.      Doya Ji Doya Yam
vii.    Alibasa Yabasi Alibasa Onions
viii.      Tuwo

ix.      Shinkafa

x.        Jara

xi.         Remu

xii.       Suya

xiii.      Dawa

xiv.     Masara

xv.       Takada

xvi.     Gaskiya

xvii.    Lafịa

xviii.  Yaya

xix.     Baba

xx.       Aduwa

xxi.  Achana

xxii. Rankadede

xxiii.     Agogo

xxiv.     Asibiti

xxv.Akwụya

xxvi.     Danchiki

xxvii.   nunu

 

Nri oka

Osikapa

Mmezi

Oroma

Anụ mmịkpọ

Ikakporo

Ọka

Akwụkọ

Ezioku Ọma

Ada nwanyị

Nna

Ekpere

Mkpaọkụ

Onye ukwu

Mgbaka wọchị

Ụlọ ọgwụ

Ewu

Drọọs

Mmiri ara efi

Tuwo

Shinkafa

Jara

Remu

Suya

Dawa

Masara

Takada

Gaskiya

Lafịa Yaya Bab

Aduwa

Achana

Rankadede

Agogo

Asibityai

Akwụ

Danchiki

Nụnụ

Corn food

rice

additional

orange

roasted meat

millet

maise

booktruth

well/fine

elder sister

father

prayer

matches

honourable

wrist watch

hospital

goat

short-nicker

Fresh catle milk

 

Ọmụmaatụ dị n’elu na-egosi okwu mbite ole na ole (representative examples) ndị Igbo bitere n’asụsụ Hausa n’ebe dị iche iche n’ebe mepere emepe n’Abuja. Ndị Igbo na-ebite okwu dị iche iche dị ka aha, ngwaa, na nkọwaa aha. Mana dị ka anyị si hụta na tebuul dị n’elu, aha ka ha ka ebite karịa okwu ndị ọzọ. Imaatụ, okwu ngwaa dị sọsọ anọ (ii, iii, iv, v), okwu nkọwa aha dị abụọ (xvii, xxii), okwu ndị ọzọ niile bụzị aha. O gosiri na abịa na okwụ mbite, ọ bụ aha ka a na- ebitekarị. Ọzọkwa, ndị Igbo na-ebite okwu Hausa aghara aghara n’Abụja iji hụ na ha na-ndị Hausa na-akpakọrịta nke ọma. Ọzọkwa, asụsụ ndị Hausa anaghị ahịa ahụ na mmụta. ọtụtụ mgbe, ha bite okwu, ndebe ọlụ ha na-adịkarị ka nke ndị Hausa. Oge ụfọdụ, ndị Igbo na-eji akseent Igbo akpọpụta okwu ụfọdu ha bitere. Imaatu, n’okwu nunu (ix), ha na-akpọ ya nụnụ. maka na e nwere nkpụrụụda n’asụsụ Igbo.

 

Mbite N’ogo Ahịrịokwu N’ụlọ ebe obibigasị

 

                                                                                                                                            

         Hausa Igbo tupu mmetuta Igbo mgbe e nwere mmetuta Gloss
i.               Ya-ya Kedu Ya ya How are you
ii.              Mai – ruwa Onye mmiri Mai ruwa Water seller
iii.            Kunu aya Akamu akị awusa Kunu aya A type of pap
iv.            Waye Ọ bu onye Waye Whoare you
v.             Babu

vi.            Tuwo masara

vii.          tuwo shinkapa

viii.         tuwo dawa

 

Amaghị m

ụtara ọka

ụtara rice

ụtara ikakporo

 

Babu

Tuwo masara

Tuwo shinkapa

Tuwo dawa

 

I don’t know/

Maize fou fou

Rice fou fou

Millet fou fou

 

 

 

 

 

Ọmụmaatụ dị n’elu na-egosi mbite ahịrịokwu n’asụsụ Hausa n’ebe obibi dịgasi iche iche na Abuja speechi kọmunitii. Ha na-eji akseent Hausa akpọpụtakwa ọtụtụ ọkwu ha bitere dị ka ọ dị n’ọmụmaatụ dị n’elu. Ọzọkwa, mbite a na-gosiri na ndị Igbo anaghị ebite okwu sọọsọ maka azụmahịa. Ha na-asụkwa ma na-etinyekwa okwu ha bitere n’ọrụ n’ụlọ ebe ha bigasi, ọ kacha mgbe ha na ndị Hausa na-akpakọrịta. Oge ụfodụkwa, ha na-asụ Igbo ma ọ bụrụ na ha na ndị Igbo ibe ha na-akpakọrịta. O gosikwara na ndị Igbo na-ahapụ asụsụ ha oge ọ bụla nakwa etụ masịrị ha.

 

 

Okwu Mbite (ahịrịokwu) N’ụlọ Ọrụ

 

     Hausa                         Igbo tupu mmetuta Igbo mgbe e nwere mmetuta Gloss
i.              Mallam/ Mallama Onye nkuzi/ọga Mallam/ Mallama Teacher/boss
ii.            Sanu da ayki Dalụ ọrụ Sanu da ayki Well done
iii.          Ya ya ayki Kedu maka ọrụ Yaya ayki How is work
iv.          Akwa yi ayki? E nwere m ọrụ/         I nwere ọrụ? A kwayiayki I have work or do you have work?
v.            Ba karfi

vi.          Aboki

vii.        Yaro

Ike adịghị m

Enyi

Okorobia

Ba karfi

Aboki

Yaro

I am tired

Friend

Young man

A chọpụtara site n’ọmụmaatụ dị n’elu na ndị Igbo na-ebitekwa ma ahịrịokwu site n’asụsụ Hausa n’ụlọ ọrụ ebe ha na-arụgasị ọrụ iji hụụ na ha na-aghọta onwe ha. Ha na-ejikwa akseent Hausa akpọpụtakwa ọtụtụ okwu ha bitere.

 

Okwu Mmafenye (code-switching) n’etiti Igbo na Hausa na Abuja spiichi kọmunitii

Ọtụtụ mgbe, ndị Igbo na-esi n’asụsụ Igbo mafenye n’asụsụ Hausa ma ha na-akpa nkata. Ihe       ọmụmatu dị n’okpuru gosiri nke a nke ọma:

  1. Ọga, I na-akụ abincị?

Ọga, I na-eri nri?

Master, are you eating food?

  1. Mallam nye m anụ dubu daya.

Onye na-ere anụ nye m anụ otu puku naira

Meat seller give meat of N1,000.00

  • Mai ụdara, ole ole.

Onye ụdara, ole ole.

Udara seller, how much

  1. Mama ya biyu

Mama ejima

Mother of twins

  1. Haa egusi da ogbono gaba daya.

Tinyekọta egụsi na ogbono niile ọnụ.

Put all the egusi and ọgbọnọ together

  1. A yọla m ya ugboro ugboro I naa.

A yọla m ya ugboro ugboro o kweghi.

I have begged him/her several times and he refused.

  • Nyarinya/mai kaya, kawo

Nwanyi, onye na-ere ihe weta egusi.

Madam/item seller bring melon

  • Kawo ụgụ da onugbụ.

Weta ụgụ na onugbu

Bring pumpkin leaf and bitter leaf.

  1. Isi akara biyu

Isi akara abụọ.

Two bulbs of beans

 

N’ihe ọmụmatụ dị n’elu, e dere asụsụ Hausa nitaliiks mana etinyeghi nke Igbo n’italiiks. Ya bụ n’okwu niile dị n’italiiks bụ okwu Hausa, ebe nke adịghi bụ okwu Igbo. A chọpụtara na ndị Igbo na-amafe site n’okwu Igbo ga n’okwu Hausa mgbe ọtụtụ mgbe, nakwa etu o si sọ ha.Ha na-emekwa nke mgbe sọọsọ ha na-akparịta nkata dị ka e gosirila n’elu.                                                                                                      

 

Okwu ndị Hausa bitere site n’asụsụ Igbo na Abuja spiichi kọmunitii.

Oge ụfọdụ, ndị Hausa na-ebitekwa okwu Igbo mana ọ naghị abụ mgbe niile. Okwu ha na-ebite n’asụsu Igbo na-adị ole na ole dị ka anyị si gosi n’okpuru ebe a:

 

       Igbo                          Hausa tupu mmetuta Hausa mgbe e nwere     mmetuta      Gloss

i     Ọga                           mallam                     oga                                             master ⁄boss

ii     Ego                         kudi                       ego                                           money

iii     Bịa                         zoo                         bịa                                           come

iv   Kedu                       ya ya                       kedu                                         how are you

Nnọ                           sanu                       nno                                         welcome

 

Ọmụmaatụ dị n’elu na-egosi na ndị Hausa na-ebite okwu n’asụsụ Igbo, mana ha anaghị ebite nnukwu. Ha anaghị akpọpụtakwa okwu ndị ha bitere ọfụma. Imaatụ, ihe ha na akpọ ọga bụ oga, nnọ bụ nno. Ha na-eme nke a ka o wee dabanye nke ọma ka ha si akpọpụta okwu n’asụsu ha.

 

Mmafenye okwu Igbo n’Hausa

Oge ụfọdụ, ndị Hausa na-esitekwa n’okwu Hausa mafenye n’okwu Igbo. Ahịriokwu dịgasị n’okpuru ebe a gosiri nke a:

  1. i. Nyarinya weta ego.

Woman bring money.

Nwanyi weta ego.

ii.Oga, akwai sablu?

Master, do you have soap?

Ọga, I nwere ncha?

  1. Mai kaya, kawo

Item seller, bring pumpkin leaf.

Onye na-ere ihe, weta ụgụ.

  1. Gashi, i meele.

Take, thank you.

Were, i meela.

N’ọmụmaatụ dị n’elu, a chọpụtara na ndị Hausa anaghị amafenye ọtụtụ mkpụrụokwu n’ahịrịokwu ha. Ọtụtụ oge, ọ na-abụkarị otu mkpụrụokwu nke bụ aha ihe ha chọrọ izuru ma ọ bụ ihe ha na-ere ka ha na-amafenye. Ọzọkwa, n’ọmụmatụ ndị dị n’elu (i-vi) e dere okwu Hausa n’italiiks mana edeghi nke Igbo. Nke a bụ ka e wee mara nke bụ nke.

 

Nchọpụta, Nchịkọta na Mmechi

Mbịakọt asụsụ na-eweta mmetute asụsu, mbite okwu, mmafenye asụsụ, nakwa ihe ndị ọzọgasị.

Dị ka anyị siri gosiputa n’ihe nchọcha a. Ọchọcha chọputara na mbịakọta asụsụ Igbo na Hausa n’Abuja na-emetuta asụsụ n’ogo ụda, mkpụrụokwu, mbite, nhapụ asụsụ dgz. Pinker (2010) chọpụtara na mmgbanwe otu asụsụ na-enwe n’asụsụ ọzọ nwere ike iweta mmebe asụsụ. Igbado ukwu n’ihe ndị a di n’elu, anyị chọpụtara n’asụsụ Hausa nwere oke mmetute n’ebe asụsụ Igbo nọ na Abuja spiich kọmunitii. Nke a bụ n’ihi mgbanwe ọtụtụ okwu Hausa megoro nye Igbo n’Abuja. Anyị chọpụtakwara na e nwere mbite okwu n’etiti asụsụ abụọ ndị a. Nchọcha a dabara n’atụmatụ Harris (2009), onye chọpụtara na mbite okwu na-adị n’ụdị mkpụrụ okwu, mkpụrụ ụdaasụsụs, mmebe okwu na usoro okwu na mmetuta asụsụ. Ọzọkwa, nchọcha a dabara n’atụtụ Giles na Smith (1979) nke kwuru sị na mbịakọ bụ mgbe ndị mmadụ hapụrụ etu ha si asụ asụsụ ma were usoro asụsụ onye ha na-agwa okwu. Ọ dabakwara na nke ha kọwara na e nwere ụdịdị ihe abụọ na-akpọlite mbịakọ: Mkpọlite ihe mmetụta obi na mkpọlite mmụọ akpamụbụbọ. Nke a bụ okwuu innabata usoro asụsụ ọnụụ iji wulite mmetuta mmụọ ga-ejiko ya na ọnụụ, iji mee ka ọnụụ ghọta ya. Nke ọzọ bụ na mmetuta asụsụ na-eme ka mmadụ mụta asụsụ nke abụọ. Cobbs (2007) kwuru na mmetuta asụsụ na-eweta iji otu asụsụ nọchie asụsụ ọzọ. Nke a na-eme mgbe otu asụsụ nwere ugwu karịa nke ọzọ. Regan (2010) kwukwara na mgbe otu asụsụ nwere oke ugwu, na ọ na-ebute asụsụ ị nọ na nsogbu ma ọ bụ nnwupịa asụsụ. Ọchọcha chọpụtakwara na mbịakọta asụsụ na-ebute mmetuta na ọnwụ asụsụ. Nke a bụ nnukwu nsogbu asụsụ Igbo nọ na ya. Na Abuja spiichi kọmunitiik e nweghịzi ndị nọ n’afọ iri atọ gbadata kana asụ Igbo. Ya bụ na ọ bụrụ na ndị Igbo ekulighị n’ụra, oge na-adịghị anya, asụsu ha ga-anwụ; maka na nsogbu a abụghị sọọsọ na Abuja kama ọ dị na mpaghara ala anyị niile ebe ndị Igbo bigasị. Nchọcha a ga-enye aka n’ikuzi asụsụ Igbo nakwa Hausa, ya na ihe gbasara mbịakọta asụsụ n’ogo ụlọ akwụkwọ di iche iche na Naịjirịa.
Nrụka

Agbedo, C. U. (2007). Problems of multilingual nations: The Nigerian perspective. Enugu Fidgina Global Books.

Bynon, T. (1990). Historical Lingustics. Britain: Bath Press.

Giles, H. (1973). Accent mobility. A model and some data Anthropological linguistics, 15, 87-105.

Giles, H. and Smith, P. (1979). Accomodation Theory. Optimal Levels of Convergence: Language and Social Psychology, 45-65.

Giles, H.Taylor, D. M., & Bourhis, R. Y (1973). Towards a theory of interpersonal accommodation through speech some Canadian data language in society.

Gracia, M. (2003). Linguistics Borrowing in Bilingual Contexts. Journal of Linguistics. University of Texas. Sao Antonio.

Harris, K. N. (2009). Apporaches to the study of vocabulary exchange in society. London: Eldan Press.

Ibrahim, R. A. (2014). Expanding the domain of English influence: The issue of colour naming in some indigenous Nigerian language. European Scientific Journal 10 (14) 1857-7887.

Jekins, J. (2000). The Phonology of English as an International Language. Oxford. Oxford University Press.

Kaugman, S. O. (2009). Effects of language contact. New York: Cambridge University Press.

Mijaki, T. (no) Accomodation theory in inter language talk. Convergence across different levels of English. Unpublished Thesis. Retrieved from http://enwikipedia.org/eiki/accomodation-theory on May 2017.

Mufwere, R. O. (2010). Language contact. Ibadan: Jumoke Publishers.

Nwaozuzu, G. I., Agbedo, E. U. & Ugwuona, C. N. (2013). Sociolinguistic study of language contact in Obollo speech community. Research on Humanities and Social Sciences E. 3 (12).

Okorji, R. I. & Ọmachọnụ, G. S. (2007). The influence of Igbo on Ibaji dialect of Igala. Awka Journal of Linguistics and Languages. AJILL, 3, 43-31.

Pinker, Z. N. (2010). The input hypothesis: Issues and implication of language contact in L1 and L2 speakers. Boston: Little brown publishers.

Regan, C. W. (2010). A General and unified theory of transmission process in language contact. Heidac berg. Universitatsver (ag) C. Winter.

Schumann, A. N. (2010). A pedagogical description of English language. Wellington: New Zealand Press.

Thomason, S.A. (2010). Language contact, creolization and genetic linguistics. Berkely: University of California press.

Ugwuona, C. N. (2013). Sociolinguistic Study of Language Contact in Obollo Speech Community. Unpublished Ph.D Thesis University of Nigeria, Nsukka.

Ugwuona, C.N. (2014). Hyperadoptation as a Sociolinguistic Situation in Ubolo Speech Community of Igboland. In Nsukka Journal of Humanities, 100-107.

Weinreich (2010). Language interferences in dialect. London: Macmillan publisher.

Weinreich, P. R. (2011). Social implication of language contact. New York: Willy Publishers.

Wikipedia2017. Retrieved from http://enwikipedia.org/eiki/languagecontact on May, 2017.

Wilson, N. O. (2009). The analysis of Lingustics Borrowing. Language Journal of Research, 2 (1), 50-60.

Windford, (2008). Language contact study: oxford: Blackwell publishers.

Yule, G. (1995). The study of language United Kingdom. Cambridge University Press.

 

 

Leave a Reply